Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 7/8 p. 11-13
  • Ịhọrọ Ihe Oriri nke Na-akwalite Ahụ Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịhọrọ Ihe Oriri nke Na-akwalite Ahụ Ike
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Bụ Isi n’Ihe Oriri Na-akwalite Ahụ Ike
  • Isi Ihe Dị Mkpa
  • Ịdị Na-agbakọ Calorie
  • Mgbe A Gara Iri Nri n’Ụlọ Nri
  • Ihe Oriri Na-akwalite Ahụ Ike Maka Mmadụ Nile
  • Ihe Oriri Gị—Ọ̀ Pụrụ Igbu Gị?
    Teta!—1997
  • Oké Ibu—Gịnị Bụ Ngwọta Ya?
    Teta!—2004
  • Ụzọ Isi Chebe Ahụ Ike Gị
    Teta!—1999
  • Ihe Oriri Ndị Na-enye Ihe n’Ahụ́ Dị n’Ebe Aka Gị Ga-eru
    Teta!—2002
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 7/8 p. 11-13

Ịhọrọ Ihe Oriri nke Na-akwalite Ahụ Ike

Ọ BỤ ezie na a na-azụ ndị dọkịta taa ịgwọ ọrịa, otu onye dibịa kwuru, sị: “Ahụ ike, n’ụzọ na-eju nnọọ anya, abụghị ọrụ anyị. Ahụ ike bụ ibu ọrụ dịịrị onye ọ bụla.”

Joe, onye e hotara n’isiokwu bu ụzọ, nakweere ibu ọrụ a mgbe a wasịrị ya ahụ maka akwara nkesa ọbara n’obi nke sụchiri nke ukwuu. O mere mgbanwe ndị dị mkpa n’iri ihe ya ma nweta abamuru ndị dị ịtụnanya. “I nwewo ọganihu n’ọnọdụ obi gị Joe,” ka dọkịta ya ji obi ụtọ kọọ. “Nhọrọ ị họọrọ òkè na ụdị nri ị na-eri arụwo ọrụ.”

Ụdị mgbanwe dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ ime n’ihe oriri anyị? Olee otú anyị pụrụ isi nakwere ibu ọrụ maka ahụ ike anyị ma na-eri ihe n’ụzọ yiri ka ọ ga-eme ka ọ ka mma?

Ihe Bụ Isi n’Ihe Oriri Na-akwalite Ahụ Ike

Ihe bụ isi n’ihe oriri na-akwalite ahụ ike bụ nanị ime ezi nhọrọ site n’ihe oriri ndị e nwere. Iji nweta enyemaka n’ime nhọrọ ndị dị mma, Ngalaba Ọrụ Ugbo nke United States na-atụ aro iji pyramid nduzi maka ihe oriri nke nwere nkeji anọ eme ihe.—Lee chaatị dị na peji nke 12.

Carbohydrate ndị nwere ọtụtụ ngwakọta, bụ́ nke gụnyere ihe oriri sitere ná mkpụrụ akụ́kụ́, dị ka bred, cereal, osikapa, na pasta dị n’ala ala pyramid ahụ. Ihe oriri ndị a bụ ntọala nke ihe oriri na-akwalite ahụ ike. E nwere nkebi abụọ hà nhata ná nkeji nke abụọ; otu bụ akwụkwọ nri, nke ọzọkwa bụ mkpụrụ osisi. Ihe oriri ndị a bụkwa carbohydrate ndị nwere ọtụtụ ngwakọta. I kwesịrị ịhọrọ ihe ka ukwuu n’ihe oriri ị na-eri kwa ụbọchị site n’ụdị ihe oriri atọ ndị a.

Nkeji nke atọ nwere nkebi abụọ ndị dị nta karị. Otu nkebi nwere ihe oriri ndị dị ka mmiri ara ehi, yogurt, na cheese; nke ọzọkwa na-agụnye anụ, anụ ọkụkọ, azụ̀, àgwà kpọrọ akpọ, àkwá, na akị.a E kwesịrị iri nanị ntakịrị ihe oriri site n’ụdị ndị a. N’ihi gịnị? N’ihi na ihe ka ukwuu n’ihe oriri ndị a jupụtara na cholesterol na abụba ọjọọ, bụ́ ndị pụrụ ịmụba ihe ize ndụ nke ọrịa obi na ọrịa cancer.

N’ikpeazụ, e nwere ntakịrị ebe na-agụnye abụba, mmanụ, na swiit n’elu elu pyramid ahụ. Ihe oriri ndị a na-enye nnọọ ntakịrị ihe na-edozi ahụ, e kwesịkwara iri ha ntakịrị. E kwesịrị ịhọrọ ihe oriri ka ukwuu site n’akụkụ ala ala pyramid ahụ, na ole na ole karị site n’elu.

Kama ịrapara n’otu ihe oriri ahụ ndị sitere ná nkebi nke ọ bụla ndị dị n’ala pyramid ahụ, ọ bụ ihe amamihe dị na ya ịnwale ihe oriri dị iche iche ndị dị ná nkebi ndị ahụ. Nke a bụ n’ihi na ihe oriri ọ bụla nwere ngwakọta dị iche nke ihe ndị na-edozi ahụ na fiber. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ nri na mkpụrụ osisi ụfọdụ bụ ebe dị mma e si enweta vitamin A na C, ebe ndị ọzọ nwere ọ̀tụ̀tụ̀ folic acid, calcium, na iron dị elu.

N’ụzọ na-adịghị eju anya, ihe oriri akwụkwọ nri na-aghọ ihe na-ewu ewu karị. “Ihe ndekọ na-egosi n’ụzọ siri ike na ndị na-eri nanị akwụkwọ nri nọ n’ihe ize ndụ dị ala karị maka ibu oké ibu, . . . afọ okuko, ọrịa cancer akpa ume, na aṅụrụma,” ka ọkà n’ihe oriri bụ́ Johanna Dwyer kwuru na magazin bụ́ FDA Consumer. N’ụzọ dịkwa iche n’ihe ụfọdụ pụrụ ikweta, site n’inwe atụmatụ e ji nlezianya mee, nke kwesịrị ekwesị, ọbụna ihe oriri ndị anụ na-adịghị “pụrụ igbo mkpa Òkè Ihe Oriri A Tụrụ Aro Ya maka ihe ndị na-edozi ahụ,” dị ka ụkpụrụ nduzi ihe oriri ahụ nke 1995 si kwuo.

Otu isi ihe dị mkpa nye onye ọ bụla bụ ime ka abụba sitere n’ihe oriri a na-eri ghara iru 30 pasent nke calorie nile na abụba ọjọọ ghara iru 10 pasent. Ị pụrụ ime nke a n’aghọghị onye na-eri nanị akwụkwọ nri na n’ahapụghị ịnụ ụtọ nke iri ihe n’ụzọ na-adịghị mkpa. N’ụzọ dị aṅaa?

Isi Ihe Dị Mkpa

“Ndochi anya bụ isi ihe dị na ya,” ka Dr. Peter O. Kwiterovich, nke Ụlọ Akwụkwọ Mahadum Ọgwụ nke Johns Hopkins kwuru. “Jiri ihe oriri ndị nwere ntakịrị ngụkọta abụba, abụba ọjọọ, na cholesterol dochie anya ndị nwere abụba ndị a n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu.” Jiri mmanụ akwụkwọ nri na margarine dị nro mee ihe n’ọnọdụ abụba anụ, abụba kpụkọrọ akpụkọ, ma ọ bụ ghee—bụ́ bọta a zara aza nke a na-ejikarị eme ihe n’India. Zere iji mmanụ akwụkwọ nri ndị dị ka mmanụ nkwụ na mmanụ akị oyibo, bụ́ ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke abụba ọjọọ eme ihe. Belatakwa n’ụzọ dị ukwuu oriri ị na-eri ihe ndị e ghere eghe e ji achụ nta ego—doughnut, keeki dị iche iche, na pie—ebe ha na-enwekarị abụba ọjọọ

Tụkwasị na nke a, jiri (1 pasent) mmiri ara ehi a zara aza ma ọ bụ nke nwere ntakịrị abụba dochie anya mmiri ara ehi a na-azaghị aza, jiri margarine dochie bọta, nakwa cheese ndị nwere ntakịrị abụba dochie cheese nkịtị. Ọzọkwa, jiri mmiri ara ehi jụrụ oyi, sherbet, ma ọ bụ yogurt jụrụ oké oyi nke nwere ntakịrị abụba dochie anya ice cream. Ụzọ ọzọ isi belata cholesterol n’ihe oriri gị bụ ibelata oriri ị na-eri ime àkwá ịbụ otu ma ọ bụ abụọ kwa izu; jiri nanị ime àkwá nke ọcha ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dochie anya àkwá n’isi nri na isi ihe n’ovun.

E denyere anụ n’otu nkebi nke Pyramid Nduzi Maka Ihe Oriri ahụ ebe a gụnyere anụ ọkụkọ na azụ̀. Otú ọ dị, azụ̀, anụ ọkụkọ, na anụ torotoro na-enwekarị abụba dị ala karị n’otu ihe oriri karịa anụ ndị dị ka anụ ehi, anụ atụrụ, na anụ ezì, na-adabere n’ókè e ji mee ihe na ụzọ e si kwadebe ya. Anụ e gwere egwe nkịtị, anụ e siri esi, anụ ezì, na ngwọngwọ na-enwekarị ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu karịsịa nke abụba ọjọọ. Ọtụtụ ndị ọkà n’ihe oriri na-atụ aro ịkpara anụ ndị na-enweghị abụba, azụ̀, na anụ ọkụkọ a na-eri kwa ụbọchị ókè ịghara ịgafe gram 170. Ọ bụ ezie na anụ akụkụ ahụ, dị ka imeju, pụrụ inwe abamuru ihe oriri, e kwesịrị icheta na ha na-enwekarị ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke cholesterol.

Tupu oge iri ihe, ọtụtụ ndị na-eri mgbadume, bụ́ ndị na-abụkarị poteto e ghere ege, ahụekere, kashuu, biskit, swiiti, na ihe ndị ọzọ. Ndị matara uru nke ihe oriri na-akwalite ahụ ike ga-eji mgbadume ndị nwere ntakịrị abụba ndị gụnyere pọpkọn e mere n’ụlọ n’etinyeghị ya bọta ma ọ bụ nnu, mkpụrụ osisi a ghọtara ọhụrụ, na akwụkwọ nri a na-esighị esi dị ka karọt, celery, na broccoli wee dochie anya ndị a.

Ịdị Na-agbakọ Calorie

Mgbe i mere ka ihe oriri gị hiwe isi na carbohydrate ndị nwere ọtụtụ ngwakọta kama ịbụ n’ihe oriri ndị nwere ọ̀tụ̀tụ̀ abụba dị elu, e nwere uru ndị dị mma. Ị pụkwara ifelata ma ọ bụrụ na i bubigara ibu ókè. Ruo n’ókè ị pụrụ iji mkpụrụ akụ́kụ́, akwụkwọ nri, na àgwà dochie anya anụ, ruo n’ókè ahụ ka ị ga na-enwe abụba dị ala n’ime ahụ gị.

Rosa, onye e hotara n’isiokwu nke abụọ, chọrọ iwepụ ihe dị ka kilogram 25 n’otu afọ. Iji wepụ ọkara otu kilogram, ọ ghaghị iri calorie ji 3,500 dị ala karịa ihe ahụ ya chọrọ. Ọ pụrụ ime nke a site n’iri ihe dị ntakịrị karị ma ọ bụ site n’ịdị na-emega ahụ karị. Rosa kpebiri ime ha abụọ. O wepụrụ 300 n’ọ̀tụ̀tụ̀ calorie ọ na-enweta site n’ihe oriri kwa ụbọchị. Ọ malitekwara ịga ije ihe dị ka kilomita 32 kwa izu, si otú a na-emefu ihe dị ka calorie 1,500. Site n’ịrapagide n’atụmatụ a, o nwewo ike iwepụ ihe dị ka ọkara otu kilogram kwa izu.

Mgbe A Gara Iri Nri n’Ụlọ Nri

Ụlọ nri ngwa ngwa aghọwo ihe na-ewu ewu. Ma a chọrọ nlezianya n’ihi na ihe oriri ndị ha na-enwe na-enwekarị ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke abụba ọjọọ na calorie. Dị ka ihe atụ, otu nnukwute anụ e gwere egwe ma ọ bụ abụọ e jikọtara n’otu, na-enwe ihe dị n’agbata calorie 525 na 980—ọtụtụ n’ime ha site n’abụba. Ọtụtụ mgbe, a na-eghe nri ngwa ngwa eghe ma ọ bụ na-ebupụtakọ ha na cheese, ihe mwụkwasị, ma ọ bụ ihe ịchọ mma ndị na-akpata ibu ibu. Iri ụdị nri ndị ahụ ga-emetụta ahụ ike gị ma eleghị anya.

Ọ bụrụ na i bi ná mba ebe ụlọ nri na-enye nri buru ibu, ọ dị gị mkpa ilezi anya n’ókè ihe oriri ị na-eri. Ọ bụrụ na i richaghị nri ahụ, ị pụrụ ikwu ka i were nke ị na-erighị laa. Ụfọdụ ndị na-elezi anya maka ihe ha na-eri na-eme ọda nanị maka ihe ndị a na-eri tupu nri bụ isi, bụ́ nke na-adị ntakịrị karịa nri bụ isi. Ụfọdụ di na nwunye na-eme ọda maka otu efere nri bụ isi ma kerịta ya, ma ha na-emekwa ọda maka efere salad ọzọ. N’ụzọ amamihe, ị ga-akpachara anya maka ụlọ nri ndị na-enye ihe oriri a na-akparaghị ókè maka otu ọnụ ahịa dị mma. Ebe ndị a pụrụ ịbụ ọnwụnwa iribiga nri ókè!

Ihe Oriri Na-akwalite Ahụ Ike Maka Mmadụ Nile

Ka ndị nọ ná mba Ọdịda Anyanwụ na-alụso ibu oké ibu ọgụ ma na-enwe ịwa ahụ mgbugharị okpo, iji ọgwụ agwọ ọrịa, iji ụzarị ọkụ agwọ ọrịa, na ọgwụgwọ ndị na-efu oké ego, ọnụ ọgụgụ bara ụba nke ihe a kpọrọ mmadụ na-adị ndụ n’erighị ihe na-edozi ahụ zuru ezu ma ọ bụ ọbụna na-anwụ n’ihi agụụ. Otú ọ dị, n’ime ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa, nsogbu nke ihe oriri na ihe ndị na-edozi ahụ ga-abụ ihe oge ya gafeworo. Bible na-ekwe nkwa, sị: “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.” (Abụ Ọma 72:16) Mgbe ahụ ihe a kpọrọ mmadụ ga-ama ụzọ isi nụ ụtọ ụbara ihe oriri n’ụzọ bara uru, ebe Bible na-emesikwa anyị obi ike, sị: “Onye obibi ya agaghị asị, Ana m arịa ọrịa.”—Aịsaịa 33:24.

Oge ahụ a ga-enwe ahụ ike zuru okè dị nso. Ka ọ dị ugbu a, anyị pụrụ ịgbalị ịnọgide na-enwe ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ezi ahụ ike site n’ime nhọrọ ziri ezi site n’ihe oriri ndị anyị nwere.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ihe oriri ụfọdụ pụrụ iso n’ihe gafere otu ụdị. Dị ka ihe atụ, a pụrụ ịgụnye àgwà kpọrọ akpọ na lentil dị ka ihe oriri so n’ụdị akwụkwọ nri ma ọ bụ n’ụdị anụ na àgwà.

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 12]

Pyramid Nduzi Maka Ihe Oriri

Jiri amamihe họrọ nri sitere ná nkebi ndị dị n’ala nke Pyramid Nduzi Maka Ihe Oriri ahụ

Abụba, mmanụ, na swiiti

Na-eri ha ntakịrị

Ụdị mmiri ara, yogurt, na cheese Ụdị anụ, anụ ọkụkọ, azụ̀, àgwà kpọrọ akpọ, àkwá, na akị

Ugboro nri 2-3 kwa ụbọchị Ugboro nri 2-3 kwa ụbọchị

Ụdị akwụkwọ nri Ụdị mkpụrụ osisi

Ugboro nri 3-5 kwa ụbọchị Ugboro nri 2-4 kwa ụbọchị

Ụdị bred, cereal, osikapa, na pasta

Ugboro nri 6-11 kwa ụbọchị

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Ebe e si nweta ya: Ngalaba Ọrụ Ugbo nke United States,

Ngalaba Ahụ Ike na Ije Ozi Ọha na Eze nke United States

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya