Echiche nke Bible
Nwunye Ido Onwe Ya n’Okpuru Gịnị Ka Ọ Pụtara?
OKWU CHINEKE, bụ́ Bible, na-ekwu ná Ndị Efesọs 5:22, sị: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị.” Gịnị kpọmkwem ka nke a pụtara? Nwunye ọ̀ ga-ekwenyerịrị n’ihe nile di chọrọ, n’agbanyeghị ihe ọ bụla? Ọ́ pụghị iji echiche nke onwe ya mee ihe ma ọlị ma ọ bụ nwee echiche dị iche na nke di ya?
Tụlee ihe ndekọ Bible banyere Abigail. O ji amamihe mee ihe ma n’ụzọ dị iche n’ihe di ya bara ọgaranya bụ́ Nebal chọrọ. N’agbanyeghị obiọma ụmụazụ Devid, bụ́ onye Chineke họọrọ ịbụ eze Israel gosiri Nebal, Nebal ‘makwasịrị ha.’ Devid, n’ịbụ onye enweghị ekele Nebal kpasuru iwe, dị njikere igbu mmadụ. Abigail ghọtara na ezinụlọ ya dum nọ n’ihe ize ndụ. O mere ka obi jụrụ Devid. N’ụzọ dị aṅaa?—1 Samuel 25:2-35.
Abigail kwetara n’ihu Devid na Nebal bụ́ ‘nwoke jọgburu onwe ya’ wee nye Devid ihe ndị ahụ Nebal jụrụ inye. Dị ka o kwesịrị, ọ dị njọ nye di ma ọ bụ nwunye ịkọ adịghị ike nke onye òtù ọlụlụ ya n’ihu ọha. Abigail ọ̀ bụ onye nnupụisi n’ikwu okwu na ime omume n’ụzọ a? Ee e. Ọ na-anwa ịzọpụta ndụ Nebal na ezinụlọ ya. E nweghị ihe ọ bụla gosiri na o nwere àgwà nke enweghị nkwanye ùgwù ma ọ bụ adabereghị n’onye ọzọ. Nebal ahụ ọ na-esi ike imeta mma ekwupụtaghị enweghị afọ ojuju ọ bụla banyere otú o si nye aka n’ilekọta nnukwu ala na ụlọ ya. Ma n’ọnọdụ nsogbu a, amamihe chọrọ ka ọ gbasoo echiche nke onwe ya. Ọzọkwa, Bible na-ekwu okwu n’ụzọ dị mma banyere ihe Abigail mere.—1 Samuel 25:3, 25, 32, 33.
Ogologo oge tupu ụbọchị Abigail, e nwere oge mgbe ndị nwunye nke ndị nna ochie kwupụtara echiche ha ma mee ihe dị iche n’ihe di ha chọrọ. Ma, a na-egosi ‘ndị inyom a dị nsọ, ndị na-ele anya Chineke’ dị ka ihe nlereanya nke ido onwe onye n’okpuru nye nwunye bụ́ onye Kraịst. (1 Pita 3:1-6) Dị ka ihe atụ, mgbe Sera chọpụtara na nwa nwoke Abraham bụ́ Ishmael aghọwo ihe iyi egwu nye nwa ha nwoke, bụ́ Aịsak, o kpebiri na a ghaghị ịchụpụ Ishmael. Nke a “jọrọ njọ nke ukwuu n’anya Abraham.” Ma Chineke gwara Abraham, sị: “Ka ọ ghara ịjọ njọ n’anya gị n’ihi nwa okoro a, . . . ihe nile Sera na-asị gị mee, gee ntị n’olu ya.”—Jenesis 21:11, 12.
Nghọta Dị Mkpa
Mgbe ahụ, ọ gaghị abụ ihe dị mma nye nwunye ịbụ onye a rụgidere ime ihe ọ maara na amamihe adịghị na ya ma ọlị ma ọ bụ n’imebi ụkpụrụ Chineke, n’ihi ido onwe ya n’okpuru. E kwesịghịkwa ime ka o nwee mmetụta nke ikpe ọmụma n’ihi ibute ụzọ n’okwu ụfọdụ dị mkpa, dị ka Abigail na Sera mere.
Nwunye ido onwe ya n’okpuru apụtaghị na nwunye aghaghị ikwenye mgbe nile n’ihe ọ bụla di ya chọrọ. Gịnị dị iche na ya? Mgbe ụkpụrụ ndị ziri ezi bụ ihe iseokwu, ọ pụrụ ịjụ ikwenyere di ya. Ọbụna otú ahụ, ọ ka kwesịrị igosipụta mmụọ zuru ezu nke ido onwe ya n’okpuru n’ụzọ nke Chineke.
N’eziokwu, nwunye kwesịrị ilezi anya ka ọ ghara ileghara ọchịchọ di ya anya n’ihi ịgba isi akwara, ibu iwe n’obi, ma ọ bụ ebumnobi ndị ọzọ na-adịghị mma. Ọ ghaghị inwe ezi izu, ‘nwee ezi uche,’ dị ka Abigail nwere.—1 Samuel 25:3.
Mgbe Di Na-ezere Ibu Ọrụ
Ihe mgbaru ọsọ bụ́ isi na mmụọ nke nwunye ido onwe ya n’okpuru n’ụzọ nke Chineke bụ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ site n’ikwenyere di ya na ịkwado mkpebi ya. Nke a na-adịtụ mfe mgbe di bụ onye tozuru okè n’ụzọ ime mmụọ. Ọ pụrụ ịbụ ihe ịma aka ma ọ bụrụ na o tozughị okè.
N’ọnọdụ a, olee otú ọ pụrụ isi nagide? Ọ pụrụ ịrịọsi ya arịrịọ ike ma ọ bụ tụọ aro mkpebi ndị ga-akasị bara ezinụlọ uru. Ọ bụrụ na ọ na-ekwe ka ọ ‘nọrọ n’isi ụgbọ ahụ,’ ikekwe ọ pụrụ inwekwu nkà na ya. Ikwuchi di ntị n’esepụghị aka na-emebi mmụọ nke ezi ido onwe n’okpuru. (Ilu 21:19) Ma, ọ bụrụ na o doro anya na ụkpụrụ ime ihe ya etinyewo ọdịmma ezinụlọ ahụ dum n’ihe ize ndụ, ọ pụrụ ịhọrọ ịtụ aro ụzọ ziri ezi, dị ka Sera mere.
Ọ bụrụ na di bụ onye na-ekweghị ekwe, ihe ịma aka nwunye nwere ọbụna ka ukwuu. Ma, o kwesịrị ido onwe ya n’okpuru ma ọ bụrụhaala na ọ dịghị agwa ya ka o mebie iwu Bible. Ọ bụrụ na o mee nke ahụ, mgbe ahụ mmeghachi omume nwunye bụ onye Kraịst kwesịrị ịdị ka nke ndị na-eso ụzọ mgbe ụlọikpe gwara ha ka ha mebie iwu Chineke: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karịa mmadụ.”—Ọrụ 5:29.
Otú ọ dị, n’ihi enweghị ahụmahụ na amamihe dị nta, ọbụna ndị di na nwunye bu ezi ihe n’obi pụrụ ime ihe gabiga ọrụ ha. Di pụrụ ịbụ onye na-adịghị echebara onye ọzọ echiche; nwunye pụrụ isi ọnwụ gabiga ókè maka ihe ndị ọ họọrọ. Gịnị ga-enye aka? Ile onwe onye anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị dị ha abụọ mkpa, ebe ọ bụ na “anyị nile na-asụ ngọngọ n’ọtụtụ ihe.”—Jemes 3:2.
Ọtụtụ ndị ikom ga-enwe mmasị ná mbute ụzọ si n’ezi obi nke nwunye ma ọ bụrụ na o ji ya eme ihe n’ụzọ dị mma. A na-enwekwu nkwekọrịta ma ọ bụrụ na ha abụọ arịọ mgbaghara mgbe ha mehiere ihe. Dị ka Jehova na-agbaghara adịghị ike kwa ụbọchị anyị, otú ahụ ka anyị kwesịrị ịgbaghara ndị ọzọ. “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Ja, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo? Ma n’aka Gị ka mgbaghara dị.”—Abụ Ọma 130:3, 4.
‘Idorịta Onwe n’Okpuru Ibe Ha’
Mgbe ahụ, n’ọdịmma anyị kasị mma, Akwụkwọ Nsọ na-adụ ọdụ, sị: “Na-edorịta onwe unu n’okpuru ibe unu n’ime egwu Kraịst.” Na-enyerịta onwe unu nkwanye ùgwù dị omimi; egbochila ma ọ bụ na-ama aka. Akụkụ ihe odide ahụ gara n’ihu, sị: “Ndị bụ nwunye, na-edonụ onwe unu n’okpuru di nke aka unu, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị. N’ihi na di bụ isi nke nwunye, dị ka Kraịst anyị bukwa isi nzukọ Ya.”—Ndị Efesọs 5:21-23.
Okwu Grik Pọl ji mee ihe ná Ndị Efesọs 5:21, 22 na-enye echiche nke ido onwe onye n’okpuru, ọ bụghị ịbụ onye a manyere ido onwe ya n’okpuru. Ido onwe n’okpuru ahụ bụkwa n’ihi Onyenwe anyị, ọ bụghị nanị n’ihi ịdị n’udo nke alụmdi na nwunye ahụ. Ọgbakọ Kraịst e tere mmanụ na-eji afọ ofufo na ọṅụ edo onwe ya n’okpuru Kraịst. Mgbe nwunye na-emere di ya otu ihe ahụ, mgbe ahụ o yikarịrị ka alụmdi na nwunye ahụ ga-enwe obi ụtọ, gaakwa nke ọma.
Akwụkwọ Nsọ na-ekwukwa, sị: “Unu [ndị bụ́ di] hụkwa nwunye unu n’anya, onye ọ bụla ya hụ nwunye nke aka ya n’anya, dị ka ọ na-ahụ onwe ya n’anya,” n’abụghị n’aka ntagide. (Ndị Efesọs 5:33; 1 Pita 3:7) Di kwesịrị iburu n’uche na ya onwe ya kwa kwesịrị ido onwe ya n’okpuru isi ya, n’ihi na Bible na-ekwu, sị: “Kraịst bụ isi nke nwoke ọ bụla.” Ee, nwoke kwesịrị ido onwe ya n’okpuru nkụzi Kraịst. Kraịst, n’aka nke ya, nọ n’okpuru isi ya: “Chineke bụkwa isi nke Kraịst.” Ya mere, mmadụ nile e wezụga Jehova nwere isi. Ọbụna na ọ na-eme ihe kwekọrọ n’iwu ya.—1 Ndị Kọrint 11:3; Taịtọs 1:2; Ndị Hibru 6:18.
Ido onwe n’okpuru nke ndị Kraịst ziri ezi, baakwa uru nye ma ndị ikom ma ndị inyom. Ọ na-ewetara alụmdi na nwunye ịdị n’otu na afọ ojuju nke ọ bụ nanị Onye Okike anyị na-ahụ n’anya pụrụ inye.—Ndị Filipaị 4:7.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 14]
Leslie’s