“Ana M Eguzosi Ike! Ana M Eguzosi Ike! Ana M Eguzosi Ike!”
1 Okwu ndị ahụ nke onye Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ onye lanahụrụ Oké Mgbukpọ ahụ kwuru, na-egosipụtaghachi mkpebi siri ike nke ọtụtụ puku Ndịàmà—ndị dị ndụ na ndị nwụrụ anwụ—ndị kwụsiri ike n’ihe ha kweere n’agbanyeghị mmekpọ ọnụ ndị Nazi. (Efe. 6:11, 13) A kọrọ akụkọ na-akpali akpali nke obi ike na mmeri ha na vidio ahụ na-emetụ n’obi bụ́ Jehovah’s Witnesses Stand Firm Against Nazi Assault. A na-agba ndị nile nọ n’ọgbakọ ume ikiri ya ma soro ibe ha kwurịta echiche na mmetụta ha nwere banyere ya.
2 Ka ajụjụ ndị a kpalie gị iche echiche: (1) N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji jiri obi ike guzogide ndị Nazi? (2a) Olee echiche ndị megiderịtara onwe ha e nwere banyere otu ekele, n’ihi gịnịkwa? (2b) Olee otú nke a si metụta ezinụlọ Ndịàmà? (3) Ndịàmà ole ka e zigara n’ogige ịta ahụhụ, olee otú e si amata ha ebe ahụ, oleekwa otú ndị Gestapo si mesoo ha? (4) Olee ihe ụmụnna anyị na-adịghị njikere ime iji nwere onwe ha? (5a) Olee otú Ndịàmà Jehova si jiri obi ike kwuo okwu megide arụrụala nile nke ọchịchị Hitler, oleekwa mgbe ha mere nke ahụ? (5b) Olee otú Hitler si meghachi omume? (6) Olee otú ịdị n’otu nke ndị Jehova si bụrụ nke na-azọpụta ndụ nye ha na ndị ọzọ, n’ụzọ anụ ahụ nakwa n’ụzọ ime mmụọ? (7) Olee abụ Alaeze e dere n’ogige ịta ahụhụ? (8) Olee ihe nlereanya ndị ikom, ndị inyom, na ndị ntorobịa ndị na-akwali gị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova, ihe ọ sọrọ ya mee? (Leekwa 1999 Yearbook, peeji nke 144-147.) (9) Dị ka otu n’ime Ndịàmà Jehova, olee mmetụta vidio a na-eme ka i nwee banyere abụghị akụkụ nke ụwa?
3 Ihe nlereanya dị mma nke Ndịàmà Jehova bụ́ nke e gosipụtara na vidio ahụ bụ́ Stand Firm pụrụ inyere ndị na-eto eto, ọbụna ndị na-abụghị Ndịàmà, aka iche okwu ndị dị mkpa dị ka ekweghị ibe nọrọ, nrụgide ndị ọgbọ, na akọ na uche, ihu. Ọ bụrụ na ị bụ onye ntorobịa nọ na kọleji ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ ka elu, ị̀ pụrụ inye ndị nkụzi gị ohere iji vidio a mee ihe na klas? Ikekwe ị pụrụ inye ha otu n’ime vidio ahụ ma kọwaa ya dị ka akụkọ ihe mere eme a maara obere ihe banyere ya ma ọ bụ ntụle na-enye ihe ọmụma.
4 Vidio ahụ bụ́ Stand Firm bụ ngwá ọrụ magburu onwe ya iji gosi otú izi ihe Chineke si enye anyị ikike ime mmụọ iji mee ihe na-atọ Chineke ụtọ site n’ịnọgide na-eguzosi ike maka ihe ziri ezi. (1 Kọr. 16:13) Soro ndị nile nwere mmasị n’eziokwu ahụ kerịta ya.