Ịdị Na-eme Mgbanwe, ma Na-ejidesi Ụkpụrụ Chineke Ike
“NDỊ ikom na-anagide ihe adịghị nzuzu, ndị ikom dị nzuzu adịghịkwa anagide ihe,” ka otu ilu ndị China na-ekwu. E nwere eziokwu buru ibu n’ilu ahụ, ebe ọ bụ na ịnagide ihe bụ ihe ịma aka, na-achọ ijidesi ụkpụrụ omume ndị kwesịrị ekwesị ike. Ma olee ụkpụrụ ndị anyị kwesịrị ijidesi ike? Ọ́ gaghị abụ ihe ezi uche dị n’ime ya ịgbaso ụkpụrụ ndị Onye Mere ihe a kpọrọ mmadụ setịpụrụ, dị ka a kọwara n’Okwu ya, bụ́ Bible Nsọ? Chineke n’onwe ya na-esetịpụ ihe nlereanya kasị mma nke idebe ụkpụrụ ya.
Onye Okike—Onye Nlereanya Anyị Kasị Ukwuu
Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, nwere nguzozi zuru okè n’ịnagide ihe, n’adịghị egosi ya n’ụzọ gabigara ókè ma ọ bụ n’ụzọ dị oké nta. Ruo ọtụtụ puku afọ, ọ nagidewo ndị na-ewetara aha ya nkọcha, merụọ ihe a kpọrọ mmadụ, ma jiri ụwa na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Pọl onyeozi dere, dị ka e dekọrọ ná Ndị Rom 9:22, na Chineke “weere ogologo ntachi obi hie nne nagide ihe iwe e doziworo ka ha baa n’ịla n’iyi.” N’ihi gịnị ka Chineke jiworo na-anagide ihe ruo ogologo oge otú a? N’ihi na nnagide ihe ya nwere nzube.
Chineke nwere ndidi n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ “n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:9) Onye Okike enyewo ihe a kpọrọ mmadụ Bible, nyekwa ndị ohu ya ọrụ ime ka a mara ụkpụrụ omume ya n’ebe nile. Ezi ndị Kraịst na-ejidesi ụkpụrụ ndị a ike. Ma nke a ọ̀ pụtara na ndị ohu Chineke aghaghị ịgba isi akwara n’ọnọdụ nile?
Ịkwụrụsi Ike, ma Na-eme Mgbanwe
Jisọs Kraịst gbara ndị na-achọ ndụ agwụghị agwụ ume ka ha ‘si n’ọnụ ụzọ dị warara baa.’ Ma isi n’ọnụ ụzọ dị warara baa apụtaghị inwe uche na-agbasapụghị agbasapụ. Ọ bụrụ na anyị na-enwe ọchịchọ ịchị ndị ọzọ ma ọ bụ ikwesi olu ike mgbe anyị na ndị ọzọ nọ, n’ezie ọ ga-eme ka ndụ dịkwuo ụtọ nye mmadụ nile ma ọ bụrụ na anyị achịkwaa ọchịchọ a. Ma n’ụzọ dị aṅaa?—Matiu 7:13; 1 Pita 4:15.
Theofano, nwa akwụkwọ bụ́ onye Gris, onye kọwara na oge o ji soro ndị nwere nzụlite dị iche nọrọ dugara n’ịghọta ha nke ọma karị kwuru, sị: “Ọ dị mkpa na anyị gbalịrị ịmata otú ha si eche echiche kama ịmanye ha ịnakwere nke anyị.” N’ihi ya, site n’ịmata mmadụ nke ọma karị, anyị pụrụ ịchọpụta na ụdị nri na-amasị ya na ọbụna ụda asụsụ ya adịchaghị iche otú anyị chere. Kama ịdị na-ekwukarịsị onye ọ bụla mgbe nile ma ọ bụ ịdị na-esi ọnwụ ịbụ onye ga-ekwubi okwu, anyị na-amụta ọtụtụ ihe bara uru site n’ige ntị n’echiche ya. N’ezie, ndị nwere uche ghere oghe na-anụ ụtọ ndụ karị.
Mgbe ọ bụla o metụtara ihe na-amasị mmadụ, anyị kwesịrị ịdị na-eme mgbanwe ma na-ahapụ ndị ọzọ ka ha mee nhọrọ nke onwe ha. Ma mgbe akparamàgwà bụ okwu banyere nrubeisi nye Onye Okike anyị, anyị kwesịrị ịkwụrụsi ike. Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile adịghị anakwere ụdị akparamàgwà nile. O gosipụtara nke a site n’ụzọ o si meso ndị ohu ya n’oge gara aga.
Ọnyà nke Ịbụ Onye Na-anagide Ihe Gabiga Ókè
Ilaị, bụ́ onyeisi nchụàjà nke mba Israel oge ochie, bụ ohu Chineke nke dabara n’ọnyà nke ịbụ onye na-anagide ihe gabiga ókè. Ụmụ Israel esorowo Chineke banye ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ, na-ekwere irube isi n’iwu ya. Ma ụmụ ndị ikom abụọ nke Ilaị, bụ́ Họfnaị na Finehas, bụ ndị anyaukwu na ndị na-eme omume rụrụ arụ, bụrụkwa ndị na-enweghị nkwanye ùgwù ma ọlị n’ebe Onye Pụrụ Ime Ihe Nile nọ. Ọ bụ ezie na Ilaị maara Iwu Chineke nke ọma, ọ baghị mba, o nyeghịkwa ahụhụ kwesịrị ekwesị. O hiere ụzọ n’iche na Chineke ga-anagide ajọ omume. Onye Okike na-akpa ókè n’etiti adịghị ike na ajọ omume. N’ihi ịkpachara anya mebie Iwu Chineke, e nyere ụmụ ọjọọ Ilaị ntaramahụhụ siri ike—n’ụzọ kwesịkwara ekwesị.—1 Samuel 2:12-17, 22-25; 3:11-14; 4:17.
Lee ọdachi ọ ga-abụrụ anyị ịnagide ihe gabiga ókè n’ezinụlọ anyị site n’ịgba nkịtị n’ihe ọjọọ ụmụ anyị nọgidere na-eme! Lee ka ọ ga-esi ka mma ịzụlite ha “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị”! Nke a pụtara na anyị onwe anyị aghaghị ịrapagidesi ike n’ụkpụrụ omume Chineke ma kụnye ya n’ime ụmụ anyị.—Ndị Efesọs 6:4.
N’otu aka ahụ, ọgbakọ ndị Kraịst apụghị ịnagide ajọ omume. Ọ bụrụ na onye òtù ya emee oké ihe ọjọọ ma jụ ichegharị, a ghaghị ịchụpụ ya. (1 Ndị Kọrint 5:9-13) Otú ọ dị, e wezụga n’ime ezinụlọ na ọgbakọ, ezi ndị Kraịst adịghị agbalị ịgbanwe ọha mmadụ nile.
Isoro Jehova Nwee Mmekọrịta Siri Ike
Anagideghị ihe na-eme ka e nwee ọnọdụ nke nchegbu. Otú ọ dị, ọ bụrụ na anyị na Jehova nwere mmekọrịta onwe onye chiri anya, anyị na-enwe mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi nke na-enyere anyị aka inwe echiche ziri ezi. “Ụlọ elu dị ike ka aha Jehova bụ: n’ime ya ka onye ezi omume na-agbaba, o wee nọọ n’elu,” ka anyị na-agụ n’Ilu 18:10. N’ezie ọ dịghị ihe ọjọọ pụrụ ime anyị ma ọ bụ ndị anyị hụrụ n’anya nke Onye Okike ahụ na-agaghị edozi n’oge nke ya.
Otu onye ritere uru nke ukwuu site n’isoro Chineke nwee mmekọrịta chiri anya bụ Pọl onyeozi. Dị ka onye Juu a maara dị ka Sọl, ọ kpagburu ụmụazụ Jisọs Kraịst, bụrụkwa onye ikpe mwụfu ọbara mara. Ma Sọl n’onwe ya ghọrọ onye Kraịst, mesịakwa kere òkè n’ikwusa ozi ọma oge nile, dị ka Pọl onyeozi. Pọl gosipụtara omume nke inwe uche ghere oghe n’ime nkwusa nye mmadụ nile, “ma ndị Grik ma ndị na-asụ asụsụ ọzọ, ma ndị maara ihe ma ndị na-enweghị uche.”—Ndị Rom 1:14, 15; Ọrụ 8:1-3.
Olee otú o si nwee ike ịgbanwe? Site n’inweta ezi ihe ọmụma nke Akwụkwọ Nsọ na site n’ito eto n’ịhụnanya maka Onye Okike ahụ, bụ́ onye na-adịghị ele mmadụ anya n’ihu. Pọl mụtara na Chineke bụ ezi onye n’ihi na Ọ na-ekpe onye ọ bụla ikpe, ọ bụghị dị ka ọdịbendị ma ọ bụ agbụrụ si dị, kama dị ka ihe onye ahụ bụ na ihe ọ na-eme. Ee, nye Chineke, ọrụ dị mkpa. Pita kwuru na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu: kama n’ime mba ọ bụla onye na-atụ egwu Ya, onye na-arụkwa ọrụ ezi omume, bụ onye Ọ na-anara nke ọma.” (Ọrụ 10:34, 35) Chineke nke Pụrụ Ime Ihe Nile enweghị ajọ mbunobi. Nke a adịghị ka ụfọdụ ndị ndú ụwa, ndị pụrụ ịkpachara anya jiri anagideghị ihe ọ bụla na-eme ihe maka nzube nke onwe ha.
Oge Na-agbanwe
Dị ka John Gray, nke Mahadum Oxford n’England si kwuo, ịnagide ihe bụ “omume ọma nke ghọworo ihe dị ụkọ n’oge ndị a.” Ma nke a ga-agbanwe. Nnagide ihe nke e ji amamihe Chineke tigwaa ga-ejupụta ebe nile.
N’ụwa ọhụrụ Chineke nke dị nso, anagideghị ihe agaghị adịkwa ọzọ. Ụdị anagideghị ihe ndị gabigara ókè, dị ka ajọ mbunobi na ịkpọ ekwo nkụ, agaghị adịkwa ọzọ. Enweghị uche gbasapụrụ agbasapụ agaghị ewepụ ihe ụtọ ná ndụ ọzọ. Mgbe ahụ, a ga-enwe paradaịs nke dị nnọọ ebube karịa ihe ọ bụla e nwetụrụla na Ndagwurugwu Kashmir.—Aịsaịa 65:17, 21-25.
Ị̀ na-atụ anya ibi n’ụwa ọhụrụ ahụ? Lee ihe ùgwù nakwa ihe na-akpali akpali nke ahụ ga-abụ!
[Foto dị na peeji nke 22]
Pọl onyeozi gosipụtara echiche ziri ezi n’ihi na o sooro Chineke nwee mmekọrịta