Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ypq ajụjụ 5 p. 15-17
  • Gịnị Ka M Ga-eme ma A Chọwa M Okwu n’Ụlọ Akwụkwọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Ka M Ga-eme ma A Chọwa M Okwu n’Ụlọ Akwụkwọ?
  • Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ma A Chọwa M Okwu?
    Ndị Na-eto Eto Na-ajụ, Sị
  • Nnwere Onwe Pụọ ná Nsogbu nke Iji Ike Emegbu Mmadụ
    Teta!—2003
  • Iji Ike Emegbu Mmadụ—Ihe Ụfọdụ Ndị Na-akpata Ya na Mmetụta Ndị Ọ Na-enwe
    Teta!—2003
  • Iji Ike Emegbu Mmadụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Azịza Ajụjụ Iri Ndị Na-eto Eto Na-ajụ
ypq ajụjụ 5 p. 15-17
Ebe otu nwata nwoke na-achọ ibe ya okwu n’ihu ụmụ akwụkwọ ibe ya

AJỤJỤ NKE 5

Gịnị Ka M Ga-eme ma A Chọwa M Okwu n’Ụlọ Akwụkwọ?

IHE MERE AJỤJỤ A JI DỊ MKPA

Ihe i mere nwere ike ime ka ihe ka mma ma ọ bụ ka njọ.

GỊNỊ KA Ị GA-EME?

Chegodị banyere ihe atụ a: Thomas achọghị ịga ụlọ akwụkwọ taa, echi, ma ọ bụ ụbọchị ọzọ. Nsogbu ya malitere ọnwa atọ gara aga mgbe ụmụ akwụkwọ ibe ya ji ya na-agba asịrị. Ha gụrụ ya ọtụtụ aha. Mgbe ụfọdụ, otu onye na-akụpụ akwụkwọ ndị o ji n’aka ma mee ka ọ maghị ụma mee ya. Ọ bụrụ na ha dị ọtụtụ, otu onye na-esi n’azụ kwaa ya aka, ma ọ tụgharịa, ọ gaghị ama onye n’ime ha mere ya. Ụnyaahụ, ha si n’Ịntanet zitere ya ozi na ha ga-emesi ya ike . . .

Ọ bụrụ na ị bụ Thomas, gịnị ka ị ga-eme?

CHEGODỊ ECHICHE

Ọ pụtaghị na e nweghị ihe ị ga-emeli. Nke bụ́ eziokwu bụ na ị ga-emerili onye na-achọ gị okwu n’emetụghị ya aka. Olee otú ị ga-esi eme ya?

  • JIDE ONWE GỊ. Baịbụl sịrị: “Onye nzuzu adịghị ejide mmụọ ya ma ọlị, ma onye maara ihe na-ejideru ya n’isi.” (Ilu 29:11) Ọ bụrụ na i jide onwe gị ma gbachi nkịtị, ike nwere ike ịgwụ ndị na-achọ gị okwu.

  • EMEGWARALA. Baịbụl sịrị: “Ejila ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:17) Imegwara ga-eme ka ihe ka njọ.

  • GBAARA NSOGBU ỌSỌ. Baịbụl sịrị: “Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo.” (Ilu 22:⁠3) Gbasie mbọ ike ka ị gbaara ndị nwere ike ịchọ gị okwu ọsọ. Emekwala ihe ga-eme ka a chọọ gị okwu.

  • MEE IHE Ọ NA-ATỤGHỊ ANYA YA. Baịbụl sịrị: “Azịza dị nro na-eme ka ọnụma laa.” (Ilu 15:⁠1) I nwedịrị ike ikwu ihe na-atọ ọchị. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na onye na-achọ gị okwu akpọọ gị akpa akpụ, i nwere ike ịchịtụ ọchị, sị ya, “Ọ dị ka ị̀ ma na m kwesịrị ifelatatụ.”

  • GBACHI YA NKỊTỊ. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri na itoolu aha ya bụ Nora sịrị: “Ịgba nkịtị ga-egosi na ị bụ dimkpa nakwa na ị ka onye ahụ ike. Ọ ga-egosikwa na ị na-ejide onwe gị. Ọ bụ ihe onye na-achọ gị okwu na-agaghị emeli.”​—⁠2 Timoti 2:⁠24.

  • GBALỊA KA Ị GHARA ỊNA-ATỤ ỤJỌ. Ndị ọchọ okwu na-amakarị ndị obi na-akaghị, ndị na-agaghị emegwara ma a chọọ ha okwu. Ma ike ga-agwụ ọtụtụ ndị ọchọ okwu ma ha hụ na i kweghị ka ha menye gị ụjọ.

  • GWA YA ONYE ỌZỌ. Otu onye bụ́bu onye nkụzi sịrị: “Ihe m na-agwa onye a na-achọ okwu bụ ka ọ gwa ya onye ọzọ. Ọ bụ ihe onye ahụ kwesịrị ime. O nwere ike ime ka ọchọ okwu ahụ ghara ịchọ onye ọzọ okwu.”

Ebe otu nwa okorobịa katara obi legide onye na-achọ ya okwu anya

Ịkata obi ga-eme ka i nwee ụdị ike onye na-achọ gị okwu na-enweghị

Ị̀ MAARA?

Ịchọ okwu abụghị naanị ịkụ mmadụ ihe, o nwekwara ike bụrụ:

  • Ebe okwu yiri ọkụ si ọchọ okwu n’ọnụ na-apụta

    Ịgwa mmadụ okwu ọjọọ. Otu nwa agbọghọ dị́ afọ iri abụọ aha ya bụ Celine sịrị: “Agaghị m echefu aha ndị ha kpọrọ m ma ọ bụ ihe ndị ha gwara m. Ha mere ka ọ dị́ m ka abaghị m uru, na a jụrụ m ajụ, nakwa na m dị iberiibe. Ọ gaara akara m mma ma a sị na a kụrụ m isi aba okpu.”

  • Ebe otu nwa okorobịa nọ naanị ya n’ihi na ụmụaka ibe ya na-agbara ya ọsọ

    Ịkpapụ mmadụ iche. Otu nwa okorobịa dị́ afọ iri na asatọ aha ya bụ Haley sịrị: “Ụmụ akwụkwọ ibe m malitere ịgbara m ọsọ. Ha na-eme ka ọ dị́ ka ebe a na-anọ eri nri ehihie agaghị aba m, ya emezie ka mụ na ha ghara ịnọ. N’afọ ahụ niile, m na-ebe ákwá, e nweghịkwa onye mụ na ya na-anọ eri nri.”

  • Ebe otu nwa agbọghọ e si n’Ịntanet chọọ okwu na-agbara kọmputa ọsọ

    Isi n’Ịntanet achọ mmadụ okwu. Otu nwa okorobịa dị́ afọ iri na anọ aha ya bụ Daniel sịrị: “Naanị mkpụrụ okwu ole na ole mmadụ dere na kọmputa nwere ike imebi aha onye ọzọ ma ọ bụdị kpatara onye ahụ nsogbu ọzọ. Ọ dị ka ihe na-enweghị ike ime eme. Ma, o nwere ike ime.”

AJỤJỤ GBASARA ỊCHỌ OKWU

ZAA EZIOKWU MA Ọ BỤ ỤGHA

AZỊZA

1 Ndị mmadụ na-achọ ibe ha okwu kemgbe ọtụtụ puku afọ.

1 Eziokwu. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru banyere ndị Nefilim. Aha a a kpọrọ ha pụtara “Ndị Na-akwatu Ndị Ọzọ.”​—⁠Jenesis 6:⁠4.

2 Ịchọ okwu bụ naanị ihe egwuregwu. Ọ bụghị oké ihe. O nweghịkwa ihe ọ na-eme mmadụ.

2 Ụgha. Ịchọ okwu so n’ihe na-eme ka ọtụtụ ndị na-eto eto gbuo onwe ha.

3 Otú kacha mma ị ga-esi mee ka a kwụsị ịchọ gị okwu bụ ịchọgwara onye ahụ okwu.

3 Ụgha. Ọtụtụ mgbe, ndị na-achọ okwu na-esi ike karịa ndị ha na-achọ okwu. N’ihi ya, imegwara ha abaghị uru.

4 Ị hụ ebe a na-achọ mmadụ okwu, ọ kacha mma ka ị gba nkịtị.

4 Ụgha. E nweghị otú ị ga-esi nọrọ ebe a na-achọ mmadụ okwu gba nkịtị, ya abụrụ na aka gị dị ọcha. Ị hụ ebe a na-achọ mmadụ okwu gbachi nkịtị, ọ pụtara na ị na-akwado ịchọ okwu, ọ bụghị ime ka ọ kwụsị.

5 N’agbanyeghị na ndị na-achọ okwu na-etu ọnụ, ọtụtụ mgbe, obi anaghị esicha ha ike.

5 Eziokwu. Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị na-achọ okwu na-ebuli onwe ha elu, obi anaghị akacha ọtụtụ n’ime ha. Ha na-akparị ndị ọzọ ka ha nwee obi ụtọ.

6 Ndị na-achọ okwu nwere ike ịgbanwe.

6 Eziokwu. E nyere ndị na-achọ okwu aka, ha nwere ike ịgbanwe àgwà ha na otú ha si eche echiche.

IHE M GA-EME

  • Mmadụ chọwa m okwu, gịnị ka m ga-eme ma ọ bụ kwuo?

CHỌPỤTA IHE NDỊ ỌZỌ

Otú Ị Ga-esi Emeri Onye Na-achọ Gị Okwu n’Emetụghị Ya Aka

Lee katuun a na-ese na bọọdụ bụ́ Otú Ị Ga-esi Emeri Onye Na-achọ Gị Okwu n’Emetụghị Ya Aka, dị́ na www.jw.org/⁠ig. (Gaa n’ebe e dere IHE BAỊBỤL NA-AKỤZI, pịa ebe e dere NDỊ NA-ETO ETO)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya