Olee Otú A Pụrụ Isi Belata Ihe Ize Ndụ Ya?
A NA-EJIKỌTA ọrịa akwara obi (CAD) na ọtụtụ ihe na-emetụta mkpụrụ ndụ ihe nketa, gburugburu ebe obibi, na ụzọ ndụ. CAD na nkụchi obi pụrụ ịbụ n’ihi ọtụtụ afọ, ma ọ́ bụghị ọtụtụ iri afọ, nke ihe ize ndụ ndị e jikọtara ha na otu ma ọ bụ ọtụtụ n’ime ihe ndị a.
Afọ Ndụ, Óké Ma Ọ Bụ Nne, na Ebumpụta Ụwa
Afọ ndụ ka ukwuu na-eweta ihe ize ndụ ka ukwuu nke nkụchi obi. Ihe dị ka 55 pasent nke nkụchi obi na-eme ndị gafeworo afọ 65. Ihe dị ka 80 pasent nke ndị nkụchi obi na-egbu dị afọ 65 ma ọ bụ karị.
Ndị ikom na-erubeghị afọ 50 nọ n’ihe ize ndụ karịa ndị inyom nọ n’otu ọgbọ ahụ. Mgbe nkwụsị ịhụ nsọ gasịrị, ihe ize ndụ nwanyị na-amụba n’ihi ndalata dị ngwa ná mmiri ọgwụ ahụ na-enye nchebe bụ́ estrogen. Dị ka atụmatụ ụfọdụ si dị, usoro ọgwụgwọ ntinyeghachi estrogen pụrụ iji 40 pasent ma ọ bụ karị belata ihe ize ndụ nke ọrịa obi ná ndị inyom, ọ bụ ezie na a pụrụ inwe ihe ize ndụ ka ukwuu nke ọrịa cancer ụfọdụ.
Ihe e ketara eketa pụrụ ikere òkè bụ isi. Ndị nne na nna ha nwere nkụchi obi tupu ha eruo afọ 50 nwere ihe ize ndụ ka ukwuu nke nkụchi obi. Ọbụna a sị na nne na nna nwere ya mgbe ha gafesịworo afọ 50, e nwere ihe ize ndụ dị ukwuu. Ọ bụrụ na e nwere akụkọ nke nsogbu obi n’ezinụlọ, o yikarịrị ka ụmụ ha ga-azụlite nsogbu yiri nke ahụ.
Ụtụ Cholesterol Na-atụnye
Cholesterol, otu ụdị nke mmiri lipid, dị mkpa maka ndụ. Imeju na-emepụta ya, ọbara na-ebugakwa ya ná mkpụrụ ndụ, n’ime ụmụ irighịri ihe a na-akpọ lipoprotein. Ụdị abụọ bụ lipoprotein na-agbajughị agbaju (LDL cholesterol) na lipoprotein gbajuru agbaju (HDL cholesterol). Cholesterol na-aghọ ihe na-akpata ihe ize ndụ na-akpata CAD mgbe e nwere LDL cholesterol dị ukwuu n’ọbara.
A na-eche na HDL na-arụ ọrụ nchebe site n’iwepụ cholesterol n’uru ahụ na ibughachi ya n’imeju, bụ́ ebe a na-agbanwe ya ma wepụ ya n’ahụ. Ọ bụrụ na nnwale egosi ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke LDL na HDL dị ala, ihe ize ndụ nke ọrịa obi dị elu. Iwetu ọ̀tụ̀tụ̀ LDL pụrụ ime ka e nwee ndalata buru ibu n’ihe ize ndụ. Ịchịkwa ihe oriri bụ ihe gbara ọkpụrụkpụ n’ọgwụgwọ, mmega ahụ pụkwara inye aka. Ọgwụ dị iche iche pụrụ ịrụpụta ihe, ma ụfọdụ nwere mmetụta ndị na-adịghị mma.a
A na-atụ aro ihe oriri nwere cholesterol na abụba nwere ngwakọta mmiri ọgwụ n’ụzọ na-emerụ ahụ dị ala. Iji nri nwere abụba nwere ngwakọta mmiri ọgwụ n’ụzọ dị mma n’ahụ, dị ka mmanụ canola ma ọ bụ mmanụ olive, dochie anya ndị nwere nke dị elu dị ka bọta, pụrụ iwetu ọ̀tụ̀tụ̀ LDL ma chekwaa HDL. N’aka nke ọzọ, akwụkwọ bụ́ American Journal of Public Health na-ekwu na mmanụ akwụkwọ nri e tinyere hydrogen, bụ́ nke dị n’ihe ka ọtụtụ n’ihe ndị na-ebelata margarine na akwụkwọ nri, pụrụ iwelite ọ̀tùtụ̀ LDL ma belata HDL. A na-atụkwa aro ka e belata iri anụ ndị nwere oké abụba na iji anụ ọkụkọ na nke torotoro nwere abụba dị ala na-edochi anya ha.
Ihe ọmụmụ egosiwo na vitamin E, mmiri beta-carotene, na vitamin C pụrụ ibelata abụba atherosclerosis dị n’anụmanụ. Otu ihe ọmụmụ kwubiri na ndị a pụkwara ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ ụmụ mmadụ ji enwe nkụchi obi. Iri akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi ndị jupụtara na beta-carotene na mmiri carotene ndị ọzọ na vitamin C, dị ka tomato, akwụkwọ nri na-achatụ akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ, ose, karọt, ji nwannu, na egusi, pụrụ inyetụ nchebe pụọ na CAD.
Ihe ọzọ e kwukwara na ọ bara uru bụ vitamin B6 na mmanụ magnesium. Mkpụrụ ọka ndị dị ka ọka barley na nke oat tinyere àgwà, lentil, na mkpụrụ osisi na akị ụfọdụ pụrụ inye aka. Ọzọkwa, a na-eche na iri azụ̀ ndị dị ka salmon, mackerel, herring, ma ọ bụ tuna ma ọ dịkarịa ala ugboro abụọ kwa izu pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke CAD, ebe ọ bụ na ndị a nwere ụba nke omega-3 fatty acid nwere ngwakọta mmiri ọgwụ n’ụzọ dị mma n’ahụ.
Ụzọ Ndụ Ịnọ Otu Ebe
Ndị na-anọ otu ebe nwere ihe ize ndụ ka elu nke nkụchi obi. Ha na-anọ ihe ka ọtụtụ n’ụbọchị ha n’arụghị ọrụ siri ike, ha adịghịkwa emega ahụ mgbe mgbe. Ndị a na-enwekarị nkụchi obi mgbe ha mere ihe omume ndị siri ike dị ka ịrụsị ọrụ ike n’ugbo, ịgba mwe mwe ọsọ, ibuli ihe ndị dị arọ, ma ọ bụ iji shọvel kupụ snow. Ma ihe ize ndụ ya na-ebelata n’etiti ndị na-enwe mmega ahụ mgbe mgbe.
Ijesi ije ike site na 20 ruo 30 minit ugboro atọ ma ọ bụ anọ n’izu pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke nkụchi obi. Mmega ahụ a na-enwe mgbe mgbe na-akwalite ikike obi nwere ịsụpụta ọbara, na-enye aka n’ibelata ịdị arọ, ọ pụkwara ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ma wetulata mgbali elu nke ọbara.
Ọbara Mgbali Elu, Oké Ibu, na Ọrịa Shuga
Ọbara mgbali elu pụrụ imerụ ime akwara nkesa ọbara ahụ ma mee ka LDL cholesterol banye n’ime akwara nkesa ọbara wee kwalite nkwakọba nke plaque. Ka njukọba nke plaque na-amụba, a na-enwekwu mgbochi n’oruru ọbara, mgbali elu nke ọbara na-arịkwa elu.
E kwesịrị ịdị na-enyocha mgbali nke ọbara mgbe nile, ebe ọ bụ na e nwere ike a gaghị enwe ihe àmà a na-ahụ anya nke nsogbu. Maka mbelata otu akara ọ bụla ná mmali diastolic (nọmba dị n’okpuru), a pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke nkụchi obi site na 2 ruo 3 pasent. Ọgwụgwọ iji belata mgbali nke ọbara pụrụ ịdị irè. Ịkpara ihe oriri ókè, na igbochi iri nnu n’ọnọdụ ụfọdụ, tinyere mmega ahụ mgbe mgbe maka ibelata ịdị arọ pụrụ inye aka chịkwaa ọbara mgbali elu.
Oké ibu na-akwalite ọbara mgbali elu na lipid adịghị otú o kwesịrị. Izere ma ọ bụ ịgwọ oké ibu bụ ụzọ bụ isi iji gbochie ọrịa shuga. Ọrịa shuga na-akwalite CAD ma na-amụba ihe ize ndụ nke nkụchi obi.
Ise Siga
Ise siga bụ ihe siri ike nke na-akpata mwulite nke CAD. Na United States, ọ bụ ya na-akpata kpọmkwem ihe dị ka 20 pasent nke ọnwụ na-esite n’ọrịa obi na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 50 pasent nke nkụchi obi nile ụmụ nwanyị na-erubeghị afọ 55 na-enwe. Ise siga na-amụba mgbali nke ọbara ma na-akpata ọgwụ ndị na-egbu egbu, dị ka nicotine na carbon monoxide, n’ime usoro ọbara. N’aka nke ha, ọgwụ ndị a na-emebi akwara nkesa ọbara.
Ndị na-ese siga na-etinyekwa ndị na-ekuru anwụrụ ha n’ihe ize ndụ. Ihe ọmụmụ na-egosi na ndị na-adịghị ese siga ha na ndị na-ese siga bi nwere ihe ize ndụ na-amụba amụba nke nkụchi obi. N’ihi ya, site n’ịkwụsị ise siga, mmadụ pụrụ ibelata ihe ize ndụ nke ya ma nweekwa ike ọbụna ịzọpụta ndụ nke ndị ọ hụrụ n’anya na-adịghị ese siga.
Nrụgide
Mgbe ha nwere oké nrụgide mmetụta uche ma ọ bụ nke ụbụrụ, ndị nwere CAD na-eche ihe ize ndụ ka ukwuu nke nkụchi obi na ọnwụ ọrịa obi mberede ihu karịa ndị nwere akwara nkesa ọbara na-enweghị nsogbu. Dị ka otu ihe ọmụmụ gosiri, nrụgide pụrụ ime ka akwara nkesa ọbara nke plaque jupụtara hịgọọ, nke a na-ejikwa ihe ruru 27 pasent belata oruru nke ọbara. A hụrụ nhịgọ pụtara ìhè ọbụna n’akwara nkesa ọbara ndị nwetụrụ ọrịa. Ihe ọmụmụ ọzọ gosiri na oké nrụgide pụrụ ime ka ọ dịrị plaque dị n’ime akwara nkesa ọbara mfe ịgbawa, na-akpalite nkụchi obi.
Akwụkwọ bụ́ Consumer Reports on Health na-asị: “O yiri ka ụfọdụ ndị na-eji àgwà ọjọọ na-adị ndụ. Ha na-eme oké nkatọ, na-ewe iwe, bụrụkwa ndị a pụrụ ịkpasu iwe ngwa ngwa. Ọ bụ ezie na ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eleghara mkpasu iwe ndị dị nta anya, ndị na-ebu iro na-eji mmetụta uche gabigara ókè eme ihe.” Iwe na-adịghị ala ala na ibu iro na-ebuli mgbali nke ọbara, na-amụba ọ̀tụ̀tụ̀ nke otiti obi, ma na-akpali imeju ịwụnye cholesterol n’ime usoro ọbara. Nke a na-emebi akwara obi ma na-akpata CAD. A na-eche na iwe na-eme ka ihe ize ndụ dị okpukpu abụọ, nke a na-abụkwa ihe ize ndụ dị adị ruo ma ọ dịkarịa ala hour abụọ. Gịnị pụrụ inye aka?
Dị ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times si kọọ, Dr. Murray Mittleman sịrị na ndị na-agbalị ịnọrọ jụụ n’oge ọgba aghara mmetụta uche pụrụ inwe ike ibelata ihe ize ndụ ha nwere maka nkụchi obi. Nke a na-ada nnọọ dị ka okwu ndị e dekọrọ na Bible ọtụtụ narị afọ gara aga: “Ndụ nke anụ ahụ ka obi [dị jụụ, NW] bụ.”—Ilu 14:30.
Pọl onyeozi maara ihe o yiri ịnọ n’okpuru nrụgide. O kwuru banyere nchegbu ndị o chegburu onwe ya banyere ha kwa ụbọchị. (2 Ndị Kọrint 11:24-28) Ma o nwetara enyemaka sitere n’aka Chineke wee dee, sị: “Unu echegbula onwe unu n’ihe ọ bụla; kama n’ihe nile ọ bụla site n’ekpere na arịrịọ, ya na ekele, meenụ ka Chineke mara ihe nile unu na-arịọ. Udo nke Chineke, nke kachasị uche nile, ga-echekwa obi unu na echiche uche unu nche n’ime Kraịst Jisọs.”—Ndị Filipaị 4:6, 7.
Ọ bụ ezie na e nwere ihe ndị ọzọ ha na nsogbu obi nwere njikọ, ndị a tụlere n’ebe a pụrụ inye aka ime ka a mata ihe ize ndụ ka mmadụ wee nwee ike ime ihe kwesịrị ekwesị. Otú ọ dị, ụfọdụ echewo ihe ọ dị ka ya nye ndị na-aghaghị ịnagide ihe na-esochi nkụchi obi. Ruo n’ókè hà aṅaa ka mgbake kwere omume?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Teta! adịghị akwalite ọgwụgwọ e ji ọgwụ, mmega ahụ, ma ọ bụ ihe oriri enye, kama ọ na-enye ihe ọmụma a tụlere nke ọma. Onye ọ bụla aghaghị ikpebi ihe ya onwe ya ga-eme.
[Foto ndị dị na peeji nke 9]
Ise siga, ịbụ onye iwe ọkụ, iri nri nwere oké abụba, na ibi ndụ nke ịnọ otu ebe na-amụba ihe ize ndụ nke nkụchi obi