Ịnagide Ihe—Site n’Otu Akụkụ Gabigara Ókè Gaa n’Ọzọ
ỌDỊDỊ mara mma nke Ndagwurugwu Kashmir kpaliri onye ọkà ihe ọmụma nke narị afọ nke 16 iti mkpu, sị: “Ọ bụrụ na ọ dị ebe e nwere paradaịs, ọ bụ n’ebe a!” O doro anya na ọ maghị ihe ga-eme n’akụkụ nke ụwa ahụ ka oge na-aga. N’ime afọ ise gara aga, ọ dịkarịa ala e gbuwo mmadụ 20,000 n’ebe ahụ n’ọgụ ndị òtù nkewa na Ndị Agha India na-alụ. Akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Süddeutsche Zeitung na-akọwa ógbè ahụ ugbu a dị ka “ndagwurugwu anya mmiri.” Ndagwurugwu Kashmir na-enye ihe mmụta dị mfe ma baa uru: Anagideghị ihe pụrụ ibibi ebe pụrụ ịbụ paradaịs.
Gịnị ka ịnagide ihe pụtara? Dị ka akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Collins Cobuild English Language Dictionary si kwuo, “ọ bụrụ na ị bụ onye na-anagide ihe, ị na-enye ndị ọzọ ohere inwe àgwà ma ọ bụ nkweta ndị nke ha, ma ọ bụ ịkpa àgwà n’otu ụzọ, ọ bụrụgodị na i kwenyeghị ma ọ bụ kwadoo ya.” Lee àgwà ọma ọ bụ igosipụta! N’ezie anyị na-enwe ahụ iru ala n’ebe ndị na-akwanyere nkweta na àgwà anyị ùgwù, ọbụna mgbe ha dị iche na nke ha.
Site n’Ịnagide Ihe Gaa n’Ịkpọ Ekwo Nkụ
Okwu na-emegide ịnagide ihe bụ anagideghị ihe, nke nwere ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche nke isi ike. Anagideghị ihe pụrụ ịmalite site n’iji enweghị uche gbasapụrụ agbasapụ na-akatọ akparamàgwà onye ọzọ ma ọ bụ ụzọ o si eme ihe. Enweghị uche gbasapụrụ agbasapụ na-ewepụ obi ụtọ ná ndụ, na-emechikwa uche mmadụ n’ebe echiche ndị ọhụrụ dị.
Dị ka ihe atụ, onye nwere nanị otu ụzọ isi mee ihe pụrụ ịla azụ n’ịnụ ọkụ n’obi na-ekpo ọkụ nke nwata. Onye na-eto eto pụrụ inwe ike ọgwụgwụ n’ụzọ onye ka ya mee okenye si atụgharị uche n’ihe. Gwa onye na-elezi anya ka ya na onye na-eme mwụgharị na-arụkọ ọrụ, ha abụọ pụkwara ịbụ ndị a kpasuru iwe. Gịnị na-akpata ịla azụ ahụ, ike ọgwụgwụ ahụ, na mkpasu iwe ahụ? N’ihi na, n’ọnọdụ ọ bụla, ọ na-esiri onye ahụ ike ịnagide omume ma ọ bụ akparamàgwà onye nke ọzọ.
Ebe anagideghị ihe na-etolite, enweghị uche gbasapụrụ agbasapụ pụrụ ịghọ ajọ mbunobi, nke bụ ịkpọ otu ìgwè, agbụrụ, ma ọ bụ okpukpe asị. Nke ka ajọ mbunobi sie ike bụ ịkpọ ekwo nkụ, nke pụrụ igosipụta onwe ya n’ịkpọasị ime ihe ike. Ihe na-esi na ya apụta bụ nhụsianya na mwụfu ọbara. Cheedị ihe anagideghị ihe kpatara n’oge Agha Ntụte ndị ahụ! Ọbụna taa, anagideghị ihe so n’ihe kpatara agha a na-alụ na Bosnia, Rwanda, na Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa.
Ịnagide ihe chọrọ echiche ziri ezi, ijigide echiche ziri ezi adịghịkwa mfe. Anyị dị ka mkpara ígwè klọọkụ nke na-aga site n’otu akụkụ gaa na nke ọzọ. Mgbe ụfọdụ, anyị na-anagide ihe n’ụzọ dị nta gabiga ókè; mgbe ụfọdụ, ọ na-agafe ókè.
Site n’Ịnagide Ihe Gaa n’Omume Rụrụ Arụ
Ò kwere omume ịnagide ihe gabiga ókè? Ome Iwu Dan Coats nke United States, mgbe ọ na-ekwu okwu na 1993, kọwara “agha a na-ebu banyere ihe ịnagide ihe na ime ya eme pụtara.” Gịnị ka o bu n’uche? Ome iwu ahụ kwara arịrị na n’aha ịnagide ihe, ụfọdụ “na-agbahapụ nkweta n’eziokwu banyere omume—n’ihe ọma na ihe ọjọọ, n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.” Ndị dị otú ahụ na-eche na ọha mmadụ enweghị ikike ikpebi ihe bụ ezi akparamàgwà na ihe dị njọ.
Na 1990, onye ndọrọ ndọrọ ọchịchị Britain bụ́ Nwa Amadị Hailsham dere na “onye iro kasị njọ nke omume ọma abụghị ekweghị na Chineke, amaghị ma Chineke ọ̀ dị, ịhụ ihe onwunwe n’anya, anyaukwu ma ọ bụ nke ọ bụla n’ime ihe ndị ọzọ a nakweere na-akpata ya. Onye iro nke omume ọma n’ezie bụ ekwetaghị n’ihe ọ bụla.” N’ụzọ doro anya, ọ bụrụ na anyị ekwenyeghị n’ihe ọ bụla, anyị enweghị ụkpụrụ ọ bụla nke akparamàgwà kwesịrị ekwesị, a pụkwara ịnagide ihe nile. Ma ò kwesịrị ekwesị ịnagide ụdị àgwà ọ bụla?
Otu onye isi ụlọ akwụkwọ dị elu na Denmark echeghị otú ahụ. O dere otu isiokwu akwụkwọ akụkọ ná mmalite afọ ndị 1970, na-eme mkpesa banyere mkpọsa ndị a na-eme n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche maka ihe ihe ngosi ndị na-akpali agụụ mmekọahụ ndị na-egosi mmekọahụ n’etiti anụmanụ na ụmụ mmadụ. A hapụrụ mkpọsa ndị a n’ihi ‘nnagide ihe’ nke Denmark.
N’ụzọ doro anya, nsogbu na-ebilite site n’igosi ịnagide ihe n’ụzọ dị nta gabiga ókè, kamakwa site n’ịnagide ihe gabiga ókè. Gịnị mere o ji esi ike izere imebiga ihe ókè ma nwee ezi nguzozi? Biko gụọ isiokwu na-esonụ.
[Foto dị na peeji nke 17]
Imeghachi omume n’ụzọ gabigara ókè n’ihie ụzọ nke ụmụaka pụrụ imerụ ha ahụ
[Foto dị na peeji nke 18]
Ịnagide ihe ọ bụla ụmụaka mere agaghị akwadebe ha maka ibu ọrụ nke ndụ