Kichin Pụrụ Ịbụ Ebe Obi Ụtọ
“SI NA kichin pụọ!” Ọtụtụ ụmụaka agụụ ji anarawo ịdọ aka ná ntị ahụ mgbe ha na-agbalị ibu ụzọ detụ nri abalị ire. Ma, kama ịchụpụ ha, ndị mụrụ ụmụ nwere ezi ihe mere ha ga-eji gwa ụmụ ha ka ha bata n’ime kichin. Ọ bụ n’ihi gịnị? N’ihi na kichin bụ, n’ezie, ọnụ ụlọ klas na-adọrọ mmasị.
Kichin bụ ebe ụmụaka pụrụ ịzụlite ikike imepụta ihe na nkà idozi nsogbu, ebe ha pụrụ ịmụta ijere ndị ọzọ ozi ma rụọ ọrụ dị ka akụkụ nke otu ìgwè, ebe mkparịta ụka bara uru na-emetụ n’obi pụrụ ibilitere onwe ya, ebe a pụrụ iji nwayọọ nwayọọ kụnyemie ụkpụrụ omume ndị e ji kpọrọ ihe nke ukwuu. Ee, e nwere ihe mmụta bara uru dị n’igbe nri na drọwa na n’elu shelf ndị ihe jupụtara n’ime kichin ọ bụla—dị njikere ka e tinye ha n’ọrụ mgbe a na-akwadebe ihe oriri na-esochi.
N’ọgbọ a nke nkà na ụzụ na ihe ọmụma, gịnị mere a ga-eji jiri kichin mere ebe a na-enye ụmụaka ọzụzụ? Azịza ya bụ oge. Ọtụtụ ndị mụrụ ụmụ na-amata na e nweghị nnọọ ihe nnọchianya maka iji oge na-anọnyere ụmụ ha—oge dị ukwuu!a Nsogbu bụ ebe a ga-achọta ya. Ụfọdụ ndị ọkachamara na-agba ndị mụrụ ụmụ ume iwere ọrụ ha na-arụ mgbe mgbe na gburugburu ụlọ dị ka ohere iji soro ụmụ ha emekọ ihe na ịkụziri ha ihe. Nke a kwekọrọ n’iwu Chineke nyere ndị mụrụ ụmụ ná mba Israel oge ochie: “Okwu ndị a, nke mụ onwe m na-enye gị n’iwu taa, ga-adịkwasịkwa n’obi gị: ị ga-ejisikwa ike izi ha ụmụ gị, ị ga-ekwukwa okwu banyere ha mgbe ị na-anọdụ n’ụlọ gị, na mgbe ị na-eje ije n’ụzọ, na mgbe ị na-edina ala, na mgbe ị na-ebili ọtọ.”—Deuterọnọmi 6:6, 7.
N’ihi na anyị aghaghị itinye oge na kichin mgbe nile, ọ ga-eyi ka ọ bụ nnọọ ebe ihe omume ezinụlọ nwekọrọ ọnụ. N’adịghịkwa ka oge mkpapụ ndị pụrụ iche, nke na-aghaghị ichere ọtụtụ mgbe ruo mgbe anyị nwere ohere, ikike, ma ọ bụ ego ya tupu a kwadoo ha, ezigbo agụụ na-ajụ ichere ruo mgbe ọzọ. E wezụga nke ahụ, kichin nwere ikike ndọrọ e bu pụta ụwa n’ebe ụmụaka nọ. E kwuwerị, olee ebe ọzọ a na-akụziri ha iji nlezianya jiri mma na arịa ndị ọzọ na-eme ihe? Ụmụaka na-enwe obi ụtọ pụrụ ọbụna isi otu ihe oriri site n’oge ruo n’oge! Otú ọ dị, ihe mmụta dị aṅaa ka kichin nwere inye?
Ịmụta Ihe ‘n’Ọnụ Ụlọ Klas’ nke Kichin
Louise Smith—nke ụmụ akwụkwọ ya dị afọ anọ maara dị ka Nwaada Gingerbread—kwupụtara echiche a nke dabeere n’ahụmahụ afọ 17 o nwere n’ịkụziri ụmụaka otú e si esi nri: “Nri bụ oké ngwá ọrụ nkụzi n’ihi na ọ bụ ihe ụmụaka nile na-aghọta. Ikike ha nke ịnụ ísìsì, ụtọ, na mbitụ aka na-arụ ọrụ nke ukwuu n’afọ ndị ha bụ ụmụaka nke na ha na-emikpu onwe ha n’ime ya kpam kpam. Ị pụkwara ịkụzi nkà mmụta ụda, mgbakọ na mwepụ, na nkà idozi nsogbu site ná nri.” Ịwụnye ihe, ịsụ ihe, ịbacha ihe, ịyọcha ihe, ịkpagharị ihe, na ịfụkọta ihe na-enyere ụmụaka aka ịzụlite nkà iji ike ọkpụkpụ aka eme ihe na njikọ anya na aka nwere. Ịhọpụtasị ihe (na-edebe mkpụrụ vine a mịrị amị na akị n’ikpo dịgasị iche iche) na ịhazi ihe n’usoro kwesịrị ha (ịchịkọta iko e ji atụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ n’usoro) na-akụzi echiche na-eje ozi dị ka ntọala maka ịmụ mgbakọ na mwepụ. Ịgbaso usoro isi nri bụ nnwale n’iji ọnụ ọgụgụ, ihe ọ̀tụ̀tụ̀, idebe oge, ezi izu, na asụsụ eme ihe. Mmadụ apụghịkwa ịnwa ịbanye n’ụwa dị mgbagwoju anya ma jupụta n’ihe ize ndụ nke kichin n’amụtaghị ihe banyere nchebe, ibu ọrụ, nhazi onwe onye, na ịrụkọ ọrụ ọnụ.
Ihe a na-agaghị eleghara anya bụ abamuru nke ịmụta isi nri. Ọ dịghị esiri ụmụaka malitere site n’inye aka na kichin ike inwe ike ịkwadebe ihe oriri nanị ha ka ha na-erule n’afọ iri na ụma ha. Olee nne na nna ji ọrụ n’aka nke ahụ na-agaghị amasị site n’oge ruo n’oge? Ọzọkwa, isi nri na-enyere ndị ntorobịa aka ịzụlite obi ike na afọ ojuju onwe onye—àgwà ndị pụrụ ịbara ha uru mgbe ha mesịrị buru ibu ọrụ nke ndị meworo okenye, ma hà lụrụ di ma ọ bụ nwunye ma hà nọ n’alụghị.—Tụlee 1 Timoti 6:6.
Lee, bụ́ onye na-alụghị nwunye ruo ná mmalite afọ ndị 30 ya, na-echeta, sị: “Nne m malitere inye m ọzụzụ n’usoro ndị bụ isi na kichin mgbe m dị ihe dị ka afọ isii. Na mbụ, enwere m mmasị karịsịa n’ime achịcha, keki, na ihe nracha ndị ọzọ. Ma ka m na-erule afọ itoolu, enwere m ike ime atụmatụ ma kwadebe ihe oriri maka ezinụlọ anyị, emekwara m ya mgbe mgbe. E mesịa, dị ka onye meworo okenye na-alụbeghị nwunye, achọpụtara m na ịmara otú e si arụ ọrụ dị iche iche n’ezinụlọ, gụnyere isi nri, mere ka ndụ dị mfe karị. Aga m ekwukwa kpọmkwem na nke a atụnyewo ụtụ n’alụmdi na nwunye na-aga nke ọma m na-anụ ụtọ ya ugbu a.”
Isi Nri Na-enye Obi Ụtọ!
Olee otú nne ma ọ bụ nna pụrụ isi nwee ohere iji nye ụmụaka ọzụzụ na kichin? Otu nne na-atụ aro ịhazi oge mgbe e nwere ihe ndọpụ uche ole na ole dị ka o kwere mee. Ọ bụrụ na i nwere ọtụtụ ụmụ, ị pụrụ ịchọ isoro otu nwatakịrị rụọ ọrụ n’otu oge mgbe ha ka na-amalite amalite. Iji mee nke a, họrọ oge mgbe ụmụaka ndị ọzọ na-arahụ ụra ma ọ bụ nọrọ n’ụlọ akwụkwọ. Mee ndokwa itinye oge karịa otú ị ga-etinye ma a sị na ị na-esi nri nanị gị. Meekwa ndokwa inwe obi ụtọ na kichin!
Maka oge isi nri nke mbụ unu, ị pụrụ ịhapụ nwa gị ka ọ họrọ ihe na-amasị ya iri. Chọọ usoro dị mfe nke na-arụpụta ihe ngwa ngwa. Jide n’aka na ọ na-agụnye ọrụ ndị ọ ga-enwe ike ịrụzu nke ọma. Iji mee ka nwa gị ghara inwe ahụ erughị ala na ike ọgwụgwụ, mee ka ọ chọta ihe ụfọdụ e ji esi nri na arịa ndị dị mkpa tupu oge eruo. Ị pụrụ ọbụna ịkwadebetụ ụfọdụ ihe e ji esi nri tupu oge eruo ka oge isi nri ahụ ghara ịdị oké ogologo ma na-agwụ ike.
Soro nwa gị tụleghachi usoro ahụ, na-egosi ya otú e si arụzu ọrụ nke ọ bụla. Nye nwa gị ohere nke ya na kichin—ikekwe otu drọwa e tinyere efere na arịa ole na ole—nyekwa ya otu ákwà apron. Kama ime ka nwa okoro yiri ákwà apron ndị inyom, ị pụrụ inwetara ya otu e mere maka nwoke bụ osi ite. Site nnọọ ná mmalite, mesie ike mkpa nchebe dị, setịpụkwa ụkpụrụ nduzi ndị ezi uche dị na ha maka kichin.—Lee igbe a kpọrọ “Ihe Mmụta Mbụ—Nchebe,” peji nke 18.
Nke kasịnụ, gbalịa ime ka ọ bụrụ ihe obi ụtọ. Ekwela ka nwa gị na-ele gị sọ n’anya; mee ka ọ kwọọ aka ya, ma tinye ha n’ọrụ ná nkwadebe nke ihe oriri ahụ n’onwe ya. Nye ya ohere ime nchọpụta, nnwale, na ịjụ ajụjụ. Mgbe nri na-adịghị mma otú a chọrọ, esogbula. Ọ bụrụ na nwa gị siri ya n’onwe ya, eleghị anya ọ ga-erikwa ya!
Ịdị n’Otu Ezinụlọ
N’enweghị obi abụọ, abamuru kasịnụ ga-esite na kichin pụta na-agụnye ịdị n’otu na ihe ndị ezinụlọ ji kpọrọ ihe. I nwere ike ịchọpụtawo na n’ezinụlọ ụfọdụ taa, ndị òtù ezinụlọ na-eje n’ọrụ ha dị iche iche n’enwekebeghị ezi mmekọrịta ọ bụla n’ebe ibe ha nọ. N’okpuru ọnọdụ ndị dị otú ahụ, ebe obibi pụrụ ịghọ ihe ji nke nta karịa ebe nkwụsịtụ, ebe a na-agbara mmanụ ụgbọala. N’ụzọ dị iche, ezinụlọ na-esikọ nri ọnụ yikarịrị ka hà ga-erikọ nri ọnụ ma debekọọ ihe ọcha ọnụ. Ihe omume ndị a na-enye ha ohere mgbe mgbe ikwurịta okwu, imekọrịta ihe, na ịmata banyere onwe ha. “Mụ na ụmụ m ndị nwoke nwere mkparịta ụka kasị mma n’ọkwa ịsa ihe na kichin,” ka otu nne na-echeta. Hermann, bụkwa nna bụ́ onye Kraịst, na-agbakwụnye, sị: “Anyị ma ụma ghara inwe ígwè e ji asa arịa nri ruo ọtụtụ afọ, nke mere ka e jiri aka saa ma hichaa arịa ndị ahụ. E kenyere ụmụ anyị ndị ikom ọrụ ihicha ha, onye hichaa ibe ya ehichaa. Ọ bụ oge kasị mma maka nkwurịta okwu a na-emeghị ndokwa ya.”
Ee, oge gị na ụmụ gị ji nọkọọ na kichin—site n’izu ruo n’izu, site n’afọ ruo n’afọ—na-enye ihe ndabere nke ụkpụrụ ime mmụọ na àgwà nsọpụrụ Chineke pụrụ itolite n’elu ya. Ọ bụ n’oge ntụsara ahụ dị otú ahụ nke ịdị n’otu ka mkparịta ụka sitere n’obi n’etiti nne ma ọ bụ nna na nwa pụrụ ibilitere onwe ha, bụrụkwa mgbe mmetụta nke ihe nlereanya nne ma ọ bụ nna pụrụ iji nwayọọ nwayọọ na-emetụta obi nwatakịrị. Ọzụzụ dị otú ahụ pụrụ ịbara nwatakịrị uru ruo ogologo ndụ ya nile, n’ihi na Ilu 22:6 na-asị: “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị, ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”
Ya mere ọ bụrụ na dị ka nne ma ọ bụ nna, ị na-achọ ụzọ ịnọnyekwuru ụmụ gị, gịnị ma ị kpọọ ha inyere gị aka ịkwadebe keki ma ọ bụ otu ihe oriri? I nwere ike ịchọpụta na iso ha rụkọọ ọrụ na kichin bụ otu ụzọ isi zụọ ma lekọta ezinụlọ gị.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle nke isiokwu a, lee isiokwu bụ́ “E Kerie ‘Oge Bara Uru’ n’Ọ̀tụ̀tụ̀ Ndị Dị Nta,” ná mbipụta Teta! nke May 22, 1993 (Bekee), peji nke 16-17.
[Igbe dị na peeji nke 18]
Ihe Mmụta Mbụ—Nchebe
Buru Nchebe n’Obi
• N’ụzọ iji ihe kpọrọ ihe ma n’abụghị n’ụjọ, kọwaa ihe ize ndụ nke ịrụ ọrụ na kichin, n’otu ụzọ ahụ ị ga-esi kọwaa ihe ize ndụ nke ụgbọala n’okporo ụzọ na-ekwo ekwo. Setịpụ ezi ihe nlereanya n’onwe gị.
• Nye nlekọta onye meworo okenye mgbe ọ bụla ụmụaka na-arụ ọrụ na kichin. Ekwela ka nwatakịrị jiri arịa ma ọ bụ ngwá ọrụ ọ bụla mee ihe, karịsịa nke eletrik, ruo mgbe ọ pụrụ iji ya mee ihe n’ụzọ na-adịghị ize ndụ.
• Hazie kichin gị n’ụzọ dị n’usoro. Hichaa ihe ndị wụfuru awụfu ma wepụsịa ihe dasịrị aghara aghara ozugbo. E kwesịrị iwepụ anụmanụ e ji mere enyi na ihe ndọpụ uche ndị ọzọ na kichin mgbe ị na-esi nri.
Chebe Mkpịsị Aka
• E kwesịrị iji ígwè eletrik na-akwọ ihe, ígwè e ji agwakọta nri, na ígwè food processor mee ihe nanị mgbe onye okenye na-elekọta ya. Jiri n’aka na a gbanyụrụ ngwá ọrụ ahụ ma kwụpụ ya n’ọkụ tupu nwa gị etinye ngaji n’ime efere ahụ.
• Mee ka mma na-aghọ nkọ, ebe ọ bụ na mma na-adịghị nkọ na-achọ ka e tinyekwuo ike, n’ihi ya kwa nwee ike ichipụ karị.
• Mgbe nwa gị na-amụ iji mma eme ihe, mee ka ọ gbasoo nzọụkwụ ndị a: (1) site n’isi mma ahụ welite ya, (2) tụkwasị mma ahụ n’elu nri ahụ, (3) tụkwasị aka nke ọzọ n’azụ mma ahụ, na (4) tinye ikike iji bewaa nri ahụ.
• Jiri bọọdụ e ji eberi ihe mee ihe. Iji gbochie akwụkwọ nri ịdagharị mgbe nwa gị na-agbalị iberi ha, buru ụzọ bewaa ha ụzọ abụọ ma kpudo akụkụ sara mbara n’elu bọọdụ ahụ e ji eberi ihe.
Chee Nche Megide Ọkụ Ọtịta
• Na-agbanyụ stoovu na ebe e si agbanyụ ovun mgbe nile n’oge a na-ejighị ha eme ihe. Wepụ ákwà mmiri, akwụkwọ isi nri, na ihe ndị e ji ejide ihe dị ọkụ n’ihu stoovu.
• Mee ka aka pan chee ihu n’ebe etiti stoovu, n’ebe ihe na-apụghị imetụ ha ngwa ngwa wee mee ka ihe wụfuo.
• Ọ bụrụ na ị hapụrụ nwa gị ka o jiri stoovu rụọ ọrụ, jiri n’aka na ọ na-eguzo n’elu ebe siri ike na-adịghị amị amị.
• Ebulitela ihe dị ọkụ ọ gwụla ma i bu ụzọ mara ebe ị ga-edebe ya. Jiri n’aka na ndị ọzọ nọ na kichin maara mgbe i bu ihe dị ọkụ, karịsịa ma ọ bụrụ na ị na-aga ịga ha n’azụ.