Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 1/8 p. 8-21
  • Ị̀ Maara?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Maara?
  • Teta!—1997
Teta!—1997
g97 1/8 p. 8-21

Ị̀ Maara?

(A pụrụ ịchọta azịza nye ajụjụ ndị a n’ebe ndị e zoro aka na Bible, e bipụtakwara ndepụta zuru ezu nke azịza ha na peji nke 8. Maka ihe ọmụma ka ukwuu, tụlee akwụkwọ bụ́ “Insight on the Scriptures,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.)

1. Site n’ụzọ dị aṅaa ka Chineke ji kee eluigwe na ala a na-ahụ anya? (Jenesis 1:2)

2. Site n’ihe ndị na-enye ìhè dị na mbara eluigwe, maka gịnị ka Jehova nyere ihe ndabere ya? (Lee Jenesis 1:14.)

3. Gịnị ka ndị ohu Senakerib bu n’uche ịrụzu site n’iji oké olu gwa ndị Juu nọ ná mgbidi Jerusalem okwu na n’asụsụ ndị Juu? (2 Ihe Emere 32:18)

4. Olee ngwá ọrụ ugbo nke e ji mee ihe n’oge ochie iji bọchaa uke n’ala? (Aịsaịa 7:25)

5. Gịnị bụ aha e nyere akpa nsọ ahụ a kpara akpa, nke nwere Ìhè ahụ na Izu Okè ahụ, bụ́ nke onye isi nchụàjà na-eyi n’obi ya mgbe ọ bara n’Ebe Nsọ? (Ọpụpụ 28:​29, 30)

6. Dị ka iwu Chineke si dị, gịnị bụ ọnụ ọgụgụ ndị àmà kasị ala a chọrọ iji mesie okwu ike? (Ndị Hibru 10:28)

7. Gịnị bụ aha onye agha Israel ahụ gburu Lahmi, nwanne Gọlaịt? (1 Ihe Emere 20:5)

8. Ònye bụ onye isi nchụàjà ahụ gburu Eze Nwanyị Atalaịa? (2 Ndị Eze 11:​15, 16)

9. Gịnị ka Bible kwuru na mmadụ pụrụ ime “ihu” Jehova mgbe ọ na-arịọ ka e mere ya ebere? (Ọpụpụ 32:11)

10. Olee nwa Jekọb nke nwere aha pụtara “Ihe Ndabara Ọma,” n’ịdabere ná mkpu Lia tiri mgbe a mụrụ ya? (Jenesis 30:11, NW )

11. Gịnị bụ aha nkume ahụ a ma ama nke Solomọn wuru ụlọ nsọ Jehova n’elu ya? (2 Ihe Emere 3:1)

12. Gịnị ka utu aha Jisọs bụ́ “Kraịst” pụtara? (Ọrụ 4:26)

13. Gịnị ka Jisọs sịrị na a ghaghị ime ‘iji si n’ọnụ ụzọ dị warara baa’? (Luk 13:24)

14. Olee aha e nyere ihe ikpeazụ Chineke kere n’elu ụwa dị ka a kọrọ akụkọ ya na Bible? (Jenesis 3:20)

15. Ná mmalite, ntụle dị aṅaa nke obi ihe a kpọrọ mmadụ ka Chineke mere? (Jenesis 8:21)

16. Ada eze ndị Midian ole nke ka Fineas tigburu, nke wetara ihe otiti Chineke tiri Israel ná njedebe? (Ọnụ Ọgụgụ 25:15)

17. Site n’iji gịnị mee ihe ka nwunye Devid bụ Maịkal ji ghọgbuo ndị ozi Sọl zigara igbu Devid? (1 Samuel 19:​11-⁠16)

18. N’elu gịnị ka mmụọ ozi nke asaa wụsara ọkwá ya nke iwe Chineke? (Mkpughe 16:17)

19. Olee aha e ji mee ihe n’ime Bible iji kọwaa ndị na-esiteghị n’usoro ọmụmụ ụmụ Israel? (Ezra 10:2)

20. Olee onye sitere n’usoro ọmụmụ Juda, n’enweghị ụmụ ndị ikom, nke nyere ohu ya bụ́ Jaha nwa ya nwanyị iji nọgide na-enwe ndị sitere n’usoro ọmụmụ ya? (1 Ihe Emere 2:​34, 35)

21. Ka a na-ebuga igbe ọgbụgba ndụ ahụ, gịnị kpaliri Ụza ijide ya aka? (1 Ihe Emere 13:​9, 10)

22. Gịnị bụ nanị ihe ndekọ Bible nke na-ekwu nanị banyere ọrụ e nyere onye amụma ịkpọsa ozi ikpe nye obodo na-abụghị nke ụmụ Israel?

23. Gịnị ka Chineke na-apụghị ime? (Ndị Hibru 6:18)

24. Mgbe Jehova nyere ngọzi, gịnị ka ọ na-adịghị atụkwasị na ya? (Ilu 10:22)

25. Gịnị bụ ihe ndị Devid weere n’akụkụ isi Sọl mgbe Sọl na-ehi ụra, iji gosi na ya agaghị emerụ ya ahụ? (1 Samuel 26:12)

26. Gịnị ka Jisọs mere iji zere ịbụ onye a tụrụ nkume? (Jọn 8:59)

[Igbe dị na peeji nke 8]

Azịza Nye Ajụjụ

1. Ike ọrụ ya

2. Kalenda

3. Ime ka ha tụọ ụjọ na inye ha nsogbu

4. Ọgụ̀

5. Ihe mgbochi obi

6. Abụọ

7. Elhanan

8. Jehọịada

9. Ime ka ọ dajụọ

10. Gad

11. Ugwu Moraịa

12. Onye E Tere Mmanụ

13. “Jisienụ ike”

14. Iv

15. “Dị njọ site na nwata”

16. Zua

17. Terafim na ákwà e ji ajị́ ewu mee

18. N’elu mbara eluigwe

19. Ala ọzọ

20. Sheshan

21. Ehi na-agba ụkwụ

22. Akwụkwọ Jona

23. Ịgha ụgha

24. Ihe mgbu

25. Ube na ite mmiri

26. O zobere onwe ya

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya