Ha Mere Uche Jehova
Pọl Emerie Ihe Isi Ike
PỌL nọ n’ọnọdụ olileanya na-adịghị na ya. Ya na mmadụ 275 ọzọ nọ n’ụgbọ mmiri nke Yurakwilo na-akwagharị—ifufe kasị ike na Mediterranean. Oké ifufe ahụ siri nnọọ ike nke na a pụghị ịhụ anyanwụ n’ehihie, ma ọ bụ kpakpando n’abalị. O kwere nghọta na egwu ji ndị njem ahụ maka ndụ ha. Ma, Pọl akasie ha obi site n’ịkọrọ ha ihe Chineke kpugheere ya ná nrọ: “Ọ dịghị ntufu ndụ ga-adị n’etiti unu, kama ọ bụ ntufu nke ụgbọ.”—Ọrụ 27:14, 20-22.
N’abalị nke 14 nke oké ifufe ahụ, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ emee nchọpụta dị ịtụnanya—mmiri ahụ dị nanị mbudu 20 n’omimi.a Mgbe ha gara n’ihu nke nta, ha atụọkwa ya ọzọ. Na nke ugbu a, mmiri ahụ dị mbudu 15 n’omimi. Ala dị nso! Ma ozi ọma a kwesịrị ka e chebara ya echiche. N’ịbụ nke a na-akwagharị ná mmiri na-emighị emi n’abalị, ụgbọ mmiri ahụ pụrụ ịkpọ na nkume ma kpọkasịa. N’ụzọ amamihe, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ ewedata arịlịka ya. Ụfọdụ n’ime ha achọọ iwedata ụgbọ nta banye n’ime ya, na-etinye onwe ha n’ihe ize ndụ n’oke osimiri.b Ma Pọl akwụsị ha. Ya agwa ọchịagha na ndị agha ahụ, sị: “Ọ bụrụ na ndị a anọgideghị n’ụgbọ, a pụghị ịzọpụta unu onwe unu.” Ọchịagha ahụ aṅaa Pọl ntị, ugbu a kwa ndị njem 276 nile ahụ echere n’obi erughị ala ruo chi ọbụbọ.—Ọrụ 27:27-32.
Ụgbọ Mmiri Ekpuo
N’ụtụtụ echi ya, ndị njem nọ n’ụgbọ mmiri ahụ ahụ otu ọnụ mmiri nke nwere ụsọ mmiri. N’inwetaghachi olileanya, ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ egbupụ arịlịka ahụ ma dọlie ákwà ifufe nke ọnụ ụgbọ ahụ. Ụgbọ mmiri ahụ amalite ịga n’ebe ikperé mmiri nọ—obi abụọ adịghị ya na ha na-eti mkpu ọṅụ.—Ọrụ 27:39, 40.
Otú ọ dị, na mberede, ụgbọ mmiri ahụ atọkịrị n’ájá n’ebe mmiri ahụ na-emighị emi. Nke ka njọ, oké ebili mmiri etikwasị isi ụgbọ nke ụgbọ mmiri ahụ na-etikasị ya. Ndị njem nile nọ n’ụgbọ mmiri ahụ ga-esirịrị na ya gbapụ! (Ọrụ 27:41) Ma nsogbu dị na nke a. Ọtụtụ n’ime ndị nọ n’ụgbọ mmiri ahụ—gụnyere Pọl—bụ ndị mkpọrọ. N’okpuru iwu Rom, onye nche nke kwere ka onye mkpọrọ o ji gbapụ aghaghị ịnata ntaramahụhụ e zubere inye onye mkpọrọ ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na ogbu mmadụ agbapụ, onye nche ahụ na-elezighị anya aghaghị iji ndụ ya kwụọ ụgwọ.
N’ịbụ ndị na-atụ egwu ihe ndị dị otú ahụ, ndị soja ahụ ekpebisie ike igbu ndị mkpọrọ ahụ nile. Otú ọ dị, ọchịagha ahụ, bụ́ onye na-emeso Pọl omume enyi, egbochie ha. Ya enye iwu ka ndị nile pụrụ igwu mmiri maba n’ime mmiri ma gwuru mmiri pụta n’ala. Ndị na-apụghị igwu mmiri aghaghị ijide aka n’elu ibe osisi ma ọ bụ ihe dị iche iche si n’ụgbọ ahụ pụta. N’otu n’otu, ndị njem ahụ nọ n’ụgbọ mmiri ahụ na-ala n’iyi arịpụtasịa n’ikperé mmiri. N’imezu okwu Pọl, ọ dịghị onye ọ bụla nwụrụnụ!—Ọrụ 27:42-44.
Ọrụ Ebube na Melita
Ìgwè ahụ ike gwụrụla agbabawo n’otu àgwàetiti a kpọrọ Melita. Ndị bi na ya bụ ndị “na-asụ asụsụ ọzọ,” n’ụzọ nkịtị n’asụsụ Bekee ọ pụtara “barbarians” (Grik, barʹba·ros).c Ma ndị Melita abụghị ndị obi ọjọọ. N’ụzọ dị iche, Luk, onye ya na Pọl so na-eme njem, na-akọ na ha “weere obiọma mezie anyị n’ụzọ a na-ahụghị mgbe ọ bụla: n’ihi na ha fụnwuru ọkụ, kpọbata anyị nile, n’ihi mmiri nke na-ezo n’oge ahụ, na n’ihi oyi.” Pọl n’onwe ya sonyeere ụmụ afọ Melita n’ịchịkọta na isonye nkụ́ n’ọkụ.—Ọrụ 28:1-3, nkọwa ala ala peji nke NW.
Na mberede, otu ajụala ehikọọ Pọl n’aka! Ndị bi n’àgwàetiti ahụ echee na Pọl aghaghị ịbụ ogbu mmadụ. Ma eleghị anya ha na-eche na Chineke na-enye ndị mmehie ntaramahụhụ site n’ịwakpo akụkụ ahụ ha jiri mehie ya. Ma Lee! N’ụzọ juru ndị obodo ahụ anya, Pọl efeba ajụala ahụ n’ime ọkụ. Dị ka ihe ndekọ Luk nke ihe o ji anya ya hụ na-ekwu, “ha na-ele anya na [Pọl] gaje ịza, ma ọ bụ ịda n’ala nwụọ na mberede.” Ndị bi n’àgwàetiti ahụ agbanwee uche ha ma malite ịsị na Pọl aghaghị ịbụ chi.—Ọrụ 28:3-6.
Pọl anọọ ọnwa atọ ọzọ na Melita, bụ́ mgbe ọ gwọrọ nna Pọbliọs, bụ́ onyeisi àgwàetiti ahụ, onye naara Pọl nke ọma, nakwa ndị ọzọ na-arịa ọrịa. Ọzọkwa, Pọl akụọ mkpụrụ eziokwu, na-ewetara ndị na-ele ọbịa bi na Melita ọtụtụ ngọzi.—Ọrụ 28:7-11.
Ihe Mmụta Nye Anyị
N’oge ozi ya, Pọl zutere ọtụtụ ihe ịma aka. (2 Ndị Kọrint 11:23-27) N’ihe ndekọ ahụ dị n’elu, ọ bụ onye mkpọrọ n’ihi ozi ọma ahụ. Ọ ghaghịzi iche ọnwụnwa ndị ọ na-atụghị anya ha ihu: oké ifufe na ụgbọ okpukpu sochirinụ. N’ihe ndị a nile, Pọl amaghị jijiji ma ọlị ná mkpebisi ike ya ịbụ onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi nke ozi ọma ahụ. Site n’ahụmahụ, o dere, sị: “N’ihe nile e ziwo mụ ihe omimi a, bụ́ ịnọ n’afọ ojuju na ịnọkwa n’agụụ, ịbabiga ókè na ịnọkwa ná mkpa. Enwere m ike n’ihe nile n’ime Onye ahụ Nke na-eme m ka m dị ike.”—Ndị Filipaị 4:12, 13.
Ọ dịghị mgbe ọ bụla nsogbu nke ndụ kwesịrị ibelata mkpebi anyị ịbụ ndị ozi na-anụ ọkụ n’obi nke ezi Chineke ahụ! Mgbe ọnwụnwa a na-atụghị anya ya bilitere, anyị na-atụkwasị Jehova ibu arọ anyị. (Abụ Ọma 55:22) Anyị ejirizie ndidi chere ịhụ otú o si eme ka o kwe anyị omume idi ule ahụ. Ka ọ dịgodị ugbu a, anyị na-aga n’ihu na-ejere ya ozi n’ịkwesị ntụkwasị obi, na-enwe obi ike na ihe banyere anyị na-emetụ ya n’obi. (1 Ndị Kọrint 10:13; 1 Pita 5:7) Site n’ịnọgide na-eguzosi ike, n’agbanyeghị ihe ọ bụla merenụ, anyị—dị ka Pọl—pụrụ imeri ihe isi ike.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A na-elekarị otu mbudu anya dị ka cubit anọ, ma ọ bụ ihe dị ka mita 1.8.
b E ji ụgbọ nta ahụ agaru n’ọnụ mmiri mgbe a kwụsịrị ụgbọ mmiri na nso ụsọ oké osimiri. Ihe àmà na-egosi na ndị ọrụ ụgbọ mmiri ahụ na-anwa ịzọpụta ndụ ha ebe ha na-eleghara ndụ ndị a ga-ahapụ n’ụgbọ mmiri ahụ anya, bụ́ ndị na-amaghị otú e si achịkwa ụgbọ mmiri.
c Akwụkwọ Wilfred Funk bụ́ Word Origins na-ekwu, sị: “Ndị Grik lelịrị asụsụ ndị ọzọ na-abụghị nke ha anya, ha sịrị na ha dara ha ‘bar-bar’ ná ntị, ha kpọkwara onye ọ bụla na-asụ ha barbaros.”