Ọgụ Na-enweghị Isi A Na-alụso Mpụ
“A PỤRỤ ịchịkwa mpụ ngwa ngwa ma ọ bụrụ na onye ọ bụla dị njikere itinye mgbalị,” ka e hotara na onye bụbu onyeisi Ndị Uwe Ojii Obodo Ukwu kwuru n’akwụkwọ akụkọ Liverpool Daily Post nke England. N’ezie, ọ bụrụ na onye ọ bụla erube isi n’iwu, mpụ ga-apụ n’anya.
Ma, n’ihe ka n’ọtụtụ ebe mpụ na-arị elu. Okwu ndị e kwuru ọtụtụ puku afọ gara aga dabara n’oge anyị: “E bibiri ụwa n’ihu Chineke, ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” (Jenesis 6:11)—Lee igbe dị na peji chere nke a ihu.
Mpụ Na-amalite Obere Obere
Site n’imebi iwu n’ihe ndị dị nta, ọ pụrụ ịmara mmadụ ahụ imebi ya n’ihe ndị ka ukwuu. Iji kụnye eziokwu a n’ime ụmụ akwụkwọ ya, otu onye nkụzi kọwara, sị: “Ndị na-ezu ohi n’ụlọ akụ̀ na-amalite site n’izuru pensịl n’ụlọ akwụkwọ.”
Ka oge na-aga, gịnị na-emekarị n’ebe ọrụ? Ndị mmadụ na-ahapụ ịga ọrụ n’ihi ihe a sị na ọ bụ ọrịa, mgbe ahụkwa nara ego nke na-erughịrị ha. A na-ahụkarị emeghị ihe n’eziokwu a karịa otú mmadụ pụrụ iche. Dị ka ihe atụ, na Germany, pasent 6 nke ụbọchị ezumike n’ihi ọrịa nke ndị ọrụ na-ewere na-adaba na Wednesday, pasent 10 na Tuesday, pasent 16 kwa na Thursday, ma pasent 31 buru nnọọ ibu na-adaba na Monday, nke kasị elu bụ pasent 37 na Friday! Ndị mmadụ hà na-arịakarị ọrịa na Monday na Friday n’ezie, ka nke a ọ̀ bụ nnọọ ụdị ọzọ nke izu ohi?
Olee Ndị Bụ Ndị Omempụ?
N’ezie, mpụ nke ndị mmadụ nkịtị mere adịghị enwekarị otu ụdị mmetụta ahụ dị ka nke ndị nọ n’ọkwá ọchịchị mere. Ná mmalite afọ ndị 1970, mpụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị oké njọ kpara United States aka ọjọọ nke na aha e jikọtara ya na ya ghọrọ akụkụ nke asụsụ Bekee.
“Watergate,” dị ka Barnhart Dictionary of New English si kwuo, bụ “wuruwuru, karịsịa nke gụnyere ịnwa ikpuchi ihe ọmụma na-emebi ihe ma ọ bụ ihe omume iwu na-akwadoghị.”a Mgbe ahụ ọ gbakwụnyere, sị: “Ihe ahụ mere na Watergate nwere mmetụta siri ike n’asụsụ nke afọ ndị 1970. Okwu ahụ kpalitere nchepụta okwu dị iche iche, e jikwa ụdị njikọ ya bụ́ -gate eme ihe iji gosi wuruwuru ma ọ bụ nrụrụ aka.”
Kemgbe ahụ Watergate ole ọ bụla e nwere egosiwo na mpụ gbasazuru ebe nile, ọbụna n’etiti ndị kwesịrị ịbụ ihe nlereanya n’ịkwalite iwu. Na Japan nrụrụ aka ndọrọ ndọrọ ọchịchị ghọrọ nke gbasazuru nnọọ ebe nile nke na a ghaghị iti iwu ndị ọhụrụ ná mmalite afọ ndị 1990 iji lụsoo ya ọgụ. Na 1992 a chụdara president nke Brazil n’ihi ebubo nrụrụ aka.
Ọ̀ bụghị ihe doro anya na omume ọjọọ nke ndị nọ n’ọkwá ịchịisi, gụnyere ndị nne na nna, ndị nkụzi ụlọ akwụkwọ, na ndị na-ahụ na e debere iwu, so na-akpata ime mpụ nke ọha mmadụ?
Ezi Nzube Obi Ezughị
Ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ga-ekwere na gọọmenti chọrọ ikpochapụ mpụ. Ma, otu onye isi ọrụ laworo ezumike nká kwuru banyere mba ya, sị: “Gọọmenti emewo ihe dị nnọọ nta n’ime ka usoro ịkwado ikpe ziri ezi rụọ ọrụ ngwa ngwa na n’ụzọ dị irè. E nweghị ndị ọkàikpe zuru ezu, n’ihi ya ole na ole anyị nwere na-arụgbu onwe ha n’ọrụ. Ndị uwe ojii enweghị ndị ọrụ zuru ezu, ha enweghịkwa ngwá ọrụ zuru ezu. Mgbe ụfọdụ a naghị akwụ ndị uwe ojii ụgwọ ọnwa ha n’oge, na-eme ka a na-anwa ha ọnwụnwa ịnara aka azụ.”
Magazin ndị Itali bụ́ La Civiltà Cattolica na-egosi oké mwute maka “adịghị ike nke Ọchịchị n’ime ihe banyere mpụ a haziri ahazi” na-ekwuzi: “A maara itinye uche n’ihe nke ụlọ ọrụ ndị na-ahụ na e debere iwu na usoro ikpe n’ịlụso mpụ ọgụ, ma o doro anya na o metụtaghịdị mpụ a haziri ahazi ma ọlị; n’ụzọ dị iche, ume na ike ya na-eto eto.”
N’ụzọ doro anya, ezi nzube obi nke gọọmenti ịlụso mpụ ọgụ ezughị ezu. Anita Gradin, onye Europe bụ́ kọmishọna na-ahụ maka isi mba ọzọ kwabata na ikpe, kwuru n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Anyị chọrọ usoro ịrụ ọrụ ka mma, nke dịkwu irè maka imekọ ihe ọnụ n’ọgụ a na-alụso ibubata na ire ọgwụ ọjọọ, ịkpọbata ndị mmadụ na nzuzo na isi mba ọzọ kwabata n’ụzọ iwu na-akwadoghị, mpụ a haziri ahazi, wayo na nrụrụ aka.”
Ruo Ókè Hà Aṅaa Ka Ndị Ọrụ Iwu Na-etinye Uche n’Ihe?
Ụfọdụ na-agbagha ókè ndị ọchịchị tinyeruru uche ha n’ezie n’ịlụso mpụ ọgụ. Onye bụbu ọga kpata kpata ndị uwe ojii n’otu mba kwuru na onye ọ bụla, ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ihu ọha, “na-akatọ nrụrụ aka na mpụ metụtara ego.” Ma, o kwuru na mmadụ nile enweghị ọchịchọ n’ezie ikpochapụ mpụ na nrụrụ aka. Ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị mmadụ—gụnyere ndị ọrụ iwu—yiri ka ha na-ele inye aka azụ, wayo, na izu ohi anya dị ka ụzọ a pụrụ ịnakwere nke isi rịgoo n’ọkwá.
Eziokwu ahụ bụ́ na ọtụtụ ndị “na-eme mpụ adịghị enweta ntaramahụhụ,” dị ka onye ọfịsa ndị ọrụ ahịa iwu si kwuo ya, bụ otu ihe doro anya kpatara ịrị elu nke mpụ. Dị ka ihe atụ, otu mbipụta ndị Russia na-ekwu banyere “otú o si adịrị ndị omempụ mfe ịgbanarị ntaramahụhụ.” Nke a, ka mbipụta ahụ na-agbakwụnye, “yiri ka ọ na-akpali ụmụ amaala nkịtị ime mpụ ndị kasị njọ.” Nke a bụ nnọọ dị ka onye so dee Bible kwuru ihe dị ka afọ 3,000 gara aga: “N’ihi na e meghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ.”—Eklisiastis 8:11.
Ọ bụghị ikwubiga okwu ókè ikwu na gọọmenti na-alụso mpụ ọgụ na-enweghị isi. Akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Rheinischer Merkur na-ekwu, sị: “Egwu ọha na eze banyere ịrị elu nke mpụ ime ihe ike bamiri abami, nsegharị okwu a na-ahụkarị nke òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma ọ bụ ihe ndekọ ọnụ ọgụgụ ndị na-atụ aro na ọnọdụ ahụ adịghị njọ dị ka ọ pụrụ iyi apụghịkwa ime ka o belata.”
Kama mpụ ịghara ịdị njọ dị ka ọ pụrụ iyi, o yikarịrị ka ọ dị njọ karịa ka ọ pụrụ iyi. Ma, e nwere ohere maka inwe nchekwube. Ụwa mpụ na-adịghị na-abịaru nso karị, ị pụkwara ịnọ ndụ hụ ya. Isiokwu na-esonụ ga-egosi ihe mere anyị ji kwuo nke ahụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A kpọrọ ihe omume Watergate ahụ aha ahụ n’ihi na mwaba e mere n’ụlọ nwe aha ahụ bụ ihe gbara okwu ahụ n’anwụ. Wuruwuru ahụ mesịrị duga n’ịgba arụkwaghịm nke President Richard Nixon nke United States na ịtụ mkpọrọ nke ọtụtụ ndị ndụmọdụ ya selitere isi.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Ọtụtụ ndị na-ele mpụ anya dị ka ụzọ a pụrụ ịnakwere nke isi rịgoo n’ọkwá
[[Igbe dị na peeji nke 5]
Ụwa nke Ime Ihe Ike Jupụtara
BRAZIL: “Ná mmeghachi omume nye ntiwapụ ime ihe ike na-arị elu, ọtụtụ narị puku ndị mmadụ jupụtara okporo ámá azụmahịa [nke Rio de Janeiro], na-ekwupụta egwu na iwe n’ihi mpụ nke jichiworo obodo ukwu ha.”—International Herald Tribune.
CHINA: “Ndị òtù ndị omempụ na-ebiliteghachi na China, mpụ gbara ọkpụrụkpụ yikwara ihe a na-apụghị ịchịkwa achịkwa. . . . Ndị ọkachamara nke China na-ekwu na ọnụ ọgụgụ nke òtù ndị omempụ na ‘òtù nzuzo’ na-amụba ọsọ ọsọ karịa otú ndị uwe ojii pụrụ ịgụta.”—The New York Times.
GERMANY: “Oghere dị n’agbata ịdị njikere ime mpụ na ọnọdụ nke na-akpali mmadụ ime otú ahụ anọgidewo na-ebelata. Ya mere ọ bụghị ihe iju anya na ime ihe ike aghọwo ihe na-eme kwa ụbọchị.”—Rheinischer Merkur.
GREAT BRITAIN: “Ihe na-akpalite ime ihe ike arịwo elu ngwa ngwa, e nwekwara ohere nke na-amụba amụba na onye dara iwu ga-ebu ụzọ mee ihe ike.”—The Independent.
IRELAND: “Ezinụlọ ndị omempụ yiri nke ndị Mafia agbanyewo mkpọrọgwụ n’ime obodo Dublin na n’ime ógbè ọdịda anyanwụ ya ndị dịpụrụ adịpụ, ndị dara ogbenye karị. Òtù ndị omempụ ndị ahụ na-enwe ngwá ọgụ n’ụzọ na-arị elu.”—The Economist.
MEXICO: “Mpụ amụbawo nnọọ ọsọ ọsọ n’ime oge dị mkpirikpi otú a nke na ọ na-akpata egwu.”—The Wall Street Journal.
NIGERIA: “Njikọ ezinụlọ, chọọchị, ụlọ okpukpe ndị alakụba, ụlọ akwụkwọ na òtù dị iche iche adawo n’ọrụ ha nke igbochi ndị ntorobịa itinye aka na mpụ, dị ka ọnụ na-ekwuchitere ndị uwe ojii, bụ́ Maazị Frank Odita, si kwuo.”—Daily Champion.
PHILIPPINES: “Isii n’ime ezinụlọ iri ọ bụla na Philippines na-ekwu na ha adịghị enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe n’ebe obibi ha ma ọ bụ n’okporo ámá.”—Asiaweek.
RUSSIA: “Òtù ndị omempụ yiri ndị Mafịa agbanwewo otu obodo ukwu nke bụ otu n’ime ndị kasị dị nchebe n’ụwa n’oge ọ nọ n’okpuru Soviet ịbụ obodo ukwu nke ndị omempụ. . . . ‘N’ime afọ 17 mụ nke ịnọ n’ọrụ nche,’ ka onye uwe ojii bụ́ lieutenant Gennadi Groshikov na-ekwu, ‘ahụtụbeghị m mpụ hiri nne otú a na Moscow, ahụbeghịkwa m ihe ọ bụla dị obi ọjọọ otú a.’”—Time.
SOUTH AFRICA: “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ime ihe ike nke a na-achịkwaghị achịkwa na-eyi onye ọ bụla n’ime anyị, na ihe nile anyị na-eme egwu—a ghaghịkwa ime ihe pụtara ìhè.”—The Star.
TAIWAN: “Na Taiwan . . . ọ̀tụ̀tụ̀ na-arị elu nke izu ohi, mwakpo na igbu mmadụ ejiriwo ntakịrị ntakịrị bata n’ime ọha mmadụ . . . N’ezie, ọ̀tụ̀tụ̀ ime mpụ ji nwayọọ nwayọọ na-arị elu, n’ọnọdụ ụfọdụkwa na-akarị ndị dị ná mba Ebe Ọdịda Anyanwụ.”—The New York Times.
UNITED STATES: “United States bụ mba kasị eme ihe ike ná mba ndị mepere emepe. . . . Ọ dịghị mba ọzọ mepere emepe ruru otú ahụ.”—Time.