“Mgbukepụ nke Ìhè na Mgbe Ụwa Ka Nọ n’Ìsì”
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Germany
NKE a bụ otú otu ọkọ akụkọ ihe mere eme si kọwaa akụkọ ihe mere eme nke Ndịàmà Jehova n’oge Nazi. Ọ bụ n’oge ngosi mbụ n’ụwa nke vidio ihe ọmụma bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault, nke e nwere n’Ihe Ncheta Ravensbrück, na Germany. Vidio a na-egosi ihe ndekọ na-emetụ n’ahụ nke obi ike na okwukwe dị ka mmadụ 24 lanarịrị oge Nazi kọrọ, tinyere ndị ọkà mmụta 10 nke akụkọ ihe mere eme na okpukpe.
Ogige ịta ahụhụ Ravensbrück nweburu mgbe ọtụtụ narị Ndịàmà Jehova nọ na ya. Ụfọdụ Ndịàmà ndị ka dị ndụ, ndị ndị Nazi tụrụ mkpọrọ ihe karịrị afọ 50 gara aga, nọ ya maka ngosi mbụ ahụ. Ha, tinyekwara ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọrụ ọchịchị, chetara oge ihe isi ike mgbe Nazi chịrị Europe n’ọchịchị dị oké egwu. Ihe dị ka mmadụ 350 nọ ya ṅara ntị n’akụkọ na-akpali akpali nke iguzosi ike n’ezi ihe ndị Kraịst nke ọtụtụ narị Ndịàmà bụ́ ndị ji obi ike ruo ọnwụ ha kama ịjụ okwukwe ha.
Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi Arịba Ama
E nwere nnọkọ nkwurịta okwu ndị nta akụkọ n’otu họtel dị na Berlin n’ụtụtụ nke ngosi mbụ ahụ, bụ́ November 6, 1996. Ndị odeakụkọ kiriri nkebi ụfọdụ nke vidio ahụ ma ṅazie ntị n’okwu nke ndị ọkà mmụta bụ́ ndị kwuru okwu n’ịdị mkpa nke ihe nkiri ihe ọmụma ọhụrụ ahụ n’ịkọ banyere otu akụkụ nke akụkọ ihe mere eme nke ọtụtụ na-amaghị, nke dịkwa mkpa. Dr. Detlef Garbe, onye ntụzi nke Ihe Ncheta Neuengamme, kọwara, sị: “Anyị—Ndịàmà Jehova na ndị na-abụghị Ndịàmà—ekwesịghị ichefu akụkọ ihe mere eme nke ndị ngá na-eyi purple triangle [akara nke Ndịàmà bụ́ ndị mkpọrọ na-eyi]. Nke a bụ mgbukepụ nke ìhè na mgbe ụwa ka nọ n’ìsì.”
Ọtụtụ Ndịàmà lanarịrịnụ bụ́ ndị pụtara na Stand Firm nọ ya ikwu banyere ahụmahụ ha. Hà nwere obi ilu banyere nhụjuanya ha? Ihu ha dị jụụ ma na-egbuke egbuke gosiri na ha enweghị.
Mgbe oge ajụjụ na azịza gasịrị, a kpọrọ ndị nta akụkọ òkù ná ngosi mbụ nke ihe nkiri ihe ọmụma bụ́ Stand Firm n’Ihe Ncheta Ravensbrück, ihe dị ka kilomita 64 site n’ebe ahụ. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile nakweere òkù ahụ.
Ngosi Mbụ Ahụ
Ihu igwe dị ojii na nsha nsha mmiri n’ụbọchị oge mgbụsị akwụkwọ a jụrụ oyi nyere ohere maka ọnọdụ na-akpali akpali n’ime ụlọ nzukọ ahụ e dozigharịrị ọhụrụ nke dị nso n’Ihe Ncheta Ravensbrück. Prọfesọ Jürgen Dittberner, bụ́ onye ntụzi nke Òtù Ihe Ncheta Ravensbrück, Sachsenhausen, na Brandenburg n’oge ahụ kwuru, sị: “A ghaghị ịkwanyere obi ike Ndịàmà Jehova gosiri n’okpuru ọchịchị ọha na eze nke mba ùgwù. . . . Anyị na-asọpụrụ ihe ncheta nke ndị a na-ajụghị okwukwe ha, ndị na-aghaghịkwa ịta ahụhụ ma ọ bụ ọbụna nwụọ dị ka ihe si na ya pụta.”
Angelika Peter, minista agụmakwụkwọ, ndị ntorobịa, na egwuregwu maka Brandenburg, Germany, zigara ozi, nke a gụrụ. O kwupụtara, sị: “Ọ dị mkpa na anyị chetara taa ihe nlereanya iguzosi ike nke Ndịàmà Jehova.” Dr. Sigrid Jacobeit, onye ntụzi nke Ihe Ncheta Ravensbrück, kwuru, sị: “Eji m atụmanya na ọṅụ na-elepụ anya maka ngosi mbụ a. Nke a bụ ụbọchị pụrụ iche, ekwenyere m na ọ bụ nye anyị nile.”
Mgbe ahụ a gbanyụlata ọkụ maka mmalite nke vidio ahụ. Ruo minit 78, ọ bụghị nanị ndị lanarịrịnụ si mba asatọ kamakwa ndị nile na-ege ntị chetaghachiri ọdachi na mmeri nke oge a dị mwute n’akụkọ ihe mere eme Germany. O siiri ọtụtụ ike ịkwụsị ibe ákwá ka ndị mmadụ nkịtị a na-akọ ihe omume ndị pụrụ iche nke ịhụnanya na okwukwe n’okpuru ọnọdụ ndị kasị njọ.
Mgbe ịkụ aka dara oké ụda belatara, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Joachim Görlitz gụpụtara okwu ikpeazụ nke otu Onyeàmà e gburu na Brandenburg. Görlitz chọtara ihe odide ahụ nanị n’izu abụọ gara aga mgbe ọ na-eme nnyocha n’Ihe Ncheta na Ebe Ndebe Ihe Mgbe Ochie Brandenburg, nke ọ bụ onye ntụzi ya. Olu gụrụ ya n’ihi mmetụta ka ọ na-agụpụta okwu nwoke onye Kraịst a kwesịrị ntụkwasị obi nke na-agba ndị kwere ekwe ibe ya ume ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Onyenwe ha. Mgbe ahụ Görlitz kwubiri, sị: “Ụmụibe, ekwetara m na ihe nkiri banyere Ndịàmà Jehova ga-atụnye ụtụ dị mkpa n’ọrụ mmụta anyị.”
Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Wulff Brebeck kwupụtara na “site n’ihe nkiri a a tụkwasịwo akụ̀ ọhụrụ dị oké ọnụ ahịa nke dị mkpa—olu nke ndị lanarịrịnụ a na-adịghị anụkebe, na . . . olu nke ndị na-alanarịghị.” Dr. Garbe kwukwasịrị: “Ndị a bụ ahụmahụ ndị dị mkpa nke ụmụ mmadụ ndị okwukwe ha nwere n’ebe Chineke nọ na ntụkwasị obi ha nwere ná nkwa Bible nyere ha ume iguzogide n’oge ahụ dị oké njọ.”
Dị ka mmechi kwesịrị ekwesị nye usoro ihe omume ahụ, ọzọkwa ọtụtụ Ndịàmà lanarịrịnụ gwara ndị na-ege ntị okwu. O doro mmadụ nile anya na ndị Kraịst a dị ike ka nwere otu ụdị okwukwe siri ike nke kwagidere ha n’oge ọtụtụ ule ha.
Eri ngosi mbụ ahụ, ihe karịrị isiokwu 340 banyere Ndịàmà Jehova na ihe nkiri ihe ọmụma Stand Firm ahụ apụtawo n’akwụkwọ akụkọ na Germany nile. Ọtụtụ usoro ihe omume redio, otu n’ụlọ ọrụ redio nke mba, bu akụkọ ọma n’otu aka ahụ.
Ihe nkiri ihe ọmụma Stand Firm ga-emesịa pụta na ma ọ dịkarịa ala asụsụ 24. Ka oge na-aga, a ga-ewepụtakwa ụdị a haziri maka iji mee ihe na klas. Eri mwepụta nke vidio ahụ, ọnụ ọgụgụ na-arị elu nke ndị ọkà nkụzi amalitewo iji ihe nkiri ihe ọmụma Stand Firm eme ihe dị ka akụkụ nke usoro ihe ọmụmụ ha iji nyere ndị na-eto eto aka ịtụle okwu ndị dị mkpa, dị ka ajọ mbunobi, nrụgide ndị ọgbọ, na olu nke akọ na uche.
N’ụwa a nke ịkpọasị na nraranye kewasịworo, lee ka o si bụrụ oge kwesịrị ekwesị ime ka ọha na eze mara banyere akụkọ iguzosi ike n’ezi ihe a! N’eziokwu nhụjuanya nke ndị Kraịst a kwesịrị ntụkwasị obi abụghị n’efu.—Ndị Hibru 6:10.
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
Nnọkọ nkwurịta okwu ndị nta akụkọ na Berlin. Site n’aka ekpe: Dr. Detlef Garbe, ndị lanarịrị Oké Mgbukpọ bụ́ Simone Liebster na Franz Wohlfahrt, na ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Wulff Brebeck