Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 6/8 p. 11-12
  • Ha Kpọrọ Ya Ntụrụndụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ha Kpọrọ Ya Ntụrụndụ
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe A Na-amụta Site n’Akụkọ Ihe Mere Eme nke Rom
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2002
  • Otú Anyị Ga-esi Na-ahọrọ Ntụrụndụ Dị Mma
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • Jiri Ihe Ga-amasị Jehova Na-eme Onwe Gị Obi Ụtọ
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Lezie Anya Mgbe Ị Na-ahọrọ Ihe Ndị I Ji Atụrụ Ndụ
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 6/8 p. 11-12

Ha Kpọrọ Ya Ntụrụndụ

ỤLỌ egwuregwu ukwu ahụ jupụtara n’oké ọṅụ. Ọtụtụ iri puku zukọtara maka otu n’ime ihe nkiri kasị akpali akpali nke Rom oge ochie. E ji ọkọlọtọ, rose, na ákwà mgbochi tụrụ àgwà chọọ ọgbọ egwuregwu ahụ oké mma. Isi mmiri na-asụpụta mmiri na-esi ísì ọma, na-etinyetụ ísì ụtọ n’ikuku. Ndị nwere ego yi ákwà ha ndị kasị maa mma. Ntiwapụ nke ọchị tigwara mkparịta ụka nke ìgwè mmadụ ahụ, ma ejighị ihe kpọrọ ihe nke ìgwè mmadụ a kpuchiri iyi egwu nke ihe gaje iwere ọnọdụ.

N’oge na-adịghị anya ụda na-agba àmà ihe ọjọọ nke tuba kpọpụtara mmadụ abụọ na-alụ ọgụ ọnwụ ịlụ ọgụ. Ìgwè mmadụ ahụ na-agba aghara mgbe ndị ahụ na-asọ mpi malitere ibekasị onwe ha n’ụzọ emeghị ebere. Mkpu ịja ike na-adachi ntị nke ndị na-ekiri ihe na-emenụ na-eme ka a ghara ịnụ ụda nke nkụkọrịta mma agha. Na mberede, n’ime ihe n’ụzọ dị ngwa, otu onye na-asọ mpi tituru onye na-alụso ya ọgụ n’ala. Olileanya nke onye ahụ na-alụ ọgụ ọnwụ bụ́ onye e tituru n’ala dịzi ugbu a n’aka ndị na-ekiri ihe na-emenụ. Ọ bụrụ na ha fegharịa hankachif ha, ọ ga-adị ndụ. N’otu mmegharị ahụ nke mkpịsị aka ukwu ha, mkpọkọta ahụ—gụnyere ndị inyom na ụmụ agbọghọ—nyere iwu ka e tie ihe otiti ahụ ga-eweta ọnwụ. Na nwa oge, a dọkpụpụrụ ozu ahụ n’ala ọgbọ egwuregwu ahụ, a na-eji shọvel kpoghaa ájá ahụ nke ọbara dere, e fesasịrị ájá ọhụrụ, ìgwè ahụ kwadebere onwe ha maka akụkụ fọdụrụnụ nke oké mgbukpọ ahụ.

Nye ọtụtụ ndị bi na Rom oge ochie, nke ahụ bụ ntụrụndụ. “Ọbụna onye kasị akwalite omume ọma ekwughị ihe ọ bụla megide mmasị a ná mwụfu ọbara,” ka akwụkwọ bụ́ Rome: The First Thousand Years na-ekwu. Egwuregwu ịlụ ọgụ ọnwụ bụ nanị otu ụdị nke ntụrụndụ rere ure Rom nwere. A na-egosikwa ọgụ ụgbọ mmiri mere eme maka obi ụtọ nke ndị na-ekiri ihe na-emenụ bụ́ ndị nkwafu ọbara na-amasị. A na-enwe ọbụna ogbugbu ihu ọha, ebe a ga-ekegide onye omekome a mara ikpe ọnwụ n’osisi, anụ ọhịa ndị a kwụwara agụụ abịakwa ripịa ya.

Nye ndị mmasị ha ná nkwafu ọbara na-erughị otú a, Rom na-enye ụdị ihe nkiri dị iche iche. N’ihe nkiri imegharị ahụ n’ekwughị okwu—egwuregwu ndị dị mkpirikpi banyere ndụ a na-adị kwa ụbọchị—“ịkwa iko nke di ma ọ bụ nwunye na mmekọrịta ịhụnanya bụ isiokwu ndị bụ isi,” ka Ludwig Friedländer dere n’akwụkwọ bụ́ Roman Life and Manners Under the Early Empire. “Asụsụ ha jupụtara n’okwu ndị rụrụ arụ, okwu ọchị ndị rere ure, na-enwe ọtụtụ ịgbarụ ihu, mmegharị ahụ rụrụ arụ, na, nke ka nke, ite egwú ọjà ndị na-adịghị mma ile anya.” Dị ka The New Encyclopædia Britannica si kwuo, “e nwere ihe àmà na a kwara iko n’ezie n’ọgbọ ihe nkiri imegharị ahụ n’ekwughị okwu n’oge Alaeze Ukwu Rom.” Friedländer nwere ezi ihe mere o ji kpọọ ihe nkiri imegharị ahụ n’ekwughị okwu “nke kasị gabiga ókè n’ụzọ pụtara ìhè n’omume rụrụ arụ na okwu rere ure,” o kwukwara, sị: “Akụkụ ndị kasị jọọ njọ bụ ndị a na-akụkarịsịrị aka.”a

Gịnị banyere taa? Mmasị ụmụ mmadụ ná ntụrụndụ ọ̀ gbanweela? Tụlee ihe àmà e nwere, dị ka a tụlere n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Mgbe ụfọdụ, a na-egbu mmadụ n’elu ebe ihe nkiri iji mee ka mmepụta ihe nkiri ahụ bụrụ eziokwu. Akwụkwọ bụ́ The Civilization of Rome na-ekwu, sị: “Ọ bụghị ihe a na-adịghị ahụkarị bụ́ onye omekome a mara ikpe ọnwụ iwere ọnọdụ onye na-eme ihe nkiri n’oge a ga-egbu mmadụ.”

[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 11]

The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya