Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 2/15 p. 4-7
  • Cheedi Echiche Banyere Ụwa nke Na-enweghị Anyaukwu

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Cheedi Echiche Banyere Ụwa nke Na-enweghị Anyaukwu
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Iwepụ Anyaukwu Site n’Inye Ọzụzụ
  • Eziokwu Bible Nọ n’Ọrụ
  • Ụwa Ọhụrụ nke Anyaukwu Na-adịghị
  • “Ọgbọ nke Anyaukwu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Nwee Ihe Ịga Nke Ọma N’izere Ọnyà Nke Anyaukwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ị Ga-esili n’Ọnyà Setan Pụta
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
  • Anyaukwu—Gịnị Ka Ọ Na-eme Anyị?
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 2/15 p. 4-7

Cheedi Echiche Banyere Ụwa nke Na-enweghị Anyaukwu

Ị̀ PỤRỤ iji anya nke uche gị hụ ụwa ebe ụmụ mmadụ na-emekọ ihe n’otu kama ịdị na-asọrịta mpì? Ebe ụmụ mmadụ na-emeso ibe ha dị ka ọ ga-amasị ha ka e si mesoo ha? Nke a bụ ihe ndị e ji amara ụwa nke na-enweghị anyaukwu. Lee nnọọ ụdị ụwa nke ahụ ga-abụ! Ọ̀ dị mgbe ọ ga-emesịa bịa? Ee, ọ ga-abịa. Ma olee ụzọ a pụrụ isi kpochapụ anyaukwu—bụ́ nke gbamiworo mkpọrọgwụ nke ukwuu n’ime ihe a kpọrọ mmadụ?

Iji nweta azịza ya, anyị aghaghị ibu ụzọ mata ebe anyaukwu si malite. Bible na-egosi na nke a abụghị ihe e ji mara agbụrụ mmadụ site ná mmalite. Onye amụma bụ Moses na-echetara anyị na ọ dịghị ntụpọ ọ bụla dị ka anyaukwu nke a hụrụ n’ime mmadụ mbụ ahụ, bụ́ ihe okike nke Onye Okike ahụ na-enweghị anyaukwu ma ọlị: “Oké nkume ahụ, ihe zuru oké ka ọrụ ya bụ: n’ihi na ụzọ ya nile bụ ikpe ziri ezi.” Ya mere, olee ebe anyaukwu si bịa? Mmadụ abụọ mbụ ahụ kwere ka o tolite n’ime onwe ha—Iv, n’iji anyaukwu na-atụ anya ihe ọ ga-enweta site n’iri mkpụrụ osisi ahụ Chineke machibidoro iwu, Adam, n’iji anyaukwu chọọ ka ọmarịcha nwunye ya ghara ifunahụ ya. Moses kwukwara, n’okwu ndị bụkwa eziokwu n’ihe banyere Adam na Iv, sị: “Ha ebibiwo onwe ha, ọ bụghị nke ụmụ ya ka ọrụ nke dị ha n’ahụ bụ.”—Deuterọnọmi 32:4, 5; 1 Timoti 2:14.

Ka ọ na-eru oge Iju Mmiri ahụ zuru ụwa ọnụ n’oge Noa, anyaukwu na oké ọchịchọ amụbawo ruo ókè buru ibu nke na “ihe ọjọọ nke mmadụ hiri nne n’ụwa, . . . nchepụta nile ọ bụla nke echiche obi ya bụ nanị ihe ọjọọ ogologo ụbọchị nile.”—Jenesis 6:5.

Àgwà nke a siri ike nke anyaukwu n’ime mmadụ anọgidewo na-aga n’ihu ruo ugbu a, na-eyi ka ọ̀ na-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’ime ọgbọ anyaukwu na-enweghị ekele nke oge a.

Iwepụ Anyaukwu Site n’Inye Ọzụzụ

Dị nnọọ ka anyaukwu mụbaworo n’etiti ụmụ mmadụ, otú ahụ, o kwekwara omume ime ihe megidere nke ahụ. A pụrụ imeri inwe anyaukwu. Ma, ka e wee mee nke a, inye ọzụzụ kwesịrị ekwesị dị mkpa, na-agbaso ntụziaka ma ọ bụ ụkpụrụ akparamagwa ndị siri ike. Nke a pụrụ iyi ihe ga-ekwe omume, ma ọ̀ bụ ònye pụrụ inye ọzụzụ dị otú ahụ, jidekwa n’aka na a ga-etinye ihe a mụtara n’ọrụ—ọbụna rụgide ka e tinye ya n’ọrụ ma ọ bụrụ na ọ dị mkpa?

Ọzụzụ dị otú ahụ aghaghị isite n’ebe anyaukwu na-adịghị ma ọlị. A gaghị enwe nzube nzuzo ọ bụla ma ọ bụ na-atụ anya inweta ihe ụfọdụ n’ihi inye ọzụzụ dị otú ahụ. Ọzọkwa, a ghaghị inye ọzụzụ banyere abamuru nke ime ihe n’achọghị ọdịmma onwe onye, gosipụtakwa ụzọ e si eme nke a n’ihe omume. Ọ dị mkpa ime ka o doo onye ahụ a na-ezi ihe anya na, ọ bụghị nanị na a pụrụ ịgbaso ụzọ ndụ dị otú ahụ, kama na ọ bụ ya bụ nke ka mma, nke ga-ewetara ya onwe ya na ndị nọ ya gburugburu abamuru.

Ọ bụ nanị Chineke nke eluigwe pụrụ inye ọzụzụ dị otú a, n’ihi na olee mmadụ ma ọ bụ òtù dị n’elu ala nke ga-enwe iru eru iji mee nke a? Mmadụ nile bụ ndị na-erughị eru n’ihi eziokwu Bible ahụ bụ: “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.”—Ndị Rom 3:23.

Ọ bụ ihe obi ụtọ na Jehova, bụ́ Chineke nke eluigwe na-enye ọzụzụ dị otú ahụ n’akwụkwọ ọgụgụ ma ọ bụ akwụkwọ ntụziaka ya e dere ede, bụ́ Bible Nsọ. Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst, kwadoro ụdị ọzụzụ nke a n’oge ọ bụ mmadụ nọ n’elu ala. N’etiti Ozizi Elu Ugwu Jisọs ahụ a ma ama, o kwuru okwu banyere ụzọ ndụ nke yiri ihe a na-ahụtụbeghị mbụ nye ihe ka ọtụtụ ná ndị na-ege ya ntị, n’ihi na ọ gụnyekọtara achọghị ọdịmma onwe onye ọbụna n’ebe ndị iro ma ọ bụ ndị na-emegide mmadụ nọ. Jisọs sịrị: “Na-ahụnụ ndị iro unu n’anya, na-ekpekwa ekpere nye ndị na-esogbu unu; ka unu wee bụrụ ụmụ nke Nna unu nke bi n’eluigwe: n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume. N’ihi na ùnu nwere ụgwọ ọrụ gịnị, ma ọ bụrụ na unu hụrụ ndị ahụ n’anya, bụ́ ndị na-ahụ unu n’anya? Ọbụna ndị ọna ụtụ, hà adịghị eme otu ihe ahụ?”—Matiu 5:44-46.

Otu akụkụ nke ozi Jisọs jere n’elu ala bụ ịzụ ndị ozizi ndị na-adịghị achọ ọdịmma onwe ha ka ha onwe ha nweekwa ike inye ndị ọzọ ọzụzụ n’ụzọ ndụ nke a nke anyaukwu na-adịghị. Oge ụfọdụ mgbe ọnwụ na mbilite n’ọnwụ Jisọs gasịrị, Pọl onyeozi ghọrọ otu n’ime ndị ozizi dị otú ahụ. N’ọtụtụ n’ime akwụkwọ ozi ya ndị e dere n’ike mmụọ nsọ, Pọl gbara ume maka mkpochapụ nke inwe anyaukwu. Dị ka ihe atụ, o degaara ndị Efesọs akwụkwọ, sị: “Ma ịkwa iko, na adịghị ọcha nile, ma ọ bụ anyaukwu, ka a ghara ịkpọ ọbụna aha ya n’etiti unu, dị ka o kwesịrị ndị nsọ.”—Ndị Efesọs 5:3.

Otú ahụkwa taa, Ndịàmà Jehova na-ezi ndị ikom na ndị inyom ihe ka ha na-abịanyụ mkpali nile nke inwe anyaukwu. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ndị a na-erukwa eru ịpụ jee kuziere ndị ọzọ ụzọ nsọpụrụ Chineke ndị dị otú a.

Eziokwu Bible Nọ n’Ọrụ

Ma ị pụrụ ịjụ, sị: ‘Mmadụ ndị na-ezughị okè, ndị inwe anyaukwu gbaworo mkpọrọgwụ n’ime ha, hà pụrụ n’ezie iwepụchasị ya site n’ọdịdị mmadụ ha?’ Ee, ha pụrụ ime nke a. O doro anya na ọ bụghị n’ụzọ zuru okè, kama ruo n’ọ́kè nke kwesịri ịrịba ama. Ka anyị tụlee otu ihe atụ banyere nke a.

Otu onye ohi a ma ama bi na Spain. Ụlọ ya jupụtara n’ihe ndị e zuru ezu. O wee malite iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible. N’ihi nke a, akọ na uche ya malitere inye ya nsogbu, o wee kpebie iweghachi ihe ndị ahụ nile o zutere na nke ndị nwe ha. O jekwuuru onye ọ na-arụrụ ọrụ na mbụ wee kwupụta na ya zuuru otu ígwè ọhụrụ e ji asa ákwà. Onye ahụ were ya n’ọrụ, n’ihi mmetụta o nwere maka àgwà ya nke gbanweworo agbanwe, kpebiri na ya agaghị akọrọ ndị uwe ojii, kama kwere nanị ka onye ahụ na-ezubu ohi kwụọ ụgwọ ígwè ahụ na-asa ákwà.

Ọzọ, onye ohi ahụ nke gbanweworonụ kpebisiri ike ije n’ụlọ onye ọ bụla o chetara na ya zunaara ihe wee weghachi ihe ndị ahụ o zutere. Onye ọ bụla o jere na nke ya gosipụtara ihe ijuanya o nwere na n’ihi itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ, o mewo oké mgbanwe dị otú ahụ n’akparamagwa ya.

Ugbu a, otu nnukwute ihe isi ike chere ya ihu. Ọ maghị ndị nwe ọtụtụ n’ime ihe ndị ahụ ka dị n’ụlọ ya. Ya mere, mgbe o kpekusịrị Jehova ekpere, o jere n’isi ụlọ ọrụ ndị uwe ojii wee bunye ha ígwè redio stereo isii ndị o siworo n’ụgbọ ala dị iche iche zuru. Nke a tụrụ ndị uwe ojii n’anya, ebe ọ bụ na ọ dịghị ebubo ọ bụla a na-ebo ya n’ihe ndekọ ha. Ha kpebiri ka ọ kwụọ nhá wee nọọ n’ụlọ mkpọrọ nwa mkpirikpi oge.

Onye a bụbu onye ohi nwere akọ na uche dị ọcha ugbu a, ebe ọ hapụworo ndụ nke imempụ na anyaukwu iji wee sonyere ọgbakọ zuru ụwa ọnụ nke Ndịàmà Jehova.

Ọ dị mfe inye ọtụtụ puku ihe atụ ndị dị otú ahụ. Ọ bụ ezie na ndị meworo mgbanwe ndị dị otú ahụ ná ndụ ha dị nanị ole na ole n’etiti ndị bi n’ụwa, eziokwu ahụ nke bụ na ọtụtụ ndị emewo otú ahụ na-egosipụta ike dị mma nke na-abịa site n’ịmara na itinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ.

Ka afọ nke ọ bụla na-agabiga, ọtụtụ ndị ọzọ na-anakwere ụzọ ndụ nke a. A na-enye ọzụzụ Bible n’ihe karịrị 60,000 ọgbakọ Ndịàmà Jehova gburugburu ụwa. Ndịàmà ahụ adịghị atụ anya ịgbanwe ụwa dum n’oge a, na-ewepụ anyaukwu site n’etiti ọtụtụ puku nde ndị dị ndụ ugbu a. Ma, amụma Bible na-egosi na n’oge na-adịghị anya ugbu a, ụzọ ndụ nke anyaukwu na-adịghị na ya ga-ejupụta n’elu ụwa dum!

Ụwa Ọhụrụ nke Anyaukwu Na-adịghị

A gaghị enwe ohere ọ bụla maka anyaukwu na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị n’ime ụwa ọhụru nke na-abịanụ. Pita onyeozi mesiri anyị obi ike na ezi omume ga-abụ ihe e ji mara ma “eluigwe ọhụrụ” ma “ụwa ọhụrụ” ahụ. (2 Pita 3:13) Anyaukwu ga-eso n’ime “ihe mbụ nile” ndị ahụ gabigaworonụ, gụnyere ọrịa, iru újú, na ọbụna ọnwụ.—Mkpughe 21:4.

Ya mere, ọ bụrụ na anyaukwu na ụzọ ịchọ ọdịmma onwe onye na-amụbawanye amụbawanye nke anyị na-ahụ gburugburu anyị taa na-enye gị nsogbu, nwee nkasi obi! Malite ugbu a ịdị ndụ maka ụwa ọhụrụ ahụ nke na-abịanụ, bụ nke ga-abịarute n’oge na-adịghị anya. Site n’enyemaka Chineke, gbasie mbọ ike iwepụ anyaukwu site ná ndụ nke onwe gị. Sonye n’inyere ndị ọzọ aka ịhụ uru nile a pụrụ irite ugbu a site n’ịdị ndụ ndị Kraịst. Tinye okwukwe na ntụkwasị obi gị ná nkwa Jehova Chineke nke bụ na n’oge na-adịghị anya, anyaukwu ga-eso n’ajọ ihe ndị ahụ ‘a na-agaghị echetakwa, ndị na-agaghị abatakwa n’obi anyị.’—Aịsaịa 65:17.

[Foto dị na peeji nke 5]

Jisọs kwuru okwu banyere ụzọ ndụ nke na-akwalite achọghị ọdịmma onwe onye nanị, ọ bụghị anyaukwu

[Foto dị na peeji nke 7]

N’isi nso—ụwa nke anyaukwu na-adịghị

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya