Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 2/1 p. 26-29
  • Ònye Ka Ụta Dịịrị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Ka Ụta Dịịrị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Isi Ike Ego   
  • Enwetaghị Ihe A Tụrụ Anya Ya n’Ebe Ụmụaka Nọ
  • Emeghị nke Ọma n’Ụzọ Ime Mmụọ
  • Ngọpụ Ikpeazụ
  • Iche Ihe Bụ́ Eziokwu Ihu
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsị Ịbụ Onye A Na-ata Ụta Mgbe Nile?
    Teta!—1997
  • Ụta Adịghịrị Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • “O Sighị M n’Aka”
    Teta!—1996
  • N’ihi Gịnị Ka O Ji Esi M n’Aka Mgbe Nile?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 2/1 p. 26-29

Ònye Ka Ụta Dịịrị?

NWOKE mbụ bụ́ Adam, malitere omume ahụ. Mgbe o mehiesịrị ọ gwara Chineke, sị: “Nwanyị ahụ nke I nyere m ka mụ na ya biri, ya onwe ya nyere m mkpụrụ sitere n’osisi ahụ, m wee rie.” Ihe okwu ya pụtara bụ: “Ọ bụghị m ka ụta dịịrị!” Nwanyị mbụ ahụ, bụ́ Iv, mere otu ihe ahụ mgbe ọ sịrị: “Agwọ ahụ rafuru m, m wee rie.”—Jenesis 3:12, 13.

E si otú a setịpụ ụkpụrụ n’ogige Iden ahụ maka ndị mmadụ ịjụ ịnakwere ibu ọrụ maka omume ha. Ọ̀ dịtụwo mgbe i mere nke a? Mgbe nsogbu bilitere, ị̀ na-ata ndị ọzọ ụta ngwa ngwa? Ka ị̀ na-atụle ọnọdụ ahụ iji hụ onye ụta dịịrị? Ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị, ọ dị nnọọ mfe ịdaba n’ọnyà nke ịta ndị ọzọ ụta n’ihi mmejọ anyị dị iche iche na ikwu, sị, “Ọ bụghị m ka ụta dịịrị!” Ka anyị leba anya n’ọnọdụ ndị a na-ahụkarị wee hụ ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-emekarị. Nke ka mkpa, tụgharịa uche n’ihe ị ga-eme n’ọnọdụ ndị ahụkwa.

Ihe Isi Ike Ego   

“Ọ bụghị m ka ụta dịịrị—ọ bụ ọnọdụ akụ̀ na ụba, ndị o ji ego achụ ego na-adịghị akwụwa aka ọtọ, ịda ọnụ nke ihe ndị e ji ebi ndụ ka ụta dịịrị,” ka ụfọdụ pụrụ ikwu mgbe ha chọtara onwe ha n’ime nsogbu ego dị ukwuu. Ma ọ̀ bụ ihe ndị a n’ezie ka ụta dịịrị? Ma eleghị anya ọnọdụ ndị a na-ejighị n’aka dubara ha n’atụmatụ azụmahịa ndị a na-enyo enyo ma ọ bụ ndị a na-ejichaghị n’aka. Mgbe ụfọdụ anyaukwu na-ekpuchi iche ezi echiche, ndị mmadụ na-achọtakwa onwe ha ka ha na-egwugharị n’ime mmiri ndị a na-amaghị ama, na-aghọrọ oké azụ ihe oriri. Ha na-echezọ ilu ahụ bụ́, “Otú akị ilu si ada n’ọnụ abụghị otú o si atọ ụtọ.” Ha na-achọgharị ndụmọdụ ndị ha chọrọ ịnụ, ma mgbe ihe isi ike akụ̀ na ụba sepụtara isi ọjọọ ya, ha na-achọwa onye ọzọ ha ga-ata ụta. N’ụzọ dị mwute, nke a na-eme mgbe ụfọdụ ọbụna n’ime ọgbakọ ndị Kraịst.

A matawo ụfọdụ ndị n’ọnyà nke atụmatụ azụmahịa ndị amamihe na-adịghị na ha ma ọ bụ ọbụna ndị bụ́ wayo, dị ka ịzụta diamond ndị na-adịghị adị, iji ego kwadoo usoro ihe omume telivishọn ndị bụ ọkpọka bụ́ ndị pụrụ n’anya ngwa ngwa, ma ọ bụ ịkwado azụmahịa nke ọtụtụ ụlọ na ala bụ nke bara n’iji ụgwọ. Ọ pụrụ ịbụ na oké ọchịchọ maka akụ̀ na ụba ekpuchiwo ncheta ha na-echeta ndụmọdụ Bible ahụ bụ́: “Ndị na-ezube ịbụ ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà . . . werekwa ọtụtụ ihe mgbu dụpuo onwe ha.”—1 Timoti 6:9, 10.

Mmefu ego ndị a na-achịkwaghị achịkwa pụkwara iduje n’ọdịda n’ụzọ ego. Ụfọdụ na-eche na ha aghaghị ịdị ka ndị a na-egosi n’akwụkwọ ndị na-akpọsa ejiji ndị kasị ọhụrụ, na-eme njem ezumike ndị na-efu oké ego, na-eri nri n’ụlọ nri ndị mara mma, ma na-azụ “ihe egwuregwu” ndị kasị ọhụrụ nke ndị toruworo ogo mmadụ—ụgbọ ala ntụrụndụ, ụgbọ epeepe, kamera, ngwa egwú stereo. N’ezie, mgbe oge na-aga ụfọdụ pụrụ inwe ike inweta ihe ndị a site n’iji akọ na-eme atụmatụ na ichekwa ego. Ma ndị ahụ ọ dị ngwa ngwa inweta ha pụrụ ịchọta onwe ha ka ha nọ n’oké ụgwọ. Ọ bụrụ na ha chọta onwe ha otú a, onye ka ụta dịịrị? N’ụzọ doro anya ha elegharawo ezi ndụmọdụ nke Ilu 13:18 anya: “Ịnọ n’ogbenye na nlelị ga-adịrị onye na-ezere ịdọ aka ná ntị.”

Enwetaghị Ihe A Tụrụ Anya Ya n’Ebe Ụmụaka Nọ

“Ọ bụ ndị okenye ka ụta dịịrị na ụmụ m hapụrụ eziokwu,” ka ụfọdụ ndị mụrụ ụmụ pụrụ ikwu. “Ha elebaraghị ụmụ m anya n’ụzọ zuru ezu.”

Ndị okenye nwere ibu ọrụ nke ịzụ na ilekọta ìgwè atụrụ ahụ anya, ma olee banyere ndị mụrụ ụmụ n’onwe ha? Hà na-egosipụta ezi ihe nlereanya n’igosipụta mkpụrụ nke mmụọ Chineke n’ihe nile ha na-eme? À na-amụchi ọmụmụ Bible ezinụlọ anya? Ndị mụrụ ụmụ hà gosiri ịnụ ọkụ n’obi n’ozi Jehova ma nyere ụmụaka ahụ aka ịkwadebe maka ya? Hà leziri anya banyere ndị ha na ụmụ ha na-akpakọrịta?

N’otu aka ahụ, ọ dịịrị nne ma ọ bụ nna mfe ikwu banyere ọrụ ụlọ akwụkwọ: “Ọ bụ ndị nkụzi ka ụta dịịrị na nwa m nwoke emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. Ha enweghị mmasị n’ebe nwa m nwoke nọ. E kwuwerị, ụlọ akwụkwọ ahụ nwekwara ọ̀tụ̀tụ̀ akara mmụta dị ala.” Ma nne ma ọ bụ nna ahụ ò sooro ụlọ akwụkwọ ahụ nwee nkwurịta okwu chiri anya? Nne ma ọ bụ nna ahụ ò nwere mmasị n’ihe omume ụlọ akwụkwọ na ọmụmụ ihe nke nwatakịrị ahụ? È dokwara oge maka ihe omume e kenyere ya ka o mee n’ụlọ, è nyekwara enyemaka mgbe a chọrọ ya? Ọ̀ pụrụ ịbụ na nsogbu kpatara ọnọdụ ahụ bụ nke omume ma ọ bụ umengwụ nke nwatakịrị ahụ ma ọ bụ onye mụrụ ya?

Kama ndị mụrụ ụmụ ịdị na-ata usoro ụlọ akwụkwọ ụta, ọ na-arụpụta ihe karị ma ọ bụrụ na ha mee ihe kwesịrị ekwesị iji jide n’aka na ụmụ ha nwere omume ziri ezi, na ha na-ejikwa ohere ndị ha nwere n’ụlọ akwụkwọ maka ịmụ ihe na-eme ihe.

Emeghị nke Ọma n’Ụzọ Ime Mmụọ

Site na mgbe ruo na mgbe anyị na-anụ ka mmadụ na-asị: “M ga-esi ike karị n’ụzọ ime mmụọ, ma ọ bụghị m ka ụta dịịrị na mụ esighị. Ndị okenye adịghị elebara m anya n’ụzọ zuru ezu. Enweghị m ndị enyi ọ bụla. Mmụọ Jehova adịghị n’ọgbakọ a.” Ka ọ dịgodị, ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ahụ nwere ndị enyi, nwee obi ụtọ, ma na-enwe ọganihu ime mmụọ mara mma; e jikwa uto na ụba ime mmụọ gọzie ọgbakọ ahụ. Ya mere gịnị mere ụfọdụ ji enwe nsogbu?

Ọ bụ mmadụ ole na ole chọrọ ịbụ ezi ndị enyi nke ndị na-egosipụta mmụọ na-adịghị mma na nke ime mkpesa. Ire na-agba agba, nke na-akpasu iwe na ime mkpesa oge nile pụrụ ịbụ ihe kasị akụda aka. N’achọghị ịbụ ndị a dọghachiri azụ n’ụzọ ime mmụọ, ụfọdụ pụrụ ịkpara mmekọrịta mmadụ na mmadụ nke ha na ndị dị otú ahụ ókè. N’iwere nke a dị ka enweghị mmasị nke ọgbakọ n’ebe ọ nọ, mmadụ pụrụ ịmalite ịkwagharị, na-aga site n’otu ọgbakọ gaa n’ọzọ, sikwa n’ebe ahụ gaa n’ọzọ. Dị ka ehi ndị Africa na-agagharị agagharị na mbara ala bụ́ nanị ahịhịa ndị na-anọ mgbe nile na-achọgharị ebe ahịhịa buru ibu karị, ndị Kraịst ndị a “na-agagharị agagharị” na-anọ mgbe nile na-achọgharị ọgbakọ nke dịịrị ha mma. Lee ka ha ga-esi enweworị obi ụtọ dị ukwuu karị ma ọ bụrụ na kama nke ahụ na ha ga-elega anya n’àgwà ndị dị mma ná ndị ọzọ ma gbalịa igosipụta n’ụzọ zuru ezu karị mkpụrụ nke mmụọ Chineke ná ndụ nke ha!—Ndị Galetia 5:22, 23.

Ụfọdụ na-eme otú ahụ site n’ime mgbalị pụrụ iche ikwunyere onye ọzọ dị iche okwu ná nzukọ ọ bụla e nwere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze na ịja ya mma n’obi eziokwu maka otu ezi ihe o mere. Ọ pụrụ ịbụ banyere ụmụ ya ndị na-akpa ezi àgwà, ịbịachi nzukọ ndị Kraịst anya, ajụjụ ndị a kwadebere nke ọma ndị ọ na-aza n’Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, mmesapụ aka ya n’inye ebe obibi ya maka Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na nzukọ dị iche iche maka ije ozi ubi, na ihe ndị ọzọ. Site n’ime ya ihe mgbaru ọsọ gị ile anya gabiga ihe mkpuchi nke ezughị okè, ị ga-achọpụta n’ezie àgwà ndị magburu onwe ha n’ime ụmụnna gị ndị Kraịst ndị nwoke na ndị nwanyị. Nke a ga-adọta gị nso n’ebe ha nọ, ị ga-achọpụtakwa na ị nọghị n’ụkọ nke ndị enyi na-eguzosi ike n’ihe.

Ngọpụ Ikpeazụ

“Ọ bụ uche Chineke.” “Ọ bụ Ekwensu ka a ga-ata ụta.” Ma eleghị anya ngọpụ ikpeazụ bụ ịta Chineke ma ọ bụ Ekwensu ụta maka mmejọ ndị anyị mere. Ọ bụ eziokwu na Chineke ma ọ bụ Setan pụrụ inwe mmetụta n’ihe ụfọdụ mere ná ndụ anyị. Otú ọ dị, ụfọdụ ndị kwenyere na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile, ma ọ dị mma ma ọ dị njọ, ndị mere ná ndụ ha bụ ihe sitere ná ntinye aka nke Chineke ma ọ bụ Setan. O yiri ka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụla nke mere ha nke bụ́ n’ihi omume nke ha. “Ọ bụrụ na Chineke chọọ ka m nwee ụgbọ ala ọhụrụ, ọ ga-ahụ na m nwetara ya.”

Ndị dị otú ahụ na-ebi ndụ ha n’ụzọ elezighị anya, na-eme mkpebi ego na mkpebi ndị ọzọ na-eche na Chineke ga-azọpụta ha. Ọ bụrụ na omume ha ụfọdụ ndị amamihe na-adịghị na ha arụpụta ọdachi ụfọdụ, nke akụ̀ na ụba ma ọ bụ ihe ọzọ, ha na-ata Ekwensu ụta. Ime ihe ọkụ ọkụ n’ebughị ụzọ nọdụ ala ‘gụkọọ ihe ọ ga-efu,’ wee mesịzia tawa Setan ụta maka ọdịda, ma ọ bụ nke kakwarị njọ, na-atụ anya ka Jehova tinye aka, ga-abụ ọ bụghị nanị mpako kama nke megidere Akwụkwọ Nsọ.—Luk 14:28, 29.

Setan nwara ime ka Jisọs chee otú ahụ ma ghara ịnakwere ibu ọrụ maka omume Ya nile. Banyere ọnwụnwa nke abụọ, Matiu 4:5-7 na-akọ, sị: “Ekwensu kuuru Ya baa n’obodo nsọ; o wee guzoo Ya n’elu akụkụ ụlọ ukwu Chineke, sị Ya, ọ bụrụ na Ị bụ Ọkpara Chineke tụda onwe gị n’ala: n’ihi na e dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Ndị mmụọ ozi Ya ka Ọ ga-enye iwu banyere gị: ọ bụkwa n’elu aka ha ka ha ga-eburu gị, ka ị ghara ịkpọbi ụkwụ gị na nkume.” Jisọs matara na ya apụghị ịtụ anya ka Jehova tinye aka ma ọ bụrụ na ọ ga-agbaso ụzọ nzuzu doro anya, ọbụna nke igbu onwe onye. N’ihi ya, ọ zaghachiri, sị: “E dewo ya n’akwụkwọ nsọ, sị, Anwala Onyenwe anyị Chineke gị.”

Ndị nwere ọchịchọ nke ịta Ekwensu ma ọ bụ Chineke ụta maka omume nke onwe ha ndị a na-enyo enyo yiri nnọọ ndị na-agụ kpakpando bụ́ ndị na-eji nnọọ kpakpando dochie anya Chineke ma ọ bụ Ekwensu. N’ibu ndị kwetasiri ike na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile na-emenụ karịrị ike ha, ha na-eleghara ụkpụrụ ahụ dị mfe nke e kwuru ná Ndị Galetia 6:7 anya: “Mkpụrụ ọ bụla mmadụ na-agha, nke ahụ ka ọ ga-ewetakwa n’ubi.”

Iche Ihe Bụ́ Eziokwu Ihu

Ọ dịghị onye ga-arụ ụka na anyị na-ebi n’ime ụwa nke na-ezughị okè. Nsogbu ndị a tụlere n’ebe a bụ ihe na-eme eme n’ezie. Ndị mmadụ ga-erigbu anyị n’ụzọ ego. Ụfọdụ ndị na-ewe ndị mmadụ n’ọrụ ga-abụ ndị na-adịghị eme ihe n’ụzọ ziri ezi. Ndị anyị maara pụrụ inwe mmetụta n’ahụ ụmụaka anyị n’ụzọ na-adịghị mma. Ụfọdụ ndị nkụzi na ụlọ akwụkwọ chọrọ mmeziwanye. Ndị okenye pụrụ mgbe ụfọdụ inwe ịhụnanya na nchegbu karị. Ma anyị aghaghị ịmata mmetụta nke ezughị okè na-enwe, na dịkwa ka Bible na-egosi, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” Ya mere ọ bụghị ihe ezi uche dị na ya ịtụ anya na ụzọ anyị ná ndụ ga-adị werewere mgbe nile.—1 Jọn 5:19.

Tụkwasị, anyị aghaghị ịmata ezughị okè na adịghị ike nke onwe anyị ma ghọta na ọtụtụ mgbe nsogbu anyị bụ ihe nzuzu nke anyị rụpụtara. Pọl dụrụ ndị Kraịst nọ na Rom ọdụ, sị: “Sị onye ọ bụla nọ n’etiti unu, ka ọ ghara ịtụkwasị uche n’onwe ya karịa nke o kwesịrị ịtụkwasị uche.” (Ndị Rom 12:3) Okwu ndụmọdụ ahụ na-emetụta anyị taa n’otu aka ahụ. Mgbe ihe gahiere ná ndụ anyị, anyị agaghị agbaso nna na nne ochie anyị bụ́ Adam na Iv ozugbo wee, sị: “Ọ bụghị m ka ụta dịịrị!” Kama nke ahụ, anyị ga-ajụ onwe anyị, sị, ‘Gịnị ka m gaara emeworị n’ụzọ dị iche iji zere ihe ọjọọ nke a si n’ime ya pụta? Èjiri m ezi echiche mee ihe n’okwu ahụ ma chọọ ndụmọdụ site n’ebe amamihe dị na ya? M̀ na-ewere ya na aka nke onye ma ọ bụ ndị nke ọzọ ihe ahụ metụtara dị ọcha, na-akwanyere ha ùgwù?’

Ọ bụrụ na anyị agbasoo ụkpụrụ ndị Kraịst ma gosipụta ezi echiche, anyị ga-enwekwu ndị enyi na nsogbu dị ala karị. Ọtụtụ n’ime nsogbu ndị na-adịghị mkpa ná ndụ anyị na-adị kwa ụbọchị ga-abụ ndị e doziri. Anyị ga-achọta ọṅụ ná mmekọrịta nke anyị na ndị ọzọ, anyị agaghịkwa abụ ndị ajụjụ ahụ bụ́: “Ònye ka ụta dịịrị?” na-enye nsogbu.

[Foto ndị dị na peeji nke 28]

Ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime ihe dị ukwuu iji nyere ụmụ ha aka ime nke ọma n’ụzọ ime mmụọ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya