Ụmụaka Nọ ná Nsogbu
“Nsogbu nile bụ́ isi karịsịa, ndị na-adịte anya nke ihe a kpọrọ mmadụ ga-anọgide na-abụ nsogbu ndị bụ́ isi, ndị na-adịte anya, ọ gwụlakwa ma e lebaara ụmụaka anya.”—Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu.
N’ỤWA nile ụmụaka nọ ná nsogbu. E wepụtara ihe àmà doro anya na-egosi otú ọdachi a bururu n’ibu ná Nzụkọ Ụwa Megide Iji Ụmụaka Akpa Ego n’Ụzọ Mmekọahụ nke e nwere na Stockholm, Sweden, na 1996, nke ndị nnọchiteanya nke mba 130 bịakwara. Dị ka ihe atụ, e dekọrọ na n’ọtụtụ akụkụ ụwa, e nwere ọtụtụ nde ụmụ agbọghọ, ndị ụfọdụ n’ime ha dị ọbụna nanị afọ iri, bụ́ ndị a na-amanye ịgba akwụna.
Akwụkwọ bụ́ Melbourne University Law Review nke Australia kwuru na a kpọwo ụdị ịgba akwụna ahụ a manyere amanye “otu n’ime ụdị ịgba ohu kasị njọ n’oge a.” Ọ na-enwe mmetụta ọjọọ n’ahụ ụmụ agbọghọ ndị a ruo ogologo ndụ ha nile mgbe ọtụtụ afọ nke iti ihe, mkpaghasị uche, na igbu mmụọ gasịrị. N’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ, ụmụ agbọghọ ndị ahụ na-etinye onwe ha ná mmeso obi ọjọọ a nanị n’ihi na ha chọrọ iri nri iji dịrị ndụ. Nhọrọ ọzọ ha nwere bụ ịnwụ n’agụụ. Ọ dị mwute ikwu na ọ bụ ndị nne na nna dara ogbenye nke ọtụtụ n’ime ụmụaka ndị a na-enweghị ebe obibi, bụ́ ndị rere ha n’ihi ego, manyere ha ịgba akwụna.
Okwu banyere iji ụmụaka akpata ego, bụ́ nke a na-arụkarịrị oké ụka, bụ ọdachi ọzọ pụtara ìhè nye ụmụaka. N’Esia, n’Ebe Ndịda America, na n’ebe ndị ọzọ na n’ụfọdụ ógbè ebe ndị kwabatara akwabata bi na United States, a na-amanye ụmụaka ndị dị ọbụna nanị afọ ise n’ihe a pụrụ ịkpọ “ịgba ohu.” Ha na-arụ ọrụ dị ka ụmụ obere ígwè ọrụ robot n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha nke na-ebibisị ahụ na uche ha na-akabeghị aka. Ihe ka ọtụtụ n’ime ha adịghị aga akwụkwọ, ha adịghị enweta ịhụnanya nne na nna, ha enweghị ebe obibi ebe ha ga-anọ n’obi iru ala, ha enweghị ihe ndị e ji egwuri egwu, ha enweghị ogige ntụrụndụ. Nne na nna nke ọtụtụ n’ime ha na-erigbu ha n’emeghị ebere.
Ụmụaka Bụ́ Ndị Soja na Ogige Ụmụ Mgbei
N’ime ka ọdachi ahụ kakwuo njọ, e nwewo ịrị elu nke iji ụmụaka bụ́ ndị soja eme ihe n’usuu ndị agha okpuru. A pụrụ ịtọrọ ụmụaka ma ọ bụ zụta ha n’ahịa ohu ma jirizie nwayọọ nwayọọ mekpọọ ha ọnụ, mgbe ụfọdụ site n’ime ka ha na-ekiri igbu mmadụ. E nyewo ọbụna ụfọdụ iwu ka ha gbuo ndị mụrụ ha ma ọ bụ ṅụọ ọgwụ ọjọọ iji mee ka ha nwekwuo ọchịchọ igbu mmadụ.
Ihe na-esonụ bụ ihe atụ nke mmetụta nzighasị uche ahụ e zighasịworo ọtụtụ puku ụmụaka bụ́ ndị soja n’Africa nwere. Mkparịta ụka a na-awụ akpata oyi n’ahụ bụ nke otu onye ọrụ ebere na otu nwatakịrị nwoke bụ́ onye soja nke yiri ka ọ na-anwa igosi na o nwere ebe aka ya dị ọcha:
“Ì gburu mmadụ? ‘Ee e.’
Ì nwere égbè? ‘Ee.’
Ị̀ tụgidere mmadụ égbè ahụ? ‘Ee.’
Ị̀ gbara ya? ‘Ee.’
Gịnị mere? ‘Ha dara nnọọ n’ala.’”
Ụfọdụ n’ime ndị na-eto eto ndị a ka bụ ụmụ ọhụrụ n’iburu n’uche na ụfọdụ ndị soja ahụ dị afọ isii ma ọ bụ karịa. A kọwo na ọbụna laa azụ na 1988, ụmụaka bụ́ ndị soja dị ihe dị ka 200,000 n’ụwa nile.
A na-ekwu na n’agbata afọ 1988 na 1992, n’otu ogige ụmụ mgbei dị n’otu mba Esia, a họpụtara ụmụaka 550, ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ụmụaka nwanyị, ịnwụ n’agụụ. Otu dọkịta na-akọ, sị: “Ụmụ mgbei ahụ enweghị mkpụrụ ọgwụ ga-akwụsị ihe mgbu ha. Ọbụna ka ha dina n’ute ọnwụ, e ji eriri kedo ha n’àkwà ha.”
Gịnị banyere Europe? E nwere ọgba aghara n’otu mba n’ebe ahụ mgbe a chọpụtara òtù azụmahịa zuru ụwa ọnụ nke na-eji ụmụaka eme ihe na-akpali agụụ mmekọahụ, nke na-atọrọ ụmụaka nwanyị n’ike maka irigbu ha n’ụzọ mmekọahụ. E gburu ụfọdụ ụmụaka nwanyị nwere ihe ndabara ọjọọ ma ọ bụ debe ha ka ha nwụọ n’agụụ.
Akụkọ ndị a na-egosi n’ezie na ọtụtụ mba nwere ezigbo nsogbu n’ihe banyere imetọ na irigbu ụmụaka. Ma ikwu na nke a bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ, ọ̀ bụ ikwubiga okwu ókè? Isiokwu na-esonụ ga-aza ajụjụ ahụ.
[Foto dị na peeji nke 4]
Otu nwatakịrị bụ́ onye soja na Liberia
[Ebe E Si Nweta Foto]
John Gunston/Sipa Press
[Foto dị na peeji nke 4]
A na-eji ụmụaka emere “wheelbarrow” n’otu ụlọ ọrụ na-akpụ brik na Colombia
[Ebe E Si Nweta Foto]
UN PHOTO 148000/Jean Pierre Laffont
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 3]
FAO photo/F. Botts