Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 12/8 p. 4-8
  • Ịmata na Ime Ihe Banyere Mgbaàmà Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmata na Ime Ihe Banyere Mgbaàmà Ya
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Merenụ
  • Nkụchi Ahụ
  • N’Ụlọ Ọgwụ
  • Dọkịta ahụ Enye Nkọwa
  • Atụmanya Mgbake Gbara Ọchịchịrị
  • Ọrịa Obi—Ihe Na-eyi Ndụ Egwu
    Teta!—1996
  • Olee Otú A Pụrụ Isi Belata Ihe Ize Ndụ Ya?
    Teta!—1996
  • Ụzọ Mgbake
    Teta!—1996
  • Ị Pụrụ Izere Nkụchi Obi Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 12/8 p. 4-8

Ịmata na Ime Ihe Banyere Mgbaàmà Ya

MGBE mgbaàmà nkụchi obi weere ọnọdụ, ọ dị mkpa ịchọ enyemaka ahụ ike ozugbo, ebe ọ bụ na ihe ize ndụ nke ọnwụ kasị ukwuu n’ime otu hour mbụ mgbe nkụchi gasịrị. Ọgwụgwọ dị ngwa pụrụ ịzọpụta uru ahụ obi pụọ ná mmebi a na-apụghị imekwata emekwata. Ruo n’ókè a napụtara uru ahụ obi, otú ahụ ka obi ga-asụpụtakwu ọbara n’ụzọ dị irè mgbe nkụchi ahụ gasịrị.

Otú ọ dị, nkụchi obi ụfọdụ adịghị agba àmà, n’egosipụtaghị mgbaàmà ndị a na-ahụ anya. N’ọnọdụ ndị a onye ahụ nwere ike ghara ịma na ya nwere ọrịa akwara obi (CAD). N’ụzọ dị mwute, nye ụfọdụ, nkụchi siri oké ike pụrụ ịbụ ihe àmà mbụ nke nsogbu obi. Mgbe nkụchi obi weere ọnọdụ (obi na-akwụsị ịsụpụta ọbara), ohere nlanarị e nwere dị obere, ọ gwụkwala ma a kpọrọ ìgwè ndị nnapụta ozugbo, onye nọ nso agbasookwa usoro mweghachi iku ume (CPR) n’egbughị oge.

N’ime ọtụtụ ndị nwere mgbaàmà nke CAD, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Harvard Health Letter na-akọ, ihe dị ka ọkara ga-eyigharị oge ịchọ enyemaka ahụ ike ozugbo ahụ. N’ihi gịnị? “Ọ na-abụkarị n’ihi na ha amaghị ihe mgbaàmà ha na-egosi ma ọ bụ ha adịghị eji ha akpọrọ ihe.”

John,a onye na-arịa nkụchi obi, bụrụkwa otu n’ime Ndịàmà Jehova, na-arịọ, sị: “Mgbe ị matara na ihe amaghị kwụrụ, egbula oge n’inweta enyemaka ahụ ike n’ihi egwu nke ịghara iyi onye na-emebiga ihe ngwa ngwa ókè. Ọ fọrọ nke nta ka m tụfuo ndụ m n’ihi na emechaghị m ihe banyere ya ngwa ngwa.”

Ihe Merenụ

John na-akọwa, sị: “Otu afọ na ọkara tupu m nwee nkụchi obi, otu dọkịta dọrọ m aka ná ntị banyere ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke cholesterol m nwere, bụ́ otu isi ihe na-atụnye ụtụ n’ihe ize ndụ na CAD. Ma eleghaara m okwu ahụ anya, ebe m chere na emebeghị m agadi—n’erubeghị afọ 40—nweekwa ezi ahụ ike. Ana m akwa ụta nke ukwuu n’ihi na mụ emeghị ihe ọ bụla mgbe ahụ. Enwere m ihe mgbaàmà ịdọ aka ná ntị ndị ọzọ—iku ume ọkụ ọkụ n’oge mmega ahụ, ahụ mgbu ndị m chere na ha bụ nri agbarighị nke ọma n’afọ, na, ruo ọtụtụ ọnwa tupu nkụchi ahụ, oké ike ọgwụgwụ. Echere m na ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị a bụ n’ihi ihi obere ụra na inwe oké nrụgide n’ọrụ. Ụbọchị atọ tupu m nwee nkuchi obi, enwere m ihe m chere na ọ bụ njikọlata nke uru ahụ n’obi m. Ọ bụ nkụchi dị nta nke mere tupu nke nnukwu mere n’ụbọchị nke atọ mgbe nke ahụ gasịrị.”

Obi mgbu ma ọ bụ nrụgide, a na-akpọ angina, na-enye ihe dị ka ọkara nke ndị na-arịa nkụchi obi ịdọ aka ná ntị. Ụfọdụ na-enwe iku ume ọkụ ọkụ ma ọ bụ oké ike ọgwụgwụ dị ka mgbaàmà, na-egosi na obi adịghị enweta ikuku oxygen zuru ezu n’ihi mkpọchi nke akwara obi. Mgbaàmà ịdọ aka ná ntị ndị a kwesịrị ịkwali mmadụ ịgakwuru dọkịta maka nnyocha obi. Dr. Peter Cohn na-ekwu, sị: “Mgbe a gwọsịrị angina, e jighị n’aka na a ga-egbochi nkụchi obi, kama ma ọ dịghị ihe ọzọ a na-ebelata ohere ndị e nwere na ọ ga-akụchi n’isi nso.”

Nkụchi Ahụ

John na-aga n’ihu, sị: “N’ụbọchị ahụ anyị na-aga ime egwuregwu softball. Ka m ji ọsọ ọsọ na-eri anụ e gwere egwe na poteto e ghere eghe dị ka nri ehihie, eleghaara m ahụ erughị ala ụfọdụ, onunu agbọ, na njikpa na-egbu mgbu n’elu ahụ ndị m nwere anya. Ma mgbe anyị ruru n’ogige egwuregwu bọl ma malite egwuregwu, amatara m na nsogbu dị. Ka oge na-aga n’ehihie ahụ, ọnọdụ m ji nwayọọ nwayọọ kawanye njọ.

“Ọtụtụ mgbe, edinara m na bench ndị na-eme egwuregwu, chee ihu n’elu, ma gbalịa ịgbatị uru ahụ obi m, ma ha nọgidere na-ejikpa ejikpa karị. Ka m na-eme egwuregwu, agwara m onwe m, sị, ‘Eleghị anya enwere m ahụ ọkụ,’ ebe ọ bụ na enwekwara m ahụ ịjụ oyi na ike ọgwụgwụ mgbe ụfọdụ. Mgbe m gbara ọsọ, o doro anya na adịghị m eku ume nke ọma. Edinara m n’elu bench ọzọ. Mgbe m biliri ọtọ, obi abụọ adịghị ya na m nọ n’oké nsogbu. Etikuru m nwa m nwoke bụ́ James mkpu, sị: ‘Achọrọ m ije ụlọ ọgwụ UGBU A!’ Ọ dị m ka a ga-asị na obi m dakpuru n’ime. Ihe mgbu ahụ dị ukwuu nke na apụghị m ibili ọtọ. Echere m sị, ‘Nke a apụghị ịbụ nkụchi obi, ka ọ̀ pụrụ ịbụ? Adị m nanị afọ 38!’”

Ọkpara John, onye dị afọ 15 n’oge ahụ, na-akọ, sị: “O were nanị minit ole na ole ka papa m ghara inwekwa ume, nke mere na a ghaghị ibuga ya n’ụgbọala. Enyi m nyara ụgbọala ahụ ma na-ajụ papa m ajụjụ iji nọgide na-amata ihe bụ ọnọdụ ya. N’ikpeazụ, papa m azaghị. ‘John!’ ka enyi m tiri ná mkpu. Ma nna m azaghịkwa. Mgbe ahụ papa m megharịrị ahụ n’ike n’oche ya, na-amalite inwe ihe ọdịdọ ma na-agbọ agbọ. Etiri m mkpu ugboro ugboro, sị: ‘Papa m! Ahụrụ m gị n’anya! Anwụla biko!’ Mgbe ọdịdọ ahụ gasịrị, ahụ ya dum tọgbọ n’emegharịghị ahụ n’oche ahụ. Echere m na ọ nwụwo.”

N’Ụlọ Ọgwụ

“Anyị gbabara n’ụlọ ọgwụ inweta enyemaka. Minit abụọ ma ọ bụ atọ agafewo kemgbe m chere na papa m anwụwo, ma enwere m olileanya na a pụrụ ịtụte ya. N’ijuanya m, ihe dị ka Ndịàmà Jehova 20 ibe anyị ndị nọrịị n’ogige egwuregwu bọl ahụ nọ n’ọnụ ụlọ nchere. Ha mere ka m nwee mmetụta nke onye a kasiri obi na onye a hụrụ n’anya, nke bụ oké enyemaka n’oge nhụsianya dị otú ahụ. N’ihe dị ka minit 15 ka e mesịrị, otu dọkịta bịara ma kọwaa, sị: ‘O kwere anyị mee ịtụte papa gị, ma o nwewo oké nkụchi obi. Anyị ejighị n’aka na ọ ga-adị ndụ.’

“Mgbe ahụ o kwere ka m hụ papa m n’oge dị mkpirikpi. Okwu ịhụnanya papa m kwuru maka ezinụlọ anyị riri m ọnụ. N’oké ahụ mgbu, ọ sịrị: ‘Ọkpara m, ahụrụ m gị n’anya. Na-echeta mgbe nile na Jehova bụ onye kasị mkpa ná ndụ anyị. Akwụsịla ijere ya ozi mgbe ọ bụla, nyekwara nne gị na ụmụnne gị nwoke aka ka ha ghara ịkwụsị ijere ya ozi mgbe ọ bụla. Anyị nwere olileanya siri ike ná mbilite n’ọnwụ, ọ bụrụkwa na mụ anwụọ, achọrọ m ịhụ unu nile mgbe m bịaghachiri.’ Anyị abụọ bepụtara anya mmiri nke ịhụnanya, egwu, na olileanya.”

Nwunye John, bụ́ Mary, rutere otu hour ka e mesịrị. “Mgbe m banyere n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede, dọkịta ahụ sịrị: ‘Di gị enwewo oké nkụchi obi.’ Akụjara m. Ọ kọwara na a gbatịwo nhịkọ uru ahụ obi John ugboro asatọ. Ọgwụgwọ ọnọdụ mberede a na-agụnye iji voltage eletrik akwụsị otiti obi na-eti aghara aghara ma weghachi otiti kwesịrị ekwesị. Tinyere CPR, nkesa oxygen, na ọgwụ a na-agbanye n’akwara, ịgbatị nhịkọ nke uru ahụ obi bụ usoro ka elu nke ịzọpụta ndụ.

“Mgbe m hụrụ John, o wutere m. Ọ chagharịrị nke ukwuu, e nwekwara ọtụtụ tube na waya a kwụnyere ya n’ahụ site n’ígwè ọrụ dị iche iche. N’ekwughị okwu, ekpegaara m Jehova ekpere ka o nye m ume iji die ule nke a n’ihi ọdịmma nke ụmụ anyị ndị ikom atọ, ekpekwara m ekpere maka nduzi iji mee mkpebi amamihe dị na ya banyere ihe pụrụ ịdị n’ihu. Ka m na-eru nso àkwà John, echere m, sị, ‘Gịnị ka ị ga-agwa onye ị hụrụ n’anya n’oge dị ka nke a? Ànyị dị njikere n’ezie maka ọnọdụ dị otú ahụ nke na-eyi ndụ egwu?’

“‘Ezigbo m,’ ka John kwuru, ‘ị ma na e nwere ike agaghị m alanarị nke a. Ma ọ dị mkpa ka gị na ụmụ okoro ahụ nọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Jehova n’ihi na usoro ihe a ga-agwụ n’isi nso, ọrịa na ọnwụ agaghị adịkwa. Achọrọ m ibili n’usoro ihe ọhụrụ ahụ ma hụ gị na ụmụ okoro ahụ n’ebe ahụ.’ Anya mmiri rudatara n’ihu anyị.”

Dọkịta ahụ Enye Nkọwa

“Dọkịta ahụ mesịrị kpọpụ m iche ma kọwaa na nnyocha gosiri na ihe kpatara nkụchi obi John bụ mkpọchi dị 100 pasent n’ebe isi isi aka ekpe nke akwara nkesa ọbara na-agbada agbada. O nwekwara mkpọchi n’akwara nkesa ọbara ọzọ. Dọkịta ahụ gwara m na mụ aghaghị ime mkpebi banyere ọgwụgwọ John. Abụọ n’ime nhọrọ abụọ dịnụ bụ ọgwụ na usoro ịkwụnye plastik n’akwara nkesa ọbara. O chere na nke ikpeazụ ga-aka mma, ya mere anyị họọrọ usoro ịkwụnye plastik n’akwara nkesa ọbara. Ma ndị dọkịta ahụ ekweghị nkwa ọ bụla, ebe ọ bụ na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ adịghị alanarị ụdị nkụchi obi a.”

Usoro ịkwụnye plastik n’akwara nkesa ọbara bụ usoro nke ịkwụnye tube plastik nwere ọnụ bolombolo n’ime akwara obi ma fụọ ya iji mepee mkpọchi ahụ. Ụkpụrụ ahụ nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ihe ịga nke ọma dị elu n’ime ka ọbara maliteghachi irugharị. Mgbe ihe kpọchiri oghere ọtụtụ akwara nkesa ọbara nke ukwuu, a na-atụkarị aro ka e nwee ịwa ahụ nke igbugharị okpo n’obi.

Atụmanya Mgbake Gbara Ọchịchịrị

Mgbe a kwụnyesịrị plastik n’akwara nkesa ọbara, ndụ John nọgide bụrụ nke a na-ejighị n’aka ruo hour 72 ọzọ. N’ikpeazụ, obi ya malitere ịgbake site n’ọnọdụ mkpasasị uche ahụ. Ma obi John na-asụpụta ọbara na nanị nkera nke ikike mbụ ya, akụkụ ya buru ibu aghọwokwa uru ahụ bu àpà, ya mere ọ fọrọ nke nta ka atụmanya nke ịbụ onye nkụchi obi kwarụrụ bụrụ ihe a na-apụghị izere.

N’ileghachi anya azụ, John na-adụ ọdụ, sị: “Ọ bụ ibu ọrụ anyị n’ebe Onye Okike anyị, ezinụlọ anyị, ụmụnna ndị ikom na ndị inyom ime mmụọ anyị, na onwe anyị nọ, ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị na ilekọta ahụ ike anyị—karịsịa ma ọ bụrụ na anyị nọ n’ihe ize ndụ. Ruo n’ókè ụfọdụ, anyị pụrụ ịkpata obi ụtọ ma ọ bụ iru újú. Ọ dị n’aka anyị.”

Ọnọdụ John siri ike, chọọkwa nlebara anya n’egbughị oge. Ma ọ bụghị onye ọ bụla nwere ahụ erughị ala yiri nke obi ire ọkụ ka ọ dị mkpa ịgbaga na nke dọkịta. Ma, ahụmahụ ya bụ ihe ịdọ aka ná ntị, ndị chekwara na ha nwere mgbaàmà kwesịrị ịga mee nnyocha.

Gịnị ka a pụrụ ime iji belata ihe ize ndụ nke nkụchi obi? Isiokwu na-esonụ ga-atụle nke a.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a A gbanwewo aha ndị dị n’isiokwu ndị a.

[Igbe dị na peeji nke 6]

Mgbaàmà nke Nkụchi Obi

• Mmetụta ahụ erughị ala nke nrụgide, njikpa, ma ọ bụ obi mgbu nke na-adị gafee minit ole na ole. A pụrụ ịghọtahie ya dị ka oké obi ire ọkụ

• Ahụ mgbu nke pụrụ ịgbasaru—ma ọ bụ dị nanị—n’agbà, olu, ubu, ogwe aka, ikpere aka, ma ọ bụ aka ekpe

• Ahụ mgbu na-adịte anya n’agbata afọ na obi

• Iku ume ọkụ ọkụ, ajụ obubu, ịtụbọ, ịgba ọsụsọ, ma ọ bụ oké ahụ ịjụ oyi

• Ike ọgwụgwụ—nke a pụrụ inwe ọtụtụ izu tupu nkụchi ahụ

• Onunu agbọ ma ọ bụ ịgbọ agbọ

• Obi mgbu angina mgbe mgbe nke na-abụghị oké ndọlị na-akpata

Mgbaàmà pụrụ ịgbanwe site n’ụzọ dị nro gaa n’ụzọ siri ike, ha nile adịghịkwa ewere ọnọdụ ná nkụchi obi nile. Ma ọ bụrụ na e nwee ngwakọta nke ndị a, nweta enyemaka ngwa ngwa. Otú ọ dị, n’ọnọdụ ụfọdụ adịghị enwe mgbaàmà; a na-ezo aka n’ebe ndị a dị dị ka nkụchi obi na-adịghị agba àmà.

[Igbe dị na peeji nke 7]

Ihe Ndị A Ga-eme Iji Lanarị

Ọ bụrụ na gị ma ọ bụ onye ị maara egosi mgbaàmà nkụchi obi:

• Mata mgbaàmà ndị ahụ.

• Kwụsị ihe ọ bụla ị na-eme ma nọdụ ala ma ọ bụ dina ala.

• Ọ bụrụ na mgbaàmà adịruo ihe karịrị minit ole na ole, kpọọ nọmba telifon ọnọdụ mberede dị n’ebe ahụ. Gwa onye ọrụ nzipụ ozi ngwa ngwa ahụ na ọ dị gị ka i nwere nkụchi obi, nyekwa ya ihe ọmụma dị mkpa iji chọta gị.

• Ọ bụrụ na ị pụrụ ibuga onye ọrịa ahụ n’ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede ụlọ ọgwụ ngwa ngwa karị site n’ịnya ụgbọala n’onwe gị, mee otú ahụ. Ọ bụrụ na i chere na ị na-enwe nkụchi obi, gwa mmadụ ka o buga gị ebe ahụ.

Ọ bụrụ na ị na-echere òtù ndị ọrụ ahụ ike ọnọdụ mberede:

• Tọpụtụ ákwà tagidere atagide, gụnyere belt ma ọ bụ taị. Nyere onye ọrịa ahụ aka ka ahụ ruo ya ala, na-eji ohiri isi ewelitetụ ya elu ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa

• Nọrọ jụụ, ma ị̀ bụ onye ọrịa ahụ ma ọ bụ onye na-enyere ya aka. Oké mkpali pụrụ ime ka ikwe omume nke arrhythmia na-eyi ndụ egwu dịwanye elu. Ekpere pụrụ ịbụ enyemaka na-enye ume n’ịnọrọ jụụ.

Ọ bụrụ na o yie ka onye ọrịa ahụ kwụsịrị iku ume:

• N’olu dara ụda jụọ, sị, “Ị̀ na-anụ ihe m na-ekwu?” Ọ bụrụ na ọ zaghachighị, ọ bụrụ na e nweghị otiti, ọ bụrụkwa na onye orịa ahụ adịghị eku ume, malite usoro mweghachi iku ume (CPR).

• Cheta nzọụkwụ atọ bụ isi nke CPR:

1. Welite agbà onye ahụ elu, iji wee mepee ebe ikuku si aga.

2. Mgbe ebe ikuku si aga ghere oghe, ka ị na-apịchi imi onye ahụ, jiri nwayọọ fụnye ume ugboro abụọ n’ọnụ ya ruo mgbe obi fụliri elu.

3. Bịaa aka ugboro 10 ruo 15 n’etiti obi n’agbata ọnụ ara abụọ iji nupụ ọbara n’obi. Na kịmkịm 15 ọ bụla, fụnye ume ugboro abụọ, na-eji ịbịa aka ugboro 15 na-escochi ya ruo mgbe e nweghachiri otiti obi na iku ume ma ọ bụ mgbe ndị òtù ọnọdụ mberede rutere.

Onye e nyere ọzụzụ ime CPR kwesịrị ime ya. Ma mgbe onye e nyere ọzụzụ na-anọghị ya, “CPR ọ bụla dị mma karịa nke a na-emeghị,” ka Dr. R. Cummins, bụ́ onye ntụzi nke nlekọta ọnọdụ mberede nke nkụchi obi, na-ekwu. Ọgwụla ma e nwere onye malitere nzọụkwụ ndị a, ohere ndị e nwere maka nlanarị dị nnọọ nta. CPR na-eme ka e nwee oge ruo mgbe enyemaka rutere.

[Foto dị na peeji nke 5]

Ọgwụgwọ dị ngwa mgbe e nwesịrị nkụchi obi pụrụ ịzọpụta ndụ ma belata mmebi nke obi

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya