Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 2/8 p. 24-25
  • Iju Mmiri ahụ Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Iju Mmiri ahụ Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nkọwa Ndị A Pụrụ Ịdabere na Ha
  • A Kwadoo Izi Ezi Ya
  • Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ—Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo Nkịtị?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Akụkọ Noa na Iju Mmiri ahụ Bụ Eziokwu, Ọ Bụghị Akụkọ Ifo
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Okwukwe Noa Na-ama Ụwa Ikpe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ihe Ndekọ Njem Noa—Ò Nwere Ihe Ọ Pụtara Nye Anyị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 2/8 p. 24-25

Echiche nke Bible

Iju Mmiri ahụ Eziokwu Ka Ọ̀ Bụ Akụkọ Ifo?

‘Anụmanụ nile wee bakwuru Noa n’ụgbọ ahụ, abụọ abụọ.’—Jenesis 7:8, 9.

OLEE onye na-anụbeghị banyere Iju Mmiri ụbọchị Noa? Ikekwe ị mawo akụkọ ahụ site na nwata. N’ezie, ọ bụrụ na ị gaa n’ọbá akwụkwọ obodo ime nchọpụta banyere Iju Mmiri ahụ, ị pụrụ ịhụ ọtụtụ akwụkwọ ndị e dere maka ụmụaka n’isiokwu ahụ karịa maka ndị toworo ogo mmadụ. N’ihi ya, ị pụrụ ikpebi iwere akụkọ Iju Mmiri ahụ nanị dị ka akụkọ oge ịlakpu ụra. Ọtụtụ ndị na-eche na akụkọ Iju Mmiri oge Noa, tinyere ihe dị ukwuu n’akụkụ Bible ndị ọzọ, bụ nnọọ nanị akụkọ ifo ma ọ bụ, n’ebe ọ makarịsịrị mma, ihe na-akụzi ụkpụrụ omume nke mmadụ chepụtara.

N’ụzọ na-eju anya, ọbụna ụfọdụ ndị na-azọrọ na nkwenkwe okpukpe ha na-adabere na Bible na-arụ ụka na Iju Mmiri ahụ mere eme n’ezie. Ụkọchukwu Katọlik bụ́ Edward J. McLean kwuru otu mgbe na akụkọ Noa kwesịrị ka a kọwaa ya, ọ bụghị dị ka akụkọ ihe mere eme, kama dị ka “akụkọ ifo ma ọ bụ ụdị ihe odide nkịtị mmadụ dere.”

Otú ọ dị, akụkọ Iju Mmiri ahụ dị n’ime Bible ọ̀ bụ nanị akụkọ ifo, nke a na-ezubeghị ka e were ya n’ụzọ nkịtị. Bible n’onwe ya ò nyere ohere maka ụdị echiche a?

Nkọwa Ndị A Pụrụ Ịdabere na Ha

Buru ụzọ tụlee ihe ndekọ ahụ Mosis dere n’ime akwụkwọ Jenesis. N’ebe ahụ, anyị ga-achọta kpọmkwem afọ, ọnwa, na ụbọchị mgbe oké mmiri ozuzo ahụ bidoro, mgbe ụgbọ ahụ kwụsịrị, na mgbe ụwa kọsịrị. (Jenesis 7:11; 8:4, 13, 14) Ọ bụ ezie na e dekọghị kpọmkwem ụbọchị mgbe nile n’ebe ndị ọzọ na Jenesis, ụbọchị ndị a na-emesi ike eziokwu bụ na Mosis lere Iju Mmiri ahụ anya dị ka ihe omume mere eme n’ezie. Tụlee ọdịiche dị n’ụda eziokwu dị n’ime Bible na okwu mmeghe a na-ejikebe eme ihe nke ọtụtụ akụkọ ifo, “O ruru otu mgbe . . .”

Dị ka ihe atụ ọzọ, tụlee ụgbọ ahụ n’onwe ya. Bible na-akọwa ụgbọ dị ihe dị ka mita 133 n’ogologo, na-enwe nkezi nke 10 maka 1 ma e jiri ịdị ogologo tụnyere ịdị elu na nkezi nke 6 maka 1 ma e jiri ịdị ogologo tụnyere ịdị obosara. (Jenesis 6:15) Ugbu a, Noa abụghị onye na-ewu ụgbọ. Chetakwa, nke a bụ ihe karịrị afọ 4,000 gara aga! Ma, e jiri ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị wuo ụgbọ ahụ maka ọrụ ya dị ka ihe e ji etinye ihe nke na-ese n’elu mmiri. N’eziokwu, ndị na-ewu ụgbọ mmiri n’oge a achọpụtawo ụdị nkezi ndị yiri ndị a dị ka nke dabara adaba maka isi ike nke ihe owuwu na ịkwụ chịm n’elu osimiri. Ọ bụ ezie na Bible ekwughị kpọmkwem ogologo oge Noa tinyere n’iwu ụgbọ ahụ, ihe ndekọ ahụ na-enye ohere maka ihe owuwu were afọ 50 ma ọ bụ 60. (Jenesis 5:32; 7:6) Ihe ndị a dị nnọọ iche n’ebe akụkọ a maara nke ọma a chọtara n’Akụkọ Banyere Gilgamesh nke ndị Babilọn. Akụkọ ahụ na-akọwa ihe dị ka igbe ukwu jọrọ njọ ile anya, buru oké ibu, nke dị ihe dị ka mita 60 n’akụkụ nile, nke e wuru nanị n’ụbọchị asaa. N’adịghị ka akụkọ mgbe ochie ndị Babilọn ahụ, ihe ndekọ Iju Mmiri Bible na-akpali obi ike n’izi ezi ya.

E wezụga ihe ndekọ Jenesis, Akwụkwọ Nsọ zoro aka n’ebe Noa ma ọ bụ Iju Mmiri ahụ zuru ụwa nile nọ ugboro iri. Izo aka ndị a hà na-egosi na ndị dere ihe odide ahụ n’ike mmụọ nsọ lere Iju Mmiri ahụ anya dị ka akụkọ ihe mere eme bụ eziokwu ka ọ̀ bụ dị ka akụkọ ifo?

A Kwadoo Izi Ezi Ya

N’Akwụkwọ Nsọ, Noa na-apụta n’usoro ọmụmụ abụọ nke mba Israel, nke abụọ na-ejedebe na Jisọs Kraịst. (1 Ihe Emere 1:4; Luk 3:36) Ezra na Luk, ndị nchịkọta usoro ọmụmụ ndị a, bụcha ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme maara ọrụ ha nke ọma, ha aghaghịkwa ikwetaworị na Noa bụ onye dịrị adị n’ezie.

N’ebe ọzọ na Bible, e denyekọrọ Noa n’etiti ndị dịrị n’akụkọ ihe mere eme, bụrụ onye a kpọtụrụ uche dị ka nwoke ezi omume na okwukwe. (Ezikiel 14:14, 20; Ndị Hibru 11:7) Ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ndị dere Bible itinye onye na-adịghị adị dị ka ihe nlereanya a ga-eṅomi? Ee e, n’ihi na nke a n’ụzọ dị mfe pụrụ iduje ndị na-agụ Bible ikwubi na okwukwe karịrị ike ụmụ mmadụ na ọ bụkwa nanị ndị e denyere n’ime akwụkwọ akụkọ ifo pụrụ igosipụta ya. E depụtara aha Noa na ndị ikom na ndị inyom okwukwe ndị ọzọ n’ihi na ha bụ mmadụ ndị nwere adịghị ike na mmetụta dị ka nke anyị.—Ndị Hibru 12:1; tụlee Jemes 5:17.

N’izo aka Akwụkwọ Nsọ fọdụrụnụ, e zoro Noa na Iju Mmiri ahụ aka n’okwu metụtara mbibi Chineke wetara n’ahụ ọgbọ ahụ na-enweghị okwukwe nke gbara Noa gburugburu. Rịba ama izo aka Jisọs zoro Iju Mmiri ahụ, nke e dekọrọ na Luk 17:26, 27: “Dị ka e mere n’ụbọchị Noa, otú a ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ. Ha na-eri ihe, ha na-aṅụ ihe ọṅụṅụ, ha na-alụ nwunye, a na-enye ha n’ọlụlụ di, ruo ụbọchị Noa batara n’ụgbọ ya, oké iju mmiri ahụ wee bịa, laa ha nile n’iyi.”

Jisọs Kraịst jiri anya ya hụ ihe omume ahụ ọ kọwara, ebe ọ dịwororị ndụ n’eluigwe tupu ndụ ya n’elu ala. (Jọn 8:58) Ọ bụrụ na Iju Mmiri ahụ bụ nanị akụkọ ifo, mgbe ahụ ma ọ bụghị na Jisọs na-enye echiche na ọnụnọ ya dị n’ihu bụ ihe e chere n’echiche efu ọ bụrụ na ọ na-ekwu okwu ụgha. Ọ dịghị otu n’ime nkwubi okwu ndị ahụ kwekọrọ n’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị ọzọ. (1 Pita 2:22; 2 Pita 3:3-7) Ya mere, n’ihi ihe ọ hụrụ n’onwe ya, Jisọs Kraịst kweere ihe ndekọ Bible ahụ nke Iju Mmiri zuru ụwa nile dị ka akụkọ ihe mere eme bụ eziokwu. Nye ezi ndị Kraịst, n’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, nke a bụ ihe àmà kasị eju afọ na Iju Mmiri ụbọchị Noa bụ eziokwu, ọ bụghị akụkọ ifo.

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]

L. Chapons/Illustrirte Familien-Bibel nach der deutschen Uebersetzung Dr. Martin Luthers

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya