Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 5/8 p. 10-11
  • Olee Okpukpe Chineke Kwadoro?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Olee Okpukpe Chineke Kwadoro?
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mgbalị Ime Ngọpụ
  • Ndị A Matara Site ná Mkpụrụ Ha
  • Okpukpe nke Chineke Kwadoro
  • Okpukpe Nile nke Ụwa Hà Na-enye Nduzi Ziri Ezi?
    Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Okpukpe Nile Hà Na-amasị Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
  • Ọ̀ Bụ Otu Chineke Ka Okpukpe Niile Na-efe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ihe Mere Okpukpe Ụwa Ga-eji Abịa ná Njedebe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 5/8 p. 10-11

Olee Okpukpe Chineke Kwadoro?

N’ỤZỌ dị mwute, ịkpọasị okpukpe na France nke narị afọ nke 16 akwụsịghị. Na narị afọ na-esonụ, ajọ mbunobi miri emi tọsara Europe, ka ndị Katọlik na ndị Protestant banyere ọzọ n’ọgbọ agha n’ime Agha Iri Afọ Atọ (1618-1648). N’aha Chineke, ndị sịrị na ha bụ ndị Kraịst maliteghachiri ogbugbu obi ọjọọ nke ibe ha.

Ịkpọasị na ogbugbu okpukpe akwụsịbeghị. Ndị Katọlik na ndị Protestant egburịtawo onwe ha na Ireland n’oge na-adịbeghị anya, ndị òtù nke okpukpe Orthodox na Roman Katọlik emewokwa otu ihe ahụ n’ókèala nke ebe bụbu Yugoslavia. N’agbanyeghịkwa otú o yiruru ihe a na-apụghị ikwere, n’oge Agha Ụwa Mbụ na nke Abụọ, ma ndị Katọlik ma ndị Protestant gburu ọtụtụ narị puku nke ndị òtù okpukpe nke ha n’ọgbọ agha. È nwere ngọpụ maka ogbugbu nke a? Gịnị bụ echiche Chineke?

Mgbalị Ime Ngọpụ

Akwụkwọ 1995 Britannica Book of the Year na-ekwu, sị: “Ọtụtụ ìgwè mmadụ nwalere ngọpụ n’ụzọ nkà mmụta okpukpe na 1994.” Ihe karịrị afọ 1,500 gara aga, onye ọkà ihe ọmụma Katọlik bụ́ “Senti” Augustine mere mgbalị yiri nke ahụ inye ngọpụ maka igbu mmadụ. Dị ka New Catholic Encyclopedia si kwuo, ọ “bụ onye malitere ozizi agha ziri ezi,” akwụkwọ nkà mmụta ahụ na-ekwukwa na iche echiche ya ‘na-enwe mmetụta ọbụna n’oge a.’

Chọọchị Katọlik, Orthodox, na Protestant agbachiwo nkịtị, na ọbụna kwadoo, ogbugbu n’aha Chineke. Ọ bụ ezie na ihe ndekọ nke okpukpe ndị a bụ nke jupụtara n’ọbara, nke ọtụtụ okpukpe ndị ọzọ bụ isi n’ụwa akaghịkwa mma. Mgbe ahụ, olee otú ị pụrụ isi mata ndị na-efe ezi ofufe?

Ọ bụghị nanị site n’ige ntị n’ihe ha na-asị na ha kwere. Banyere okwu a, Jisọs Kraịst dọrọ aka ná ntị, sị: “Kpachara anya maka ndị amụma ụgha na-abịakwute unu dị ka a ga-asị na ha bụ atụrụ ma n’okpuru ha bụ anụ ọhịa wolf ọjọọ. Unu ga-enwe ike ịmata ha site ná mkpụrụ ha. . . . Osisi dị mma na-amịpụta mkpụrụ dị mma ma osisi na-adịghị mma mkpụrụ na-adịghị mma. . . . A na-egbutu osisi ọ bụla nke na-adịghị amịpụta mkpụrụ dị mma ma tụba ya n’ọkụ.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.)—Matiu 7:15-20, The New Jerusalem Bible.

Ndị A Matara Site ná Mkpụrụ Ha

Ọtụtụ nde ndị nwere obi eziokwu na-amata na okpukpe ndị dị n’ụwa bụ “osisi na-adịghị mma” nke mịpụtaworo “mkpụrụ na-adịghị mma,” karịsịa, site n’ịkwado agha ndị jupụtara ná nkwafu ọbara. N’ime Bible a kọwara alaeze ụwa nke okpukpe ụgha dị ka nwanyị na-akwa iko n’ụzọ ime mmụọ nke a kpọrọ “Babilọn Ukwu ahụ.” Bible na-asị na “n’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.”—Mkpughe 17:3-6; 18:24.

N’ihi ya, kama ịkwado agha nke ndị ndú okpukpe gọziworo, n’oge na-adịghị anya Chineke ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’isi okpukpe ndị ahụ gbuworo mmadụ n’aha ya. Ọ ga-eme nke a ná mmezu nke amụma Bible nke na-asị: “A ga-atụda Babilọn, bụ́ obodo ukwu ahụ, n’oké ọdịda, a gaghị ahụkwa ya ọzọ ma ọlị.” Mgbe ihe omume ahụ na-enye ọṅụ weere ọnọdụ, Chineke ‘ga-ekpeworị oké nwanyị ahụ na-akwa iko ikpe’ ma ‘bọọ ọ́bọ̀ ọbara ndị ohu Ya n’isi ya.’—Mkpughe 18:21; 19:2.

Ndị ogbugbu nile nke e meworo n’aha Chineke na-ewute pụrụ ịjụ ma è nwere ndị Kraịst na-ebi ndụ n’ezie n’ụzọ kwekọrọ n’amụma Bible ahụ bụ́: “Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha nile ka ha bụrụ mma ogè, na ube ha nile ka ha bụrụ mma ịkwa osisi: mba agaghị ebuli mma agha megide mba, ha agaghị amụtakwa agha ọzọ.” (Aịsaịa 2:4) Ị̀ maara ndị na-atụ egwu Chineke n’eziokwu bụ́ ndị jụworo agha?

Okpukpe nke Chineke Kwadoro

Ihe ọmụmụ nkà mmụta mmekọrịta ọha na eze a kpọrọ “Ihe Ọmụma Banyere Ịgọpụ Ime Ihe Ike,” nke Mahadum Michigan bipụtara, kwuru, sị: “Eri mmalite nke narị afọ a, Ndịàmà Jehova anọgidewo na-ejigide nguzo ha nke ‘Nnọpụiche Ndị Kraịst’ n’emeghị ihe ike n’ime oge agha ụwa abụọ gbara ọkpụrụkpụ na ná nkwata ndị agha nke oge ‘Agha Nzuzo.’” N’ịkọwa ihe mere Ndịàmà ahụ ji nọpụ iche, ihe ọmụmụ ahụ sịrị: “Nkụzi nke Ndịàmà Jehova gbanyere mkpọrọgwụ ná nkwenye ha bụ na Bible bụ okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ.”

Ee, Ndịàmà Jehova na-ebi ndụ kwekọrọ na Bible, nke na-akụzi, sị: “N’ime nke a ka ụmụ Chineke bụ ndị e meworo ka ha pụta ìhè, ha na ụmụ ekwensu: onye ọ bụla nke na-adịghị eme ezi omume esighị na Chineke pụta, onye nke na-adịghị ahụ nwanna ya n’anya esighịkwa na Ya pụta. . . . Ka anyị hụrịta onwe anyị n’anya: ọ bụghị dị ka Ken si . . . gbuo nwanne ya.”—1 Jọn 3:10-12.

Ndịàmà Jehova na-adọtakarị uche ndị mmadụ gaa n’ikpe ọmụma ọbara nke okpukpe ụwa. Ha ekwupụtawokwa arịrịọ Bible ahụ dị ngwa: “Ndị nke m, sinụ n’ime ya [Babilọn Ukwu ahụ] pụta, ka unu wee ghara iso ya nwekọọ mmehie ya nile, gharakwa ịnata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya nile: n’ihi na mmehie ya nile rapakọrọ n’otu ruo eluigwe, Chineke chetakwara ajọ omume ya nile.”—Mkpughe 18:4, 5.

Ọtụtụ ndị nwere ezi obi na-aṅa ntị n’òkù ahụ ịhapụ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha. Ọ bụrụ na ogbugbu nile a na-eme n’aha okpukpe na-awụ gị ibobo n’ahụ nke ukwuu, anyị na-akpọ gị òkù ịkpọtụrụ onye nyere gị magazin a ma ọ bụ degaa akwụkwọ ozi n’otu n’ime adres ndị e depụtara na peji nke 5. Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmụta banyere nkwa Bible banyere ụwa ọhụrụ nke ezi omume, nke agha na-agaghị adịkwa.—Abụ Ọma 46:8, 9; 2 Pita 3:13.

[Foto dị na peeji nke 10]

“Ha na-ekwupụta na ha matara Chineke; ma ọrụ nile ha ka ha ji gọnarị ya.” Taịtọs 1:16

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya