Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 10/8 p. 26-27
  • Ịhụnanya nke Na-ejikọ Ejikọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịhụnanya nke Na-ejikọ Ejikọ
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbe Oké Ifufe Bilitere
  • Ịhụnanya nke Na-ejikọ Anyị n’Otu
  • Ndị Olileanya Na-eme Ka Ha Kwụsie Ike, Ndị Ịhụnanya Na-akwali
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • “O Nweghị Onye Ọ Bụla n’Ime Unu Ga-ala n’Iyi”
    ‘Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke’
  • Okpukpe Gị Ọ̀ Bụ Ụgbọ Nke Ọ Na-adịghị Mgbe A Ga-agbahapụ Ya?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Pọl Emerie Ihe Isi Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 10/8 p. 26-27

Echiche nke Bible

Ịhụnanya nke Na-ejikọ Ejikọ

NA 1978 oké ifufe na-efe n’Ugwu Atlantic wakwasịrị nnukwu ụgbọ mmiri okomoko ahụ bụ́ Queen Elizabeth 2. Mmali mmiri ịdị elu ya ruru ụlọ elu dị okpukpu iri dakwasịrị ụgbọ mmiri ahụ, na-eme ka ọ na-amali ma na-amada dị ka mgbaàmà agá azụ. A tụfusịrị arịa na ndị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ aghara aghara ka ụgbọ mmiri ahụ ji ike na-emikpu ma na-apụta. N’ụzọ dị ịtụnanya, e nwere nanị obere mmerụ ahụ n’etiti 1,200 nọ n’ụgbọ ahụ. Ọrụ injinia, ngwá ọrụ, na ụzọ iwu ihe dị mma mere ka ụgbọ mmiri ahụ ghara ịgbawa.

N’ọtụtụ narị afọ gara aga, e nwere ụgbọ mmiri ọzọ oké ifufe jọgburu onwe ya jidere. Pọl onyeozi na 275 ndị ọzọ nọ n’ime ya. N’ịtụ egwu na ịdị ike nke oké ifufe ahụ ga-etirisị ụgbọ mmiri ahụ, o yiri ka ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ wefere “ụdọ”—chen ma ọ bụ eriri—n’okpuru ụgbọ mmiri ahụ site n’otu akụkụ gaa n’akụkụ nke ọzọ, iji jikọta plank ndị e ji rụọ ahụ ụgbọ mmiri ndị ahịa ahụ. A zọpụtara ndị nile nọ n’ụgbọ mmiri ahụ, ọ bụ ezie na a zọpụtaghị ụgbọ mmiri ahụ.—Ọrụ, isi nke 27.

Ule ndị dị ná ndụ pụrụ ime ka ọ dị anyị mgbe ụfọdụ ka a ga-asị na anyị nọ n’ụgbọ nọ n’oké osimiri na-adịghị jụụ. Mwakwasị nke nchegbu, ndakpọ olileanya, na ịda mbà n’obi pụrụ irikpu anyị, na-ele ọ̀tụ̀tụ̀ ịhụnanya anyị oké ule. Iji nagide oké ifufe dị otú ahụ ma zere ịgbawa, enyemaka ụfọdụ dịkwa anyị mkpa.

Mgbe Oké Ifufe Bilitere

E dekọrọ okwukwe na ntachi obi Pọl onyeozi nke ọma n’ime Bible. Ọ rụsiri ọrụ ike maka ọdịmma ọgbakọ ndị Kraịst oge mbụ. (2 Ndị Kọrint 11:24-28) Ihe ndị ọ rụzuru n’ọrụ Onyenwe anyị na-agba akaebe doro anya maka ịhụnanya siri ike o nwere n’ebe ndị agbata obi ya nọ na mmekọrịta siri ike o nwere n’ebe Chineke nọ. Ma, ndụ Pọl agaghị were were mgbe nile. Ma n’ụzọ nkịtị ma n’ụzọ ihe atụ, onyeozi ahụ nagidere ọtụtụ oké ifufe.

N’ụbọchị Pọl, mgbe ụgbọ mmiri zutere oké ifufe jọgburu onwe ya, nlanarị nke ụgbọ mmiri ahụ na ndị o bu dabeere na nkà ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ tinyekwara ókè ụgbọ mmiri ahụ jikọtara n’otu. Ọ dịkwa otú ahụ mgbe onyeozi ahụ zutere oké ifufe ihe atụ. Ọ bụ ezie na Pọl anagidewo ịnọ n’ụkọ anụ ahụ, ịga mkpọrọ, na ntaramahụhụ, oké ifufe kasị ike nke mara nkwụsị ike ime mmụọ na nke mmetụta uche ya na ikike ya ịnọgide na-ahụ n’anya aka si n’ime ọgbakọ ndị Kraịst bịa.

Dị ka ihe atụ, Pọl rụsiri ọrụ ike ruo otu afọ na ọkara iji guzobe ọgbakọ dị n’obodo Kọrint. Ahụmahụ o nwere n’ebe ndị Kọrint nọ mere ka ọ zụlite mmetụta dị nro maka ìgwè atụrụ ahụ. Ọbụna Pọl kwuru banyere onwe ya dị ka nna nye ha. (1 Ndị Kọrint 4:15) Ma, n’agbanyeghị aha ọma ya nke ịhụnanya na ịrụsi ọrụ ike maka ọdịmma ọgbakọ ahụ, ụfọdụ ndị na Kọrint katọrọ Pọl. (2 Ndị Kọrint 10:10) N’ihi ihe nile o meworo n’ụzọ ịchụ onwe onye n’àjà, lee ka nke ahụ na-aghaghị isiworị bụrụ ihe na-akụda mmụọ!

Olee otú ndị nataworo ịhụnanya na-achọghị ọdịmma onwe onye nanị nke Pọl pụrụ isi nwee obi ọjọọ ma na-akatọ ya otú ahụ? Ọ ghaghị ịdịworị Pọl ka a ga-asị na a na-adọwa ya, dị ka ụgbọ mmiri oké ifufe ji aka ọjọọ. Lee ka ọ ga-esiworị dịrị ya mfe ịda mbà, iche na mgbalị ya nile gara aga bụ ihe efu, ma ọ bụ nọrọ ná mkpasu iwe! Gịnị jikọtara Pọl n’otu? Gịnị gbochiri ya ịbụ onye ndakpọ olileanya dọwara?

Ịhụnanya nke Na-ejikọ Anyị n’Otu

Pọl ahapụghị obi abụọ n’uche ndị na-agụ akwụkwọ ya banyere ihe bụ isi iyi nke ma ume ya ma mkpali ya. O dere, sị: “Ịhụnanya Kraịst na-erugide anyị.” (2 Ndị Kọrint 5:14) Pọl zoro aka n’ebe isi iyi kasịnụ nke ume na mkpali nọ. Ikike nrụgide ahụ bụ ‘ịhụnanya Kraịst.’ Otu ọkà mmụta Bible kwuru ihe na-esonụ banyere akụkụ akwụkwọ nsọ a, sị: “Pọl adịghị ekwu na ịhụnanya anyị maka Kraịst na-ejigide anyị n’ozi anyị . . . Nke ahụ ga-abụ ịkwụsị n’ụzọ. Ịhụnanya ya maka anyị tụtere ma nọgidekwa na-akwado ịhụnanya anyị maka Kraịst.”—Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụzọ dị iche.

Ịhụnanya Kraịst gosiri site n’inyefe onwe ya n’ọnwụ na-egbu mgbu n’elu osisi ịta ahụhụ—wee si otú ahụ na-enye ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka ihe mgbapụta iji zọpụta ihe nile a kpọrọ mmadụ kwere ekwe—kpaliri, kwaliri, ma rụgide Pọl ịnọgide na-eje ozi maka ọdịmma nke Kraịst na òtù ụmụnna ahụ. N’ihi ya, ịhụnanya Kraịst chịkwara Pọl, na-egbochi ya pụọ n’ọdịmma onwe onye nanị, meekwa ka nzube ya bụrụ nanị ijere Chineke na ndị mmadụ ibe ya ozi.

N’ezie, isi iyi nke mkpali nọ n’azụ ụzọ ndụ kwesịrị ntụkwasị obi onye Kraịst bụ ịhụnanya Kraịst. Mgbe ule ndị pụrụ inwe mmetụta na-agwụ ike n’ụzọ anụ ahụ, mmetụta uche, na n’ime mmụọ chere anyị ihu, ike nrụgide nke ịhụnanya Kraịst na-eme ka anyị gafee ebe ike ga-agwụ onye nwere mkpali dị nta. Ọ na-enye anyị ume ịtachi obi.

Anyị apụghị ịdabere ná mmetụta uche anyị na-ezughị okè ịkwagide na ịkpali anyị. Nke a dị otú ahụ karịsịa mgbe ule anyị na-abịa dị ka ihe ndakpọ olileanya na nchegbu kpatara. N’aka nke ọzọ, ịhụnanya Kraịst nwere ikike ijigide anyị n’ozi anyị, ịkwagide na ịkpali anyị, n’agbanyeghị ule onwe onye anyị. Ịhụnanya Kraịst na-enyere onye Kraịst aka ịtachi obi, ọ bụghị nanị gabiga atụmanya ndị ọzọ, kama ikekwe ọbụna gabiga atụmanya nke onwe ya.

Ọzọkwa, ebe ọ bụ na ịhụnanya Kraịst na-adịgide adịgide, mmetụta ya adịghị ejedebe ma ọlị. Ọ bụ ike na-akwali akwali nke na-adịghị ada ada ma ọ bụ na-ebelata. “Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:8) Ọ na-enyere anyị aka ịnọgide na-eso ya n’ikwesị ntụkwasị obi, ihe ọ sọrọ ya bụrụ.

Ule mmetụta uche nwere ikike pụrụ ịdọwa anyị. Ya mere, lee ka o si dị mkpa na anyị na-atụgharị uche n’ịhụnanya Kraịst gosiri anyị. Ịhụnanya Kraịst ga-ejikọ anyị n’otu. Ịhụnanya ya na-eme ka o kwe omume izere ikpu okwukwe anyị dị ka ụgbọ. (1 Timoti 1:14-19) Ọzọ, ịhụnanya Kraịst na-akwali anyị ime ihe nile anyị pụrụ ime inye onye ahụ nke mere ka ngosipụta nke ịhụnanya Kraịst kwe omume, bụ́ Jehova Chineke, otuto.—Ndị Rom 5:6-8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya