Echiche Ziri Ezi Pụrụ Ime Ka Ndụ Gị Dịkwuo Ụtọ
ỊNAGIDE ihe dị ka shuga e tinyere n’ime iko kọfị. Ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị pụrụ ịtụkwasị ihe n’ịdị ụtọ nke ndụ. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ịdị na-eji shuga eme ihe nke ukwuu, ọtụtụ mgbe anyị na-enwe aka ntagide n’ihe banyere ịnagide ihe. N’ihi gịnị?
“Ụmụ mmadụ adịghị achọ ịnagide ihe,” ka Arthur M. Melzer, osote prọfesọ na Mahadum Michigan State, dere. “Ihe a na-enwekarị bụ . . . ajọ mbunobi.” Ya mere anagideghị ihe abụghị adịghị ike nke na-emetụta nanị ọnụ ọgụgụ dị nta; anyị na-enwekarị uche na-agbasapụghị agbasapụ n’ihi na ihe nile a kpọrọ mmadụ ezughị okè.—Tụlee Ndị Rom 5:12.
Ndị Pụrụ Ịghọ Ndị Na-etinye Ọnụ n’Ihe Na-agbasaghị Ha
Na 1991, magazin bụ́ Time kọrọ banyere ịrị elu nke inwe uche na-agbasapụghị agbasapụ na United States. Ihe odide ahụ kọwara “ndị itinye ọnụ n’ihe na-agbasaghị ha bụ ụzọ ndụ ha,” ndị na-anwa ime ka onye ọ bụla nakwere ụkpụrụ omume ha. A tawo ndị na-ekwenyeghị ahụhụ. Dị ka ihe atụ, a chụrụ otu nwanyị n’ọrụ na Boston n’ihi na ọ jụrụ ite ihe ntecha. A chụrụ otu nwoke n’ọrụ na Los Angeles n’ihi na o buru oké ibu. Gịnị mere e ji enwe ịnụ ọkụ n’obi ime ka ndị ọzọ kwekọọ?
Ndị na-enweghị uche gbasapụrụ agbasapụ enweghị ezi uche, na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, dị isi ike, ma na-ekwesi olu ike. Ma ọ̀ bụ na ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị mmadụ abụghị ndị na-enweghị ezi uche, na-achọ ọdịmma onwe ha nanị, dị isi ike, ma ọ bụ na-ekwesi olu ike ruo n’ókè ụfọdụ? Ọ bụrụ na àgwà ndị a agbagidesie mkpọrọgwụ ike n’ụdị onye anyị bụ, anyị ga-enwe uche na-agbasapụghị agbasapụ.
Gịnị banyere gị? Ị̀ na-akatọ ụdị nri na-amasị onye ọzọ? Ná mkparịta ụka, ị̀ na-achọkarị ịbụ okwuchaa ọgwụ? Mgbe i so otu ìgwè na-arụ ọrụ, ị̀ na-atụ anya ka ha gbasoo ụzọ i si eche echiche? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụrụ ịdị mma itinyekwu obere shuga na kọfị gị!
Ma, dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, anagideghị ihe ọ bụla pụrụ ịbịa n’ụdị ajọ mbunobi. Otu ihe nke pụrụ ime ka anagideghị ihe rịa elu bụ oké nchegbu.
“Oké Mmetụta nke Ejighị Ihe n’Aka”
Ndị ọkà mmụta agbụrụ mmadụ elebawo anya n’oge ndị gara aga nke ihe a kpọrọ mmadụ iji chọpụta mgbe na ebe ajọ mbunobi agbụrụ pụtaworo ìhè. Ha chọpụtara na ụdị anagideghị ihe nke a adịghị ebilite mgbe nile, a dịghịkwa egosipụta ya n’ala nile n’otu ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ. Magazin Germany banyere sayensị ihe ndị sitere n’okike, bụ́ GEO, na-akọ na esemokwu agbụrụ na-apụta n’oge ọgba aghara mgbe “ndị mmadụ nwere oké mmetụta nke ejighị ihe n’aka, matakwa na a na-eyi ndị ha bụ egwu.”
“Oké mmetụta nke ejighị ihe n’aka” dị otú ahụ ò zuru ebe nile taa? Kpọmkwem. Dị ka ọ na-emetụbeghị na mbụ, ihe a kpọrọ mmadụ na-enwe otu nsogbu ma ọzọ gasịa. Enweghị ọrụ, ịrị elu nke ọnụ ahịa nke ihe e ji ebi ndụ, oké ụba mmadụ, mbelata nke ihe nchebe ozone, ime ihe ike n’obodo ukwu dị iche iche, mmetọ mmiri ọṅụṅụ, ikpo ọkụ nke ụwa—ụjọ na-adịgide adịgide nke nke ọ bụla n’ihe ndị a na-amụba nchegbu. Nsogbu na-akpata nchegbu, nchegbu na-enweghị isi na-edujekwa na anagideghị ihe.
Dị ka ihe atụ, anagideghị ihe dị otú ahụ na-apụta ìhè n’ebe ìgwè agbụrụ na ọdịbendị dị iche iche gwakọrịtara, dị ka ọ dị n’ala Europe ụfọdụ. Dị ka otu akụkọ nke National Geographic kọrọ na 1993 si kwuo, mba ndị dị n’Ọdịda Anyanwụ Europe nabatara mgbe ahụ ihe karịrị nde 22 nke ndị si mba ọzọ kwabata. Ọtụtụ ndị Europe “bụ ndị nnubata nke ndị ọhụrụ riri ọnụ,” bụ́ ndị nwere asụsụ, ọdịbendị, ma ọ bụ okpukpe dị iche. E nwewo ịrị elu ná mmetụta nke imegide ndị si esi bịa n’Austria, Belgium, Britain, France, Germany, Itali, Spain, na Sweden.
Gịnị banyere ndị ndú ụwa? N’ime afọ ndị 1930 na 1940, Hitler mere anagideghị ihe ụkpụrụ gọọmenti. N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe taa na-eji anagideghị ihe enweta ihe ndị ha chọrọ. Ọ dịwo otú a n’ebe ndị dị ka Austria, France, Ireland, Russia, Rwanda, na United States.
Zere Ọnyà nke Enweghị Mmasị
Ọ bụrụ na shuga atụghị kọfị anyị, anyị na-amata na ọ dị ihe na-adịghị ya; ọ bụrụkwa na shuga agabiga ókè, anyị na-enwe ụtọ na-adịghị mma n’ọnụ anyị. Ọ bụ otu ihe ahụ n’ebe ịnagide ihe dị. Tụlee ahụmahụ nke otu nwoke na-akụzi ihe n’otu kọleji na United States.
Afọ ole na ole gara aga, David R. Carlin, Jr., chọpụtara otu ụzọ dị mfe ma dị irè isi kpalite nkwurịta okwu klas. Ọ na-ekwu okwu nzube ya bụ iji maa echiche ụmụ akwụkwọ ya aka, na-amara na ha agaghị ekwe. Ihe na-esi na ya pụta bụ nkwurịta okwu na-ekpo ọkụ. Otú ọ dị, na 1989, Carlin dere na otu ụzọ ahụ adịghịkwa arụ ọrụ nke ọma. N’ihi gịnị? Ọ bụ ezie na ụmụ akwụkwọ adịghị ekwenye n’ihe o kwuru, ha adịkwaghị enye onwe ha nsogbu ịrụwa ụka. Carlin kọwara na ha azụlitewo “omume ịnagide onye na-arụ ụka n’ụzọ dị mfe”—àgwà enweghị nchekasị, nke ọ gbasaghị m.
Àgwà nke ọ gbasaghị m na ịnagide ihe hà bụ otu ihe? Ọ bụrụ na ọ dịghị onye chọrọ ịma ihe mmadụ na-eche ma ọ bụ na-eme, e nweghị ụkpụrụ ma ọlị. Enweghị ụkpụrụ bụ enweghị mmasị—enweghị mmasị ma ọlị. Olee otú a pụrụ isi nwee ọnọdụ dị otú ahụ?
Dị ka Prọfesọ Melzer si kwuo, enweghị mmasị pụrụ ịgbasa n’ọha mmadụ na-anakwere ọtụtụ ụkpụrụ omume dị iche iche. Ndị mmadụ na-ekwerezi na a pụrụ ịnabata ụdị àgwà nile nakwa na ihe nile bụ okwu nke ihe mmadụ họọrọ. Kama ịmụta iche echiche na ịgbagha ihe a pụrụ ịnabata na nke a na-apụghị, ndị mmadụ “na-amụtakarị ịghara iche echiche ma ọlị.” Ha enweghị ikike omume nke na-akpali mmadụ ịkwụrụsi ike n’ịjụ anagideghị ihe nke ndị ọzọ.
Gịnị banyere gị? Ị̀ na-ahụ onwe gị mgbe ụfọdụ ka ị na-enwe àgwà nke ọ gbasaghị m? Ị̀ na-achị ọchị n’okwu egwuregwu ndị na-adịghị ọcha ma ọ bụ na-akpa ókè agbụrụ? Ị̀ na-ahapụ nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị dị afọ iri na ụma ka ọ na-ekiri vidio ndị na-akwalite anyaukwu ma ọ bụ omume rụrụ arụ? Ì chere na o kwesịrị ekwesị ka ụmụ gị jiri egwuregwu ime ihe ike kọmputa na-egwuri egwu?
Ọ bụrụ na a na-anagide ihe gabiga ókè, ezinụlọ ma ọ bụ ọha mmadụ ga-ahụsi anya, ebe ọ bụ na ọ dịghị onye maara—ma ọ bụ chọrọ ịma—ihe ziri ezi ma ọ bụ ihe dị njọ. Ome iwu Dan Coats nke United States dọrọ aka ná ntị banyere “ọnyà nke ịnagide ihe dị ka enweghị mmasị.” Ịnagide ihe pụrụ iduga n’inwe uche ghere oghe; ịnagide ihe gabiga ókè—enweghị mmasị—gaa n’inwe okpokoro isi.
Ya mere, gịnị ka anyị kwesịrị ịnagide, gịnịkwa ka anyị kwesịrị ịjụ? Gịnị bụ isi ihe dị n’inweta echiche ziri ezi? Nke a ga-abụ isiokwu nke isiokwu na-esonụ.
[Foto dị na peeji nke 19]
Gbalịa inwe mmeghachi omume kwesịrị ekwesị n’ọnọdụ dị iche iche