Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 12/8 p. 3-4
  • Ọrịa Obi—Ihe Na-eyi Ndụ Egwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọrịa Obi—Ihe Na-eyi Ndụ Egwu
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú A Pụrụ Isi Belata Ihe Ize Ndụ Ya?
    Teta!—1996
  • Ịmata na Ime Ihe Banyere Mgbaàmà Ya
    Teta!—1996
  • Ị Pụrụ Izere Nkụchi Obi Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Nweta Obi nke Dị Ka Jehova Si Chọọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Teta!—1996
g96 12/8 p. 3-4

Ọrịa Obi—Ihe Na-eyi Ndụ Egwu

KWA afọ ọtụtụ nde ndi ikom na ndị inyom n’ụwa nile na-arịa nkụchi obi. Ọtụtụ na-alanarị ma nwee ihe ole na ole na-esochi ya. Ndị ọzọ adịghị alanarị. Nye ndị ọzọ kwa obi na-ebibi nke na “ịlaghachi n’ọrụ bara uru na-abụ ihe a na-ejighị n’aka,” ka ọkà n’ọrịa obi bụ́ Peter Cohn, na-ekwu, na-ekwukwa, sị: “Ya mere, ọ dị oké mkpa ịlụso nkụchi obi ọgụ ozugbo mgbe ọ bụla o kwere omume.”

Obi bụ uru ahụ nke na-asụpụta ọbara gaa n’ahụ dum. Ná nkụchi obi (myocardial infarction), akụkụ nke uru ahụ obi na-anwụ mgbe e gbochiri ya inweta ọbara. Iji nọgide n’ahụ ike, obi nwere mkpa nke ikuku oxygen na ihe ndị ọzọ na-edozi ahụ ndị ọbara na-ebu. Ọ na-esite n’akwara obi enweta ndị a, bụ́ nke na-agbakụ ihu obi.

Ọrịa pụrụ imetụta akụkụ ọ bụla nke obi. Otú ọ dị, nke a na-ahụkarị bụ ọrịa dị aghụghọ nke akwara obi, a na-akpọ atherosclerosis. Mgbe nke a mere, a na-amalite inwe plaque ma ọ bụ iberibe abụba n’ime akwara nkesa ọbara. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, plaque pụrụ ịkpụkọba, gbasie ike ma mee ka akwara nkesa ọbara dị warara, ma gbochie ọbara na-eruga n’obi. Ọ bụ ọrịa a bụ isi nke akwara obi (CAD) na-akpata ihe ka ọtụtụ ná nkụchi obi.

Mkpụchi nke otu akwara nkesa ọbara ma ọ bụ karị na-akpata nkụchi mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ oxygen obi chọrọ karịrị ihe ọ na-enweta. Ọbụna n’akwara nkesa ọbara ndị na-adịchaghị warara, njukọba nke plaque pụrụ ịgbawatụ ma duga ná mkpụkọta nke ọbara (thrombus). Ọ na-adịkwara akwara nkesa ọbara ndị nwere ọrịa mfe karị ijikọlata. A pụrụ inwe mkpụkọta ọbara n’ebe ahụ e nwere njikọlata, na-ewepụta mmiri ọgwụ nke na-ejikọtakwu ime akwara nkesa ọbara, na-akpalite nkụchi.

Mgbe e gbochiri uru ahụ obi inweta oxygen ruo ogologo oge, a pụrụ imebi uru ahụ ndị dị ya nso. N’adịghị ka uru ahụ ụfọdụ, uru ahụ obi adịghị erupụtaghachi. Ruo n’ókè nkụchi ahụ dịruru, otú ahụ ka ọ na-emebikwu obi, otú ahụ ka ohere nke igbu mmadụ na-aka ukwuu. Ọ bụrụ na e mebie usoro na-enye obi ike, otiti obi kwesịrị ekwesị pụrụ ịkpaghasị, obi pụkwara ịmalite ịma oké jijiji (enweghị ngakọ). Ná mgbanwe otiti obi nke a, ikike obi nwere ịsụpụta ọbara nke ọma gaa n’ụbụrụ na-ada. N’ime minit iri ụbụrụ na-anwụ, ọnwụ na-ewerekwa ọnọdụ.

N’ihi ya, inye ọgwụgwọ n’oge site n’aka ndị ọrụ ahụ ike a zụrụ azụ dị mkpa. Ọ pụrụ ịzọpụta obi pụọ ná mbibi na-aga n’ihu, gbochie ma ọ bụ gwọọ mgbanwe otiti obi, ọbụna zọpụtakwa ndụ mmadụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya