Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
Ịchọ Okwu—Olee Ihe Ọjọọ Dị Ya?
‘Aa! Ọ bụ nanị obere egwu ka m na-egwu. Gịnị dị njọ na ya? E wezụga nke ahụ, o kwesịrị Ron.’
Ị PỤRỤ ịgba dimkpa, siekwa ike karịa ihe ka ọtụtụ ná ndị ọgbọ gị. Ma ọ bụ ikekwe ị dị nkọ n’uche, na-ama njakịrị, na-ewekwa iwe ọkụ. Ihe ọ sọrọ ya bụrụ, imenye mmadụ egwu, ime mmadụ ihe ọchị, ma ọ bụ ịchị ọchị n’ọdachi onye ọzọ yiri ka ọ na-adịrị gị mfe.
Ọ bụ ezie na ịdị na-arụsa ndị ọzọ arụrụala pụrụ ime ka ndị enyi gị chịa ọchị, ọ bụghị ihe e ji egwuri egwu. N’ezie, ụfọdụ ndị nchọpụta na-achọpụta na ịchọ okwu na-ewetara onye a chọrọ okwu mbibi karịa otú ha chetụrụla n’uche. Otu nnyocha e mere ndị ntorobịa ruworo ogo ịga akwụkwọ na United States chọpụtara na “90 pasent nke ndị a na-achọ okwu kwuru na ha tara ahụhụ ihe ndị si na ya pụta—ndalata n’akara mmụta, mmụba nke nchekasị, mfu nke ndị enyi ma ọ bụ ndụ ọha na eze.” Na Japan otu onye dị afọ 13 “kwụgburu onwe ya mgbe o desịrị otu akwụkwọ dị ogologo nke kọrọ banyere ịbụ onye a na-achọ okwu ruo afọ atọ.”a
Gịnị kpọmkwem na-eme mmadụ ọchọ okwu? Ọ bụrụkwa na gị onwe gị na-akpa àgwà dị ka ọchọ okwu, olee otú ị pụrụ isi gbanwee?
Gịnị Bụ Ọchọ Okwu?
Bible na-ekwu banyere ndị ọchọ okwu biri tupu Iju Mmiri Noa. A kpọrọ ha Nefilim—okwu pụtara “ndị na-eme ka ndị ọzọ daa.” N’oge ọchịchị ha nke iyi egwu, “ụwa jupụtakwara n’ihe ike.”—Jenesis 6:4, 11.
Otú ọ dị, ọ dịghị gị mkpa iti ndị mmadụ ihe ma ọ bụ inugharị ha aka iji bụrụ ọchọ okwu. Onye ọ bụla na-emeso ndị ọzọ—karịsịa ndị na-adịghị ike ma ọ bụ ndị na-enweghị nchebe—n’ụzọ obi ọjọọ ma ọ bụ n’ụzọ na-adịghị mma bụ ọchọ okwu. (Tụlee Eklisiastis 4:1.) Ndị ọchọ okwu na-anwa iyi egwu, ịmaja, na ịchịkwa mmadụ. Ma ihe ka ọtụtụ na-eji ọnụ ha, ọ bụghị aka ha. N’ezie, ịchọ okwu nke mmetụta uche bụ ụdị mmetọ a nke a kasị ahụ. N’ihi ya ọ pụrụ ịgụnye mkparị, okwu njakịrị, ịkwa emo, na ịkọ ọnụ.
Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ ịchọ okwu pụrụ ịdị aghụghọ. Were, dị ka ihe atụ, ihe mere Lisa.b O nwere ìgwè ndị enyi nwanyị ya na ha tokọrọ. Ma mgbe ọ dị afọ 15, ihe malitere ịgbanwe. Lisa mara ezigbo mma, malitekwa ịdọrọ ọtụtụ mmasị. Ọ na-akọwa, sị: “Ndị enyi m malitere ịgụpụ m, na-ekwukwa ihe ndị na-adịghị mma banyere m n’azụ—ma ọ bụ ọbụna n’ihu m.” Ha gbasakwara ụgha banyere ya, na-anwa ibibi aha ọma ya. Ee, n’ịbụ ndị ekworo kpaliri, ha chọrọ ya okwu n’ụzọ obi ịta mmiri na obi ọjọọ.
Ịghọ Ọchọ Okwu
A na-ejikọtakarị àgwà ise okwu na gburugburu ebe obibi mmadụ. “Nna m na-esekarị okwu,” ka otu onye ntorobịa aha ya bụ Scott na-ekwu, “n’ihi ya ana m esekarị okwu.” Ndụ sikwaara Aaron ike n’ụlọ. Ọ na-echeta, sị: “Achọpụtara m na ndị mmadụ maara banyere ọnọdụ ezinụlọ m—na ọ dị iche—enweghịkwa m mmasị ná ndị mmadụ imere m ebere.” Ya mere mgbe Aaron na-eme egwuregwu, ọ ghaghị imeri. Ma imeri ezughị. Ọ ghaghị iweda ndị ya na ha na-eme egwuregwu ala—na-eme ka mmeri ahụ fụkasịa ha ahụ.
Brent, n’aka nke ọzọ, bụ onye nne na nna na-atụ egwu Chineke zụlitere. Ma ọ na-ekweta, sị: “M ga-eme ka ndị mmadụ chịa ọchị, ma mgbe ụfọdụ adịghị m ama mgbe m ga-akwụsị, ana m emekwa ihe na-ewute mmadụ.” Ọchịchọ Brent ime ihe ọchị na ịdọta mmasị n’ebe onwe ya nọ kpataara ya ileghara mmetụta ndị ọzọ anya.—Ilu 12:18.
O yiri ka telivishọn na-emetụta ndị ntorobịa ndị ọzọ. Ihe nkiri ime mpụ na-eto ‘ndị dị ike’ ma na-eme ka o yie ka ịdị obiọma abụghị omume ndị ikom. Ihe nkiri ime ihe ọchị bụ́ ndị a ma ama jupụtara n’okwu njakịrị. Ndekọ akụkọ na-emekarị ka ọgụ na okwu iwe ndị e kwuru n’oge ihe omume egwuregwu pụta ìhè. Ndị enyi anyị pụkwara inwe mmetụta n’otú anyị si emeso ndị ọzọ. Mgbe ndị ọgbọ anyị bụ ndị ọchọ okwu, ọ na-adịrị anyị mfe isonyere ha iji zere anyị onwe anyị ịbụ ndị e lekwasịrị anya.
N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ gị, ọ bụrụ na ị na-eji ụzọ ịchọ okwu eme ihe, mgbe ahụ ọ bụghị nanị ndị i mesoro ya ka a na-emerụ ahụ.
Ihe Ndị Na-esi na Ya Apụta Na-adịru Oge Nile A Dị Ndụ
Magazin bụ́ Psychology Today na-akọ sị: “Ịchọ okwu pụrụ ịmalite na nwata, ma ọ na-aga n’ihu ruo mgbe e toruworo ogo mmadụ.” Otu ihe ọmụmụ nchọpụta a kọrọ akụkọ ya n’akwụkwọ akụkọ bụ́ The Dallas Morning News chọpụtara na “65 pasent nke ụmụ okoro a matara dị ka ndị ọchọ okwu na praịmarị nke abụọ ghọrọ ndị a mara ikpe maka ajọ mpụ mgbe ha na-erule afọ 24.”
N’eziokwu, ọ bụghị ndị ọchọ okwu nile na-aghọ ndị omekome. Ma ime ka ileghara mmetụta ndị ọzọ anya mara gị ahụ pụrụ ịkpatara gị ezigbo nsogbu ka oge na-aga ná ndụ. Ọ bụrụ na e buru ya baa n’alụmdi na nwunye, ọ pụrụ ịkpatara onye òtù ọlụlụ gị na ụmụ gị oké nsogbu. Ebe ọ bụ na ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-enwe mmasị ná ndị ha na ndị ọzọ na-adị ná mma, ọ pụrụ ime ka ohere dị iche iche nke inweta ọrụ funahụ gị. N’otu aka ahụ a pụrụ ijichi ihe ùgwù ije ozi ọdịnihu n’ọgbakọ ndị Kraịst. “Otu ụbọchị, m ga-achọ iru eru ije ozi dị ka okenye,” ka Brent na-ekwu, “ma papa m nyeere m aka ịghọta na ndị mmadụ agaghị eji nsogbu ha abịakwute m ma ọ bụrụ na ha echee na m ga-ekwu okwu njakịrị.”—Taịtọs 1:7.
Ụzọ Isi Gbanwee
Anyị adịghị ahụkebe adịghị ike anyị nke ọma mgbe nile. Akwụkwọ Nsọ na-adọ anyị aka ná ntị na mmadụ pụrụ ọbụna ‘ịgwa onwe ya okwu ire ụtọ n’anya onwe ya, banyere ịchọpụta ajọ omume ya na ịkpọ ya asị.’ (Abụ Ọma 36:2) Ya mere ị pụrụ ịgbalị ịjụ nne ma ọ bụ nna, enyi a tụkwasịrị obi, ma ọ bụ onye Kraịst tozuru okè ihe ọ chọpụtara. Ihe bụ eziokwu pụrụ ịfụ ụfụ n’ahụ, ma ọ pụrụ nnọọ inyere gị aka ịhụ mgbanwe ndị dị gị mkpa ime. (Ilu 20:30) “Echere m na ige ntị bụ ihe kasị ukwuu nyeere m aka,” ka Aaron na-ekwu. “Ndị na-ekwu eziokwu gwara m ebe ndị m na-agahie. Ọ bụghị mgbe nile ihe m chọrọ ịnụ, kama ọ bụ ihe dị m mkpa n’ezie.”
Nke a ọ̀ pụtara na ị ghaghị ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mgbanwe dị ukwuu n’ụdị onye ị bụ n’ozuzu ya? Ee e, o yikarịrị ka ọ ga-abụ nanị okwu nke imezigharị echiche gị na akparamàgwà gị ụfọdụ. (2 Ndị Kọrint 13:11) Dị ka ihe atụ, ruo ugbu a ikekwe i chewo na ị karịrị ndị ọzọ n’ihi otú ị hà, ume gị, ma ọ bụ ịghọta ihe ngwa ngwa gị. Ma Bible na-agba anyị ume iji ‘obi dị umeala na-agụrịta ibe anyị ná ndị ka anyị onwe anyị mma.’ (Ndị Filipaị 2:3) Mata na ndị ọzọ—n’agbanyeghị otú ha hà ma ọ bụ ume ha—nwere àgwà ọma ndị ị na-enweghị.
Ọ pụkwara ịdị gị mkpa iwepụ n’ime onwe gị àgwà nke iwe iwe ọkụ ma ọ bụ ịchịkwa ndị ọzọ. Rụọ ọrụ ‘n’eleghị ihe nke aka gị anya, kama n’ihe nke mmadụ ibe gị.’ (Ndị Filipaị 2:4) Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ikwu okwu, mee nke ahụ n’akpọghị mmadụ iyi, n’ekwughị okwu njakịrị, ma ọ bụ okwu mkparị.—Ndị Efesọs 4:31.
Ọ bụrụ na a nwaa gị ịchọ okwu, cheta na Chineke bibiri ndị Nefilim na-achọ okwu. (Jenesis 6:4-7; 7:11, 12, 22) Ọtụtụ narị afọ n’ihu, n’ụbọchị Ezikiel onye amụma, Chineke gosipụtara oké enweghị mmasị n’ahụ ndị ahụ ikpe ‘inuzụga’ na ‘ịsọzụga’ ndị na-enweghị enyemaka mara. (Ezikiel 34:21) Ịmata na Jehova kpọrọ ndị ọchọ okwu asị pụrụ ịbụ ihe mkpali siri ike nye mmadụ iji mee mgbanwe ndị dị mkpa!
Iji ekpere tụgharịa uche n’ụkpụrụ dị iche iche nke Bible na-enyekwa aka. Ụkpụrụ Ọma ahụ na-ekwu, sị: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu.” (Matiu 7:12) Mgbe a nwara gị ịmaja mmadụ, jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-enwe mmasị ka a na-akwagharị m, majaa m, ma ọ bụ wetuo m n’ala? Mgbe ahụ gịnị mere m ji na-emeso ndị ọzọ otú ahụ?’ Bible na-enye anyị iwu ka anyị ‘nwerịta obiọma n’ahụ ibe anyị, nwee obi ọmịiko.’ (Ndị Efesọs 4:32) Jisọs setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè n’akụkụ nke a. Ọ bụ ezie na ọ karịrị mmadụ nile ọzọ, o mesoro mmadụ nile n’ụzọ obiọma, obi ọmịiko, na nkwanye ùgwù. (Matiu 11:28-30) Gbalịa ime otu ihe ahụ ma ọ bụrụ na i zute onye ị karịrị ike—ma ọ bụ ọbụna na-akpasu gị iwe.
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ọ bụ mmetụta nke iwe banyere otú e si emeso gị n’ụlọ na-akpali àgwà ise okwu gị? N’ọnọdụ ụfọdụ, iwe dị otú ahụ pụrụ izi ezi. (Tụlee Eklisiastis 7:7.) Ma, Bible na-agwa anyị na a dọrọ nwoke ezi omume ahụ bụ́ Job aka ná ntị, sị: “Lezie anya ka ọnụma ghara ịrafu gị [banye] n’otiti ihe . . . Lezie anya, echela ajọ ihe ihu.” (Job 36:18, 21) Ọ bụrụgodị na a na-emejọ gị, i kwesịghị imejọ ndị ọzọ. Ihe ka mma ime bụ isoro ndị mụrụ gị kwurịta okwu ahụ. Ọ bụrụ na ị bụ onye e mejọrọ nke ukwuu, enyemaka sitere n’ebe ọzọ pụrụ ịdị mkpa iji chebe gị pụọ ná mmerụ ahụ ọzọ.
Mgbanwe nwere ike ọ gaghị adị mfe, ma o kwere omume. Brent na-ekwu, sị: “Ana m ekpe ekpere banyere nke a ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụbọchị nile, Jehova enyewokwara m aka ime mgbanwe ụfọdụ dị mma.” Ka ị na-eme mgbanwe n’otu aka ahụ n’ụzọ i si emeso ndị mmadụ, obi abụọ adịghị ya na ị ga-achọpụta na ndị mmadụ ga-enwe mmasị n’ebe ị nọ karị. Cheta, ndị mmadụ pụrụ ịdị na-atụ ndị ọchọ okwu ụjọ, ma ọ dịghị onye na-enwe mmasị n’ebe ha nọ n’ezie.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle nke otú ndị a na-achọ okwu pụrụ isi zere iyi egwu, lee “Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . . Gịnị Ka M Pụrụ Ime Banyere Ndị Na-achọ Okwu n’Ụlọ Akwụkwọ?,” ná mbipụta anyị nke August 8, 1989 (Bekee).
b A gbanwewo aha ụfọdụ.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 30]
“Ịchọ okwu pụrụ ịmalite na nwata, ma ọ na-aga n’ihu ruo mgbe e toruworo ogo mmadụ”
[Foto dị na peeji nke 29]
Ịkpọ iyi bụ otu ụdị nke ịchọ okwu