Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 11/8 p. 14-16
  • Ihe Mere Ụmụaka Ji Abụ Ezigbo Ndị Agha

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mere Ụmụaka Ji Abụ Ezigbo Ndị Agha
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Uru Ha Bara Dị Ka Ndị Soja
  • Iwe Ndị Ọhụrụ na Ịzụ Ha
  • Ibiwekwa Ndụ Dị Mma Ọzọ
  • Ngwá Agha Ndị Obere, Nnukwu Nsogbu
    Teta!—2001
  • Ụmụaka Nọ ná Nsogbu
    Teta!—1999
  • Ụmụaka Kwesịrị Ịbụ Ndị A Chọrọ Ma Hụ n’Anya
    Teta!—2000
Teta!—1997
g97 11/8 p. 14-16

Ihe Mere Ụmụaka Ji Abụ Ezigbo Ndị Agha

Ì GBURU MMADỤ? “Ee e.”

Ì NWERE ÉGBÈ? “Ee.”

Ị̀ TỤGIDERE MMADỤ ÉGBÈ? “Ee.”

Ị̀ GBARA YA? “Ee.”

GỊNỊ MERE? “Ha dara nnọọ n’ala.”—World Press Review, January 1996.

MKPARỊTA ụka a na-awụ akpata oyi n’ahụ n’etiti onye ọrụ ebere na otu nwatakịrị soja n’Africa na-ekpughe mgbagwoju anya dị n’uche onye na-eto eto nke na-agbalị ịghọta ihe o mere n’oge gara aga.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ná mba 25, ụmụaka na-erubeghị afọ 16 esonyewo n’ọgụ. Na 1988 nanị, ihe dị ka ụmụaka 200,000 na-ekeresi òkè ike n’agha. N’ihi na ndị toro eto aghọgbuwo ha, ụmụaka na-alụ ọgụ bụkwa ndị na-ata ahụhụ.

Uru Ha Bara Dị Ka Ndị Soja

N’oge gara aga, mgbe usuu ndị agha ji ube na mma agha lụọ ọgụ, nwatakịrị enwekebeghị ike iguzo n’ihu onye toro eto jikwa ngwá agha yiri ndị ahụ. Ma ugbu a bụ ọgbọ ngwá agha ndị na-adịghị arọ. Taa, nwatakịrị bu égbè na-akwa mgbọ—AK-47 ndị Soviet mere ma ọ bụ M16 ndị America mere—na onye toro eto ga-achịpụli ya.

Ọ bụghị nanị na ngwá agha ndị a adịghị arọ kamakwa ha dị mfe ojiji na idozi. Onye dị afọ iri pụrụ ịtọsasị na ịkwụkọtaghachi AK-47. Égbè ndị a dịkwa ọtụtụ. E rewo ihe dị ka nde 55 AK-47. N’otu mba Africa, a na-ere ha ọnụ ala dị ka $6 (U.S.). M16 jukwara ebe nile, dịkwa ọnụ ala.

E wezụga inwe ike ịgba égbè ndị na-akwa mgbọ, ụmụaka bụ ndị soja bara uru n’ihi ihe ndị ọzọ. Ha adịghị ana ụgwọ ọnwa, ha adịghịkwa agbafukarị. Ọzọkwa, ụmụaka nwere ọchịchọ si n’ime obi imeta ndị tọrọ ha mma. Echiche ha nke ihe ọma na ihe ọjọọ na-emila ala n’ihu ọchịchọ nke ịbụ ndị ìgwè nnwere onwe ma ọ bụ ndị agha okpuru ọ bụla ghọworo “ezinụlọ” ha nakweere.

Ọtụtụ n’ime ha yikwara ka ha adịghị atụ ụjọ. Otu onye agha na-ekiri ihe na-emenụ n’Ọdịda Anyanwụ Africa kọwara, sị: “Ebe [ụmụaka] na-eyighị ka ha ghọtara ọnwụ otú ahụ ndị soja tọrọ ha si ghọta ya, o yikebeghị ka ha ga-achịli aka elu n’ọnọdụ enweghị olileanya.” Otu nwatakịrị nwoke Liberia, onye na-aza Ọchịagha Ígwè Na-egbu Mmadụ, turu ọnụ, sị: “Mgbe ndị oké mmadụ tụgharịrị rie ọsọ, anyị bụ́ ụmụaka na-eguzo ịlụ ọgụ.”

N’ụzọ na-emegide onwe ya, ọ bụ ezie na ụmụ okoro na-arụta ọrụ soja, a na-elekarị ha anya dị ka ndị kasị dị ọnụ ala idochi. N’otu agha a lụrụ n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, e nyere ìgwè ụmụaka bụ́ ndị soja iwu ka ha bute ụzọ n’ọgbọ ndị e liri ogbunigwe.

Iwe Ndị Ọhụrụ na Ịzụ Ha

Ụmụaka ụfọdụ na-abanye n’òtù ndị agha ma ọ bụ nnupụisi n’ihi na ha na-achọ ime mwagharị. Ọzọ, mgbe njinji na-achọ iji, ezinụlọ gbasasịakwa, òtù ndị agha na-enye mmetụta nke ịnọ ná ntụkwasị obi ma na-aghọ ebe e ji mere ezinụlọ. Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu, sị: “Ụmụaka toliteworo na gburugburu ebe a na-eme ihe ike na-ahụ nke a dị ka ụzọ ndụ na-adịgide adịgide. N’ịnọ nanị ha, n’ịbụ nwa mgbei, n’ụjọ, n’ike ọgwụgwụ na nkụda mmụọ, ọtụtụ mgbe ha ga-emesịa họrọ ịlụ ọgụ.”

Ụmụaka ndị ọzọ na-abanye n’òtù ndị agha n’ihi na ọ pụrụ iyi ka e nweghị nhọrọ ọzọ ka mma. Mgbe ụfọdụ, mgbe ihe oriri dị ụkọ, njinji na-achọkwa iji, ịbanye n’òtù agha pụrụ iyi ka ọ bụ nanị ụzọ isi lanarị.

Ụmụaka pụrụ ịhụ onwe ha mgbe ụfọdụ dị ka ndị na-alụ ọgụ maka ikpe ziri ezi ọha mmadụ, nkwenkwe okpukpe, ma ọ bụ njimara ọdịbendị. Dị ka ihe atụ, na Peru, ụmụaka a manyeworo ịbanye n’ìgwè ndị agha okpuru na-anata nzụgharị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ewe ogologo oge. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe nke ahụ adịghị mkpa. Brian Milne, bụ́ ọkà mmụta mmalite omume mmadụ nke mụrụ banyere ụmụaka bụ́ soja na Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia, kwuru, sị: “Ụmụaka enweghị nkwenkwe ma ọ bụ ozizi. Otu akụkụ ma ọ bụ ọzọ na-amịkọrọ ha nnọọ ma nye ha ọrụ.”

A na-amanyekwa ụmụaka ndị ọzọ ịbanye. N’agha Africa ụfọdụ, ndị agha na-awakpo ime obodo ịnwụchi ụmụaka, bụ́ ndị a na-emezi ka ha kirie ma ọ bụ kere òkè ná mmekpọ ọnụ na ogbugbu nke ezinụlọ nke ha. Mgbe ụfọdụ a na-amanye ha ịgbagbu ndị mụrụ ha ma ọ bụ ibepụ ha olu. Ozugbo e yiri ha egwu, a na-akwanye ụmụ okoro ahụ n’iyi ndị ọzọ egwu. Ụmụ okoro a a rụsịworo arụrụala na-emekarị ihe ndị jọgburu onwe ha nke ọbụna ndị soja hụworo ihe na-agaghị eme.

Ibiwekwa Ndụ Dị Mma Ọzọ

Ọ dịghịrị ụmụaka dị otú ahụ mfe ịgbanwe biwe ndụ emeghị ihe ike. Onye nlekọta nke otu ogige na-ahụ maka ụmụaka n’otu mba Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa kwuru, sị: “A kpaghasịrị uche ụmụaka ndị anyị gwọworo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị iche iche. Ha edinawo mmadụ n’ike, gbuo ma mekpaa ndị mmadụ ahụ. E nyere ihe ka ọtụtụ n’ime ha ihe ọṅụṅụ na-aba n’anya ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ, karịsịa wii wii, ma mgbe ụfọdụ heroin. . . . Ị pụrụ iche echiche banyere mmetụta ọjọọ ihe ndị dị otú ahụ na-enwe n’uche ụmụaka, ndị ụfọdụ n’ime ha ka dị afọ asatọ ma ọ bụ itoolu.”

Ọ bụkwa otu ọnọdụ ahụ dị na Liberia gbara ya agbata obi, bụ́ ebe ọtụtụ iri puku ụmụaka tinyeworo oge ịbụ nwata ha n’iyi ndị ime obodo egwu. Ọ dịghịrị ndị isi agha na ndị ọchịagha nọ n’afọ iri na ụma mfe ịhapụ ùgwù na ike nke AK-47 na-enye ha. Otu onye bi na Somalia kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i ji égbè, i ji ndụ gị n’aka. Ma i jighị égbè, i jighị ndụ gị n’aka.”

Ọtụtụ mgbe, ụmụaka na-alụ ọgụ apụghị ịlata ụlọ n’ihi ịba mba ma ọ bụ ọjụjụ nke ezinụlọ ha. Otu onye ndụmọdụ ụmụaka na Liberia kwuru, sị: “Ndị nne ga-agwa anyị, sị, ‘Unu na ya nọdụ. Anyị achọghị anụ ọhịa a n’ụlọ anyị.’”

Ọ bụ ezie na ọtụtụ ụmụaka agbanwewo biwe ndụ udo, ime otú ahụ na-achọ ịhụnanya, nkwado, na nghọta dị ukwuu site n’aka ndị nọ ha gburugburu. Ọ dịghịrị ma ụmụaka ahụ ma ezinụlọ ha mfe. Otu onye ọrụ ebere na Mozambique kọwara, sị: “Jiri ndụ nke iwere ihe ọ bụla ị chọrọ, ịgwa ndị ọzọ ihe ha ga-eme, tụnyere ndụ gị mgbe ị latara n’obodo. Karịsịa ma ọ bụrụ na ị dị afọ 17, ị maghịkwa akwụkwọ, i nweghịkwa aka ọrụ. Ike ụwa ga-agwụ gị. O siri oké ike ịlaghachi n’ọnọdụ nke ndị ọzọ ịgwa gị ihe ị ga-eme na nke ịmaliteghachi ịga akwụkwọ n’isi.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 15]

Anwar dị afọ 13 bi n’Afghanistan. Ochie dike n’ọgụ isii, o gburu mmadụ nke mbụ ya n’ọgụ nke asaa. Ọ nọ oké nso gbagbuo ndị soja abụọ ma jiri ike égbè ya dụọ ha n’ahụ iji jide n’aka na ha nwụrụ anwụ. Mgbe a jụrụ ya otú ahụ si mee ya banyere ihe merenụ, Anwar yiri onye ajụjụ ahụ gbagwojuru anya. “Obi dị m ụtọ n’ihi na m gburu ha,” ka o kwuru.

N’oge otu ọgụ ahụ, ndị soja ibe Anwar jidere ndị agha anọ bụ́ ndị iro. Mgbe ahụ e kere ndị ahụ e jidere eriri, kechie ha anya, ma gbagbuo ha. Olee otú ahụ mere Anwar banyere nke ahụ? Nwa okoro ahụ na-alụ ọgụ weliri iku anya ya elu ma jiri nwayọọ na iche echiche zaa, dị ka ọ na-agwa onye na-enweghị uche. “Obi dị m ụtọ.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 16]

Otu onye mkpọrọ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa nke a ga-atọhapụ n’isi nso bụ onye a tụrụ ịga n’aka, ma onye ọchịagha atụfuwo ugodi ahụ. Ọchịagha ahụ doziri nsogbu ahụ site n’inye otu nwatakịrị soja iwu ka o bepụ aka onye mkpọrọ ahụ. “Ná nrọ m, m ka na-anụ mkpu ákwá nke nwoke ahụ,” ka nwatakịrị ahụ na-ekwu. “Mgbe ọ bụla m chere banyere ya, m na-akwa arịrị ya.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya