Ụzọ Ndụ Ọjọọ—Ihe Hà Aṅaa Ka Ọ Na-efu?
“ỌRỊA bụ onye nwe mmadụ nile,” ka otu ilu ndị Denmark na-ekwu. Onye ọ bụla rịaworo ọrịa nke na-adịghị ala ala ga-ekweta ngwa ngwa na ‘onye nwenụ’ a pụrụ ịbụ nke obi ọjọọ n’ezie! Ma, ọ pụrụ iju gị anya ịmata na ọrịa ahụ na-abụkarị onye ọbịa a kpọrọ òkù karịa onye nwenụ. Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Nchịkwa na Mgbochi Ọrịa nke United States na-ekwu na 30 pasent nke ụbọchị ndị ọrịa na-anọ n’ụlọ ọgwụ bụ n’ihi ọrịa na mmerụ ahụ ndị a pụrụ izere. Gịnị kpatara ya? Ụzọ ndụ ọjọọ, ndị dịkwa ize ndụ. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
ISE SIGA. Ira, dị afọ 53, na-arịa ọrịa emphysema—ihe si n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ iri afọ anọ nke ise siga pụta. Iji gwọọ ọnọdụ ya, ikuku oxygen a gbara n’ololo dị ya mkpa mgbe nile, nke na-efu ihe dị ka $400 kwa ọnwa. Na 1994, ịnọ n’ụlọ ọgwụ ruo ụbọchị itoolu n’ihi ọnọdụ ya kpatara ụgwọ dị $18,000, na-eweta ngụkọta nke ihe nlekọta ahụ ike Ira furu n’afọ ahụ ịbụ ihe karịrị $20,000. Ma, ọ dịghị Ira ngwa ngwa ịkwụsị ise siga. “Ana m enwe nnọọ ọchịchọ gabigara nnọọ ókè,” ka ọ na-ekwu.
Ọnọdụ Ira apụghị iche. N’agbanyeghị ihe ize ndụ a maara nke ọma nke ise siga, ndị mmadụ gburugburu ụwa na-ese ihe dị ka ijeri 15 siga kwa ụbọchị. Na United States, e mere atụmatụ ihe nlekọta ahụ ike na-efu kwa afọ maka nrịanrịa ndị ise siga na-akpata ịbụ ijeri $50. Nke a pụtara na 1993, ná nkezi, maka mkpọ siga ọ bụla a zụtara, a na-emefu ihe dị ka $2.06 n’ụgwọ ọgwụ ndị metụtara ise siga.
Mgbe a mụrụ nwatakịrị, ụgwọ ọgwụ ndị metụtara ise siga pụrụ ịmalite ịtụkọba. Iji hota nanị otu ihe atụ, otu ihe ọmụmụ e mere na United States chọpụtara na ụmụ ọhụrụ ndị nne na-ese siga mụrụ na-enwe ihe ize ndụ dị okpukpu abụọ nke inwe mgbawa nke egbugbere ọnụ ma ọ bụ okpo ọnụ, ọnọdụ nke nwere ike ịchọ ihe ruru ịwa ahụ anọ ka ọ na-erule afọ abụọ. Ihe nlekọta ahụ ike na mmefu ndị metụtara ọnọdụ a na-efu n’ogologo ndụ otu onye bụ $100,000 ná nkezi. N’ezie, ọ dịghị ego ole ọ bụla nke ya na mfu mmetụta uche nke ịmụ nwa nwere nkwarụ ọdịdị ahụ hà nhata.
Ụfọdụ na-ekwu na eziokwu ahụ bụ na ọtụtụ ndị na-ese siga adịghị adịru ndụ ịnata ego Nchebe Ọha na Eze na-akwụ ụgwọ nlekọta ahụ ike dị elu nke ise siga. Otú ọ dị, dị ka The New England Journal of Medicine na-ekwu, “nkwubi okwu a na-akpata arụmụka; ọzọkwa, ihe ka ọtụtụ ga-ekweta na ọnwụ nnwụchu n’ihi ise siga abụghị ụzọ obi ebere nke isi chịkwaa ihe nlekọta ahụ ike na-efu.”
ỊṄỤFE MMANYA NA-ABA N’ANYA ÓKÈ. E jikọwo ịṅụfe mmanya na-aba n’anya ókè na ọtụtụ nsogbu ahụ ike, gụnyere ọrịa cirrhosis nke imeju, ọrịa obi, afọ ọzịza, ọnyá afọ, na ọzịza nke anyịnya. Ọ pụkwara ime ka ọ dị mfe karị mmadụ ibute ọrịa ndị na-efe efe dị ka oyi ịba n’ahụ. Na United States, kwa afọ “a na-eji ijeri $10 agwọ ndị na-apụghị ịchịkwa ịṅụ mmanya ha,” dị ka Dr. Stanton Peele si kwuo.
Mmanya na-aba n’anya na-emetụtakarị nwa e bu n’afọ. Kwa afọ a na-amụ ọtụtụ iri puku ụmụaka nwere nkwarụ na United States nanị n’ihi na ndị nne ha ṅụrụ mmanya mgbe ha dị ime. A chọpụtawo na ụfọdụ n’ime ụmụ ọhụrụ ndị a nwere mgbaàmà mmanya na-aba n’anya nke nwa e bu n’afọ (FAS), mgbe mgbekwa ndị a na-enwe nkwarụ anụ ahụ na nke uche. E mewo atụmatụ na nkezi nke ụgwọ ọgwụ n’ogologo ndụ nile nke nwatakịrị ọ bụla nwere FAS bụ nde $1.4.
Ebe mmanya na-aba n’anya na-ebelata ịchịkwa mkpali, ịṅụbiga mmanya ókè na-ekerekarị òkè ná ntiwapụ nke ime ihe ike, nke pụrụ ịrụpụta mmerụ ahụ nke ga-achọ nlekọta ahụ ike. E nwekwara mmerụ ahụ a na-apụghị izere ezere nke ndị na-anya ụgbọala mgbe mmanya na-egbu ha na-akpata. Tụlee mmetụta o nwere n’ahụ Lindsey, nwa agbọghọ dị afọ asatọ bụ́ onye a na-aghaghị ịdọkapụta n’oche azụ nke ụgbọala nne ya mgbe ha na onye ọkwọ ụgbọala mmanya na-egbu kụkọtasịrị. Lindsey nọrọ izu asaa n’ụlọ ọgwụ, ọ dịkwa mkpa ka a waa ya ahụ ọtụtụ ugboro. Mmefu ọgwụgwọ ya gafere $300,000. Ọ dabaara ya na ọ lanarịdịrị.
ỊṄỤ ỌGWỤ ỌJỌỌ. Otu onye nchọpụta mere atụmatụ ihe ịṅụ ọgwụ ọjọọ na-efu kwa afọ n’America ịbụ ijeri $67. Joseph A. Califano, Jr., onye isi nke Ụlọ Ọrụ Na-ahụ Maka Ihe Iri Ahụ na Ịṅụ Ihe Ndị Na-eri Ahụ na Mahadum Columbia nke New York, na-arụtụ aka n’akụkụ ọzọ na-efu oké ihe nke nsogbu ahụ: “Ụmụ ọhụrụ nne ha ṅụrụ ọgwụ crack mgbe ha dị ime ha, ihe a na-ahụkebeghị n’iri afọ gara aga, jupụtara n’ọnụ ụlọ nlekọta ụmụ ọhụrụ ndị a na-akwụ $2,000 kwa ụbọchị na ha. . . . Ọ pụrụ ifu $1 nde iji zụlite onye ọ bụla lanarịrịnụ itoru ogo mmadụ.” Tụkwasị na nke a, ka Califano na-ekwu, “ọchịchọ ndị nne dị ime na-adịghị achọ nlekọta tupu ịmụ nwa na akwụsịghị ịṅụ ọgwụ ọjọọ na-akpata ihe dị ukwuu n’ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ijeri $3 nke Medicaid mefuru na 1994 ná nlekọta nke ndị nọ n’ụlọ ọgwụ ndị metụtara ịṅụ ọgwụ ọjọọ.”
Ọdachi nke ọnọdụ ahụ na-arị elu mgbe anyị tụlere isi mmadụ dị ukwuu nke omume ọjọọ a na-ata. Esemokwu n’alụmdi na nwunye, ụmụaka e leghaara anya, na ego dalatara adalata so ná nsogbu ndị na-emetụtakarị ezinụlọ ndị ịṅụ ọgwụ ọjọọ tisara.
INWE MMEKỌAHỤ AGHARA AGHARA. Ihe karịrị nde 12 ndị mmadụ na United States na-ebute ọrịa ndị a na-ebute site ná mmekọahụ (STD) kwa afọ, na-eme ka United States nwee ọnụ ọgụgụ kasị elu nke ndị nwere STD ná mba ọ bụla mepere emepe. David Celentano, nke Ụlọ Akwụkwọ Mahadum Maka Ịdị Ọcha na Ahụ Ike Ọha na Eze nke Johns Hopkins, kpọrọ nke a “mmechuihu mba.” Ihe ọrịa ndị a na-efu kpọmkwem, n’agụnyeghị ọrịa AIDS, bụ ihe dị ka ijeri $10 kwa afọ. Ndị nọ n’afọ iri na ụma nọ n’ihe ize ndụ pụrụ iche. Ọ bụghịkwa ihe ijuanya! Dị ka otu akụkọ si kwuo, ka ha na-erule klas nke 12, ihe dị ka 70 pasent n’ime ha enwewo mmekọahụ, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ 40 pasent n’ime ha esorowo mmadụ anọ ma ọ dịkarịa ala nwee mmekọahụ.
Ọrịa AIDS bụ ọdachi nlekọta ahụ ike n’onwe ya. Ná mmalite 1996 usoro ọgwụgwọ kasị dị irè e nwere—ihe ndị na-ebelata ọrụ mmiri ọgwụ protease na ọgwụ ndị e jibu eme ihe—na-efu ihe nọ n’agbata $12,000 na $18,000 kwa afọ maka otu onye. Ma nke a bụ nanị akụkụ dị nta nke ihe a na-adịghị ahụ ngwa ngwa nke ọrịa AIDS na-efu, nke gụnyere arụpụtaghị ihe nke onye ọ na-arịa na ndị ahụ na-anara ohere ịhapụ ọrụ ma ọ bụ ịhapụ ịga akwụkwọ iji lekọta ya. A na-eme atụmatụ na ka ọ na-erule afọ 2000, HIV na ọrịa AIDS ga-efuworị ihe nọ n’agbata ijeri $356 na $514 gburugburu ụwa—nke bụ otu ihe ahụ ya na ibibi ọnọdụ akụ̀ na ụba dum nke Australia ma ọ bụ India.
IME IHE IKE. Mgbe ọ bụ dọkịta ukwu United States, Joycelyn Elders kọrọ na ụgwọ ọgwụgwọ nke ime ihe ike bụ ijeri $13.5 na 1992. President Bill Clinton nke United States kwuru, sị: “Otu n’ime ihe ndị mere nlekọta ahụ ike America ji na-ada oké ọnụ bụ n’ihi na ụlọ ọgwụ anyị na ọnụ ụlọ ọnọdụ mberede anyị jupụtara ná ndị mmadụ e bekasịrị ahụ na ndị a gbara égbè.” E nwere ezi ihe mere The Journal of the American Medical Association ji kpọọ ime ihe ike na United States “ọnọdụ mberede ahụ ike ọha na eze.” Akụkọ ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Ọ bụ ezie na ime ihe ike abụghị ọrịa n’echiche ‘e ji mara ya,’ mmetụta ọ na-enwe n’ahụ ike onwe onye na nke ọha na eze siri ike dị ka ọtụtụ nsogbu ahụ nkịtị—ikekwe karịa otú ahụ.”
Otu akụkọ sitere n’aka ụlọ ọgwụ 40 dị na Colorado na-ekwu na nkezi mmefu maka onye ọ bụla e mesoro ihe ike n’ime ọnwa itoolu mbụ nke 1993 bụ $9,600. Ihe karịrị ọkara nke ndị e nyere àkwà n’ụlọ ọgwụ bụ ndị na-enweghị inshọransị, ọtụtụ n’ime ndị a kwa enweghị ike ma ọ bụ achọghị ịkwụ ụgwọ mmefu ha. Ọnọdụ ndị dị otú ahụ na-eduje n’ụtụ isi ndị ka elu, ụgwọ inshọransị ndị ka elu, na ụgwọ ụlọ ọgwụ ndị ka elu. Òtù Ụlọ Ọgwụ Colorado na-akọ, sị: “Anyị nile na-akwụ ụgwọ.”
Mgbanwe nke Ụzọ Ndụ
Site n’ụzọ mmadụ si ele ihe anya, e nwekebeghị olileanya nke ịgbanwe omume ụzọ ndụ ọjọọ. “America abụghị Ogige Iden, ọ dịghịkwa mgbe anyị ga-akwụsịcha iji ihe na-eri ahụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi,” ka otu akụkọ nke Mahadum Columbia wepụtara na-ekwu. “Ma ruo n’ókè anyị kwụsịrị mmetọ dị otú ahụ, anyị ga-eweta ihe ubi bara ụba nke ụmụ ọhụrụ nwere ahụ ike ka mma, ime ihe ike na mpụ dị nta karị, ụtụ isi dị ala karị, mmefu nlekọta ahụ ike dị ala, uru ka elu, ụmụ akwụkwọ gụrụ akwụkwọ karị na ndị bu ọrịa AIDS dị ala karị.”
Ndịàmà Jehova achọpụtawo Bible ịbụ ihe kasị enye aka n’iru ihe mgbaru ọsọ ahụ. Bible abụghị akwụkwọ nkịtị. E dere ya n’ike mmụọ nsọ nke Onye Okike mmadụ, bụ́ Jehova Chineke. (2 Timoti 3:16, 17) Ọ bụ “Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17) Ụkpụrụ ndị e setịpụrụ na Bible na-akwalite ahụ ike, ndị na-ejekwa ije na ndụmọdụ ya na-eweta abamuru dị ukwuu.
Dị ka ihe atụ, Esther bụbu onye na-ese siga nke ukwuu.a Mgbe ọ malitesịrị iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, onye na-akụziri ya Bible kpọrọ ya òkù iwepụta otu ụbọchị iji mee njem nleta n’isi ụlọ ọrụ ụwa nile nke Ndịàmà Jehova, dị na Brooklyn, New York. Na mbụ, Esther achọghị ịga. Ebe ọ matara na Ndịàmà Jehova adịghị ese siga, o chere otú ọ ga-esi soro ha nọrọ ụbọchị dum. Ya mere Esther tinyere otu siga n’ime akpa ya, na-eche na ọ bụrụ na ọ gụọ ya ise ya, ihe ọ ga-eme bụ nanị ịmịpụ gaa n’ụlọ mposi. Dị nnọọ ka o mere atụmatụ ya, mgbe otu n’ime njem nleta ahụ gasịrị Esther banyere n’ụlọ mposi ndị inyom ma wepụta siga ya. Ma mgbe ahụ ọ chọpụtara otu ihe. Ọnụ ụlọ ahụ dị ọcha n’enweghị ntụpọ, ikuku ya dịkwa ọcha. “Apụghị m nnọọ imetọ ebe ahụ site n’ise siga ahụ,” ka Esther na-echeta, “ya mere ejiri m mmiri wụdaa ya n’ebe a na-eje mposi. Nke ahụ bụkwa siga ikpeazụ m metụrụ aka!”
N’ụwa dum, ọtụtụ nde ndị dị ka Esther na-amụta ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible. Ha na-abara onwe ha uru, ha na-aghọkwa ndị bara uru ka ukwuu nye ógbè ebe ha bi. Nke kasị mkpa, ha na-ewetara Onye Okike ha, bụ́ Jehova Chineke, nsọpụrụ.—Tụlee Ilu 27:11.
Ọ bụ ezie na mgbalị kasị mma nke mmadụ apụghị imepụtaghachi “Ogige Iden,” Bible na-ekwu na Chineke ga-eme otú ahụ. Pita nke Abụọ 3:13 na-ekwu, sị: “Ma dị ka nkwa Ya [Chineke] si dị, anyị na-ele anya eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ, nke ezi omume bi n’ime ha.” (Tụlee Aịsaịa 51:3.) N’ụwa ọhụrụ ahụ, nlekọta ahụ ike agaghị abụkwa ihe na-akpata nchegbu, n’ihi na ihe a kpọrọ mmadụ ga-anụ ụtọ ndụ n’ahụ ike zuru okè—ụzọ Chineke si zube ya site ná mmalite. (Aịsaịa 33:24) Ị̀ ga-achọ ịmụtakwu banyere nkwa Chineke? Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụghị ezigbo aha ya.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 14]
© 1985 P. F. Bentley/Black Star