Ihe Oriri Gị—Ọ̀ Pụrụ Igbu Gị?
“I nwere akwara nkesa ọbara nke obi sụchiri nke ukwuu, ihe dị ka 95% nke mkpọchi . . . Ugbu a o yiri ka ị ga-enwe obi nkụchi n’oge na-adịghị anya.”
O SIIRI Joe dị afọ 32 ike ikweta okwu ndị a nke otu onye ọkà n’ọrịa obi nyochara ya iji chọpụta ihe kpatara obi mgbu ya. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọkara nke ndị nile ga-anwụ n’ihi ọrịa obi anadịghị ama na ha nwere ya.
Ma gịnị dujere n’ọnọdụ Joe? ‘Ruo afọ 32 eriri m ihe oriri ndị America bụ́ “anụ na mmiri ara ehi,”’ ka Joe na-akwa n’arịrị. ‘N’ụzọ ụfọdụ eziokwu ahụ bụ na ihe oriri ndị America dị ize ndụ nye ahụ ike m abaghị m ntị.’
Ihe Oriri Gị na Ọrịa Obi
Gịnị dị njọ n’ihe oriri Joe? N’ụzọ bụ isi, o nwere cholesterol na abụba gabigara ókè, karịsịa abụba ọjọọ. Malite n’oge ntorobịa ya, Joe anọwo na-etinye onwe ya n’ihe ize ndụ nke ọrịa obi site n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ná ndụrụ nri ọ bụla. N’eziokwu, e jikọtara ihe oriri nwere abụba nke ukwuu n’ise n’ime ihe iri bụ isi na-akpata ọnwụ na United States. Ihe mbụ ná ndepụta ahụ bụ ọrịa obi.
A na-ahụ njikọ dị n’agbata ihe oriri na ọrịa obi n’otu ihe ọmụmụ e duziri ná mba asaa n’ihe dị ka ụmụ nwoke 12,000 nọ n’agbata afọ 40 ruo 49. Oké ọdịiche e nwere na-ekpughe ihe dị ukwuu. Ihe ọmụmụ ahụ gosiri na ụmụ nwoke ndị Finland—n’iri 20 pasent nke calorie ha dị ka abụba ọjọọ—nwere ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol dị elu, ebe ụmụ nwoke ndị Japan—n’iri nanị 5 pasent nke calorie ha dị ka abụba ọjọọ—nwere ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ọbara dị ala. Ụmụ nwoke ndị Finland ahụkwa nwere ọ̀tụ̀tụ̀ ịrịa obi nkụchi nke ji okpukpu isii dị elu karịa nke ụmụ nwoke ndị Japan!
Otú ọ dị, ọrịa obi adịkwaghị ụkọ na Japan. N’ọtụtụ afọ gara aga, ka ụdị nri ngwa ngwa nke Ọdịda Anyanwụ ghọworo ihe na-ewu ewu n’ebe ahụ, iri abụba anụ ejiriwo 800 pasent rịa elu. Ugbu a, ụmụ okoro ndị Japan nwere ọbụna ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ọbara dị elu karịa ụmụ okoro ndị America nọ n’otu afọ ndụ ahụ! N’ụzọ doro anya, abụba sitere n’ihe oriri na cholesterol so n’ọnọdụ ndị na-eyi ndụ egwu, karịsịa ọrịa obi.
Ọrụ Cholesterol
Cholesterol bụ ihe dị ọcha, yiri wax nke dị mkpa maka ndụ. A na-achọta ya ná mkpụrụ ndụ mmadụ na anụmanụ nile. Imeju anyị na-emepụta cholesterol, a na-ahụkwa ya n’ọ̀tụ̀tụ̀ dịgasị iche iche n’ihe oriri ndị anyị na-eri. Ọbara na-ebuga cholesterol ná mkpụrụ ndụ n’ókè ndị dị ntakịrị a na-akpọ lipoprotein, nke ihe mejupụtara ha bụ cholesterol, abụba, na protein. Ụdị lipoprotein abụọ na-ebu ihe ka ukwuu na cholesterol ọbara bụ low-density lipoprotein (LDL) na high-density lipoprotein (HDL).
LDL jupụtara na cholesterol. Ka ha na-agagharị n’ime ọbara, ha na-abanye n’ime mkpụrụ ndụ site n’ihe ndị na-anabata LDL ndị dị n’ahụ mkpụrụ ndụ, a gbariekwa ha ka mkpụrụ ndụ wee jiri ha mee ihe. Ihe ka ukwuu ná mkpụrụ ndụ dị n’ime ahụ nwere ụdị ihe ndị ahụ na-anabata, ha na-ewerekwa LDL ụfọdụ. Ma e mere imejụ n’ụzọ nke na 70 pasent nke mwepụ LDL n’ọbara site n’ihe ndị na-anabata LDL na-ewere ọnọdụ n’ebe ahụ.
HDL, n’aka nke ọzọ, bụ ihe ndị dị ntakịrị na-achọsi cholesterol ike. Mgbe ha na-aga n’ime ọbara, ha na-amịkọrọ cholesterol mapụtara amapụta ma na-ebuga ya n’imeju. Imeju na-agbari cholesterol ma na-ewepụ ha n’ime ahụ. N’ụzọ dị otú a, a haziri ahụ n’ụzọ dị ebube iji cholesterol dị ya mkpa mee ihe na iwepụ ndị ọzọ.
A na-enwe nsogbu mgbe e nwere LDL gabigara ókè n’ọbara. Nke a na-amụba ohere e nwere maka ntụkọba nke plaque n’ahụ akwara nkesa ọbara. Mgbe e nwere ntụkọba nke plaque, akwara nkesa ọbara na-adị warara, ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara bu ikuku oxygen ndị pụrụ isi na ha gafere na-ebelatakwa. A na-akpọ ọnọdụ a atherosclerosis. Usoro ahụ na-aga n’ihu nwayọọ nwayọọ n’enweghị ihe àmà ọ bụla, na-ewe ọtụtụ iri afọ iji gosipụta mgbààmà ndị a pụrụ ịchọpụta. Otu mgbààmà bụ angina pectoris, ma ọ bụ obi mgbu, dị ka o mere Joe.
Mgbe akwara nkesa ọbara nke obi sụchiri kpam kpam, ọtụtụ mgbe n’ihi mkpụkọ ọbara, akụkụ obi nke na-enweta ọbara site n’akwara nkesa ọbara ahụ na-anwụ. Ihe ọ na-arụpụta bụ nsụchi obi mberede, nke na-akpatakarị ọnwụ—nke a ka mara dị ka obi nkụchi. Ọbụna ntakịrị nsụchi nke akwara nkesa ọbara nke obi pụrụ iduga n’ọnwụ nke uru ahụ obi, bụ́ nke nwere ike ọ gaghị apụta ìhè n’ahụ mgbu pụtara ìhè. Nsụchi nke akwara nkesa ọbara n’akụkụ ahụ ndị ọzọ pụrụ ịkpata ahụ mkpọnwụ, gangrene ụkwụ, na ọbụna arụghị ọrụ nke akụrụ.
N’ụzọ na-adịghị eju anya, a na-akpọ LDL cholesterol ọjọọ, na-akpọkwa HDL cholesterol ọma. Ọ bụrụ na nchọpụta egosi ọ̀tụ̀tụ̀ LDL dị elu ma ọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ HDL dị ala, ihe ize ndụ nke ọrịa obi dị elu.a Ọtụtụ mgbe nnyocha dị mfe nke ọbara ga-egosi ihe ize ndụ na-abịanụ ogologo oge tupu mmadụ enwee ihe mgbaàmà ndị a pụtara ìhè, dị ka angina. Mgbe ahụ, ọ dị mkpa ịchịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ọbara gị. Ugbu a ka anyị lee otú ihe oriri gị pụrụ isi metụta ọ̀tụ̀tụ̀ a.
Cholesterol Ọbara na Ihe Oriri
Cholesterol bụ akụkụ sitere n’okike nke ihe oriri ndị a na-enweta site n’anụmanụ. Anụ, àkwá, azụ̀, anụ ọkụkọ, na ihe ndị e ji mmiri ara mee nwechara cholesterol. Ihe oriri ndị sitere n’ihe ọkụkụ, n’aka nke ọzọ, enweghị cholesterol.
Ahụ na-emepụta cholesterol nile dị ya mkpa, ya mere cholesterol e riri n’ihe oriri bụ ntụkwasị. A na-ebibi ihe ka ukwuu na cholesterol anyị nke sitere n’ihe oriri n’imeju. Dị ka ọ na-adịkarị, mgbe cholesterol sitere n’ihe oriri banyere n’imeju, imeju na-arụ ọrụ na ya ma belata mmepụta ọ na-emepụta cholesterol. Nke a na-eme ka ngụkọta cholesterol dị n’ọbara bụrụ nke a chịkwara.
Otú ọ dị, gịnị na-eme ma ọ bụrụ na ihe oriri ahụ jupụtara nnọọ na cholesterol nke na imeju apụghị ịrụ ọrụ na ya ngwa ngwa? A na-amụba ohere e nwere maka cholesterol ịbanye kpọmkwem ná mkpụrụ ndụ nke ahụ akwara nkesa ọbara. Mgbe ọ banyere, usoro nke atherosclerosis na-ewere ọnọdụ. Ọnọdụ ahụ dị ize ndụ karịsịa mgbe ahụ nọgidere na-emepụta otu ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ahụ n’agbanyeghị ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol sitere n’ihe oriri e riri. Na United States, 1 n’ime mmadụ 5 nwere nsogbu a.
Mgbe ahụ, igbubilata cholesterol sitere n’ihe oriri ị na-eri bụ ụzọ amamihe. Ma ihe ọzọ na-adị n’ihe oriri anyị nwere ọbụna mmetụta ka ukwuu n’ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ọbara—abụba ọjọọ.
Abụba na Cholesterol
Abụba dị ụzọ abụọ: ndị ọjọọ na ndị ọma. Abụba ọma pụrụ ịbụ ndị nwere otu usoro njikọ ma ọ bụ ndị nwere ọtụtụ usoro njikọ. Abụba ọma dị mma nye gị karịa ogbo ya ndị ọjọọ, ebe iri abụba ọjọọ na-eweli ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol dị n’ọbara. Abụba ọjọọ na-eme nke a n’ụzọ abụọ: Ha na-enye aka emepụtakwu cholesterol n’imeju, ha na-abịadakwa ihe ndị na-anabata LDL ná mkpụrụ ndụ imeju, na-ebelata ịdị ngwa e ji ewepụ LDL n’ọbara.
A na-achọta abụba ọjọọ n’ụzọ bụ isi n’ihe ndị sitere n’anụmanụ, dị ka bọta, ime àkwá, abụba anụ ézì, mmiri ara ehi, ice cream, anụ, na anụ ọkụkọ. Ha jupụtakwara na chocolate, akị oyibo na mmanụ ya, mmanụ akwụkwọ nri, na mmanụ nkwụ. Abụba ọjọọ na-akpụkọ akpụkọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ime ụlọ.
Abụba ọma, n’aka nke ọzọ, na-adị mmiri mmiri n’ọ̀tụ̀tụ̀ ikpo ọkụ nke ime ụlọ. Ihe oriri ndị nwere abụba ọma ndị nwere otu usoro njikọ na abụba ọma ndị nwere ọtụtụ usoro njikọ pụrụ inye aka ibelata ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ọbara gị ma ọ bụrụ na e jiri ha dochie ihe oriri ndị nwere abụba ọjọọ.b Ebe abụba ọma ndị nwere ọtụtụ usoro njikọ, ndị na-adịkarị ná mmanụ ọka na ná mmanụ mkpụrụ sunflower, na-ebelata ma cholesterol ọma ma nke ọjọọ, abụba ndị nwere otu usoro njikọ, ndị jupụtara ná mmanụ olive na mmanụ canola, na-ebelata nanị cholesterol ọjọọ n’emetụtaghị cholesterol ọma.
N’ezie, abụba bụ akụkụ dị mkpa nke ihe oriri anyị. Dị ka ihe atụ, ma e nweghị ha, a gaghị amịkọrọ vitamin A, D, E, na K. Otú ọ dị, abụba ahụ na-achọ na-adị nnọọ ntakịrị. A na-enweta ha n’ụzọ dị mfe site n’iri akwụkwọ nri, àgwà, mkpụrụ akụ́kụ́, na mkpụrụ osisi. Ya mere ibelata iri abụba ọjọọ adịghị anapụ ahụ ihe ndị na-edozi ahụ ndị dị ya mkpa.
Ihe Mere A Ga-eji Belata Abụba na Cholesterol
Ihe oriri nke jupụtara n’abụba na cholesterol ọ̀ ga-amụba cholesterol ọbara mgbe nile? Ọ gachaghị. Thomas, onye e hotara n’isiokwu mmeghe, kpebiri ime nnyocha ọbara mgbe Teta! gbasịrị ya ajụjụ ọnụ. Ihe ndị a chọpụtara kpughere na ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ya nọ n’ókè dị mma. Dị ka ihe àmà gosiri, imeju ya nwere ike ịnọgide na-achịkwa ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol.
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na Thomas anọghị n’ihe ize ndụ. Ihe ọmụmụ ndị e mere na nso nso a na-egosi na cholesterol sitere n’ihe oriri pụrụ imetụta ihe ize ndụ nke ọrịa obi n’adabereghị ná mmetụta ọ na-enwe na cholesterol ọbara. “Ihe oriri ndị nwere cholesterol nke ukwuu na-akwalite ọrịa obi ọbụna ná ndị nwere cholesterol ọbara dị nta,” ka Dr. Jeremiah Stamler, nke Northwestern University na-ekwu. “Ọ bụkwa ya mere iri cholesterol ka nta ga-ejirịrị bụrụ ihe nchegbu nye mmadụ nile, n’agbanyeghị ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ọbara ha.”
E nwekwara okwu banyere abụba dị n’ihe oriri. Inwebiga abụba ókè n’ime ọbara, ma o si n’abụba ọjọọ ma ọ bụ na nke ọma dị n’ihe oriri, na-akpata mkpụrụ ndụ ọbara uhie ịkpụkọta ọnụ. Ọbara rọrọ arọ otú ahụ adịghị agafe n’aghịrịgha akwara ndị dị warara, na-akpata ịnapụ uru ahụ ndị ahụ ihe ndị na-edozi ahụ dị ha mkpa. Mkpụrụ ndụ kpụkọtara ọnụ ndị na-agafe n’akwara nkesa ọbara ndị ahụ na-akpaghasịkwa nkesa nke ikuku oxygen gaa n’ahụ nke akwara nkesa ọbara, na-akpata mbibi elu elu, bụ́ ebe plaque pụrụ ịmalite mewe n’ụzọ dị mfe. Ma e nwere ihe ize ndụ ọzọ dị n’iribiga abụba ókè.
Ọrịa Cancer na Ihe Oriri
“Abụba nile—nke ọjọọ na nke ọma—socha na-akpata uto nke ụdị mkpụrụ ndụ ụfọdụ nke ọrịa cancer,” ka Dr. John A. McDougall na-ekwu. Otu nnyocha nke ndị na-arịa ọrịa cancer eriri afọ na ọrịa cancer ara n’ụwa nile gosiri ọdịiche na-emenye ụjọ nke dị n’agbata mba ndị ebe Ọdịda Anyanwụ, bụ́ ebe ihe oriri na-enwe abụba nke ukwuu, na mba ndị ka na-emepe emepe. Dị ka ihe atụ, na United States, ọrịa cancer eriri afọ bụ nke abụọ n’ụdị ọrịa cancer kasị arịa ụmụ nwoke na ụmụ nwanyị ma e jikọta ha ọnụ, ebe ọrịa cancer ara bụ nke kasị arịa ụmụ nwanyị.
Dị ka Òtù Ọrịa Cancer nke America si kwuo, ìgwè ndị mmadụ na-akwaga ná mba ebe ọtụtụ ndị na-arịa ọrịa cancer na-emesịa zụlite ọ̀tụ̀tụ̀ ọrịa cancer dị n’ala ahụ, dabere n’ogologo oge o were ha ịgbanwe gaa n’ụzọ ndụ na ihe oriri ọhụrụ ahụ. “Ndị Japan kwagara Hawaii,” ka akwụkwọ banyere isi nri nke òtù ọrịa cancer na-ekwu, “na-azụlite ụdị ọrịa cancer nke ebe Ọdịda Anyanwụ: ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu maka ọrịa cancer eriri afọ na ara, nke dị ala maka ọrịa cancer afọ—mgbanwe nke ụdị nke ndị Japan.” Dị ka ihe àmà na-egosi, e jikọtara ọrịa cancer na ihe oriri.
Ọ bụrụ na ihe oriri gị nwere ngụkọta dị elu nke abụba, abụba ọjọọ, cholesterol, na calorie, ọ dị gị mkpa ime mgbanwe ụfọdụ. Ezi ihe oriri pụrụ iduje n’ezi ahụ ike, ọ pụkwara ọbụna ịgbanwe ọtụtụ mmetụta ọjọọ nke ajọ ihe oriri. E jiri ya tụnyere nhọrọ ndị dị ka ịwa ahụ na-egbu mgbu nke igbugharị okpo, bụ́ nke na-efukarị $40,000 ma ọ bụ karị, nke a dị mma n’ezie.
Site n’iji ezi uche na-ahọrọ ihe ị na-eri, ị pụrụ ifelata, mee ka otú ahụ dị gị ka mma, ma nyere onwe gị aka izere ma ọ bụ ịgbanwe ọrịa ụfọdụ. A tụlere aro ndị na-enye aka na nke a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A na-atụ cholesterol n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ nke miligram n’ime desilita ọ bụla. Ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị nke cholesterol nile—ngụkọta nke LDL, HDL, na cholesterol dị na lipoprotein ndị ọzọ dị n’ọbara—erughị miligram 200 n’ime desilita ọ bụla. A na-ewere ọ̀tụ̀tụ̀ HDL dị miligram 45 n’ime desilita ọ bụla ma ọ bụ karị dị ka nke dị mma.
b Ụkpụrụ Nduzi Ihe Oriri Maka Ndị America nke 1995 na-atụ aro ngụkọta iri abụba nke na-akarịghị 30 pasent nke calorie a na-eri kwa ụbọchị ma na-atụ aro ibelata abụba ọjọọ ruo ihe na-erughị 10 pasent nke calorie. Mbelata dị 1 pasent na calorie abụba ọjọọ a na-eri na-edujekarị ná ndalata nke miligram atọ n’ime desilita ọ bụla n’ọ̀tụ̀tụ̀ cholesterol ọbara.
[Foto dị na peeji nke 8]
Ime akwara nkesa ọbara: (1) nke ghere nnọọ oghe (2) nke sụchitụrụ asụchi, (3) nke fọrọ ntakịrị ka ọ sụchisịa kpam kpam