Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 12/8 p. 11-13
  • Ụzọ Mgbake

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụzọ Mgbake
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbake
  • Ha Abụghị Obi Nọ Nanị Ha
  • Nkwado Dị Ezinụlọ Mkpa
  • Ịmata na Ime Ihe Banyere Mgbaàmà Ya
    Teta!—1996
  • Imeri n’agha a na-ebuso obi ịda mbà
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ị pụrụ inweta ọṅụ n’ime ụwa nke na-akpata obi ịda mbà!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Obi Ekele Maka Nkwado Jehova nke Na-adịghị Ada Ada
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 12/8 p. 11-13

Ụzọ Mgbake

MGBE e nwesịrị nkụchi obi, ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ mmadụ ịdị na-atụ egwu ma na-enwe nchegbu. M̀ ga-enwe nkụchi ọzọ? M̀ ga-enwe nkwarụ ma ọ bụ bụrụ onye ihe mgbu na enweghị ume na ike na-egbochi ime ihe?

John, a kpọrọ aha n’isiokwu anyị nke abụọ, nwere olileanya na ka oge na-agafe, ahụ erughị ala na obi mgbu ọ na-enwe kwa ụbọchị ga-ebelata. Ma ka ọnwa ole na ole gasịrị, ọ sịrị: “Ruo ugbu a ha ebelatabeghị. Nke ahụ, tinyere inwe ike ọgwụgwụ ngwa ngwa na obi m iti ngwa ngwa, na-eme ka m na-ajụ onwe m mgbe nile, sị, ‘Àna m aga inwe nkụchi ọzọ?’”

Jane, sitere United States, bụ́ nwa agbọghọ di ya nwụrụ n’oge o nwere nkụchi obi, kwenyere, sị: “Echere m na mụ agajeghị ịdị ndụ ma ọ bụ na m ga-enwe nkụchi ọzọ ma nwụọ. Ụjọ jidere m, ebe m nwere ụmụaka atọ ilekọta.”

Hiroshi, sitere Japan, kọrọ, sị: “Ọ bịara dị ka ihe ijuanya ịgwa m na obi m enweghịzi ike ịrụ ọrụ dị ka ọ rụrụ na mbụ; ọ̀tụ̀tụ̀ nsụpụta ọbara m ejiriwo 50 pasent dalata. Ọ fọrọ nke nta ka m jide n’aka na m ga-egbubilata ụfọdụ n’ọrụ m dị ka onye ozi nke Ndịàmà Jehova, n’ihi na m nwere ike ime ihe na-erughị ọkara nke ihe m nọworịị na-eme.”

Mgbe mmadụ nwere ikike a kpaara ókè, mwakpo nke ịda mbà n’obi na echiche nke abaghị uru pụrụ ịmalite. Marie, onye Australia dị afọ 83, nke tinyere oge ya zuru ezu n’ọrụ ime nkwusa nke Ndịàmà Jehova, kwara arịrị, sị: “Ikike m na-enwekwaghị ijechi ozi anya dị ka m mere na mbụ wutere m. Kama inyere ndị ọzọ aka, enyemaka dị m mkpa ugbu a.” Na South Africa, Harold kwuru, sị: “Enweghị m ike ịrụ ọrụ ruo ọnwa atọ. Nanị ihe m nwere ike ime mgbe ahụ bụ nanị ijegharị gburugburu ubi. Nke ahụ na-akụda mmụọ!”

Ịwa ahụ nke igbugharị okpo n’obi dị mkpa mgbe Thomas, onye Australia, nwesịrị nkụchi obi nke ugbo abụọ ya. Ọ sịrị: “Adịghị m edili ihe mgbu, ịbụkwa onye a wara ahụ siri ike fọrọ nke nta ka ọ karịa ichetụ n’echiche.” Jorge, onye Brazil, kwuru banyere ihe na-esochi ịwa ahụ n’obi, sị: “N’ihi ọnọdụ ọjọọ m n’ihe banyere ego, atụrụ m egwu na m ga-ahapụ nwunye m nanị ya n’enweghị enyemaka. Echere m na agaghị m anọkwu ogologo oge.”

Mgbake

Gịnị nyewooro ọtụtụ ndị aka ịgbake na ime ka mmetụta uche ha kwụsighachi ike? Jane kwuru, sị: “Mgbe ụjọ tụwara m, m na-agakwuru Jehova n’ekpere mgbe nile ma tụkwasị ya ibu m ma hapụ ya n’ebe ahụ.” (Abụ Ọma 55:22) Ekpere na-enyere mmadụ aka inweta ume na udo nke uche ndị dị mkpa mgbe o nwere nchekasị.—Ndị Filipaị 4:6, 7.

John na Hiroshi keere òkè n’usoro ihe omume mgbake. Ihe oriri dị mma na mmega ahụ wusiri obi ha ike, nke mere na ha abụọ maliteghachiri ịrụ ọrụ. Ha kwukwara na ọ bụ ike nkwagide nke mmụọ Chineke mere ka ha gbakee n’ụzọ ụbụrụ na mmetụta uche.

Site ná nkwado sitere n’aka ụmụnna ya ndị Kraịst, Thomas nwetara obi ike iji chee ịwa ahụ ya ihu. Ọ sịrị: “Tupu ịwa ahụ ahụ, otu onye nlekọta bịara ileta m, o sokwa m kpee ekpere. N’arịrịọ na-emetụ nnọọ n’obi, ọ rịọrọ Jehova ka o wusie m ike. N’abalị ahụ atụkwasịrị m uche n’ekpere ya ma nwee mmetụta nke onye a gọziri agọzi inwe ndị okenye dị ka ya, ndị mmetụta ọmịiko ha na-enwe n’oge mmetụta uche bụ akụkụ nke ọgwụgwọ ahụ n’onwe ya.”

Anna, sitere Itali, nagidere ịda mbà n’obi n’ụzọ a: “Mgbe m nwere nkụda mmụọ, ana m eche banyere ngọzi nile m nataworo dị ka otu n’ime ndị ohu Chineke na banyere ngọzi ndị ga-abịa n’okpuru Alaeze Chineke. Nke a na-enyere m aka inwetaghachi udo nke uche.”

Marie nwere ekele maka enyemaka Jehova. Ezinụlọ ya anọwo na-akwado ya, ọ na-ekwukwa sị: “Ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ m, nke ọ bụla na-enwe ibu nke ya iburu, wepụtara oge iji leta m, kpọọ m na fon, ma ọ bụ zite kaadị. Olee otú m pụrụ isi nọrọ ná mwute mgbe a na-egosi m ịhụnanya ndị a nile?”

Ha Abụghị Obi Nọ Nanị Ha

E kwuwo na obi a na-agwọ agwọ ekwesịghị ịbụ obi nọ nanị ya. Nkwado nke ezinụlọ na ndị enyi na-ekere òkè buru ibu ma dị mma ná mgbake nke ndị obi ha na-aghaghị idozi n’ụzọ nkịtị na n’ụzọ ihe atụ.

Michael, onye South Africa, kwuru, sị: “O siri ike ịkọwara ndị ọzọ ihe ọ dị ka ya ịbụ onye nwere oké nkụda mmụọ. Ma mgbe m batara n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze, nchegbu ụmụnna ndị ahụ na-egosi na-enye obi ụtọ ma na-akwali akwali nke ukwu nye m.” Henry, onye Australia, bụkwa onye ịhụnanya na nghọta ọgbakọ ya gosiri wusiri ike. Ọ sịrị: “Okwu ndụmọdụ ndị ahụ dị nro dị m mkpa n’ezie.”

Jorge nwere ekele maka ịdị omimi nke nchegbu ndị ọzọ gosiri site n’inyere ezinụlọ ya aka n’ụzọ ego ruo mgbe o nwere ike ịrụ ọrụ. Olga, onye Sweden, nwere ekele n’otu aka ahụ maka enyemaka dị irè ọtụtụ ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ nyere ya na ezinụlọ ya. Ụfọdụ gaara ya ahịa, ebe ndị ọzọ hichara ụlọ ya.

Ugboro ugboro, ndị ọrịa obi aghaghị ibelata òkè ha na-ekere n’ihe omume ndị masịworo ha nke ukwuu. Sven, onye Sweden, kọrọ, sị: “Mgbe ụfọdụ aghaghị m ịhapụ ikere òkè n’ozi mgbe oké ifufe na-efe ma ọ bụ mgbe oyi na-atụsi ike, ebe ọ bụ na ọ na-akpalite njikọlata nke akwara. Enwere m ekele maka nghọta nke ọtụtụ Ndịàmà ibe m na-egosi n’okwu a.” Mgbe ọ na-adịghịkwa ebili n’àkwà, Sven nwere ike ịnụrụ ihe e mere ná nzukọ n’ihi na ụmụnna ji ịhụnanya tinye ha na tepụ. “Ha na-eme ka m na-amata ihe na-eme n’ọgbakọ, ọ na-emekwa ka ọ dị m ka m na-ekere òkè.”

Marie, na-adịghị ebili n’àkwà, chere na a gọziri ya agọzi n’ihi na ndị ọ na-amụrụ Bible na-abịakwute ya. N’ụzọ a o nwere ike ịnọgide na-ekwu banyere ọdịnihu dị ebube nke ọ na-atụ anya ya. Thomas nwere ekele maka nchegbu a na-egosi ya: “Ndị okenye anọwo na-egosi nnọọ nchebara echiche, ha ebelatawokwa ọnụ ọgụgụ ihe omume ha na-enye m.”

Nkwado Dị Ezinụlọ Mkpa

Ụzọ ahụ pụrụ isiri ndị òtù ezinụlọ ike dị ka o siiri onye ọrịa ahụ. Ha na-enwekarị oké nrụgide, na-atụkwa egwu. Banyere nchekasị nke nwunye ya, Alfred, onye South Africa, kwuru, sị: “Mgbe m si n’ụlọ ọgwụ lọta, nwunye m na-akpọlite m ọtụtụ ugboro n’ime abalị iji hụ ma m ka nọ nke ọma, ọ na-esikwa ọnwụ na m ga-eje na nke dọkịta kwa ọnwa atọ maka nnyocha.”

Ilu 12:25 na-ekwu na ‘nchegbu n’obi na-eme ka o ruru ala.’ Carlo, onye Itali, na-ekwu na kemgbe o nwere nkụchi obi, nwunye ya na-ahụ n’anya ma na-enye nkwado “enwewo ịda mbà n’obi.” Lawrence, sitere Australia, sịrị: “Otu n’ime ihe ndị ị ga-elezi anya maka ya bụ na a na-elekọta onye òtù ọlụlụ gị. Nrụgide onye òtù ọlụlụ ahụ na-enwe pụrụ ịdị nnọọ ukwuu.” N’ihi ya, anyị kwesịrị iburu n’obi ihe na-akpa ndị nile nọ n’ezinụlọ, tinyere ụmụaka. Ọnọdụ ahụ pụrụ inwe oké mmetụta n’ụzọ mmetụta uche na n’anụ ahụ ha.

James, a kpọtụrụ aha n’isiokwu anyị nke abụọ, nọpụụrụ onwe ya iche mgbe nna ya nwesịrị nkụchi obi. Ọ sịrị: “Echere m na apụghị m ikpori ndụ ọzọ n’ihi na m chere na ozugbo m mere otú ahụ, ihe ọjọọ ga-eme.” Ikwupụta egwu ya gwa nna ya na ịrụ ọrụ iji guzobe nkwurịta okwu dị mma n’ebe ndị ọzọ nọ nyere aka n’ibelata nchekasị ya. N’ime oge ahụ James mere ihe ọzọ nwere oké mmetụta ná ndụ ya. Ọ sịrị: “Amụbara m ọmụmụ Bible onwe onye m na ịkwadebe maka nzukọ ndị Kraịst anyị.” Ọnwa atọ n’ihu ọ raara ndụ ya nye Jehova ma gosipụta ya site na baptism ime mmiri. “Kemgbe ahụ,” ka ọ na-ekwu, “azụlitewo m mmekọrịta chiri nnọọ anya n’ebe Jehova nọ. Enwere m ọtụtụ ihe n’ezie m ga-ekele ya maka ha.”

N’oge na-esochi nkụchi obi, mmadụ na-enwe oge iji nyochaghachi ndụ ya. Dị ka ihe atụ, ụzọ John si ele ihe anya gbanwere. Ọ sịrị: “Ị na-ahụ ihe efu nke nchụso ụwa ma na-aghọta otú ịhụnanya ezinụlọ na ndị enyi dịruru mkpa na ókè Jehova si were anyị dị ka ndị dị mkpa. Mmekọrịta m n’ebe Jehova, ezinụlọ m, na ụmụnna nwoke na nwanyị ime mmụọ m nọ, dị nnọọ mkpa ugbu a karị.” N’icheta mkpaghasị echiche nke ahụmahụ ya, ọ gbakwụnyere, sị: “Apụghị m ichetụ echiche ịnagide nke a n’agụnyeghị olileanya anyị nke oge mgbe a ga-edozi ihe ndị a. Mgbe ihe nyịturu m, ana m eche banyere ọdịnihu, ihe na-eme ugbu a na-eyikwa ka ha adịghị oké mkpa.”

Ka ha na-enwe a gatụ ihu a gatụ azụ n’ụzọ mgbake ha, ndị a na-alanarị nkụchi obi na-etinyesi okwukwe ha ike n’Alaeze ahụ Jisọs Kraịst kụziiri anyị ikpe ekpere maka ya. (Matiu 6:9, 10) Alaeze Chineke ga-ewetara ụmụ mmadụ ndụ ebighị ebi n’izu okè n’elu ala paradaịs. Mgbe ahụ a ga-ewepụ ọrịa obi na nkwarụ nile ọzọ ruo mgbe ebighị ebi. Ụwa ọhụrụ dị oké nso. N’ezie, ndụ kasị mma ka ga-abịa!—Job 33:25; Aịsaịa 35:5, 6; Mkpughe 21:3-5.

[Foto dị na peeji nke 13]

Nkwado nke ezinụlọ na ndị enyi na-arụ ọrụ dị mma ná mgbake

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya