Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 7/8 p. 17-21
  • Ọchịchọ Anyị Chọrọ—Ikpe Ziri Ezi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọchịchọ Anyị Chọrọ—Ikpe Ziri Ezi
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsogbu Mụ na Chọọchị
  • Ọrụ Soja na Alụmdi na Nwunye
  • Mmegide Isi Ike M
  • E Mejuru Ọchịchọ M Maka Ikpe Ziri Ezi
  • E Ruru Obi M n’Ikpeazụ
  • Ịchụso Ozi Oge Nile
  • Mgbe A Ga-enweta Ikpe Ziri Ezi n’Ozuzu Ya
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
Teta!—1997
g97 7/8 p. 17-21

Ọchịchọ Anyị Chọrọ—Ikpe Ziri Ezi

DỊ KA ANTONIO VILLA SI KỌỌ

Na 1836, ndị soja Mexico dị ihe dị ka ndị ikom 4,000 gburu ndị nchebe Texas nile bụ́ ndị Òtù Alamo—ndị ọnụ ọgụgụ ha na-erughị 200. Mgbe nke a gasịrị, e jiri egwú agha bụ́ “Cheta Ndị Òtù Alamo” kpasuo ọgụ maka nnwere onwe, bụ́ nke e nwetara mgbe e mesịrị n’afọ ahụ. Na 1845, ihe bụbu akụkụ nke Mexico ghọrọ akụkụ nke United States, ndị Mexico chọtakwara onwe ha n’ókèala ndị iro. A ka na-echeta esemokwu agbụrụ.

A MỤRỤ m na 1937, n’ebe na-adịghị anya site na San Antonio, Texas, ebe e nwere Òtù Alamo. N’oge ndị ahụ a na-ede n’ebe ịsa ahụ, ebe a na-aṅụ mmiri, na ihe onwunwe ọha na eze ndị ọzọ “Nanị Ndị Ọcha” na “Ndị Ọzọ.” Aghọtara m ngwa ngwa na “Ndị Ọzọ” gụnyere anyị onwe anyị bụ́ ndị Mexico.

A na-ele ihe nkiri n’ụlọ sịnịma, a na-ekwe ka ndị Mexico na ndị isi ojii nọdụ ala nanị na varanda, ọ bụghị n’ime ụlọ mgbakọ. Ọtụtụ ụlọ nri na ụlọ ahịa adịghị eresi ndị Mexico ihe. N’otu oge mgbe nwunye m, bụ́ Velia, na nwanne ya nwanyị bara n’otu ụlọ a na-emezi isi, ndị nwe ebe ahụ enweghị ọbụna olu ọma ịsị: “Anyị adịghị anabata ndị Mexico ebe a.” Nanị ihe ha mere bụ ịchị ha ọchị ruo mgbe ihere mere ka Velia na nwanne ya nwanyị pụọ.

N’oge ụfọdụ, ụmụ nwoke ndị ọcha—karịsịa mgbe ha ṅụbigara mmanya ókè—ga-achọrọ ndị inyom Mexico, bụ́ ndị ọtụtụ weere dị ka ndị rụrụ arụ site n’ọmụmụ. Echere m, ‘Ha agaghị esoro anyị kerịta ebe ịsa ahụ ma ọ bụ ebe a na-aṅụ mmiri, ma ha ga-eso ndị inyom Mexico kerịta àkwà.’ Ikpe na-ezighị ezi ndị a mere m na mbụ ịnọ n’enweghị nchebe, na mgbe e mesịrị ịka anya.

Nsogbu Mụ na Chọọchị

Ihu abụọ nke okpukpe mekwuru m obi ilu. Ndị ọcha, ndị isi ojii, na ndị Mexico nwechara chọọchị nke ha. Mgbe m na-akwadebe maka Oriri Nsọ mbụ m dị ka onye Katọlik, onye ụkọchukwu nyefere m ụfọdụ envelopu e denyere ụbọchị ndị dị n’ihu ka m nye nna m. Anyị ga-eweghachi otu envelopu e tinyere onyinye kwa izu. Nwa oge nke a gasịrị, ụkọchukwu ahụ gwara m, sị: “Ọ kara gị mma ịgwa papa gị na envelopu ndị ahụ adịghị erute ebe a.” Okwu ndị nna m kwuru n’iwe nwere mmetụta n’ahụ m: “Ọ gwụla ihe na-amasị ha—ego!”

Dị ka a mazuru, e nwegasịrị akụkọ ọjọọ a na-akọ na ndị okwuchukwu kpọọrọ ndị inyom nọ n’ọgbakọ ha gbafuo. Ahụmahụ ndị dị ka ndị ahụ dujere m n’ikwupụta ugboro ugboro, sị: “Okpukpe nwere nanị nzube abụọ—ma ọ́ bụghị inweta ego gị ọ bụrụ ịkpọrọ nwanyị gị.” N’ihi ya, mgbe Ndịàmà Jehova ga-abịa, aga m achụpụ ha, na-asị: “Ọ bụrụ na m chọrọ okpukpe, aga m achọwa ya n’onwe m.”

Ọrụ Soja na Alụmdi na Nwunye

Na 1955, esonyere m Ndị Agha Ụgbọelu United States, bụ́ ebe m nwere olileanya na site n’imekarịcha nke ọma n’ọrụ m, na apụrụ m inweta nkwanye ùgwù a jụworo inye m dị ka onye Mexico. Site n’itinye uche m, aghọrọ m onye a rịbara ama, n’ikpeazụ bụrụ onye e nyefere ilekọta ọdịdị ihe ndị e ji arụ ọrụ. Nke a gụnyere ileru ngalaba ndị ọzọ nke ọrụ soja anya.

Na 1959, alụrụ m Velia. Velia abụwo mgbe nile onye okpukpe na-amasị. Ma, chọọchị dị iche iche ọ gara mechuru ya ihu. Otu ụbọchị na 1960, mgbe ọ na-enwe oké ịda mbà n’obi, o kpere ekpere, sị: “Biko, Chineke, ọ bụrụ na ị dị adị, mee ka m mara. Achọrọ m ịmara gị.” N’otu ụbọchị ahụ otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara n’ebe obibi anyị na Petaluma, California.

Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya nke a gasịrị, Velia na Ndịàmà ahụ kwụsịrị inwe mmekọrịta n’ihi mgbanwe n’ọrụ soja m. Ọ bụzi na 1966, mgbe m nọ na Vietnam, ka ọ maliteghachiri ọmụmụ Bible ya na ha na Seminole, Texas. Mgbe m si Vietnam lọta ná mmalite afọ sochirinụ, obi adịghị m ụtọ ịhụ ya ka ya na Ndịàmà ahụ na-amụ Bible.

Mmegide Isi Ike M

Echere m na okpukpe ga-aghọgbu ma wetara Velia mmechuihu. N’ihi ya anọnyere m n’ọmụmụ ihe ahụ ma gee ntị maka ohere iji kpughee ihe àmà kasị pee mpe nke ihu abụọ. Mgbe nwanyị ahụ kwuru na Ndịàmà na-anọpụ iche ná ndọrọ ndọrọ ọchịchị, amanyere m ọnụ n’okwu, sị: “Gịnị ka di gị na-arụ?”

“Ọ na-akọ ogho,” ka ọ zara.

“Ha!” ka m zaghachiri ná mpako. “A na-eji ogho eme uwe ndị soja. Ya mere unu na-akwado mgbalị agha!” Olu m lara elu, e jighịkwa m ezi uche mee ihe.

Ọ bụ ezie na na June 1967 ọrụ soja ọhụrụ kpọgara anyị ebe dị anya, gaa Minot, North Dakota, Ndịàmà nọ n’ebe ahụ nwetara Velia wee maliteghachi ọmụmụ Bible ya. Amalitere m imegide ya n’ụzọ ụmụaka. Aga m amara ụma lọta n’oge hour ọmụmụ ihe ahụ, na-akwachi ọnụ ụzọ n’ike, na-azọsi ụkwụ ike na steepụ, na-atụsa akpụkpọ ụkwụ m n’ala n’ụzọ ha ga-eme mkpọtụ, jirikwa mmiri sachapụ ebe mposi ọtụtụ ugboro.

Velia bụ nwanyị nwere olu dị nro, na-edokwa onwe ya n’okpuru, onye na-emetụbeghị ihe ọ bụla n’anataghị m ikike. Ọ bụ ezie na ọ bụghị obi m nile ka m ji hapụ ya inwe ọmụmụ Bible, ọ maara na ọ ga-abụ nsogbu ka ukwuu ịga nzukọ Ndịàmà ahụ. Mgbe a gbara ya ume ime otú ahụ, ọ ga-azaghachi mgbe nile, sị: “Ọ ga-aka mma na mụ agaghị. Achọghị m ịkpasu Tony iwe.”

Otú ọ dị, otu ụbọchị Velia gụrụ na Bible, sị: “Unu emekwala ihe ga-ewute Mmụọ Nsọ nke Chineke.” (Ndị Efesọs 4:30) “Gịnị ka nke ahụ pụtara?” ka ọ jụrụ. Onyeàmà na-eduzi ọmụmụ ihe ahụ kọwara, sị: “Mmụọ nsọ nke Chineke kpaliri odide Bible. Ya mere ọ bụrụ na anyị ekwekọghị n’ihe Bible na-ekwu, mgbe ahụ anyị na-eme ihe na-ewute mmụọ nsọ nke Chineke. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ adịghị aga nzukọ, ọ bụ ezie na ha maara na Okwu Chineke na-ekwu na anyị kwesịrị.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Nke ahụ agwụla ihe obi Velia dị umeala chọrọ. Site na mgbe ahụ gaa n’ihu ọ gara nzukọ nile n’agbanyeghị mmegide m.

Aga m ekwu n’iwe, sị: “Olee otú ị ga-esi hapụ ụlọ mgbe ị na-ebupụtabeghị nri abalị m na table?” Velia mụtara ngwa ngwa ịhụ na ọ kwadebere nri abalị m nakwa na ọ dị ọkụ. Ya mere ejiri m ihe ngọpụ ndị ọzọ mee ihe: “Ị hụghị mụ na ụmụaka anyị n’anya. Ị na-ahapụ anyị gawa nzukọ ndị ahụ.” Ma ọ bụ mgbe m ga-ekwugide nkwenkwe Ndịàmà, Velia ewee jiri nwayọọ gbalịa ịgọchitere ha, ejiri m isiokwu m bụ bocona—“onye ọnụ ọjọọ”—mee ihe, na-akpọ ya bocona na-enweghị nkwanye ùgwù, na-adịghị edo onwe ya n’okpuru.

Otú o sina dị, Velia nọgidere na-aga nzukọ, mgbe mgbe na-ebu anya mmiri ahapụ ụlọ n’ihi ịkpọ iyi m. Ma ekwere m ka ụkpụrụ ụfọdụ duzie m. Ọ dịghị mgbe ọ bụla m tiri nwunye m ihe ma ọ bụ ọbụna chee echiche ịgbahapụ ya n’ihi okpukpe ọhụrụ ya. Ma enwere m nchekasị na otu nwoke mara mma ná nzukọ ndị ahụ pụrụ inwe mmasị n’ebe ọ nọ. Aka m chekwara na mgbe a bịara n’okpukpe, ‘Ma ọ́ bụghị ego ọ bụrụ nwanyị.’ Ana m emekarị mkpesa ka Velia na-ejikere maka nzukọ: “Ị na-achọ onwe gị mma maka onye ọzọ ma i metụbeghị ya maka m.” Ya mere mgbe mbụ m kpebiri ịga nzukọ, ekwuru m, sị: “Ana m aga—ma ọ bụ nanị ilegide gị anya!”

Otú ọ dị, ezi ebumnobi m bụ ịchọpụta ihe megide Ndịàmà. N’otu n’ime nzukọ ndị mbụ m gara, e nyere okwu metụtara ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.” (1 Ndị Kọrint 7:39) Mgbe anyị lọrutere n’ụlọ, ejiri m obi ilu mee mkpesa, sị: “Ị hụla! Ha bụ nnọọ otu ihe ahụ dị ka onye ọ bụla ọzọ—na-enwe ajọ mbunobi megide onye ọ bụla na-abụghị onye okpukpe ha.” Velia ji obi nwayọọ kwuo, sị: “Ma ọ bụghị ihe ha kwuru, ọ bụ ihe Bible na-ekwu.” Emegidere m echiche ahụ ngwa ngwa site n’isuwe aka ọkpọ m n’ahụ ụlọ na itiwe ná mkpu, sị: “Bocona abịala ọzọ!” N’ezie, enwere m nkụda mmụọ n’ihi na amaara m na o kwuru eziokwu.

Anọgidere m na-eje nzukọ ma na-agụ akwụkwọ Ndịàmà, ma ebumnobi m bụ iji katọọ ya. Amalitere m ọbụna ịza ajụjụ ná nzukọ—ma ọ bụ nanị iji gosi ndị mmadụ na abụghị m “onye Mexico dara ogbi.”

E Mejuru Ọchịchọ M Maka Ikpe Ziri Ezi

Ka ọ na-erula 1971 ọrụ soja m akpọgawo anyị Arkansas. Anọgidere m na-eso Velia na-eje nzukọ, bụ́ onye e meworo baptism na December 1969 ná ngosipụta nke nrara ya nye Jehova. Anakwaghị m emegide ya, ma agaghị m ekwe ka onye ọ bụla mụọrọ m Bible. Ihe ọmụma m n’ihi ịgụ akwụkwọ ndị e ji amụ Bible arịwo nnukwu elu. Ma, ha nile bụ ihe ọmụma e bu n’isi—ihe si n’ọchịchọ m imekarịcha nke ọma n’ihe ọ bụla m mere pụta. Otú ọ dị, nke nta nke nta, mmekọrịta mụ na Ndịàmà Jehova malitere imetụta obi m.

Dị ka ihe atụ, ahụrụ m na ndị isi ojii na-ekere òkè n’ịkụzi ihe ná nzukọ ọgbakọ. Ma ná mmalite agwara m onwe m, ‘Eenụ, ha na-eme nke ahụ nanị n’ebe a ná nzuzo.’ Otú ọ dị, mgbe anyị gara otu mgbakọ ná nnukwu ámá egwuregwu baseball, akpata oyi wụrụ m ịhụ na ndị isi ojii keere òkè n’usoro ihe omume n’ebe ahụkwa. Aghaghị m ikweta na e nweghị ịkpa ókè n’etiti Ndịàmà. Ha na-eme ihe n’ikpe ziri ezi.

Abịakwara m ghọta na Ndịàmà Jehova nwere ezi ịhụnanya n’ebe ibe ha nọ. (Jọn 13:34, 35) Mgbe m sokwara ha rụọ ọrụ n’iwu Ụlọ Nzukọ Alaeze ha, apụrụ m ịhụ na ha bụ nnọọ ụmụ mmadụ nkịtị. Ahụrụ m ka ike gwụrụ ha, ka ha hiere ụzọ, na ọbụna ka ha sarịtara onwe ha okwu ole na ole mgbe ihe na-agazighị agazi. Kama ezughị okè ndị a ime ka m kewapụ, abịara m nwee mmetụta ịnọ ná nchebe n’etiti ha. Ikekwe amatara m na olileanya dịịrị m n’agbanyeghị ọtụtụ adịghị ike m.

E Ruru Obi M n’Ikpeazụ

Aghọtara m nke mbụ ya na m na-amalite iso Jehova na-enwe mmekọrịta mgbe na 1973, Ụlọ Nche kọwara na ise siga bụ ‘mmerụ nke ahụ’ ma bụrụ ịda iwu na-akpata nchụpụ. (2 Ndị Kọrint 7:1) Mgbe ahụ ana m ese agbata otu mkpọ siga ruo abụọ kwa ụbọchị. Agbalịwo m ịkwụsị ọtụtụ ugbo na mbụ ma n’enweghị ihe ịga nke ọma. Otú ọ dị, ugbu a oge ọ bụla m nwere mkpali ise siga, aga m ekpe ekpere n’ime obi maka enyemaka Jehova iji kwụsị àgwà ahụ ruru unyi. N’ijuanya nye onye ọ bụla, esekwaghị m siga ọzọ.

Ịga ezumike nká ọrụ soja m ruru na July 1, 1975. Aghọtara m na ọ bụrụ na m chọrọ ime ihe Bible na-akụzi, na m ga-arara ndụ m nye Jehova. Enwetụbeghị m ọmụmụ Bible onwe onye, ya mere ọ bụụrụ nnọọ ndị okenye ọgbakọ ihe ịtụnanya mgbe, na June 1975, m gwara ha na m chọrọ ka e mee m baptism ozugbo ọrụ soja m gwụsịrị. Ha kọwara na m ga-ebu ụzọ mezuo iwu Jisọs nke ikere òkè n’ọrụ nkwusa. (Matiu 28:19, 20) Nke a ka m mere na Saturday mbụ na July. N’otu ụbọchị ahụ esoro m otu okenye nọkọọ ma zaa ajụjụ Bible ndị a chọrọ n’aka ndị a gaje ime baptism. N’izu atọ mgbe e mesịrị e mere m baptism.

Mgbe ha hụrụ ka e mere m baptism, ụmụaka atọ anyị—Vito, Venelda, na Veronica—malitere inwe ọganihu ime mmụọ dị ngwa. N’ime afọ abụọ sochirinụ, e mere abụọ kasị okenye baptism, nke kasị nta sochikwara n’afọ anọ mgbe e mesịrị. Mgbe m na-agwa ndị ikom maara eziokwu Bible ma ghara ime ihe ọ bụla banyere ya okwu, ana m agwakarị ha banyere ihe ndị ga-esi n’emeghị ihe ha pụta. Ana m agwa ha na ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na ụmụ ha agaghị ekwu ya, ha na-eche, ‘Ọ bụrụ na eziokwu adịghị oké mkpa nye papa m, mgbe ahụ ọ dịghị oké mkpa nye m.’

Ịchụso Ozi Oge Nile

Ezinụlọ anyị dum malitere ozi oge nile dị ka ndị ọsụ ụzọ na Marshall, Arkansas. Mụ na Velia malitere na 1979, ụmụ anyị sonyekwara anyị n’ọrụ ahụ n’afọ ndị sochirinụ ka onye nke ọ bụla na-apụta n’ụlọ akwụkwọ dị elu.

Ná mmalite afọ ndị 1980, anyị nụrụ akụkọ banyere akpịrị ịkpọ nkụ maka ihe ọmụma Bible n’etiti ndị Ecuador, Ndịda America, anyị wee mee ya ihe mgbaru ọsọ anyị ịgafe ebe ahụ. Ka ọ na-erula 1989 ụmụ anyị etowo, nweekwa ike ilekọta onwe ha. Ya mere n’afọ ahụ anyị mere obere nleta n’Ecuador iji ‘ledo ala ahụ.’—Tụlee Ọnụ Ọgụgụ 13:1, 2.

N’April 1990 anyị rutere n’Ecuador, ebe obibi ọhụrụ anyị. Ebe anyị nwere ego dị nta—anyị dabeere n’ụgwọ ezumike nká soja m—anyị aghaghị iji nlezianya mee atụmatụ mmefu ego anyị. Ma ọṅụ nke ozi oge nile n’ókèala a na-arụpụta ihe n’ụzọ ime mmụọ akarịwo nnọọ àjà ego ọ bụla. Ná mmalite, anyị rụrụ ọrụ n’obodo ọdụ ụgbọ mmiri bụ́ Manta, ebe onye nke ọ bụla n’ime anyị duziri ihe dị ka malite n’ọmụmụ Bible 10 ruo 12 kwa izu. E mesịa, na 1992, amalitere m na-eje ozi dị ka onye ozi na-ejegharị ejegharị, nwunye m sonyeere m. Anyị na-eleta otu ọgbakọ kwa izu.

Mgbe A Ga-enweta Ikpe Ziri Ezi n’Ozuzu Ya

N’ileghachi anya azụ, mụ na Velia pụrụ ịhụ na ikpe na-ezighị ezi anyị nwere ahụmahụ ya mgbe anyị na-etolite na-enyere anyị aka ugbu a n’ozi anyị. Anyị na-amụrụ anya karịsịa ka anyị ghara ileda onye ọ bụla anya ma ọlị bụ́ onye pụrụ ịda ogbenye karị ma ọ bụ onye na-agụrughị akwụkwọ ka anyị ma ọ bụ onye si ná nzụlite agbụrụ nke dị iche pụọ na nke anyị. Anyị na-ahụkwa na ọtụtụ ụmụnna anyị ndị nwoke na nwanyị bụ́ ndị Kraịst na-enwe ahụmahụ ikpe na-ezighị ezi ọha mmadụ na-akpata nke karịrị nke anyị nwere ahụmahụ ya ná njọ. Ma, ha adịghị eme mkpesa. Ha na-elegide anya ha n’Alaeze Chineke na-abịa abịa, nke ahụ bụkwa ihe anyị mụtaworo ime. O tewo anyị kwụsịrị ịgbalị ịchọ ikpe ziri ezi n’usoro ihe nke a; ma kama nke ahụ, anyị na-eji ndụ anyị na-atụgara ndị mmadụ aka na nanị ezi ngwọta dịnụ nye ikpe na-ezighị ezi, Alaeze Chineke.—Matiu 24:14.

Anyị amụtawokwa na anyị onwe anyị ndị nweworo oké mwute maka ikpe na-ezighị ezi aghaghị ilezi anya ka anyị ghara ịtụ anya ikpe ziri ezi zuru okè n’etiti ndị Chineke. Nke a bụ n’ihi na anyị nile bụ ndị na-ezughị okè, na-enwekwa ọchịchọ nke ime ihe ọjọọ. (Ndị Rom 7:18-20) Ma, anyị pụrụ ikwu n’eziokwu na anyị achọtawo òtù ụmụnna na-ahụ n’anya nke mba nile bụ́ ndị na-agba mbọ ime ihe ziri ezi ruo ka ike ha nile hà. Ọ bụ olileanya anyị na tinyere ndị Chineke n’ebe nile na anyị ga-aba n’ime ụwa ọhụrụ Chineke nke ezi omume bi n’ime ya.—2 Pita 3:13.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 18]

Emegidere m echiche ahụ ngwa ngwa site n’isuwe aka ọkpọ m n’ahụ ụlọ

[Foto dị na peeji nke 19]

Mụ na Velia, mgbe m sonyeere ndị agha ụgbọelu

[Foto dị na peeji nke 21]

Mụ na Velia, na 1996

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya