Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 1/8 p. 22
  • Imeso Ndị Inyom Ihe ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Imeso Ndị Inyom Ihe ike
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Imeso Ụmụ Nwaanyị Ihe Ike Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2008
  • Olee Otú Chineke Si Ele Ime Ihe Ike Anya?
    Teta!—2002
  • Tigbuo Zọgbuo Ọ̀ Ga-ala Ala n’Ụwa A?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2016
  • Ịkpa Ókè Megide Ndị Inyom
    Teta!—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 1/8 p. 22

Imeso Ndị Inyom Ihe ike

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NIGERIA

SITE n’akpa nwa ruo n’ili, a na-emeso ndị inyom ihe ike, dị ka akwụkwọ òtù Mba Ndị Dị n’Otu bụ́ Human Development Report 1995 si kwuo. Ihe ọmụmụ sitere gburugburu ụwa na-ekpughe ihe ndị na-esonụ:

Tupu ọmụmụ. Ná mba ụfọdụ a na-eme nnyocha iji mata ma nwa e bu n’afọ ọ̀ bụ nwoke ka ọ bụ nwanyị. A na-esikwopụkarị ndị nwanyị.

N’oge a dị na nwata. Na Barbados, Canada, Netherlands, New Zealand, Norway, na United States, 1 n’ime ndị inyom 3 na-akọ na e metọrọ ha n’ụzọ mmekọahụ n’oge ha dị na nwata ma ọ bụ n’oge uto. N’Esia na ebe ndị ọzọ, a na-amanye ihe dị ka otu nde ụmụaka—karịsịa ụmụ agbọghọ—n’ịgba akwụna kwa afọ. A na-ebi ọtụtụ nde ụmụ agbọghọ úgwù n’ụwa nile.

Ná ntoru ogo mmadụ. Na Chile, Mexico, Papua New Guinea, na Republic of Korea, a na-emeso 2 n’ime ndị inyom 3 lụrụ di ihe ike n’ebe obibi. Na Canada, New Zealand, United Kingdom, na United States, e dinawo 1 n’ime ndị inyom 6 n’ike.

Ka oge na-aga ná ndụ. Ihe karịrị ọkara nke ndị inyom e gburu na Bangladesh, Brazil, Kenya, Papua New Guinea, na Thailand, bụ ndị ndị òtù ha na mbụ ma ọ bụ ugbu a gburu. N’Africa, Ndịda America, ọtụtụ àgwàetiti Pacific, na United States, ime ihe ike alụmdi na nwunye bụ ihe kasị akpata ndị inyom igbu onwe ha.

Imeso ndị inyom ihe ike bụ nnọọ ihe atụ nke ihe Bible na-akpọ “mgbe ikpeazụ,” n’oge ọtụtụ ndị ga-abụ ndị “na-akpọ iyi,” “obi kpọrọ nkụ,” na ndị “dị ka anụ ọhịa.” (2 Timoti 3:1-5, New American Bible) Anyị pụrụ inwe ekele n’ihi na Jehova Chineke kwere nkwa na mgbe “mgbe ikpeazụ” nke nsogbu ndị a gasịrị, ọ ga-eguzobe ụwa ọhụrụ dị n’udo ebe ndị bi n’ụwa “ga-ebi ná ntụkwasị obi, ọ dịghịkwa onye ga na-eme ka ha maa jijiji.” (Ezikiel 34:28; 2 Pita 3:13) N’okpuru Alaeze Chineke, Jisọs Kraịst “ga-anapụta ogbenye mgbe ọ na-etiku ya; ọ ga-anapụtakwa onye e wedara n’ala mgbe ọ dịghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.”—Abụ Ọma 72:12, 14.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya