Ọchịchọ A Na-achọ Paradaịs nke Nsogbu Na-adịghị na Ya
“NANỊ ihe anyị chọrọ ime bụ imepụta ụzọ ndụ na-adịghị ize ndụ na ikekwe nke oge ochie ebe ndị mmadụ na-eche banyere ibe ha,” ka otu di na nwunye bụ́ ndị Britain kọwara. Ha kpebiri ịchọta otu paradaịs àgwàetiti na-ekpo ọkụ ma guzobe n’ebe ahụ ọha mmadụ nke ga-ebikọ ọnụ n’udo. Obi abụọ adịghị ya na ị pụrụ ịghọta echiche ha. Olee onye na-agaghị eji oké mmasị nakwere ohere nke ibi na paradaịs nke nsogbu na-adịghị na ya?
Nkewapụ Iche Ọ̀ Bụ Azịza Ya?
Echiche nke ibi n’àgwàetiti na-amasị ọtụtụ ndị na-achọ paradaịs, n’ihi na nkewapụ iche na-enye ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke nchebe. Ụfọdụ na-ahọrọ àgwàetiti ndị dịpụrụ adịpụ n’Ụsọ Oké Osimiri Pacific nke Panama ma ọ bụ àgwàetiti ndị dị na Caribbean, dị ka ndị ahụ dịpụrụ adịpụ na Belize. Ndị ọzọ na-echigharịkwuru ebe ndị mara mma dị n’Oké Osimiri India—dị ka ihe atụ, Seychelles.
Ihe ndị a chọrọ maka iguzobe ógbè dịpụrụ iche na-ebu isi. Ọ bụrụgodị na e nwere ego zuru ezu, iwu ọchịchị ndị dịnụ nwere ike igbochi ịzụta ala ngwa ngwa. Ma ka e were ya na a pụrụ inweta àgwàetiti na-ekpo ọkụ dị mma, ị̀ ga-enwe obi ụtọ n’ebe ahụ? Paradaịs gị ọ̀ ga-abụ nke nsogbu na-adịghị na ya?
Àgwàetiti ndị dịpụrụ adịpụ na gburugburu ụsọ oké osimiri nke Britain nwere ugbu a ụba mmadụ na-arị elu. Ndị ọhụrụ bi na ha na-abụkebe ndị na-achọ nnọrọ onwe onye na udo. Otu nwoke nke bi nanị ya n’àgwàetiti nke Eorsa dị hekta 100, nke dịpụrụ adịpụ n’ụsọ oké osimiri ọdịda anyanwụ nke Scotland, na-azọrọ na owu adịghị ama ya n’ihi na o nwere ọtụtụ ihe ime n’ilekọta ìgwè atụrụ ya dị otu narị atụrụ. Ndị ọzọ na-achọ nnọpụ iche nke àgwàetiti na-aghọ ndị owu na-ama ngwa ngwa. A kọwo na ụfọdụ anwawo igbu onwe ha ma chọọ nnapụta.
Ọtụtụ ndị kwetara na àgwàetiti mara mma na-ekpo ọkụ ga-abụ paradaịs. Ibi na gburugburu ebe dị jụụ nke na-adịghị enwekebe ọnọdụ ihu igwe dị oké njọ na-amasị ha. Ma nchegbu banyere ikpo ọkụ nke ụwa nke pụrụ ime eme na ịrị elu nke ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri nke ga-esi na ya pụta akpatawo egwu n’etiti ọtụtụ ndị bi n’àgwàetiti. Ndị bi n’àgwàetiti gbara mmiri gburugburu ndị dị ala ndị mejupụtara ókèala Tokelau nke dị n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Pacific nakwa ndị ahụ dịsasịrị na Maldive dị n’Oké Osimiri India, àgwàetiti ndị na-adịghị elu karịa mita abụọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke oké osimiri mgbe mmiri toro, na-abụkwa ndị e yiri egwu n’otu aka ahụ.
Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ọchịchị 40 dị iche iche ejikọtawo aka ọnụ ná njikọ Steeti Ndị Na-emepe Emepe nke Obere Àgwàetiti iji rịọta enyemaka maka ọnọdụ ha. Ọ bụ ezie na ndị bi n’ụmụ obere àgwàetiti n’ozuzu ya na-adịte ndụ aka, ọnwụ ụmụ ọhụrụ ha dịkwa ala, ha nọgidere na-eche nsogbu gburugburu ebe obibi ndị siri ike ihu. Mmanụ ndị na-ese n’elu mmiri na osimiri ndị ruru unyi na-emebi ọnọdụ akụ̀ na ụba nke àgwàetiti ụfọdụ. Ndị ọzọ na-aghọ ebe mkpofu ahịhịa maka ihe mkpofu na-egbu egbu ndị mba ndị buru ibu karị chọrọ ịtụfu.
Ọbụna kpọmkwem ikwesị ekwesị nke àgwàetiti ndị ahụ dị ka ebe nchebe nye ndị na-achọ paradaịs na-eyi egwu. N’ụzọ dị aṅaa? Ndị na-eme njem nleta bụ́ ndị na-enuga n’ikperé mmiri anwụ na-acha na ha nke àgwàetiti ndị ahụ na-akpata mmadụ ijubiga ókè na mbelata nke ebe ndị e si enweta ego dị nta. Ndị nleta a na-amụbakwa nsogbu nke mmetọ. Dị ka ihe atụ, na Caribbean, nanị otu ụzọ n’ụzọ iri nke mmiri ruru unyi nke nde ndị nleta 20 na-asachapụta kwa afọ ka a na-eme ka ọ ghara imerụ ahụ.
Ihe yiri ya na-eme n’ebe ndị ọzọ pụrụ iche. Tụlee ihe na-eme na Goa n’ụsọ oké osimiri ebe ọdịda anyanwụ nke India. “Ime njem nleta n’ìgwè ‘na-emebi otu paradaịs,’” ka Independent on Sunday nke London kwupụtara. Atụmatụ ndị ọchịchị mere na-egosi ịrị elu site ná ndị na-eme njem nleta 10,000 na 1972 ruo ihe karịrị otu nde ná mmalite afọ ndị 1990. Otu ìgwè na-adọ aka ná ntị na gburugburu ebe obibi pụrụ imebi ngwa ngwa nke Goa na ọdịbendị ya pụrụ iche bụ nke a na-eyi egwu site n’anyaukwu nke ndị nwere họtel bụ́ ndị nwere oké mmasị iri uru ná nnubata nke ndị na-eme njem nleta. Otu akụkọ nke ndị ọchịchị India wepụtara na-ekweta na e wuwo ụfọdụ họtel n’ụzọ iwu megidere n’ụsọ mmiri ahụ. E gwuruwo ájá, kwatuo osisi, ma kposaa ikpó ájá. A na-awụnye mmiri ruru unyi n’ụsọ mmiri ma ọ bụ ọ na-ehibanye n’ubi osikapa dị nso, na-ekesa nje.
Hà Bụ Ndị Mpụ Na-adịghị na Ha?
Mgbebata nke mpụ na-etetọ aha ọma nke ọbụna ógbè kasị dị n’udo. Site n’àgwàetiti Caribbean dị ntakịrị bụ́ Barbuda ka e si nweta akụkọ bu isi akụkọ bụ́ “Ogbugbu na Paradaịs.” Nke a kọrọ ogbugbu na-atụ ụjọ nke mmadụ anọ n’ụgbọ mmiri ndụ okomoko nke e kedoro n’ebe dị nso n’ụsọ oké osimiri àgwàetiti ahụ. Ihe omume ndị dị otú a na-eme ka nchegbu rịa elu banyere mgbasa nke mpụ n’ógbè nile ahụ dum.
“Ọgwụ Ọjọọ Akpalie Ọgụ Òtù na ‘Paradaịs’” bụ isi akụkọ nke akụkọ dị na The Sunday Times nke London banyere otu mba Etiti Kọntinent America. Onye nchịkọta akụkọ nọ n’ógbè ahụ kwara arịrị n’eziokwu ahụ bụ na udo apụwo, na-ekwu, sị: “Ugbu a ọ bụ ihe na-emekarị bụ́ ibili n’ụtụtụ ma hụ onye ntorobịa dị afọ 16 tọgbọrọ n’ime ọbara n’okporo ámá.”
Ndị na-ezube ibi n’ógbè paradaịs na-ele anya ịdọrọ mmasị nke ndị ga-ekweta ibi n’udo. Ma gịnị bụ ihe na-eme eme? Enweghị nkwekọrịta bilitere ngwa ngwa n’ọnọdụ di na nwunye ahụ bụ́ ndị Britain e hotara ná mmalite. Ụfọdụ n’ime ndị tinyere aha isonye n’atụmatụ ha chọrọ n’ụzọ doro anya inweta ego site ná ndokwa ahụ. “Anyị achọghị ndị ndú,” ka onye ahụ na-akwalite ya kwuru. “Ebumnobi ya bụ ịtụkọta ihe anyị nwere iji mee ka ihe na-aga n’ihu. Ana m akpọ ya ógbè Ihe Izu Okè.” Nke a abụghịkwanụ nke mbụ n’ihe omume dị otú ahụ.—Lee igbe bụ́ “Nnwale Ógbè Paradaịs.”
Ụfọdụ ndị ọzọ na-achọ paradaịs kwere na ha ga-enweta ihe mgbaru ọsọ ha site n’irite lọtrị. Ma uru ego e si otú a nweta adịghị ewetakebe obi ụtọ. Na February 1995, The Sunday Times kọrọ na ezinụlọ nke ritere lọtrị kasị ukwuu nke Britain ruo ugbu a nwere esemokwu dị ilu; irite ihe wetaara ha nanị “mkpasu iwe, oké ibu iro na-adịte anya na ndakpọ olileanya.” Nke a abụghị ihe a na-adịghị ahụkebe n’ọnọdụ ndị dị otú ahụ.
N’otu ihe ọmụmụ banyere ọchịchọ mmadụ na-achọ Ihe Izu Okè, odeakụkọ bụ́ Bernard Levin na-ekwu okwu banyere “nrọ ịba ọgaranya ngwa ngwa,” ma na-ekwusi ike, sị: “Dị nnọọ ka ọtụtụ nrọ, nrọ na-atụ ụjọ na-esochi. E nwere ọtụtụ akụkọ ndị bụ eziokwu banyere ịba ọgaranya ngwa ngwa ndị dugara n’oké ọdachi (gụnyere igbu onwe onye) nke na a gaghị ewere ha dị ka ihe ndapụta.”
Gịnị Banyere Òtù Ndị Na-akpọsa Ụbọchị Mbibi?
Atụmatụ ndị ọzọ maka paradaịs enwewo ajọ ihe ndị ọzọ ha na-egosi. N’ịkọ banyere mwakpo nke ndị ọrụ gọọmenti na-ahụ maka idebe iwu mere na Waco, Texas, n’ogige nke Ndị Alaka David laa azụ na 1993, otu akwụkwọ akụkọ kwuru okwu banyere “ngwakọta dị ize ndụ nke égbè, nchịkwa echiche na onye amụma ụbọchị mbibi” nke dugara n’ọdachi ahụ. N’ụzọ dị mwute, nke a abụghị ihe omume pụrụ iche.
Ụmụazụ Bhagwan Shree Rajneesh nwụworonụ, bụ́ onye ndú okpukpe bụ́ onye India, guzobere otu ógbè n’Oregon ma mejọọ ikike mmetụta omume nke ndị agbata obi ha. Ịba ọgaranya nke ndị ndú ha na nnwale mmekọahụ ha mere mebiri nzọrọ ha nke iguzobewo “ebe nchebe mara mma.”
Ọtụtụ òtù nzuzo nke ndị nwere olileanya paradaịs na-edu na-achọ ka ụmụazụ ha na-eme ememe okpukpe ndị na-edoghị anya, bụ́ ndị na-arụpụtakarị esemokwu ime ihe ike. Onye na-ede akụkụ pụrụ iche n’akwụkwọ akụkọ bụ́ Ian Brodie na-akọwa, sị: “Òtù nzuzo na-enye ebe nchebe na ọha mmadụ a haziri ahazi nye ndị chere na ndụ ha tọgbọ chakoo ma ọ bụ ndị na-apụghị ịnagide nrụgide nke ụwa.” Ka o sina dị, okwu ya na-agba àmà nye eziokwu ahụ bụ na ọtụtụ ndị ga-achọ ibi na paradaịs.
Paradaịs Nsogbu Na-adịghị na Ya
Ndepụta nke nsogbu yiri ka ọ dịghị agwụ agwụ: mmetọ, mpụ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, oké ụba mmadụ, esemokwu agbụrụ, ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị—tinyere nsogbu ndị ahụ ụmụ mmadụ nile na-enwekarị, bụ́ ọrịa na ọnwụ. Nkwubi okwu aghaghị ịbụ na ọ dịghị ebe ọ bụla na mbara ụwa a e nwere paradaịs nke nsogbu na-adịghị na ya ma ọlị. Dị ka Bernard Levin kwetara: “E nwere ihe na-adịghị mma n’ihe ndekọ nke ụmụ mmadụ, o yikwara ka ọ dịwo ebe ahụ eri ụmụ mmadụ dịwara. Ọ dị n’ụdị nke enweghị ike isoro ụmụ mmadụ ole na ole ndị ọzọ biri n’obi ụtọ n’ụzọ chiri anya.”
Otú ọ dị, a ga-enwe paradaịs zuru ụwa ọnụ nke nsogbu na-agaghị adị na ya n’ezie. Ndịte aka ya bụ ihe ike karịrị nke mmadụ kwere nkwa ya. N’ezie, ihe karịrị nde mmadụ ise na-arụ ọrụ ọbụna ugbu a iji nweta nke ahụ, ha anọwokwarị na-anụ ụtọ ịdị n’otu dị oké ọnụ ahịa na gburugburu ebe nsogbu na-adịchaghị na ya n’etiti onwe ha. Olee ebe ị pụrụ ịchọta ha? Olee otú ị pụrụ isi kere òkè n’otu olileanya na uru ndị ahụ ha nwere ugbu a? Ruokwa ogologo oge hà aṅaa ka Paradaịs ahụ na-abịa abịa ga-adịru?
[Igbe dị na peeji nke 6]
Nnwale Ógbè Paradaịs
Ná mmalite narị afọ nke 19, onye France na-akwado ọchịchị ọha na eze bụ́ Étienne Cabet (1788-1856) na ndị òtù 280 ya guzobere otu ógbè na Nauvoo, Illinois, nke dabeere n’ụkpụrụ ya. Ma n’ime afọ asatọ esemokwu dị ukwuu bilitere n’ógbè ahụ nke na o kewasịrị n’oge na-adịghị anya, dị ka ìgwè ndị yiri ya dị n’Iowa na California mere.
Nwoke ọzọ bụ́ onye France, bụ́ Charles Fourier (1772-1837), wepụtara atụmatụ maka ógbè ịkọ ugbo na-emekọ ihe ọnụ nke nwere ibu ọrụ na-agbanwe agbanwe maka ndị òtù ya nile. Onye ọ bụla ga-anata ụgwọ ọrụ na-adabere n’ịga nke ọma nke ìgwè ahụ n’ozuzu ya. Ma ógbè ndị dabeere n’ụkpụrụ omume a ma na France ma na United States adịteghị anya.
N’ihe dị ka otu oge ahụ, onye mgbazi uche ọha bụ́ onye Wales bụ́ Robert Owen (1771-1858) mere atụmatụ obodo nta ndị na-emekọ ihe ọnụ ebe ọtụtụ narị ndị mmadụ ga-ebikọ na-enwe kichin na ebe iri ihe e nwekọrọ ọnụ. Ezinụlọ dị iche iche n’otu n’otu ga-ebi n’ụlọ nke aka ha ma lekọta ụmụ ha ruo mgbe ha ruru afọ atọ. Mgbe nke ahụ gasịrị, ógbè ahụ dum ga-eweghara nlekọta ha. Ma nnwale Owen kụrụ afọ n’ala, ihe ka ukwuu n’ihe ndị o nwere funahụrụ ya.
John Noyes (1811-1886) ghọrọ onye guzobere ihe The New Encyclopædia Britannica na-akpọ “ógbè ọha na eze ihe izu okè nke kasị gaa nke ọma e nwere na United States.” Mgbe ụmụazụ ya gbahapụrụ ịlụ otu di na otu nwunye ma nakwere inwe mmekọahụ nanị site ná nkwekọrịta n’etiti ha nile, e jidere Noyes maka ịkwa iko.
Obodo Ukwu Laissez Faire, ụdị nke “Ihe Izu Okè achụmnta ego” n’Etiti Kọntinent America, bụ mgbalị ọhụrụ e mere iji mepụta ógbè Ihe Izu Okè dị otú ahụ, ka The Sunday Times nke London na-akọ. Ihe owuwu ahụ chọrọ ndị ga-etinye ego. N’ịbụ ndị olileanya nke ibi ‘n’obodo ọrụ ebube nke narị afọ nke 21’ ratara, a kpọrọ ndị na-achọ paradaịs òkù izite $5,000 ma sonye ná nkwekọrịta azụmahịa wayo, na-achọ ndị nwere nzube yiri nke ahụ bụ́ ndị, ga-emesịa tinye ego ha. Dị ka e si kọọ, ihe ego a nile mere bụ ịkwụ ụgwọ tiketi ụgbọelu iji kirie ihe owuwu ahụ “ma ọ bụrụ na e nwere mgbe a ga-arụgide otu mba inye ya ala ebe a ga-ewu ihe, e wuokwa otu obere họtel n’ebe ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ ahụ kwuru. E nweghị olileanya ezi uche dị na ya nke iguzobe “paradaịs” ọ bụla n’ebe ahụ.
[Foto dị na peeji nke 7]
Àgwàetiti na-amasị ọtụtụ ndị na-achọ paradaịs. Ma taa mpụ na-etetọ ọbụna ógbè ndị kasị dị n’udo