Ihe Oriri Maka Mmadụ Nile—Ọ̀ Bụ Nanị Nrọ?
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’ITALI
“NWOKE, nwanyị na nwatakịrị ọ bụla nwere ikike inwere onwe ya pụọ n’agụụ na erighị ihe na-edozi ahụ,” ka Nnọkọ Nkwurịta Okwu Ụwa Maka Ihe Oriri nke Òtù Na-ahụ Maka Nri na Ọrụ Ugbo nke Mba Ndị Dị n’Otu (FAO) kwadoro kwuru laa azụ na 1974. A kpọziri òkù ka e kpochapụ agụụ n’ime ụwa “n’ime iri afọ.”
Otú ọ dị, mgbe ndị nnọchiteanya nke mba 173 zutere n’isi ụlọ ọrụ FAO na Rom ná ngwụsị afọ gara aga maka Nzukọ Ụwa Maka Ihe Oriri nke were ụbọchị ise, nzube ha bụ ịjụ, sị: “Gịnị gahiere?” Ọ bụghị nanị na a dawo n’inye mmadụ nile ihe oriri kama ugbu a, ihe karịrị iri afọ abụọ ka e mesịrị, ọnọdụ ahụ ka njọ.
Okwu ndị bụ isi nke ihe oriri, ụba mmadụ, na ịda ogbenye chọrọ nlebara anya ozugbo. Dị ka otu akwụkwọ e wepụtara ná nzukọ ahụ kwetara, ọ gwụla ma e doziri nsogbu ndị a, “nkwụsi ike ọha mmadụ nke ọtụtụ mba na ógbè pụrụ ịbụ nke e metụtara n’ụzọ siri ike, ikekwe ọbụna mebie udo ụwa.” Otu onye na-ahụ ihe na-emenụ kwuru ya hoo haa karị: “Anyị ga-ahụ mbibi nke mmepeanya na ọdịbendị nke mba.”
Dị ka Ọga Kpata Kpata Jacques Diouf nke FAO si kwuo, “ihe karịrị nde 800 mmadụ taa enweghị ike inweta ihe oriri zuru ezu; nde 200 ụmụaka so n’ime ha.” A na-eme atụmatụ na ka ọ na-erule afọ 2025, ụba mmadụ nọ n’ụwa taa bụ́ ijeri 5.8 ga-arịwo ruo ijeri 8.3, na-enwe ịrị elu kasịnụ ná mba ndị na-emepe emepe. Diouf kwara arịrị, sị: “Ọnụ ọgụgụ ndị ikom, ndị inyom na ụmụaka a napụrụ ikike ịdị ndụ na ùgwù ha nke a na-ekwesịghị ịnapụ mmadụ dị oké elu. Ákwá nke ndị agụụ ji ha ka nhụjuanya a na-adịghị anụ anụ nke ala e mebiworo ike mmepụta ihe ya, oké ọhịa ndị e gbutuworo na ebe a na-egbu azụ̀ e gbuchapụworo azụ̀ ha.”
Ihe ngwọta dị aṅaa ka a tụrụ aro ya? Diouf na-ekwu na ngwọta ya dị ‘n’iji obi ike mee ihe,’ inye “ihe oriri ga-ezu ezu” maka mba ndị nọ n’ụkọ ihe oriri tinyekwara ikike, ego, na nkà na ụzụ nke ga-eme ka ha nwee ike ịzụ onwe ha.
“Ihe Oriri Ga-ezu Ezu” —Gịnị Mere E Jighị Ya n’Aka?
Dị ka otu akwụkwọ e wepụtara ná nzukọ ahụ si kwuo, “ihe oriri ga-ezu ezu na-adị mgbe mmadụ nile, n’oge nile, nwere ikike nkịtị na nke akụ̀ na ụba inweta ihe oriri zuru ezu, na-adịghị ize ndụ na nke na-edozi ahụ iji gboo mkpa ihe oriri na nhọrọ nri ha maka ndụ ịrụsi ọrụ ike na inwe ezi ahụ ike.”
Nsogbu nke ndị gbara ọsọ ndụ na Zaire gosiri otú a pụrụ isi tinye ihe oriri ga-ezu ezu n’ihe ize ndụ. Ọ bụ ezie na otu nde ndị Rwanda gbara ọsọ ndụ na-anwụ n’agụụ, ụlọ ọrụ dị iche iche nke UN nwere ntụkọba ihe oriri dịnụ iji zụọ ha. Ma ndokwa mbugharị na nkesa ihe chọrọ inye ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ịrụkọ ọrụ ọnụ nke ndị ọchịchị ógbè—ma ọ bụ ndị ọchịagha ógbè ma ọ bụrụ na ha na-achịkwa ogige ndị gbara ọsọ ndụ. Ọnọdụ mberede dị na Zaire na-egosikwa ọzọ otú o si siere ógbè ụwa ike ịzụ ndị agụụ ji, ọbụna mgbe ihe oriri dị. Otu onye na-ekiri ihe na-emenụ kwuru, sị: “A ghaghị ịkpọtụrụ ọtụtụ òtù na ụlọ ọrụ ma rịọ ha arịrịọ tupu e nwee ike ime ihe ọ bụla.”
Dị ka akwụkwọ Ngalaba Ọrụ Ugbo nke United States wepụtara si kwuo, isi ihe ole na ole ọ bụla pụrụ imebi ihe oriri ga-ezu ezu n’ụzọ siri ike. E wezụga ọdachi ndị na-emere onwe ha, ndị a na-agụnye agha na ọgụ ime obodo, ụkpụrụ mba ndị na-ekwesịghị ekwesị, nnyocha na nkà na ụzụ na-ezughị ezu, ndakpọ gburugburu ebe obibi, ịda ogbenye, uto ụba mmadụ, ahaghị nhata nke nwoke na nwanyị, na ahụ esighị ike.
E nwewo ihe ụfọdụ a rụzuru. Kemgbe afọ ndị 1970, nkezi nke ume a na-enweta site n’ihe oriri, ihe mgbaàmà nke iri nri, arịwo site na calorie 2,140 ruo 2,520 maka otu onye kwa ụbọchị ná mba ndị na-emepe emepe. Ma dị ka FAO si kwuo, n’ihi uto ụba mmadụ nke ọtụtụ ijeri ka ọ na-erule afọ 2030, “nanị ijigide ọ̀tụ̀tụ̀ nke ókè ihe oriri dị ugbu a ga-achọ mmụba dị ngwa na nke a pụrụ ijiri gaa n’ihu iji jiri 75 pasent mụbaa ihe oriri a na-enweta n’ebibighị ihe okike ndị anyị nile na-adabere na ha.” Ọrụ nke inye ụba mmadụ na-anwụ n’agụụ ihe oriri si otú a bụrụ nke olileanya na-adịghị na ya.
‘Ime Ihe Dị Anyị Mkpa, Ọ Bụghị Inwekwu Nzukọ’
E nwere ọtụtụ nkatọ a katọrọ ụkpụrụ ime ihe nke Nzukọ Ụwa Maka Ihe Oriri na nkwa ndị o kwere. Otu onye nnọchiteanya si Latin America katọrọ “ịdị ntakịrị” nke nkwa ibelata ọnụ ọgụgụ ndị na-adịghị eri ihe na-edozi ahụ ruo nanị ọkara nke ọ̀tụ̀tụ̀ ọ dị ugbu a dị ka “ihe ihere.” Mba 15 kwupụtara nkọwa dị iche nke aro ndị nzukọ ahụ kwadoro. Ọbụna iji rute ná nkwadebe nke nkwupụta okwu na usoro ime ihe dị ntakịrị, ka akwụkwọ akụkọ Itali bụ́ La Repubblica kwuru, “afọ abụọ nke ise okwu na mkparịta ụka dị mkpa. A na-atụle okwu ọ bụla, kọma ọ bụla iji wee ghara ime ka ọnyá ahụ ghere oghe . . . malite ịgba ọbara ọzọ.”
Ọtụtụ ndị nyere aka n’ịkwadebe akwụkwọ ndị e ji mee nzukọ ahụ enweghị obi ụtọ n’ihe ndị si na ya pụta. “Anyị nwere oké obi abụọ ma à ga-emezukwa aro ọma ndị ahụ a mara n’ọkwa,” ka otu onye kwuru. Ihe na-ese okwu bụ ma è kwesịrị ịkpọ inwe ike inweta ihe oriri “ikike a matara ná mba nile,” ebe ọ bụ na a pụrụ ịzọta “ikike” n’ụlọikpe. Otu onye Canada kọwara, sị: “Mba ndị bara ọgaranya tụrụ ụjọ na a pụrụ ịmanye ha inye ihe enyemaka. Ọ bụ nke a mere ha ji sie ọnwụ na a ga-ewetulata ịdị ike nke ihe e dere ná nkwupụta okwu ahụ.”
N’ihi nkwurịta okwu na-enweghị ọgwụgwụ ná nzukọ ndị òtù UN kwadoro, minista nke otu gọọmenti Europe kwuru, sị: “Ebe e kpebiworo ọtụtụ ihe ná nnọkọ nkwurịta okwu Cairo ahụ [banyere ụba mmadụ na mmepe, e nwere na 1994], anyị na-alaghachi n’otu ihe ahụ ná nnọkọ nkwurịta okwu ọ bụla na-esonụ anyị nwere.” Ọ tụrụ aro, sị: “Itinye atụmatụ ime ihe n’ọrụ maka abamuru nke ụmụ mmadụ ibe anyị aghaghị ịbụ ihe mbụ n’isiokwu nile ndị a ga-atụle, ọ bụghị inwekwu Nzukọ.”
Ndị na-ekiri ihe na-emenụ kọwapụtakwara na ọbụna ịbịa nzukọ ahụ na-apụta mmefu buru ibu nye mba ụfọdụ ndị ọ pụrụ isiri ike ime ya. Otu obere mba Africa zigara ndị nnọchianya 14 tinyere minista 2, bụ́ ndị nọrọ na Rom ruo ihe karịrị izu abụọ. Akwụkwọ akụkọ Itali bụ́ Corriere della Sera kọrọ na nwunye otu president Africa, onye nkezi ihe otu onye na-enweta kwa afọ ná mba ya na-agafeghị $3,300, anọwo na-emefu $23,000 n’ógbè ịzụ ihe kasị ewu ewu na Rom.
È nwere ihe mere a ga-eji kwere na Atụmatụ Ime Ihe a nakweere ná nzukọ ahụ ga-aga nke ọma? Otu onye odeakụkọ na-aza, sị: “Ihe nile anyị pụrụ ile anya ya ugbu a bụ na gọọmenti ga-eji ya kpọrọ ihe ma mee ihe iji hụ na a ga-eme ihe ndị ọ tụrụ n’aro. Hà ga-eme ya? . . . Akụkọ ihe mere eme na-enye ntakịrị ihe mere a ga-eji nwee nchekwube.” Otu onye ahụ na-enye nkọwa kọwapụtara eziokwu na-akụda obi bụ́ na n’agbanyeghị n’ikwekọrịta ná Nzukọ Ụwa nke Rio de Janeiro nke 1992 iji welite ụtụ maka enyemaka mmepe ruo 0.7 pasent nke ihe nile a na-emepụta ná mba ahụ, “nanị mba ole na ole eruwo ihe mgbaru ọsọ ahụ na-abụghị iwu.”
Ònye Ga-azụ Ndị Agụụ Ji?
Akụkọ ihe mere eme egosiwo n’ụzọ buru ibu na n’agbanyeghị ezi ebumnobi nile nke ihe a kpọrọ mmadụ, “ọ bụghị n’aka ya onwe ya ka ụzọ mmadụ dị: ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzozie.” (Jeremaịa 10:23) Ya mere o yighị ka ụmụ mmadụ ga-enwe ike inye mmadụ nile ihe oriri ma a hapụ ha. Anyaukwu, ejizighị ihe, na ịchọ otuto efu edugawo ihe a kpọrọ mmadụ n’ọnọdụ dị ize ndụ. Ọga Kpata Kpata Diouf nke FAO kwuru: “Ihe a chọrọ ná nkwubi okwu bụ mgbanwe nke obi, uche na ọchịchọ.”
Nke ahụ bụ ihe nanị Alaeze Chineke pụrụ ime. N’eziokwu, ọtụtụ narị afọ gara aga, Jehova buru amụma banyere ndị ya, sị: “M ga-etinye iwu m n’ime ha, ọ bụkwa n’obi ha ka M ga-edekwasị ya dị ka n’akwụkwọ; M ga-abụkwara ha Chineke, ha onwe ha ga-abụkwara m otu ndị.”—Jeremaịa 31:33.
Mgbe Jehova Chineke kwadebere ebe obibi mbụ bụ́ ubi nke ihe a kpọrọ mmadụ, o nyere mmadụ “ihe ọkụkụ nile ọ bụla na-amịpụta mkpụrụ ọghịgha, nke dị n’elu ụwa nile, na osisi nile ọ bụla, nke mkpụrụ osisi na-amịpụta mkpụrụ ọghịgha dị n’ime ya” dị ka ihe oriri. (Jenesis 1:29) Ndokwa ahụ bara ụba, na-edozi ahụ, ma bụrụ nke aka pụrụ iru. Ọ bụ ihe dị ihe nile a kpọrọ mmadụ mkpa iji gboo mkpa ihe oriri ha.
Nzube Chineke agbanwebeghị. (Aịsaịa 55:10, 11) N’ogologo oge gara aga o nyere mmesi obi ike na nanị ya ga-egbo mkpa ọ bụla nke ihe a kpọrọ mmadụ site n’Alaeze ya nke Kraịst ga-achị, na-enye mmadụ nile ihe oriri, na-ekpochapụ ịda ogbenye, na-achịkwa ọdachi ndị na-emere onwe ha, ma na-ewepụ mbusorịta agha. (Abụ Ọma 46:8, 9; Aịsaịa 11:9; tụlee Mak 4:37-41; 6:37-44.) N’oge ahụ ‘ala ga-eme ihe omume ya: Chineke, bụ́ Chineke anyị, ga-agọzi anyị.’ “Ka ọtụtụ ọka dị n’ala n’elu ugwu nile.”—Abụ Ọma 67:6; 72:16.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 20]
Dorothea Lange, FSA Collection, Library of Congress