Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwyp isiokwu 12
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma A Chọwa M Okwu?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma A Chọwa M Okwu?
  • Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị bụ ịchọ okwu?
  • Olee ihe mere ndị mmadụ ji achọ ibe ha okwu?
  • Olee ụdị ndị a na-achọkarị okwu?
  • Gịnị ka ị ga-eme ma a chọọ gị okwu?
  • Gịnị Ka M Ga-eme ma A Chọwa M Okwu n’Ụlọ Akwụkwọ?
    Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
  • Nnwere Onwe Pụọ ná Nsogbu nke Iji Ike Emegbu Mmadụ
    Teta!—2003
  • Iji Ike Emegbu Mmadụ—Ihe Ụfọdụ Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe
    Teta!—2003
  • Iji Ike Emegbu Mmadụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
ijwyp isiokwu 12

NDỊ NA-ETO ETO NA-AJỤ, SỊ

Gịnị ka m ga-eme ma a chọwa m okwu?

  • Gịnị bụ ịchọ okwu?

  • Olee ihe mere ndị mmadụ ji achọ ibe ha okwu?

  • Olee ụdị ndị a na-achọkarị okwu?

  • Gịnị ka ị ga-eme ma a chọọ gị okwu?

Gụọ ụfọdụ ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru na ihe otu onye nkụzi kwuru gbasara ịchọ mmadụ okwu, zaakwa ajụjụ ụfọdụ gbasara ịchọ okwu.

Ịchọ okwu abụghị ihe e kwesịrị ileghara anya. Otu nnyocha e mere na Briten gosiri na e kee ndị na-eto eto gburu onwe ha ụzọ iri, ihe so mee ka ihe karịrị ụzọ anọ n’ime ha gbuo onwe ha bụ na a na-achọ ha okwu.

Gịnị bụ ịchọ okwu?

Ịchọ okwu abụghị naanị iti mmadụ ihe. Ụzọ ụfọdụ e nwere ike isi chọọ mmadụ okwu bụ:

  • Ịkọ mmadụ ọnụ. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri abụọ aha ya bụ Celine sịrị: “Ụmụ nwaanyị nwere ọnụ ọjọọ. Enweghị m ike ichefu aha ndị ha kpọrọ m ma ọ bụ ihe ndị ha kwuru. Ha mere ka m yie onye na-abaghị uru, onye a jụrụ ajụ, nakwa onye iberiibe. Ọ gaara akara m mma ma a sị na ha tiri m ihe.”

  • Ịkpapụ mmadụ iche. Nwa agbọghọ dị́ afọ iri na asatọ aha ya bụ Haley kwuru, sị: “Ụmụ akwụkwọ anyị malitere ịgbara m ọsọ. M bịa ka m soro ha nọrọ na tebụl rie nri, ha anọchie ebe niile ka m ghara iso ha nọrọ. N’afọ ahụ niile, m na-ebe ákwá, e nweghịkwa onye mụ na ya na-anọ eri nri.”

  • Isi n’Ịntanet achọ okwu. Nwa okorobịa dị́ afọ iri na anọ aha ya bụ Daniel kwuru, sị: “Naanị obere ihe mmadụ dere na kọmputa zipụ n’Ịntanet nwere ike imebi aha mmadụ ma ọ bụdị kpata nnukwu nsogbu. O nwere ike ịdị ka ihe na-enweghị ike ime eme, ma ọ na-eme.” Iji ekwentị ezipụ foto ma ọ bụ ozi ndị na-adịghị mma sokwa n’otú e si eji Ịntanet achọ mmadụ okwu.

Olee ihe mere ndị mmadụ ji achọ ibe ha okwu?

Lee ihe ụfọdụ nwere ike ịkpata ya.

  • A chọrọ hanwa okwu. Otu nwa okorobịa aha ya bụ Antonio kwuru, sị: “Otú ndị ọgbọ m si na-emesi m ike mere ka ike gwụ m, mụ amalitezie ịchọ ndị ọzọ okwu ka ndị ọgbọ m nwee mmasị n’ebe m nọ. M mechara chọpụta na ihe ahụ m mere adịghị mma.”

  • Ha mụtara ya n’aka ndị ọzọ. N’akwụkwọ Jay McGraw dere, nke a na-akpọ Life Strategies for Dealing With Bullies, ọ sịrị: ‘Ọtụtụ mgbe, ihe mere ndị na-eto eto ji achọ ndị ọzọ okwu bụ na ọ bụ otú ahụ ka nne ha na nna ha, ụmụnne ha ndị tọrọ ha, na ndị ọzọ nọ́ n’ezinụlọ ha si emeso ibe ha.’

  • Ha na-eme ka ha siri ike, ma ụjọ na-atụ ha. N’akwụkwọ Barbara Coloroso dere, nke a na-akpọ The Bully, the Bullied, and the Bystander, o kwuru, sị: “Ụmụaka ndị na-achọ okwu na-eme ka ha ka ndị ọzọ mma iji kpuchie obi ọjọọ na-eme ha nakwa ụjọ ji ha/Obi anaghị adị ụmụaka ndị na-achọ okwu mma. Ọ bụ ya mere ha ji achọ okwu ka obi wee dị ha mma.”

Olee ụdị ndị a na-achọkarị okwu?

  • Ndị na-anọ naanị ha. Ụfọdụ ndị na-eto eto ọ na-ara ahụ́ ịkpa ndị ọzọ nso na-anọkarị naanị ha, ya emezie ka ọ dịrị ndị ọchọ okwu mfe ịna-achọ ha okwu.

  • Ndị a na-ele anya na ha gbapụrụ iche. A na-achọ ụfọdụ ndị okwu maka otú ha dị, agbụrụ ha si, okpukpe ha na-ekpe ma ọ bụdị maka na ha nwere nkwarụ. Ihe ọ bụla ndị ọchọ okwu hụrụ ka ha na-eji achọ mmadụ okwu.

  • Ndị ụjọ na-atụkarị. Ndị ọchọ okwu na-ama ndị ụjọ na-atụkarị. Ọ bụ ụdị ndị ahụ ka ọ na-akacha adịrị ha mfe ịchọ okwu, ebe ha ma na ha agaghị emegwara ha.

Gịnị ka ị ga-eme ma a chọọ gị okwu?

  • Emela ka ihe ha na-eme ọ̀ na-ewe gị iwe. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kylie kwuru, sị: “Obi na-adị ndị ọchọ okwu ụtọ ma ha mata na ha emeela ka iwe wee gị. Ma, ọ bụrụ na i mee ka ihe ha na-eme ewuteghị gị, ha ga-akwụsị ịchọ gị okwu.” Baịbụl kwuru, sị: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.”​—Ilu 29:11.

  • E megwarala ha. Imegwara ha agaghị eme ka ha kwụsị ịchọ gị okwu, kama ọ ga-eme ka ha na-achọsikwu gị okwu ike. Baịbụl kwuru, sị: “Unu ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.”​—Ndị Rom 12:17; Ilu 24:19.

  • Gbaara nsogbu ọsọ. Gbaa mbọ na-ezere ndị ọchọ okwu. Agala ebe ha nwere ike ịchọ gị okwu. Emekwala ihe ga-eme ka ha chọọ gị okwu.​—Ilu 22:3.

  • Mee ihe ha na-atụghị anya ya. Baịbụl kwuru, sị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa.”​—Ilu 15:1.

  • Were ya ka egwuregwu. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye na-achọ gị okwu kọrọ gị ọnụ na i buru oké ibu, i nwere ike ịmụmụ ọnụ ọchị, sị ya: “Ọ dị ka ị̀ ma na m kwesịrị ifelatatụ.”

  • Si ebe ahụ pụọ. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri na itoolu aha ya bụ Nora kwuru, sị: “Ọ bụrụ na ị gba nkịtị, ọ ga-egosi na ị ma ihe nakwa na ị ka onye ahụ ike. Ọ ga-egosikwa na ị na-ejide onwe gị, bụ́ ihe onye ahụ na-achọ gị okwu na-agaghị emeli.”

  • Gbaa mbọ ka ị ghara ịna-atụ ụjọ. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Rita kwuru, sị: “Ndị ọchọ okwu na-ama mgbe ahụ́ na-erughị gị ala. Ha nweziri ike chọwa gị okwu mgbe ahụ ka ha menye gị ụjọ.”

  • Gwa ya onye ọzọ. Otu nnyocha e mere gosiri na ihe karịrị ọkara n’ime ndị e si n’Ịntanet chọọ okwu anaghị akọrọ ya onye ọzọ. O nwere ike ịbụ ihere mere na ha anaghị akọrọ ya onye ọzọ, karịsịa ma ọ bụrụ nwoke ka a chọrọ okwu ahụ. O nwekwara ike ịbụ maka na ha na-atụ ụjọ na a ga-emesikwu ha ike ma ha gwa ya onye ọzọ. Ma, cheta na ndị ọchọ okwu anaghị achọ ka ndị ọzọ mata ihe ha na-eme. N’ihi ya, ịgwa ndị ọzọ banyere okwu a chọrọ gị so n’ihe nwere ike ime ka ha kwụsị ịchọ gị okwu.

Ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru

“Agala ebe e nwere ike ịchọ gị okwu ma ọ bụ mee ihe nwere ike ime ka ọ dịrị ndị ọchọ okwu mfe ịchọ gị okwu. Cheta na ndị ọchọ okwu nwere nsogbu ndị ha na ha na-alụ. Ọ bụrụ na i buru ya n’obi, ọ ga-eme ka ihe ha gwara gị ghara iwute gị.”​—Antonio.

“Na-akata obi. Ụjọ atụla gị ịgwa ndị ọzọ ihe i kweere. Ndị ọchọ okwu ga-akwụsị ịchọ gị okwu ma ha hụ na ihe ha na-eme anaghị ewe gị iwe nakwa na ị naghị atụ ha ụjọ.”​—Jessica.

Ihe otu onye nkụzi kwuru

“Ịchọ okwu abụghị ihe e kwesịrị ileghara anya. N’ebe m na-akụzibu, ụmụ akwụkwọ na-alụdị ọgụ n’ime klas, ma ndị na-agụ elementrị nke atọ. Ihe mere ụfọdụ ụmụaka ji achọ ibe ha okwu bụ na ha chere na ọ ga-eme ka ha bụrụ ndị a ma ama nakwa iji gosi na ha siri ike.

“Ndị a chọrọ okwu anaghị achọ ịgwa ya ndị ọzọ n’ihi na ụjọ na-atụ ha na ndị ọchọ okwu ahụ ga-emesikwu ha ike ma ọ bụ na ụmụ klas ha ga-ele ha anya ọjọọ. Ha nwekwara ike ịna-eche na e nweghị otu a ga-esi kwụsị okwu ahụ a na-achọ ha. Ma, m na-agba onye ọ bụla a chọrọ okwu ume ka ọ gwa ya ndị ọzọ. Ọ bụ ihe onye ahụ kwesịrị ime, o nwekwara ike ime ka ndị ọchọ okwu ahụ ghara ịchọ ndị ọzọ okwu.”​—Jenilee. Ọ na-akụzibu n’otu ụlọ akwụkwọ dị́ n’Amerịka.

Ajụjụ gbasara ịchọ okwu

Zaa Eziokwu ma Ọ Bụ Ụgha

  1. Ọ dịla ezigbo anya ndị mmadụ malitere ịchọ ibe ha okwu.

  2. Ịchọ okwu e nweghị oké ihe ọ bụ, ọ bụ naanị ihe egwuregwu. E kwesịkwara ileghara ya anya.

  3. Ihe kacha mma ị ga-eme ka a kwụsị ịchọ gị okwu bụ ịchọgwara onye ahụ okwu.

  4. Ọ bụrụ na a na-achọ gị okwu, ọ pụtara na o nwere ihe i mere.

  5. Ụfọdụ ndị a chọrọ okwu na-emecha chọwa ndị ọzọ okwu.

  6. Ị hụ ebe a na-achọ mmadụ okwu, ọ kacha mma ka ị gba nkịtị.

  7. N’agbanyeghị na ndị ọchọ okwu na-etu ọnụ, mgbe ụfọdụ, ụjọ na-atụ ha.

  8. Ndị ọchọ okwu nwere ike ịgbanwe.

AZỊZA HA

  1. Eziokwu. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru banyere ndị a kpọrọ ndị Nefilim. Aha a bụ Nefilim pụtara “Ndị Na-akwatu Ndị Ọzọ.”​—Jenesis 6:4.

  2. Ụgha. Ịchọ okwu nwere ike ịkpata ọnwụ mmadụ. Ọ dị mwute na okwu a chọrọ ụfọdụ ndị ọtụtụ ugboro emeela ka ha gbuo onwe ha.

  3. Ụgha. Ndị ọchọ okwu na-esi ike karịa ndị ha na-achọ okwu, n’ihi ya, imegwara ha abaghị uru.

  4. Ụgha. O nweghị onye e kwesịrị ịchọ okwu. Ọ bụ ndị ọchọ okwu na-anọkata chọwa mmadụ okwu.

  5. Eziokwu. Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị na-eji iwe okwu a chọrọ ha chọwazie ndị ọzọ okwu.

  6. Ụgha. O nweghị otú ị ga-esi nọrọ ebe a na-achọ mmadụ okwu gba nkịtị, aka gị aghara ịdị na ya. Ọ bụrụ na ị hụ ka a na-achọ mmadụ okwu gbachi nkịtị, ọ pụtara na ị na-akwado ịchọ okwu, ọ bụghị ime ka ọ kwụsị.

  7. Eziokwu. Ọ bụ eziokwu na ndị ọchọ okwu na-etu ọnụ, ụjọ na-atụ ọtụtụ n’ime ha. Ọ bụ ya mere ha ji achọ ịkpasu ndị ọzọ iwe ka obi wee tọọ ha ụtọ.

  8. Eziokwu. Ọ bụrụ na e nyere ndị ọchọ okwu aka, ha nwere ike ịgbanwe àgwà ha na otú ha si eche echiche.​—Ndị Efesọs 4:​23, 24.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya