Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • be ihe ọmụmụ 2 p. 86-p. 88 para. 3
  • E Kwuru Okwu n’Ụzọ Doro Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • E Kwuru Okwu n’Ụzọ Doro Anya
  • Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Ire Gị Na-ekwu Okwu Ọma
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
  • Na-ekwu ‘Okwu Dị Mma Maka Iwuli Mmadụ Elu’
    “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke”
  • “Nkwekọ Ụda Olu nke Na-adabakọ n’Oge Magburu Onwe Ya”
    Teta!—1997
  • ‘Otú I Si Ekwu Okwu Ọ̀ Bụ Ihe E Ji Ama Atụ’?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Rite Uru ná Mmụta A Na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
be ihe ọmụmụ 2 p. 86-p. 88 para. 3

IHE ỌMỤMỤ NKE 2

E Kwuru Okwu n’Ụzọ Doro Anya

Gịnị ka ọ dị mkpa ka i mee?

Kwuo okwu ka ndị na-ege gị ntị wee nwee ike ịghọta ha n’ụzọ dị mfe. Nke a na-agụnye (1) iji akụkụ ahụ́ ndị e ji ekwu okwu eme ihe n’ụzọ kwesịrị ekwesị na (2) ịghọta ihe ndị mejupụtara okwu.

Gịnị mere o ji dị mkpa?

Mgbe ị kpọpụtara okwu nke ọma, ndị ọzọ pụrụ ịghọta ihe ị na-ekwu. O yikarịrị ka a ga-eji okwu e kwuru n’ụzọ doro anya kpọrọ ihe.

IJI nwee nkwurịta okwu n’ụzọ dị irè, ị ghaghị ikwu okwu n’ụzọ doro anya. Ihe ị chọrọ ikwu pụrụ ịbụ ihe na-adọrọ mmasị, ọbụna ihe dị mkpa, ma ihe dị ukwuu n’ime ya ga-efu ọhịa ma ọ bụrụ na o siri ike ịghọta ihe ị na-ekwu.

Okwu ndị mmadụ na-aghọtachaghị adịghị akpali ha. Ọ bụrụgodị na mmadụ nwere ụda olu dị ike, na a pụkwara ịnụ ihe ọ na-ekwu ngwa ngwa, ọ bụrụ na o kwupụtaghị okwu ya nke ọma, ha agaghị akwali ndị ọzọ ime ihe. Ọ ga-adị ka ọ na-ekwu okwu n’asụsụ ọzọ, nke onye na-anụ ya na-adịghị aghọta. (Jer. 5:15) Bible na-echetara anyị, sị: “Ọ bụrụ na opi akpọọ òkù na-edoghị anya, ònye ga-ejikere maka agha? N’otu ụzọ ahụkwa, ọ gwụla ma ùnu sitere n’ire unu kwuo okwu dị mfe nghọta, olee otú a ga-esi mara ihe a na-ekwu? N’eziokwu, unu ga na-agwa ikuku okwu.”—1 Kọr. 14:8, 9.

Gịnị Na-eme Ka Okwu Ghara Ido Anya? Ọ pụrụ ịbụ emepeghị ọnụ otú o kwesịrị. Uru ahụ́ kwedosiri ike bụ́ ndị dị n’agbà nakwa egbugbere ọnụ na-adịghị emegharị nke ọma pụrụ iso mee ka okwu ghara ịdapụta nke ọma.

Ikwu okwu oké ọkụ ọkụ pụkwara ime ka okwu sie ike nghọta. Nke ahụ yiri ịkpọ okwu e kwunyere na teepu oké ngwa ngwa karịa otú e mere ka e si kpọọ ya. E kwupụtara okwu ndị ahụ, ma ihe ka ukwuu n’uru ha bara na-efu ọhịa.

Mgbe ụfọdụ, okwu na-edoghị anya na-abụ n’ihi nkwarụ e nwere n’akụkụ ahụ́ ndị na-enye aka n’ikwu okwu. Ma ọbụna ndị nwere ụdị nsogbu ahụ pụrụ ime ihe dị ukwuu iji mee ka okwu ha ka mma site n’itinye aro ndị dị n’ihe ọmụmụ a n’ọrụ.

Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe, ihe na-akpata ikwu okwu na-edoghị anya bụ ekwupụtachaghị okwu ekwupụtacha—ikwukọta ha ọnụ n’enyetụghị ohere nke na ọ na-esi ike ịghọta ha. Nsogbu ahụ pụrụ ịgụnye ịmafere nkeji okwu ụfọdụ ma ọ bụ mkpụrụ akwụkwọ ndị dị mkpa ma ọ bụ akpọghị mkpụrụ akwụkwọ ndị ikpeazụ. Mgbe mmadụ na-ekwukọta okwu aghara aghara n’enyetụghị ohere, ndị ọ na-agwa okwu pụrụ ịghọtatụ ihe ụfọdụ na nkebi ahịrịokwu ụfọdụ, ma ha aghaghị ịkọ nkọ ná ndị ọzọ. Akpọpụtaghị okwu nke ọma nwere ike ime ka izi ihe mmadụ ghara ịdị irè.

Ụzọ Isi Kwuo Okwu n’Ụzọ Doro Anya. Otu n’ime isi ihe ndị dị mkpa n’ikwu okwu n’ụzọ doro anya bụ ịghọta ihe ndị na-aghọ okwu n’asụsụ gị. N’ihe ka n’ọnụ ọgụgụ asụsụ, ọ bụ nkeji okwu dị iche iche na-aghọ okwu. Ihe na-emejupụta nkeji okwu bụ otu mkpụrụ akwụkwọ ma ọ bụ karị ndị a na-akpọkọta ọnụ. N’asụsụ ndị dị otú ahụ, a na-anụkarị ụda nkeji okwu nke ọ bụla mgbe ị na-ekwu okwu, ọ bụ ezie na a gaghị emesicha ha nile ike n’ụzọ hà nhata. Ọ bụrụ na ị chọrọ ime ka okwu gị na-edo anya karị, belata otú i si ekwu okwu ngwa ngwa, meekwa ihe nile i nwere ike ime iji na-akpọpụta nkeji okwu nke ọ bụla. Ná mmalite nke a ga-ada ka ị na-elezibiga anya ókè n’otú i si ekwu okwu, ma ka ị na-amụgharị ya, ị ga-eji nwayọọ nwayọọ maliteghachi ikwu okwu n’ụzọ na-aga were were. Iji kwuo okwu n’ụzọ na-aga were were, o doro anya na ị ga-ekwukọta okwu ụfọdụ n’enyetụghị ohere, ma e kwesịrị izere nke a ma ọ bụrụ na ọ pụrụ ime ka echiche dị n’okwu gị ghara ịpụta ìhè.

Okwu ịdọ aka ná ntị: Iji meziwanye otú i si akpọpụta okwu, ị pụrụ ịmụgharị ịdị na-eji nlezianya gabigara ókè na-ekwu okwu ma na-agụ ihe. Ma ekwela ka nke ahụ ghọọ ụzọ ị ga na-esi ekwu okwu mgbe nile. Ọ ga na-ada ka ị na-eme ya ka e wee sị, ọ ga-adịkwa iche n’otú i si ekwu okwu.

Ọ bụrụ na okwu gị adịghị adapụtacha nke ọma, mụta iwelite isi gị elu, na-ewelitekwa agbà gị elu ka ọ ghara ịdịkwasị n’obi gị. Mgbe ị na-agụ Bible, welie akwụkwọ gị elu nke ọma nke na iwepụ anya gị n’ebe ndị na-ege ntị nọ ma lee na Bible gị ga-achọ nanị iledatụ anya nke nta. Nke a ga-eme ka okwu gị na-apụta n’enweghị ihe mgbochi.

Ịmụta inwe ntụsara ahụ́ pụkwara ime ka otú i si ekwu okwu gị ka mma. Ọ bụ nnọọ ihe a maara nke ọma na nkwedo nke uru ahụ́ ndị dị n’ihu gị ma ọ bụ ndị nke na-achịkwa iku ume gị pụrụ inwe mmetụta na-adịghị mma n’otú i si ekwu okwu. Ụdị nkwedo ahụ na-egbochi ịrụkọ ọrụ ọnụ nke ọma nke obi gị, akụkụ ahụ́ gị ndị na-ewepụta ụda okwu, na nchịkwa iku ume—ọrụ nke kwesịrị ịdị na-aga were were otú o kwesịrị ịdị.

Ọ dị mkpa ka uru ahụ́ ndị dị n’agbà ghara ikwedo ekwedo ka o wee mee ihe ngwa ngwa mgbe o nwetara ntụziaka site n’ụbụrụ. Egbugbere ọnụ aghaghịkwa ịtụsara ahụ́. Ha aghaghị ịdị njikere ịgbatị na ịbịaghachi ngwa ngwa ka o wee wepụtachaa ọtụtụ ụda ndị sitere n’ọnụ na n’akpịrị. Ọ bụrụ na agbà na egbugbere ọnụ kwedoro ekwedo, ọnụ agaghị emepe nke ọma, a ga-esitekwa n’ezé na-ekwupụta okwu. Nke a ga-akpata ikwu okwu na-adịghị ụtọ ná ntị, nke na-adapụtachaghị nke ọma, nke na-edoghị anya. Otú ọ dị, ime ka agbà na egbugbere ọnụ ghara ikwedo ekwedo apụtaghị ileghara otú anyị si akpọpụta okwu anya. Ọ dị mkpa ka e jikọta nke a na àgwà imepụta okwu ka e wee na-akpọpụta okwu n’ụzọ doro anya.

Mgbe i nyochara ọnọdụ gị, ị pụrụ ịchọpụta na ịgụpụta ihe agụpụta na-enye aka. Lezie anya nke ọma n’otú i si eji akụkụ ahụ́ dị ebube ndị na-enye aka n’ikwu okwu eme ihe. Ị̀ na-emeghe ọnụ gị nke ọma nke na ụda okwu na-enwe ike ịpụta n’enweghị ihe mgbochi? Ị ghaghị icheta na ọ bụghị nanị ire bụ akụkụ ahụ́ e ji ekwu okwu, ọ bụ ezie na o so ná ndị a kasị eji eme ihe. Olu, agbà, egbugbere ọnụ, uru ahụ́ ndị dị n’ihu na n’akpịrị na-ekerecha òkè. Mgbe ị na-ekwu okwu, ọ̀ na-adị gị ka ihu gị adịghị emegharị emegharị? Ọ bụrụ otú ahụ, o yikarịrị nnọọ ka okwu gị adịghị edo anya.

Ọ bụrụ na e nwere ígwè teepu, tinye ụda olu gị na teepu mgbe ị na-ekwu okwu otú i si ekwu okwu, otú ị ga-esi kwuo okwu mgbe ị na-agwa mmadụ okwu n’ozi ubi. Kwuo okwu ruo ọtụtụ minit n’ụdị mkparịta ụka ma kpọnye ha na teepu. Ige okwu ahụ i tinyere na teepu pụrụ inyere gị aka ịmata kpọmkwem nsogbu ọ bụla ị pụrụ inwe n’ịkpọpụta okwu ụfọdụ n’ụzọ doro anya. Lee ma ị̀ ga-ahụ ebe ndị i kwukọtara okwu n’enyetụghị ohere, ebe ị na-akpọpụtachaghị okwu nke ọma, ma ọ bụ ebe ị kpọbiiri okwu akpọbiri, gbalịakwa ịmata ihe kpatara ya. Ọtụtụ mgbe, a pụrụ ịgwọta adịghị ike ahụ site n’ịrụ ọrụ n’isi ihe ndị e kwuru n’elu.

Ì nwere nsogbu ikwu okwu? Mụọ imeghetụkwu ọnụ gị karịa otú ị na-emebu, gbalịakwa iji ọbụna nlezianya ka ukwuu na-akpọpụta okwu. Kujuo ume n’akpa ikuku gị mgbe ọ bụla i kuru ume, jirikwa nwayọọ nwayọọ na-ekwu okwu. Ime nke a emewo ka ọtụtụ ndị nwere nsogbu ikwu okwu nwee ike ikwu okwu n’ụzọ doro anya karị. Ọ bụrụ na ire gị na-apụta apụta mgbe ị na-akpọ mkpụrụ akwụkwọ ụfọdụ, wepụ ire gị n’ezé ihu gị mgbe ị na-akpọ s na z ndị dị n’okwu. Ọ bụ ezie na ikekwe a gaghị agwọta nsogbu gị kpam kpam, adala mbà. Cheta na Jehova họọrọ Mozis, bụ́ nwoke ọ pụrụ ịbụ na o nwere nsogbu ikwu okwu ka o zie ụmụ Izrel na Fero Ijipt ozi ndị dị mkpa. (Ọpụ. 4:10-12) Ọ bụrụ na ị dị njikere, ọ ga-ejikwa gị mee ihe, ọ ga-ejikwa ihe ịga nke ọma gọzie ozi gị.

ỤZỌ ISI MEE YA

  • Kwuo okwu ma gụpụta mkpụrụ okwu ọ bụla n’ụzọ doro anya—na-akpọpụta ha nke ọma, n’ụda olu kwesịrị ekwesị, n’ekwughịkwa okwu oké ọsọ ọsọ.

  • Ekwukọtala okwu ọnụ n’enyetụghị ohere ma ọ bụ kwuo ya n’ụzọ ga-eme ka ihe ha pụtara ghara ido ndị na-ege gị ntị anya.

  • Welite isi gị elu, megheekwa ọnụ gị nke ọma mgbe ị na-ekwu okwu.

  • Mụgharịa ime ka olu gị, agbà gị, egbugbere ọnụ gị, uru ahụ́ ndị dị n’ihu gị, na ndị dị n’akpịrị gị ghara ikwedo ekwedo.

IHE OMUME: Kwuo okwu otú i si ekwu. Olee otú ị na-emeperu ọnụ gị? Ọ̀ dị gị mkpa imepetụkwu ya ma jiri uru ahụ́ dị n’ihu gị mee ihe n’ụzọ zuru ezu karị? Mụọ ime ya ka ị na-agụpụta Matiu 8:23-27. Jide n’aka na i weliri isi gị elu, gbalịakwa ime ka uru ahụ́ ndị dị n’agbà gị ghara ikwedo ekwedo.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya