Ụwa nke Anyaukwu Na-adịghị
“Ọ BỤRỤ na e nweghị mgbanwe zuru ụwa ọnụ n’ụzọ ndị mmadụ si eche echiche, ọ dịghị ihe ga-aka mma n’ọdịdị anyị dị ka ụmụ mmadụ, ọdachi nke ụwa anyị na-agakwa izute . . . bụ ihe a na-apụghị izere ezere.”—Václav Havel, president nke Czech Republic.
Ọtụtụ ndị maara na usoro ụwa dị ugbu a apụghị ịlanarị. Ụfọdụ ndị, dị ka Václav Havel, na-ahụ mgbanwe zuru ụwa ọnụ n’iche echiche ụmụ mmadụ dị ka nanị ihe ngwọta ya. Dị ka ihe atụ, otu onye na-ekiri ihe na-eme ugbu a n’ụwa na-ekwu, sị: “Nye ọtụtụ narị nde ndị dara ajọ ogbenye, atụmanya e nwere maka nri na ihe ndị ọzọ dị mkpa ná ndụ agaghị aka mma . . . ọ gwụla ma mba ndị dị n’ụwa mere ihe ozugbo iji gbanwee ọnọdụ ndị dịnụ.”—Food Poverty & Power.
Ma, ò ziri ezi ịtụkwasị olileanya anyị maka nlanarị n’ụdị ụfọdụ nke mgbanwe ndị gbara ọkpụrụkpụ n’ọdịdị mmadụ? Ànyị pụrụ ịtụkwasị gọọmenti obi zuru ezu ‘ime ihe ozugbo iji gbanwee ọnọdụ ndị dịnụ’? Ụfọdụ chere otú ahụ. ‘Chineke nyere anyị ikike ime nhọrọ, ọ bụkwa ihe dịịrị anyị ịgbanwe ihe,’ ka ha na-ekwu. Ma eziokwu ndị siri ike nke akụkọ ihe mere eme na-ewelite ajụjụ ndị dị oké mkpa banyere ọchịchọ na ikike mmadụ nwere ime mgbanwe ndị dị mkpa. Echiche a abụghị nke enweghị nchekwube, kama nke ahụ, ọ bụ nke ezi uche dị na ya. Ị̀ ga-etinye ndụ gị n’aka dibịa na-awa ahụ ma ọ bụrụ na ị maara na ndị nile ọ waburu ahụ nwụrụ anwụ?
Ọ̀ Bụ Nsogbu nke Mmụta?
“Nsogbu ahụ metụtara mmụta,” ka Ted Trainer na-ekwu, n’akwụkwọ bụ́ Developed to Death—Rethinking Third World Development. Ọ na-ekwu na ma ọ́ bụghị ma e nwere ike ịkụziri ndị mmadụ ịhụ na mgbanwe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị mkpa, “anyị apụghị ịtụ anya inweta mgbanwe gaa n’usoro ụwa na-adịgide adịgide.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na e nwere mkpa nke ịkụziri ndị mmadụ ịdị mkpa nke ime mgbanwe n’àgwà na omume ma ọ bụrụ na ụwa ga-alanarị. N’ezie, ọ dị oké mkpa, Bible na-ekwukwa banyere usoro mmụta dị otú ahụ. Ọ na-ekwu na “ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta” ụwa. Mgbe ahụ, ọ dịghị onye ‘ga-eme ihe ọjọọ ma ọ bụ bibie’ ebe ọ bụla n’elu ụwa.—Aịsaịa 11:9.
Ma e nweghị mmụta ọ bụla, ọbụnadị usoro izi ihe Chineke, ga-ekpochapụ n’onwe ya ndị anyaukwu na-eweta oké mmerụ ahụ ma na-akpata mbibi zuru ebe nile n’ụwa. Mmụta ga-eweta mgbanwe nanị n’ime ndị chọrọ ịgbanwe, ndị chọrọ ikwekọ n’ụkpụrụ Chineke. Dị ka Jisọs Kraịst si kwuo, ha bụ ọnụ ọgụgụ dị nta karị. (Matiu 7:13, 14) Ya mere Bible adịghị adabere nkwa ya nke ime mgbanwe n’olileanya dị aghụghọ bụ na otu ụbọchị ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-amata otú nsogbu ahụ hà ma gbanwee ụzọ ha. Ọ na-ekwu na Chineke ga-eme ihe n’onwe ya iji kpochapụ ndị anyaukwu n’elu ụwa.
Ntinye Aka Chineke
Ọtụtụ na-ewere echiche a nke Chineke ime ihe n’onwe ya dị ka nrọ ma ọ bụ ihe na-apụghị ime eme. “Ịga n’ihu mberede n’ọgụgụ isi nke narị afọ nke 18 manyere anyị ịgbahapụ echiche na-akasi obi banyere Chineke nke na-etinye aka bụ́ onye ga-edozi ọnọdụ mmadụ,” ka akwụkwọ bụ́ World Hunger: Twelve Myths na-ekwu. Ma ànyị kwesịrị itinye okwukwe anyị n’arụmụka na nkà ihe ọmụma ụwa ọgụgụ isi nke ndị na-enwekwaghị okwukwe na “Chineke nke na-etinye aka”? Ọ̀ bụ na ihe ngwọta ha abụghị ihe na-apụghị ime eme?
Amamihe dị na ya karị ịtụkwasị olileanya anyị maka nlanarị n’amụma ndị na-adịghị ehie ụzọ dị n’ime Bible ndị na-atụ aka ná ntinye aka nke Chineke. Ọ bụghị nanị “echiche na-akasi obi” ikwere ná nkwa Chineke—ọ bụ nanị ezi olileanya anyị nwere maka nlanarị!
“Imebi Ndị ahụ Na-emebi Ụwa”
Gịnị kpọmkwem ka Chineke na-ekwe ná nkwa? Otu ihe bụ na ọ na-ekwe nkwa ikpochapụ ndị na-emetọ ma na-ebibi gburugburu ebe obibi n’ụwa. Mkpughe 11:18 na-ekwu na o nwere “oge” maka “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.” Gịnị ka nke ahụ ga-apụta? Ọ ga-apụta ngwụsị nke ndị nile na-emegbu ndị ogbenye na ndị na-adịghị ike ugbu a. Chineke ‘ga-ekpe ndị e wedara n’ala ikpe, nye ụmụ nke ogbenye nzọpụta, zọpịakwa onye mmegbu.’ Ọ ga-ekpochapụ ndị anyaukwu ma hapụ ndị ha rigbuworo aka ha dị ọcha ka ha mụbaa. “Ọ ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya . . . Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.”—Abụ Ọma 72:4, 12-14.
Lee mgbanwe nke ahụ ga-eweta! Dị ka Pita onyeozi si kwuo, mgbanwe a ga-emetụta ihe nile nke na ọ ga-eme ka e nwee “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (2 Pita 3:13) ‘N’ụwa ọhụrụ’ a, onye ọ bụla ga-enweta ókè kwesịrị ekwesị nke ihe ala na-emepụta. (Maịka 4:4) Ọbụna ugbu a, e nwere ihe oriri bara ụba maka mmadụ nile. Ihe bụ nsogbu bụ ikesa ha n’ụzọ na-ahaghị nhata. “E mewo atụmatụ na anyị pụrụ ịkọpụta ihe zuru ezu n’ebe ndị e nwere ike ịkọ ihe n’ụwa iji kwadoo ijeri mmadụ 38-48,” ka Anne Buchanan na-ekwu, n’akwụkwọ ya bụ́ Food Poverty & Power.
Mbara ụwa a ga-alanarị. Onye Okike ya ‘ekeghị ya ka ọ tọgbọrọ n’efu, [kama] ọ bụ ka e wee biri n’ime ya ka Ọ kpụrụ ya.’ (Aịsaịa 45:18) Ihe omume Chineke megide ndị anyaukwu ga-apụta oge dị mkpirikpi nke “mkpagbu ukwu.” (Matiu 24:21) Ndị lanarịrị oké mkpagbu ahụ ga-anụzi ụtọ nke ụwa paradaịs, nke ndị nweere onwe ha kpam kpam pụọ n’anyaukwu bijupụtara. (Abụ Ọma 37:10, 11; 104:5) Ọ ga-adị dị ka Bible na-ekwe ná nkwa: “Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu nile.”—Aịsaịa 25:8.
Ị pụrụ ịbụ otu n’ime ndị obi ụtọ ga-erite uru n’ihe Chineke ga-eme iji hichapụ anyaukwu n’ụwa. Ọ bụrụ na ị chọrọ ime uche Chineke n’ezie, jiri enyemaka nile e dokwara iji nyere gị aka ịlanarị ugbu a n’ụwa anyaukwu mee ihe. Mee ihe iji lanarị “mkpagbu ukwu” ahụ. Ndịàmà Jehova dị njikere inyere gị aka ịmụta ihe ọ dị gị mkpa ịmara. Nwere onwe gị ịkpọtụrụ ha n’Ụlọ Nzukọ Alaeze dị n’ógbè gị ma ọ bụ dega akwụkwọ n’adres dịkarịsịrị gị nso e depụtara na peji nke 5.