Ilu
12 Onye ji aka ná ntị a na-adọ ya kpọrọ ihe ji ihe ọ na-amụta kpọrọ ihe,+
Ma onye na-ejighị mba a na-abara ya kpọrọ ihe enweghị uche.+
3 Mmadụ ime ihe ọjọọ enweghị ike ime ka ihe gaziere ya+
Ma onye ezi omume ga-adị ka osisi a na-enweghị ike ifopụ efopụ.
4 Ezigbo nwaanyị bụ okpueze di ya,+
Ma nwaanyị nke na-emechu di ya ihu dị ka ọrịa nke na-eme ka ọkpụkpụ di ya rewe ure.+
5 Ndị ezi omume na-eche ihe dị mma n’echiche,
Ma ndị ajọ omume na-aghọgbu ndị ha na-edu.
6 Ihe ndị ajọ omume na-ekwu dị ka isiri mmadụ ọnyà ọjọọ,*+
Ma ihe ndị ezi omume na-ekwu na-anapụta mmadụ.+
9 Ọ ka mma na e jighị mmadụ kpọrọ ihe ma ya enwee onye na-ejere ya ozi,
Kama mmadụ ịna-etu ọnụ ma ya abụrụ na o nweghị nri* ọ bụla.+
10 Onye ezi omume na-elekọta anụ ụlọ ya,+
Ma onye ajọ omume na-eche na ya na-eme ebere, ma n’eziokwu, obi tara ya mmiri.
12 Onye ajọ omume na-enwere ndị ọjọọ ibe ya anyaụfụ maka ihe ha nwetara,
Ma ndị ezi omume dị ka osisi na-amị mkpụrụ nke gbanyesiri mgbọrọgwụ ike n’ala.
18 Okwu mmadụ kwuru n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ,
23 Onye ma ihe anaghị ekwu ihe niile ọ ma.
Ma ihe onye nzuzu na-ekwu na-egosi na ọ dị nzuzu.+
26 Onye ezi omume na-achọta ebe anụ ya ga-ata ahịhịa,
Ma ụzọ ndị ajọ omume na-eso na-edufu ha.
27 Ndị umengwụ anaghị achụ nta anụ ha ga-eri,+
Ma ịrụsi ọrụ ike dị ka akụ̀ bara ezigbo uru mmadụ nwere.
28 Ụzọ ezi omume na-eduga mmadụ ná ndụ.+
Ụzọ ya enweghị ike iduga mmadụ n’ọnwụ.