Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 10/8 p. 6-8
  • Ime Mgbalị Iji Kwụsị Mpụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ime Mgbalị Iji Kwụsị Mpụ
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ Ile Ihe Anya Nke A Ọ̀ Dị Oké Njọ?
  • Gọọmenti Na-agbalị
  • Enwekwaghị Obi Ike
  • Ọgụ Na-enweghị Isi A Na-alụso Mpụ
    Teta!—1998
  • Ndị Uwe Ojii—Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?
    Teta!—2002
  • Olee Mba nke Na-enweghị Mpụ?
    Teta!—1996
  • Mgbe Mpụ Na-adịghị
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 10/8 p. 6-8

Ime Mgbalị Iji Kwụsị Mpụ

“NDỊ Ntorobịa Na-ekwu na Ịtụ Ọ̀bọ̀ Bụ Isi Ihe Na-akpata Mpụ Ụmụaka,” ka otu isiokwu dị n’ihu otu akwụkwọ akụkọ a ma ama na Britain kpọsara. “A Taa Esemokwu Ebe Obibi Ụta Maka Mpụ Na-arị Elu,” ka ọzọ kwuru. Nke atọ kwukwara, sị: “Ihe Iri Ahụ ‘Na-akpata Ọtụtụ Puku Mpụ.’” Magazin bụ́ Philippine Panorama mere atụmatụ na ndị ji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi mere 75 pasent nke mpụ ime ihe ike nile na Manila.

Ihe ndị ọzọ pụkwara iso na-akpata àgwà ime mpụ. “Ụkwụ na ụkwụ nke ịda ogbenye na oké akụ̀ na ụba na-aga” bụ otu ihe onye isi ukwu ndị uwe ojii na Nigeria zoro aka na ya. E zokwara aka ná nrụgide ndị ọgbọ na enweghị ezi olileanya inweta ọrụ, enweghị ihe mgbochi siri ike nke iwu kwadoro, ndakpọ zuru ebe nile n’ụkpụrụ ezinụlọ, enweghị nsọpụrụ maka ịchịisi na iwu, na ime ihe ike gabigara ókè dị n’ihe nkiri na vidio.

Ihe ọzọ bụ na ndị mmadụ adịghịzi ekwenye na mpụ abaghị uru. Otu ọkà mmụta mmekọrịta ọha na eze na Mahadum Bologna n’Itali kwuru na n’ime ọtụtụ afọ, “ọnụ ọgụgụ izu ohi e nyere akụkọ ya na ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ a mara ikpe maka ha adịghị ekwekọ.” O kwuru na “ọnụ ọgụgụ ikpe a mara ndị mmadụ n’iji ya tụnyere ngụkọta ọnụ ọgụgụ izu ohi e nyere akụkọ ya adalatawo site na 50 gaa na 0.7 pasent.”

Okwu The New Encyclopædia Britannica ahụ dị mwute ma ha bụ eziokwu: “Mpụ na-arị elu yiri ka ọ bụ otu akụkụ nke ọha mmadụ nke mmepụta ihe ọgbara ọhụrụ nile, e nweghịkwa mmepe ọ bụla n’iwu ma ọ bụ ná mmụta ilekọta ndị mkpọrọ nke a pụrụ igosi na o nwewo mmetụta pụtara ìhè ná nsogbu ahụ. . . . Nye ọha mmadụ ọgbara ọhụrụ mepere emepe, ebe uto akụ̀ na ụba na ihe ịga nke ọma onwe onye bụ ụkpụrụ zuru ebe nile, e nweghị ihe mere a ga-eji chee na ọ̀tụ̀tụ̀ mpụ agaghị anọgide na-arị elu.”

Ụzọ Ile Ihe Anya Nke A Ọ̀ Dị Oké Njọ?

Ọnọdụ ahụ ọ̀ dị njọ nke otú ahụ? Ọ̀ bụ na ụfọdụ ebe adịghị akọ na mpụ na-adalata? Ee, ụfọdụ na-akọ, ma ndekọ ọnụ ọgụgụ pụrụ iduhie eduhie. Dị ka ihe atụ, a kọrọ na mpụ ji 20 pasent dalata na Philippines mgbe a machibidosịrị égbè iwu. Ma magazin bụ́ Asiaweek kọwara na otu onye ọnụ na-eru n’okwu kwenyere na ndị ohi ụgbọala na ndị na-ezu ohi n’ụlọ akụ̀ akwụsịwo izu ụgbọala na izu ụlọ akụ̀ ohi, ha “agbanwewo gaa n’ịtọrọ mmadụ.” Mbelatatụ n’izu ohi n’ụlọ akụ̀ na izu ohi ụgbọala mere ka e nwee ndalata ná ngụkọta nke mpụ e mere, ma ndalata nke a tụfuru ihe dị ukwuu n’ihe ọ pụtara n’ihi ịrị elu dị okpukpu anọ e nwere n’ịtọrọ mmadụ!

N’ịkọ banyere Hungary, magazin bụ́ HVG dere, sị: “N’iji ya tụnyere ọkara mbụ nke 1993, ọnụ ọgụgụ mpụ ji 6.2 pasent dalata. Ihe ndị uwe ojii chefuru ikwu bụ na ndalata ahụ . . . bụ karịsịa n’ihi mgbanwe ndị e nwere na gọọmenti.” E ji 250 pasent bulie ọ̀tụ̀tụ̀ ego nke okwu banyere izu ohi, igwu wayo, ma ọ bụ imebisị ihe ndị a na-emebu ndekọ ha. N’ihi ya a dịghịzi enwe ndekọ nke mpụ ihe onwunwe ndị nwere ọnụ ahịa na-erughị ọ̀tụ̀tụ̀ a. Ebe ọ bụ na mpụ na-emetụta ihe onwunwe bụ ngụkọta nke ụzọ atọ n’ụzọ anọ nke mpụ nile e mere ná mba ahụ, ndalata ahụ ezighị ezi ma ọlị.

O doro anya na o siri ike inweta ọnụ ọgụgụ mpụ a na-eme. Otu ihe kpatara ya bụ na ọtụtụ mpụ—eleghị anya ihe ruru 90 pasent n’ọkwá ụfọdụ—ka a na-adịghị enye akụkọ ha. Ma ịrụ ụka ma mpụ ọ̀ dalatawo ka ọ̀ rịwo elu abaghị uru n’ezie. Ndị mmadụ na-atụsi anya ike ka e wepụ mpụ kpam kpam, ọ bụghị nanị ibelata ya.

Gọọmenti Na-agbalị

Otu nnyocha Mba Ndị Dị n’Otu mere na 1990 kpughere na mba ndị kasị mepee emepe na-emefu nkezi nke 2 ruo 3 pasent nke atụmatụ mmefu ego kwa afọ ha n’ịchịkwa mpụ, ebe mba ndị ka na-emepe emepe na-emefu ọbụna karị, nkezi nke 9 ruo 14 pasent. Ịmụba ọnụ ọgụgụ ndị uwe ojii na inye ha ngwá ọrụ ndị ka mma na-ebute ụzọ n’ebe ụfọdụ. Ma ihe na-esi na ha apụta gwara ọgwa. Ụfọdụ ụmụ amaala Hungary na-eme mkpesa, sị: “Ọ dịghị mgbe ọ bụla a na-enwe ndị uwe ojii zuru ezu ijide ndị omekome, ma a na-enwe ndị zuru ezu mgbe nile ijide ndị na-ada iwu okporo ụzọ.”

Ọtụtụ gọọmenti ahụwo ya dị ka ihe dị mkpa n’oge na-adịbeghị anya iti iwu mpụ ndị siri ike karị. Dị ka ihe atụ, ebe ọ bụ na “ịtọrọ mmadụ na-arị elu na Latin America nile,” ka magazin bụ́ Time na-ekwu, gọọmenti ndị dị n’ebe ahụ ejiriwo iwu ndị siri ike zaghachi, bụ́ ndị “siri ike ma gharakwa ịdị irè. . . . Iti iwu bụ otu ihe,” ka ọ na-ekwenye, “itinye ha n’ọrụ bụ ihe ọzọ.”

A na-eme atụmatụ na na Britain e nwere usoro iche ógbè nche karịrị 100,000 na 1992, nke na-emetụtazu nde ebe obibi anọ, ma ọ dịkarịa ala. E tinyere usoro ndị yiri nke ahụ n’ọrụ n’Australia n’etiti afọ ndị 1980. Nzube ha, ka Ụlọ Akwụkwọ Mmụta Banyere Mpụ nke Australia na-ekwu, bụ ibelata mpụ “site n’ime ka ụmụ amaala marakwuo banyere nchekwa ọha mmadụ, site n’imeziwanye omume na àgwà ndị bi ebi nwere n’ikwu banyere mpụ na ihe omume a na-enyo enyo n’agbata obi na site n’ibelata ohere ịdaba na mpụ site n’enyemaka nke inye ihe onwunwe akara na nrụnye nke ngwá ọrụ nchebe ndị dị irè.”

A na-eji telivishọn e ji ekesa ozi nanị n’ebe a kpaara ókè eme ihe n’ebe ụfọdụ iji jikọta ụlọ ọrụ ndị uwe ojii na ebe azụmahịa. Ndị uwe ojii, ụlọ akụ̀, na ụlọ ahịa na-eji kamera vidio eme ihe dị ka ihe mgbochi ma ọ bụ dị ka ngwá ọrụ maka ịmata ndị na-enupụrụ iwu isi.

Na Nigeria, ndị uwe ojii nwere ebe nnyocha dị iche iche n’okporo ụzọ ná mgbalị ijide ndị o ji égbè ezu ohi na ndị na-ezu ohi ụgbọala. Gọọmenti eguzobewo otu òtù ọrụ ngwa ngwa ịhụ maka omume na-ezighị ezi n’azụmahịa iji lụso igwu wayo ọgụ. Kọmitii mmekọrịta ndị uwe ojii na ógbè bụ́ nke ndị ndú obodo mejupụtara na-agwa ndị uwe ojii banyere ime mpụ na ndị mmadụ nwere àgwà a na-enyo enyo.

Ndị ọbịa na Philippines na-arịba ama na a dịchaghị ahapụ ebe obibi dị iche iche n’enweghị ndị nlekọta nakwa na ọtụtụ ndị mmadụ nwere nkịta na-eche nche. Ndị ọchụ nta ego na-ewe ndị nche nke aka ha n’ọrụ iji chebe achụmnta ego ha. Ngwá ọrụ ndị e ji echebe ụgbọala pụọ n’ebe ndị ohi nọ na-aga ahịa nke ọma. Ndị nwere ike ịkwụ ụgwọ ya na-alakpu n’ebe obibi ma ọ bụ ụlọ nwere ọtụtụ ọnụ ụlọ nke nwere nchebe bụ́ ọkpọka.

Akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Independent kwuru, sị: “Ka obi ike e nwere n’ụkpụrụ iwu na-ada, ụmụ amaala na-ahazi nchebe nke ógbè ha n’ọnụ ọgụgụ na-arị elu.” Ọtụtụ ndị ọzọ na-enwekwa ngwá ọgụ. Na United States, dị ka ihe atụ, a na-eme atụmatụ na otu n’ime ezinụlọ abụọ ọ bụla nwere otu égbè ma ọ dịkarịa ala.

Gọọmenti dị iche iche na-aga n’ihu n’imepụta usoro ọhụrụ nke ịlụso mpụ ọgụ. Ma V. Vsevolodov, nke Ụlọ Akwụkwọ Ihe Metụtara Ebe Obibi na Ukraine, na-arụtụ aka na dị ka ihe ndị si n’ọnụ òtù UN pụta si dị, ọtụtụ ndị nwere onyinye pụrụ iche na-achọ “ụzọ ndị pụrụ iche iji gaa n’ihu n’ime mpụ” nke na “ọzụzụ ndị ọrụ na-ahụ maka idebe iwu nwere” enweghị ike ịnagide. Ndị omekome dị akọ na-eji aghụghọ etinyeghachi ego buru ibu n’azụmahịa na ozi ndị a na-ejere ọha na eze, na-ejikọta onwe ha n’ọha mmadụ, ma “na-enwetara onwe ha ọkwá ndị dị elu n’ọha mmadụ.”

Enwekwaghị Obi Ike

Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ ná mba ụfọdụ na-ekwenyezi na ọbụna aka gọọmenti n’onwe ya dị ná nsogbu ahụ. Asiaweek hotara onye isi nke ìgwè na-alụso mpụ ọgụ dị ka onye na-asị: “Ihe dị ka 90% nke ndị a na-enyo enyo anyị na-ejide bụ ndị uwe ojii ma ọ bụ ndị agha.” Ma ọ̀ bụ eziokwu ma ọ bụ na ọ bụghị, akụkọ ndị dị ka nke a mere ka otu onye ome iwu kwuo, sị: “Ọ bụrụ na ndị a na-edu n’iyi ịkwado iwu na-emebi iwu n’onwe ha, ọha mmadụ anyị nọ ná nsogbu.”

Akụkọ ịkpa àgwà na-ezighị ezi ndị na-emetụta ndị nọ n’ọkwá dị elu akpaghasịwo gọọmenti n’akụkụ dị iche iche nke ụwa, na-emebikwu obi ike ụmụ amaala. E wezụga enwekwaghị ntụkwasị obi n’ikike gọọmenti nwere igbochi mpụ, ndị mmadụ na-enwezi obi abụọ ná mkpebi ha ime otú ahụ. Otu onye nkụzi jụrụ, sị: “Olee otú ndị gọọmenti ndị a pụrụ isi alụso mpụ ọgụ ugbu a mgbe ha onwe ha na-emikpu n’otu ihe ahụ?”

Gọọmenti na-abịa, gọọmenti na-apụkwa, ma mpụ na-adịgide. Ma, e nwere oge na-abịa n’isi nso mgbe mpụ na-agaghị adịkwa!

[Foto ndị dị na peeji nke 7]

Ihe mgbochi mpụ: Telivishọn e ji ekesa ozi nanị n’ebe a kpaara ókè na mgbaàmà, ibo ụzọ ámá e ji ígwè mee a na-akwachi akwachi, na onye nche nwere nkịta a zụrụ azụ

[Foto dị na peeji nke 8]

Mpụ na-eme ka ndị mmadụ bụrụ ndị mkpọrọ n’ime ụlọ ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya