Ịlanarị n’Ime Ụwa nke Anyaukwu
“OLEE otú m pụrụ isi lanarị?” James Scott chere ajụjụ ahụ ihu mgbe o furu n’enweghị olileanya n’Ugwu Himalaya. Ọ nọ nnọọ n’ihe ize ndụ nke ịgbasi ma ọ bụ ịbụ onye agụụ gụgburu. O chetara ịhụ ndị mmadụ na-asọ mpi iji aka na ụkwụ na-alụ ọgụ ka “ike ji nwayọọ nwayọọ na-agwụ ha, aka ọ bụla a kụrụ na-amịkọrọ ume ndụ ha, ruo mgbe . . . ha ghọrọ ndị na-enweghị nchebe ma ọlị.” Ọ sịrị: “Nke ahụ bụ otú ọ dị m mgbe m sechiri akpa m ji ehi ụra ma jiri ike ọgwụgwụ rachaa snow. E gwepịawo mmụọ m, ọchịchọ nile nke ịdị ndụ apụwokwa n’ime m. Ọ dịbeghị mgbe ọ dị m ka e meriwo m otú ahụ.”—Lost in the Himalayas.
N’otu echiche, ọtụtụ ndị taa dị ka ya—ndị ọnyà ji n’ụwa nke anyaukwu na-achị. Ị pụrụ iche na e ji nwayọọ nwayọọ na-anapụ gị ike ma na-emeri gị. Mmadụ ole na ole nwere ike ịgbanahụ mmetụta anyaukwu na-enwe ozugbo ahụ. Na-adabere n’ebe i bi n’ụwa, nsogbu ndị ị na-eche ihu ga-adịgasị iche nke ukwuu—anyaukwu na-emetụta ndị mmadụ ná mba ndị ka na-emepe emepe n’ụzọ dị nnọọ iche n’otú o si emetụta ndị nọ ná mba ndị bara ọgaranya. Ka o sina dị, n’agbanyeghị ihe ndị bụ ihe isi ike, ikekwe ị pụrụ ịmụta otú e si alanarị n’enweghị oké mmetụta n’anụ ahụ, mmetụta uche, na n’ime mmụọ ruo mgbe nnapụta bịara. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịgbaso ndụmọdụ ndị bụ isi ndị ọkachamara nyere.
Isi ihe abụọ pụtara ìhè na ndụmọdụ ha. Nke mbụ bụ izere ime ka ọnọdụ dịworị njọ ka njọ. “Atụmatụ gị,” ka akwụkwọ bụ́ The Urban Survival Handbook na-ekwu, “aghaghị ịbụ izere ihe ize ndụ na-enweghị isi . . . ma belata mbibi ihe nke ndị ahụ ị na-enweghị ike izere na-akpata.” Nke abụọ—eleghịkwa anya nke kasị mkpa—na-emetụta àgwà. “Nlanarị,” ka akwụkwọ bụ́ The SAS Survival Handbook na-ekwu, “na-adabere n’echiche uche karịa ka ọ na-adabere ná ntachi obi anụ ahụ na ihe ọmụma.”
Mee Ihe Ị Pụrụ Ime n’Okpuru Ọnọdụ Ndị Dịnụ
“A na-egbu mmadụ na United States n’ime minit 22 ọ bụla, a na-apụnara mmadụ ihe n’ime sekọnd 47 ọ bụla, na-emerụkwa mmadụ ahụ n’ime sekọnd 28 ọ bụla,” ka akwụkwọ bụ́ Staying Alive—Your Crime Prevention Guide na-akọ. N’ọnọdụ ndị dị ka nke ahụ, gịnị ka ị pụrụ ime? Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ị pụrụ ịgbalị izere ime onwe gị onye o doro anya na a na-elekwasị anya ma ọ bụ onye dị mfe ịnwụde. Mụrụ anya ma dị akọ. Mee ihe ị pụrụ ime iji belata ihe ize ndụ.a
Dị ka ihe atụ, emela ka ọnọdụ gị ka njọ site n’ịbụ onye dị mfe nghọgbu. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The New York Times na-akọ na 18 pasent nke ndị America kwetara ịbụ ndị a ghọgburu—ghọrịa ha ọtụtụ puku dollar site n’aka ndị na-enweghị ụkpụrụ na-achụ nta ndị dị mfe nnweta. Ndị a na-erigbukarị bụ ndị agadi dị ka nwanyị di ya nwụrụ dị afọ 68, bụ́ onye e zunaara $40,000. Ahụmahụ ya kpalitere isi akụkọ a: “Ọ Bụrụ na Isi Chara Awọ́, Ndị Akpa Aghụghọ Na-ahụ Àgwà Akwụkwọ Ndụ [nke pụtara akwụkwọ ego, ma ọ bụ dollar].”
Ma ọ dịghị mkpa na ị ga-abụ nnọọ onye ọzọ na-amaghị nke a na-akọ, na-enweghị enyemaka, nọ na-echere ka e rigbuo ya. Akwụkwọ bụ́ Staying Alive na-adọ anyị aka ná ntị, sị: “Kpachara anya maka agụ nke yi ihe oyiyi nke atụrụ.” Otu nne nne dị afọ 70 naara ndụmọdụ a. E nyere ya ngụkọta inshọransị zuru ezu maka ego nlekọta ahụ ike, n’ọnụ ego bụ nanị $10 kwa ọnwa. “Nanị ihe nne nne ga-eme,” ka akụkọ ahụ na-ekwu, “bụ ibu ụzọ nye onye ahịa ahụ $2,500.” O nyeghị ya. Site n’ịkpọ ụlọ ọrụ inshọransị ahụ na fon, ọ chọpụtara na nwoke ahụ bụ onye wayo. “Ka ọ na-agbanyere onye ahịa ahụ tii n’iko nke ugboro abụọ, ndị uwe ojii rutere ma kpọrọ ya pụọ.”
Ime ike gị iji chebe onwe gị bụ nghọta dị na ndụmọdụ ahụ e nyere na Bible. “Onye na-enweghị uche na-ekwere okwu nile ọ bụla: ma onye nwere ezi uche na-aghọta ijeụkwụ ya.” (Ilu 14:15; 27:12) Ọtụtụ ndị na-eleghara Bible anya dị ka ihe oge ya gaworo nke na-abaghị uru. Ma ezi ndụmọdụ ya pụrụ inyere gị aka ịlanarị. Eze Solomọn nwere amamihe dere, sị: “Amamihe [dị ka nke dị n’ime Bible] bụ ndò, ego bụkwa ndò: ma ọkaaka nke ihe ọmụma bụ, na amamihe na-eme ka onye nwe ya dị ndụ.”—Eklisiastis 7:12.
Ọtụtụ ndị na-agụ Teta! achọpụtawo na nke a bụ eziokwu. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ enwetawo ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe site n’iti mkpu n’olu dara ụda mgbe e yiri ha egwu ndina n’ike ma ọ bụ ihe ike ndị ọzọ, n’ikwekọ n’ihe e kwuru na Deuterọnọmi 22:23, 24. Ndị ọzọ agbasowo ndụmọdụ Bible izere ihe ọ bụla “nke na-emetọ ahụ ma ọ bụ mmụọ.” (2 Ndị Kọrint 7:1, The Twentieth Century New Testament) Ha esiwo otú a chebe onwe ha pụọ n’aka ndị na-agba mgbere ụtaba na ọgwụ ọjọọ, ndị na-eme onwe ha ọgaranya ebe ọnọdụ ahụ ike ndị mmadụ na-ahụsi anya. Ọtụtụ ndị na-agụ ya ezerewo ọnyà nke ndị okwuchukwu TV na-achụ nta ego na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ike na-agụ agụụ. (Lee igbe, peji nke 7.) Gụọ Bible. Ọ̀tụ̀tụ̀ enyemaka bara uru ọ na-enye pụrụ iju gị anya.
Zere Ịbụ Onye Anyaukwu Metọrọ
Otú ọ dị, e nwere ihe ize ndụ ọzọ na-esite n’anyaukwu—gị onwe gị pụrụ ịdị anyaukwu. Nke a ga-anapụ gị àgwà ụkpụrụ omume ndị ka mma nke mere ka ị dị iche n’ebe anụ ọhịa nọ. N’ịkọwa azụmahịa onye ọ bụla zọwa isi onwe ya ebe ndị ọchụ nta ego nọ na-amaburu ihe ọ bụla ha nwere ike inweta, e hotara otu onye hụrụ ihe merenụ dị ka onye kwuru, sị: “Nnukwu ezì ndị ahụ na-eriju afọ n’ezie. Ọ̀tụ̀tụ̀ anyaukwu . . . ekwekwaghị nnọọ nchịkwa.” O yikarịrị ka nke ahụ bụ mkparị nye ezì karịa ka ọ bụ nye ndị azụmahịa na-eji ohere ọ bụla dịnụ erigbu ndị mmadụ! O yiri nnọọ ka ha na-eleghara ezi ndụmọdụ ahụ Jisọs Kraịst nyere anya: “Lezienụ anya, debekwanụ onwe unu ka unu ghara inwe anyaukwu ọ bụla.”—Luk 12:15.
Jisọs Kraịst nyere ndụmọdụ ahụ n’ihi na ọ maara ókè ị pụrụ imebiru onwe gị ma ọ bụrụ na anyaukwu ejide gị. Oké ọchịchọ ihe onwunwe—nakwa, n’ezie, oké ọchịchọ maka ike ma ọ bụ mmekọahụ—pụrụ ịghọ oké mkpali na-eripịa eripịa ná ndụ gị, na-anapụ gị oge ma ọ bụ ọnọdụ uche ọ bụla ị pụrụ inwe iji lebara ndị mmadụ ma ọ bụ abamuru ime mmụọ anya. ‘Ego,’ ka Anthony Sampson na-ekwu n’akwụkwọ ya bụ́ The Midas Touch, ‘ewegharawo ọtụtụ ihe e ji mara okpukpe.’ N’ụzọ dị aṅaa? Ego na-aghọ chi. A na-achụ ihe ọ bụla ọzọ n’àjà n’elu ebe ịchụàjà nke anyaukwu na uru. Isi ihe pụtara ìhè bụ uru. Ịka mma ya dabeere n’ibu ya. Otú ọ dị, n’ikwu eziokwu, n’agbanyeghị ókè oge i nyere ya hà, a gaghị emeju anyaukwu maka ihe onwunwe ma ọlị. Eklisiastis 5:10 na-ekwu, sị: “Onye na-ahụ ego n’anya, ego agaghị eju ya afọ; ọzọ, onye na-ahụ inwe ihe bara ụba n’anya, ihe omume agaghị eju ya afọ.” N’otu aka ahụ, “onye na-ahụ” ike, ihe onwunwe, ma ọ bụ mmekọahụ “n’anya” agaghị enwe afọ ojuju mgbe ọ bụla, n’agbanyeghị ókè ọ na-enweta.
Atụfula Ma Ọlị Olileanya nke Nnapụta
Otu isi ihe dị mkpa ná nlanarị bụ ịnọgide na-enwe ezi echiche nke nwere olileanya. Mgbe ụfọdụ e nwechaghị ihe ị pụrụ ime iji gbanahụ mmetụta nke ndị anyaukwu. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ mgbe, ndị agụụ ji enwechaghị ihe ha pụrụ ime iji gbanahụ ọnọdụ ọjọọ ha nọ na ya mgbe ahụ. Ma, adala mbà; achịlila aka elu. “Ọ dị mfe ịgbahapụ onwe gị aka, ịkụ afọ n’ala ma bụrụ onye ọmịiko onwe onye rikpuru” mgbe e kpughepụrụ gị nye ọnọdụ ọjọọ ma ọ bụ nke dị ize ndụ, ka akwụkwọ bụ́ The SAS Survival Handbook na-ekwu. Adabala n’echiche na mmetụta uche na-ezighị ezi. Ókè ị pụrụ inweru ndidi pụrụ iju gị anya. “Ndị ikom na ndị inyom egosiwo na ha pụrụ ịlanarị n’ọnọdụ ndị kasị njọ,” ka otu akwụkwọ ahụ na-ekwu. Olee otú ha si mee ya? Ọ na-ekwu na ha lanarịrị “n’ihi mkpebi siri ike ha mere ime otú ahụ.” Kpebisie ike ịghara ịbụ onye usoro ihe nke a dị anyaukwu meriri.
E mesịrị napụta James Scott, onye a kpọrọ aha ná mmalite, site n’ihe gaara abụ ili ya na Himalaya. Ọ sịrị na mgbalị ya ịlanarị akụziworo ya, ma ọ dịghị ihe ọzọ, otu ihe mmụta dị mkpa. Gịnị ka ọ bụ? “E nweghị ihe ịma aka siri ike ná ndụ nke na a pụghị iche ya ihu,” ka o kwuru. Tim Macartney-Snape, bụ́ ọrị ugwu nwere ahụmahụ, onye o juru anya na James Scott nwere ike ịlanarị ruo ogologo oge nke na a hụrụ ya ná ndụ, mụtara ihe n’otu aka ahụ. Ọ sịrị: “Ọ bụrụhaala na e nwetụrụ olileanya, adala mbà ma ọlị.” Ya mere, n’agbanyeghị otú ihe si yie ka ha gbara ọchịchịrị, ị na-eme nanị ka ihe ka njọ ma ọ bụrụ na i nwekwaghị olileanya. Atụfula ma ọlị olileanya nke nnapụta.
Ma è “nwetụrụ olileanya,” ohere ọ bụla bụ ezie nke nnapụta site n’ụwa nke anyaukwu jupụtara? Ọ̀ dị mgbe ọ bụla a ga-ewepụrụ anyị ndị anyaukwu na-ebibisị mbara ụwa a ma na-ebibi ndụ nke ọtụtụ ijeri mmadụ? N’ezie, e nwere atụmanya e ji n’aka nke nnapụta. Tụlee azịza Bible n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee isiokwu bụ́ “Ime Ihe Ike—Ị Pụrụ Ichebe Onwe Gị,” ná mbipụta Teta! nke April 22, 1989 (Bekee), peji nke 7-10.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Ịdọ Aka ná Ntị Bible Ndị Bịara n’Oge Ha
Ilu 20:23 “Ihe arụ n’anya Jehova ka ụzọ nkume isì ihe abụọ bụ; ihe osìsì aghụghọ adịghịkwa mma.”
Jeremaịa 5:26, 28 “A hụwo ndị na-emebi iwu n’etiti ndị m: ha na-ele anya gburugburu, dị ka ndị osi ọnyà si eche anwụ; ha esiwo ọnyà, ọ bụ mmadụ ka ha na-anwụde. Ha amawo abụba, ahụ ha egbuwo àmụ̀mà: ee, ha emebigawo ihe ọjọọ ókè: ha ekpeghị ọnụ, bụ ọnụ nke nwa mgbei, ka o wee gaara ha nke ọma; ọ bụkwa ikpe nke ndị ogbenye ka ha na-adịghị ekpe.”
Ndị Efesọs 4:17-19 “Ya mere nke a ka m na-ekwu, kwusiekwa ike n’ime Onyenwe anyị, ka unu ghara ijegharị ọzọ dị ka ndị mba ọzọ na-ejegharịkwa, n’ihe efu nke uche ha, n’ihi na e mewo ka ha gbaa ọchịchịrị n’echiche uche ha, e meekwa ka ha bụrụ ndị ala ọzọ n’ebe ndụ nke Chineke dị n’ihi amaghị ihe dị n’ime ha, n’ihi na a na-eme ka obi ha mee etili; mmadụ ndị, ebe mmehie ha na-adịghị ewute ha ọzọ, ha raara onwe ha nye n’aka agụụ ịkwa iko, ịrụpụta adịghị ọcha nile n’ime anyaukwu.”
Ndị Kọlọsi 3:5 “Ya mere, meenụ ka ihe nile dị unu n’ahụ nke dị n’elu ụwa nwụọ; ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ, na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị.”
2 Timoti 3:1-5 “Ma mara nke a, na oge dị oké egwu ga-abịa na mgbe ikpeazụ. N’ihi na mmadụ ga-abụ ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya, ndị na-arara mmadụ nye n’aka ndị iro ha, ndị isi ike, ndị a fụliworo elu, ndị na-ahụ ihe ụtọ n’anya kama ịhụ Chineke n’anya; ndị na-enwe ụdị nke nsọpụrụ Chineke, ma ha agọwo ike ya: gị gbakụtakwa ndị a azụ.”
2 Pita 2:3 “N’ime anyaukwu ka ha ga-ejikwa okwu nrafu dị iche iche were unu zụọ ahịa: ndị ọmụma ikpe ha na-abụghị ihe na-adịghị arụ ọrụ site n’oge ochie, ịla n’iyi ha adịghị erukwa ụra.”