“Nkwekọ Ụda Olu nke Na-adabakọ n’Oge Magburu Onwe Ya”
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SOUTH AFRICA
OKWU mmadụ bụ ihe ịtụnanya. Ihe dị ka uru ahụ 100 ndị dị n’obi, akpịrị, agbà, ire, na egbugbere ọnụ na-arụkọ ọrụ ọnụ iji mepụta ụda dị iche iche a na-apụghị ịgụta ọnụ. Uru ahụ nke ọ bụla bụ ùkwù ọtụtụ narị puku akwara. Mkpụrụ ndụ ụbụrụ isi ka ukwuu na-achịkwa akwara uru ahụ ndị a karịa ka a chọrọ iji chịkwaa uru ahụ dị n’ụkwụ onye na-eme egwuregwu. Otu akwara ozi zuru ezu ịchịkwa akwara 2,000 ọ bụla nke uru ahụ nke afọ ụkwụ. N’ụzọ dị iche, a pụrụ ijikọta mkpụrụ ndụ akwara ozi ndị na-achịkwa akpa okwu, ma ọ bụ nkọlọ na ihe ole na ole dị ka akwara uru ahụ abụọ ma ọ bụ atọ.
Okwu ma ọ bụ nkenke nkebi okwu ọ bụla i kwuru nwere usoro mmegharị uru ahụ nke ya. A chịkọbara ihe ọmụma nile dị mkpa iji kwughachi nkebi okwu dị ka “Olee otú i mere?” n’ógbè okwu dị n’ụbụrụ gị. Nke a ọ̀ na-apụta na ụbụrụ gị na-eji usoro ihe omume uru ahụ pụrụ iche, nke na-adịghị agbanwe agbanwe, nke na-aga nwayọọ nwayọọ eme ihe iji kwughachi okwu ma ọ bụ nkebi okwu ọ bụla? Ee e. Ike ikwu okwu dị egwu nke ukwuu karịa nke ahụ. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ inwe ọnyá n’ime ọnụ gị nke na-eme ka o sie ike ịkpọpụta okwu n’ụzọ pụrụ iche ị na-esi akpọpụta ya. N’amaghị ama, ụbụrụ na-agbanwe mmegharị nke uru ahụ ikwu okwu, na-eme ka i nwee ike ikwupụta okwu ndị ahụ ruo n’òkè o kwere mee n’ụzọ i si ekwu okwu. Nke a na-arụtụ aka n’eziokwu ọzọ dị ebube.
Ekele ọnụ nkịtị dị ka “Ndewo” pụrụ ịpụta ọtụtụ ihe. Ụda olu e ji kwuo ya pụrụ igosi ma obi ọ dị onye ahụ na-ekwu okwu ụtọ, ma ọ na-aṅụrị ọṅụ, ma ike ọ gwụrụ ya, ma ọ dị ya ngwa ngwa, ma ọ na-ewe iwe, ma obi adịghị ya mma, ma ọ bụ ma egwu ọ na-atụ ya, ọ pụkwara ikpughe ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche nke ọnọdụ mmetụta uche ndị dị otú ahụ. Ee, ihe otu okwu pụtara pụrụ ịgbanwe na-adabere n’ọ̀tụ̀tụ̀ mmegharị na nkwekọrịta n’otu ntabi anya nke ọtụtụ uru ahụ dị iche iche.
“N’ọ̀tụ̀tụ̀ dị mma,” ka Dr. William H. Perkins na-akọwa n’akwụkwọ ya bụ́ Stuttering Prevented, “anyị na-ewepụta ihe dị ka ụda 14 kwa sekọnd. Nke a ji okpukpu abụọ dị ngwa karịa òkè anyị pụrụ ịchịkwa ire, egbugbere ọnụ, agbà na akụkụ ọ bụla ọzọ anyị ji na-ekwu okwu mgbe anyị megharịrị ha iche iche. Ma jikọta ha nile maka okwu, ha na-arụkwa ọrụ n’ụzọ mkpịsị aka nke ndị ọkachamara n’iji ígwè typewriter ede ihe na nke ndị na-apị piano ihe nkiri si arụ. Mmegharị ha na-esochi onwe ha ná nkwekọ ụda olu nke na-adabakọ n’oge magburu onwe ya.”
N’ọ̀tụ̀tụ̀ a kpaara ókè, nnụnụ ụfọdụ pụrụ ijije ụda okwu mmadụ. Ma o nweghị anụmanụ nwere ụbụrụ e mere ikwu okwu n’ụzọ mmadụ si ekwu. Ọ bụghị ihe ijuanya na ndị ọkà mmụta sayensị enwebeghị ihe ịga nke ọma ná mgbalị ha ime ka ọzọdimgba kwuo okwu a pụrụ ịghọta. Dị ka onye ọkà ná mmụta usoro akwara ozi bụ́ Ronald Netsell si kwuo, a pụrụ iji nkà a chọrọ iji kwuo okwu tụnyere nke “onye pụrụ iche nke na-apị piano nanị ‘site n’ige ya ná ntị.’” Ma ọ bụ dị ka onye na-ede akwụkwọ ọkọwa okwu bụ́ Ludwig Koehler kwubiri: “Okwu mmadụ bụ ihe omimi; ọ bụ onyinye Chineke, ọrụ ebube.”