Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 1/8 p. 4-5
  • Anyaukwu—Gịnị Ka Ọ Na-eme Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Anyaukwu—Gịnị Ka Ọ Na-eme Anyị?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Agụụ Ji na Ndị Na-anwụ Anwụ
  • Ndị Nọ n’Ohu
  • Ọdịiche Na-arị Elu n’Agbata Ndị Ọgaranya na Ndị Ogbenye
  • Nwee Ihe Ịga Nke Ọma N’izere Ọnyà Nke Anyaukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • “Ọgbọ nke Anyaukwu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Cheedi Echiche Banyere Ụwa nke Na-enweghị Anyaukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Ịlanarị n’Ime Ụwa nke Anyaukwu
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 1/8 p. 4-5

Anyaukwu—Gịnị Ka Ọ Na-eme Anyị?

ANYAUKWU na-ebibi ndụ ọtụtụ nde mmadụ. Ọ na-eme ka ndị anyaukwu ghara inwe àgwà mmadụ ma na-ewetara ndị ha na-erigbu ihe mgbu na iru újú. Ná ndụ gị, anyaukwu pụkwara ịdị na-emetụta gị. Ọbụna ntụtụaka efu n’ụlọ ahịa na-amụba ọnụ ahịa nke ihe ị na-azụ. Ọ bụrụ na ụgwọ ọrụ gị dị ala, ọ bụrụkwa na aka gị erughị ọnụ ahịa nke ihe ndị dị mkpa e ji adị ndụ, ikekwe ọ bụ anyaukwu onye ọzọ na-emetụta gị.

Ndị Agụụ Ji na Ndị Na-anwụ Anwụ

Iji anyaukwu na-achọ ọdịmma onwe onye mba na-egbochi mgbalị gọọmenti dị iche iche na-eme inyere ndị ogbenye aka n’ụzọ dị irè. Laa azụ na 1952, onye ọkà mmụta sayensị na ọkachamara n’ihe na-edozi ahụ bụ́ Sir John Boyd Orr sịrị: “Gọọmenti dị iche iche dị njikere ijikọta ụmụ mmadụ na akụ̀ na ụba maka agha ụwa ma Ndị Ike Dị n’Aka adịghị njikere ijikọta aka iji wepụ agụụ na ịda ogbenye n’ụwa.”—Food Poverty & Power, nke Anne Buchanan dere.

Otú ọ dị, a na-enye ihe ụfọdụ yiri enyemaka. Ma olee otú ndụ ndị ogbenye dị n’ezie, bụ́ ndị ka n’ọnụ ọgụgụ e leghaara anya n’ime ndị bi n’ụwa? Otu akụkọ e nwere n’oge na-adịbeghị anya kwuru na n’agbanyeghị mmụba nke imepụta ihe oriri n’ebe ụfọdụ, “agụụ na erighị ihe na-edozi ahụ ka na-echi ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị dara ogbenye ọnụ n’ala . . . Otu ụzọ n’ụzọ ise [ihe karịrị otu ijeri] nke ndị bi n’ụwa na-akwụ agụụ kwa ụbọchị.” Akụkọ ahụ na-aga n’ihu ikwu, sị: “Ọzọkwa, ‘agụụ zoro ezo’ ji ijeri mmadụ 2 n’ihi . . . ụkọ [ezi ihe oriri] bụ́ nke pụrụ iduga ná nsogbu ndị siri oké ike.” (Developed to Death—Rethinking Third World Development) Ọnụ ọgụgụ ndị ahụ kwesịrị ịbụ isi akụkọ n’ezie!

Ndị Nọ n’Ohu

Ndị isi òtù mpụ na-eme onwe ha ọgaranya, ebe ndị a na-emeso mpụ na ọha mmadụ n’ozuzu ya na-ata ahụhụ ya. Ọgwụ ọjọọ, ime ihe ike, ịgba akwụna, na nrigbu n’ụzọ akụ̀ na ụba na-eme ka ọtụtụ nde ghọọ ohu. Ọzọ, Gordon Thomas na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ Enslaved, sị: “Dị ka Òtù Na-emegide Ịgba Ohu si kọọ, e nwere ndị ohu a na-eme atụmatụ ha ịbụ nde 200 n’ụwa. Ihe dị ka nde 100 n’ime ha bụ ụmụaka.” Gịnị bụ isi ihe na-akpata ya? Akụkọ ahụ na-akọwa, sị: “Mkpali ịgba ohu ka bụ akụkụ gbara ọchịchịrị nke ọdịdị ụmụ mmadụ . . . [Ịgba ohu bụ] ihe na-esi n’oké ọchịchọ, anyaukwu na ịhụ ike n’anya na-apụta.”

Ndị ike dị n’aka na-anapụ ndị na-enweghị ike na ndị na-enweghị nchebe ihe, na-egbukwa ọtụtụ. “N’ime nde ndị India abụọ bi na Brazil mgbe mbụ ndị ọcha rutere, eleghị anya, narị puku mmadụ abụọ dị ndụ ugbu a.” (The Naked Savage) N’ihi gịnị? Ihe bụ isi kpatara ya bụ anyaukwu.

Ọdịiche Na-arị Elu n’Agbata Ndị Ọgaranya na Ndị Ogbenye

Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times kọrọ na James Gustave Speth, onye nlekọta nke Usoro Mmepe nke Mba Ndị Dị n’Otu, kwuru na “ìgwè ndị nọ n’ọkwá dị elu na-ebilite n’ụwa nile . . . na-achịkọta akụ̀ na ụba na ike dị ukwuu, ebe a na-eleghara ihe karịrị ọkara nke ihe a kpọrọ mmadụ anya.” Okwu ya na-eme ka ọdịiche dị ize ndụ n’agbata ndị ọgaranya na ndị ogbenye pụta ìhè karị: “Anyị ka nwere ihe karịrị ọkara nke ndị mmadụ nọ na mbara ụwa na-akpata ego na-erughị $2 n’ụbọchị—ihe karịrị ijeri mmadụ 3.” O kwukwara, sị: “Nye ndị ogbenye n’ụwa a nke nwere ìgwè abụọ, ọ bụ ọnọdụ dabara adaba maka enweghị olileanya, maka iwe, maka obi nkoropụ.”

Eziokwu ahụ bụ na ọtụtụ ná ndị ọgaranya yiri ka ha enweghị nchebara echiche ma ọ bụ ọmịiko ọ bụla maka ọnọdụ ọjọọ nke ìgwè mmadụ dara ogbenye agụụ ji na-amụba enweghị olileanya nke a.

Ndị na-ata ahụhụ anyaukwu nọ n’ebe nile. Lee, dị ka ihe atụ, ọdịdị onye nọ ná mgbagwoju anya nke dị n’anya ndị gbara ọsọ ndụ nọ n’ọnyà n’etiti ọgụ a na-alụ maka ike na Bosnia, Rwanda, na Liberia. Lee ọdịdị nke enweghị nchekwube nke dị n’ihu ndị agụụ na-agụgbu n’ime ụwa nke ihe jupụtara. Gịnị na-akpata ha nile? Anyaukwu—n’otu ụdị ma ọ bụ n’ụdị ọzọ!

Olee otú ị pụrụ isi lanarị mgbe ndị ji anyaukwu erigbu ndị ọzọ nọ gị gburugburu n’ógbè ndị iro dị otú ahụ? Isiokwu abụọ na-esonụ ga-aza ajụjụ a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya