Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 2/15 p. 3-4
  • “Ọgbọ nke Anyaukwu”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Ọgbọ nke Anyaukwu”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ókè Hà Aṅaa Ka Ọ Gbasaruru?
  • A Ga-ekpochapụ Anyaukwu
  • Cheedi Echiche Banyere Ụwa nke Na-enweghị Anyaukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Nwee Ihe Ịga Nke Ọma N’izere Ọnyà Nke Anyaukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ị Ga-esili n’Ọnyà Setan Pụta
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Anyaukwu—Gịnị Ka Ọ Na-eme Anyị?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 2/15 p. 3-4

“Ọgbọ nke Anyaukwu”

Ọ BỤRỤ na mmadụ nwere ihe isi ike n’ikpochapụ ọrịa àzụ̀zụ̀ nkịtị, ohere dị aṅaa ka o nwere n’ikpochapụ ọrịa ahụ siri ike karị nke bụ anyaukwu?

O yiri nnọọ ka ọ bụ na a dịghị amụta anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe onye amụta—ha na-apụta nnọọ ìhè site na nwata. Ị pụrụ ịnọ na-ekiri ụmụntakịrị abụọ ji ihe egwuregwu ha na-egwuri egwu i wee hụ na nke a bụ eziokwu.

Anyaukwu nke ụmụ mmadụ n’otu n’otu bụ ihe a na-ahụ n’ebe nile, ọ dịkwa njọ, ma mgbe a bịara n’ihe banyere anyaukwu nke mba dum ma ọ bụ mba dị iche iche, ọ na-emetụta ọtụtụ nde mmadụ n’ụzọ dị njọ. Were, dị ka ihe atụ, azụmahịa ọgwụ ọjọọ zuru ụwa ọnụ. Otu magazin a na-ebipụta n’asụsụ Spanish na-ekwu na nke a bụ azụmahịa kasị ukwuu e nwere n’ụwa—$300 puku nde kwa afọ. A na-ebibi ọtụtụ nde ndụ ụmụ mmadụ, iji ọgwụ na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-akpatakwara ọtụtụ ndị a na-apụghị ịgụta ọnụ nnwụchu ọnwụ. Gịnị bụ isi ihe kpatara oké mmụba dị egwu a na-enwe n’azụmahịa ọgwụ ọjọọ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ anyaukwu.

Akwụkwọ akụkọ bụ World Press Review mere ka ihe mkpali nke a nke anyaukwu pụta ìhè. Ọ na-ehota okwu site na magazin ahụ a na-ebipụta na Madrid bụ Cambio 16, bú nke na-ekwu na “ọ bụ nanị 10 ruo 20 pasenti nke uru ego nile a na-erite site n’ire ọgwụ ọjọọ na-erute mba ndị na-emepụta ha aka. A na-etinyeghachi 10 pasenti ọzọ n’usoro mbugharị ya site n’itinye ego n’usoro mmepụta ya dị iche iche, ịzụta ụgbọ ala, na ngwá agha. . . . Ihe fọdụrụ na ya na-ejedebe ná mba ndị na-eji ọgwụ ndị ahụ eme ihe nakwa ná ndokwa usoro ụlọ akụ ụwa na-eme iji chebe ndị na-azụ ụdị ahịa nke a n’ịkwụ taks buru ibu.”

Nke a na-egosipụta na ọ bụ ụgha, bụ́ nzọrọ ahụ a na-eme na ọ bụ mkpa na-eduba ndị mmadụ n’inwe anyaukwu, na anyaukwu bụ ihe e ji mara nanị ndị ogbenye na ndị ihe na-adịghị agachara nke ọma. O doro anya na inwe anyaukwu bụ adịghị ike mmadụ nke na-emetụta akụkụ nile nke ọha mmadụ, gụnyere ndị ahụ na-anọghị ná mkpa ma ọlị. Otu n’ime ihe ndị dị mgbagwoju anya e ji mara anyaukwu bụ na ọ na-eji nwayọọ nwayọọ na-amata mmadụ n’ọnyà—ọbụna ndị na-enwebu afọ ojuju n’ọnọdụ ha ná ndụ ga-egosipụta anyaukwu ma ọ bụrụ na ohere ya adapụtara ha na mberede.

Odeakụkọ bụ Meg Greenfield kwara arịrị kwuo, sị: “N’ụbọchị ọ bụla i meghere akwụkwọ akụkọ, ị na-agụ banyere nnukwute òtù ikpe dị iche iche, ndị ọkà iwu pụrụ iche, na òkù telifonu ndị a na-enyo enyo, nrigbu dị iche iche na aghụghọ na nghọgbu, ọ bụkwa ihe na-akụda mmụọ. Ọbụna ikwere na n’oge ụfọdụ ebubo ndị ahụ bụ ndị na-enweghị ihe ndabere, ndị ọzọ abụrụkwa ndị e mere ka ha buo ibu karịa ka ha kwesịrị ịdị, ọ pụtara ìhè nye m na site n’oge ruo n’oge, ndị mmadụ mere ihe ụfọdụ, a gbachikwara ha nkịtị mgbe ha mere ihe ndị a na-ekwesịghị ịgba ha nkịtị na ha. . . . Nke a bụ ebe anyị bịaruworo: ọbụna akụkụ dị ukwuu n’ihe ndị anyị na-eme maka ọdịmma ndị ọzọ bụ n’ezie maka ọchịchọ onwe anyị, ihe anyaukwu.”

Ókè Hà Aṅaa Ka Ọ Gbasaruru?

Anyaukwu abụghị ihe ọhụrụ n’etiti ụmụ mmadụ, ọ bụ ezie na ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ mụbawo n’ihi ihe nrụgide nile nke ndụ a na-adị n’ime narị afọ nke iri abụọ nke a. Anyaukwu agbasaruwo ebe nile nke na otu akụkọ bụ isi nke dị n’akwụkwọ akụkọ The Christian Century nyere afọ iri nke 1980 aha o chere na o kwekọrọ n’aha ndị ahụ dị ka “Ogbọ nke Nchekasị” nke e nyere afọ ndị 1950 ma ọ bụ “Afọ Iri nke Ọchịchọ Onwe Onye” nke e nyere afọ ndị 1970. Ọ kpọkwasịrị afọ ndị 1980 aha ahụ bụ “Ọgbọ nke Anyaukwu”!

Taa, a pụrụ ịhụta anyaukwu n’ebe ọ bụla ndị mmadụ gbakọtara—n’ụlọ ọrụ, n’ụlọ akwụkwọ, nakwa n’obodo dum n’ozuzu ha. Mmetụta ya nke na-emerụ emerụ abanyewo n’ime usoro azụmahịa, n’ime ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ọbụna n’ime okpukpe ndị bụ isi nke ụwa.

Ọtụtụ mgbe, anyaukwu na-amụba wee duje n’ime omume aghụghọ ndị iwu na-akwadoghị ma ọ bụ n’igwu wayo. Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ bụ The Canberra Times, nyere Australia ọkwá ahụ na-adịghị enye nsọpụrụ nke ịbụ mba a kasị na-egwu wayo inshọransị na ya n’ime ụwa. Akwụkwọ ndị Australia bụ Law Society Journal yiri ka ọ̀ kwadoro nke a, na-asị: “Mkpesa ndị na-abụghị eziokwu/okwu ndị dejupụtara akwụkwọ inshọransị kwuru na-eme ka ụlọ ọrụ inshọransị dị iche iche, nakwa ndị ọ na-abụghị ha dejuru akwụkwọ inshọransị kpọmkwem, mefuo ọtụtụ nde dollar kwa afọ.” Akwụkwọ ahụ kwukwara na “ọ bụ nsogbu na-amụbawanye amụbawanye, karịsịa n’akụkụ nke ibibi ihe ọha na eze, ịkwakọrọ ngwongwo dị n’ọdụ ụgbọ mmiri, izu ohi moto na ihe ndị dị n’ime ụlọ.”

Ya mere, ọ dị mfe ịghọta ihe mere na ọtụtụ mmadụ na-akwa echiche ahụ emo nke bụ na ọ dị mgbe a ga-emesịa kpochapụ anyaukwu. Ee, ha na-eche na anyaukwu ga-anọgide n’ebe anyị nọ, na ụwa nke anyaukwu na-adịghị bụkwa nrọ na-apụghị ime eme.

A Ga-ekpochapụ Anyaukwu

Ọ̀ bụ n’ihe dị aṅaa ka a dabeere wee kwuo okwu a dị n’elu nke yiri ka ihe na-apụghị ime eme? Ọ dabeere n’eziokwu ahụ nke bụ na a maliteworị ibi ndụ nke anyaukwu na-adịghị emetụta. Ọ bụ eziokwu na ihe nke a e mezuru abụghị n’ụzọ zuru okè, ọ na-egosi ihe a pụrụ ime ma ọ bụrụ na e nwee ọzụzụ na ihe mkpali kwesịrị ekwesị. Isiokwu nke na-eso ga-egosi ụzọ a pụrụ isi nwee ụwa nke na-enweghị anyaukwu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya