Nrigbu Ụmụaka n’Ụzọ Mmekọahụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA SWEDEN
A na-eme ka ọha mmadụ maa jijiji site n’otu ụdị mmetọ ụmụaka na-awụ akpata oyi n’ahụ nke dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ na ọdịdị a na-amaghị n’ọtụtụ ebe ruo n’afọ ndị na-adịbeghị anya. Iji hụ ihe a pụrụ ime banyere ya, ndị nnọchiteanya nke mba 130 zukọtara na Stockholm, Sweden, na nke mbụ ná Nzukọ Ụwa Megide Nrigbu Ụmụaka n’Ụzọ Mmekọahụ Maka Azụmahịa. Otu onye nta akụkọ Teta! na Sweden nọkwa n’ebe ahụ.
MGBE Magdalen dị afọ 14, a rabanyere ya ịrụ ọrụ dị ka “nwanyị oje ozi” n’ụlọ biya dị na Manila, Philippines. N’ezie, ọrụ ya gụnyere ịkpọrọ ndị ahịa ha bụ ndị nwoke banye n’otu ntakịrị ọnụ ụlọ na ịgba ọtọ maka mmekọahụ—nkezi nke ụmụ nwoke 15 n’otu abalị na 30 na Saturday. Mgbe ụfọdụ, mgbe o kwuru na ya apụkwaghị ịnagide ya, manija ya ga-amanye ya ịga n’ihu. Ọtụtụ mgbe ọ na-emechi ọrụ n’elekere anọ n’ụtụtụ, na-enwe ike ọgwụgwụ, ịda mbà n’obi, na iwe.
Sareoun bụ nwa okoro na-eto eto bụ́ nwa mgbei nke na-ehi n’okporo ámá na Phnom Penh, Cambodia. O bu ọrịa syphilis, bụrụkwa onye a maara na o sorowo ndị ala ọzọ ‘mee mkpapụ.’ E nyere ya ụlọ n’otu ụlọ nsọ, bụ́ ebe otu onye bụbu onye mọnk gaje ‘ilekọta ya.’ Otú ọ dị, nwoke a metọrọ nwa okoro ahụ n’ụzọ mmekọahụ ma kpọrọ ya maka iso ndị ala ọzọ na-enwe mmekọahụ. Mgbe e bibiri ebe Sareoun bi n’ụlọ nsọ ahụ, ya na otu onye ikwu ya bụ nwanyị malitere ibi ma a ka manyekwara ya ịgba akwụna.
Ndị a bụ ihe atụ abụọ nanị nke ajọ nsogbu ndị e kwuru maka ha ná ngwụsị afọ gara aga ná Nzukọ Ụwa Megide Nrigbu Ụmụaka n’Ụzọ Mmekọahụ Maka Azụmahịa. Ruo n’ókè hà aṅaa ka omume a gbasaruru? Ọ gụnyere ọtụtụ narị puku ụmụaka—n’ezie, ụfọdụ na-ekwu ọtụtụ nde. Otu onye bịara nzukọ ahụ chịkọtara nsogbu ahụ, sị: “A na-azụta ma na-ere ụmụaka dị ka ngwá ahịa mmekọahụ na nke akụ̀ na ụba. A na-azụ ma na-ere ha n’ime obodo na gaa n’obodo ọzọ dị ka ahịa iwu, tụọ ha mkpọrọ n’ụlọ ndị akwụna ma manye ha inyefe onwe ha n’aka ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị nrigbu n’ụzọ mmekọahụ.”
N’okwu mmeghe ya gwa nnọkọ ahụ, praịm minista Sweden, bụ́ Göran Persson, kpọrọ nrigbu a “ụdị mpụ obi ịta mmiri kachasịnụ, nke obi ọjọọ na nke na-asọ oyi karịsịa.” Otu onye nnọchiteanya nke Mba Ndị Dị n’Otu kwuru na ọ “bụ mwakpo ụmụaka n’ụzọ nile . . . , ọ dị njọ n’ozuzu ya, ọ bụkwa mmebi kasị asọ oyi a pụrụ icheta n’echiche nke ihe ndị ruuru mmadụ.” E kwupụtara ọtụtụ okwu iwe yiri ndị ahụ banyere nrigbu ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ site n’elu ikpo okwu ná nzukọ ahụ nile ka a nọ na-atụle ókè ọ gbasaruru, ọdịdị ya, ihe ndị na-akpata ya, na mmetụta ndị ọ na-enwe.
“O zuru mba nile, mmetụta ya na-esi n’otu ọgbọ gaa n’ọgbọ ọzọ,” ka otu ihe odide kwuru. Ọzọ kwuru, sị: “E kwenyere na ihe e mere atụmatụ ya ịbụ 1 nde ụmụaka na-abanye n’ahịa mmekọahụ ahụ iwu na-akwadoghị nke na-eweta ọtụtụ ijeri dollar kwa afọ.” Na-enwe mmetụta dị aṅaa? “A na-emebi echiche inwe ùgwù, àgwà na ịba uru onwe onye nke ụmụaka, a na-abịadakwa ikike inwe ntụkwasị obi ha. A na-etinye ahụ ike anụ ahụ na nke mmetụta uche ha n’ihe ize ndụ, mebie ihe ndị ruuru ha, tinyekwa ọdịnihu ha n’ihe ize ndụ.”
Ụfọdụ Ihe Ndị Na-akpata Ya
Gịnị bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata oké uto nke nsogbu a? E kwuru na ụfọdụ ụmụaka bụ ndị “ọnọdụ na-akwabanye n’ịgba akwụna, dị ka ụzọ isi lanarị n’okporo ámá, inye aka ịkwado ezinụlọ ha, ma ọ bụ ịkwụ ụgwọ maka uwe na ihe ndị ọzọ. A na-arafu ndị ọzọ site n’oké ngosipụta nke ndị nwere ihe onwunwe n’usoro mkpọsa ngwá ahịa.” A na-atọrọkwa ma na-amanye ndị ọzọ ịba n’ịgba akwụna. E hotara ndakpọ dị oké ngwa nke ụkpụrụ omume ọma n’ebe nile, tinyere echiche enweghị olileanya zuru ebe nile dị ka ihe ndị so na-akpata ya.
Ọtụtụ ụmụ okoro na agbọghọ na-etinye aka n’azụmahịa mmekọahụ n’ihi mmetọ ezinụlọ—ime ihe ike na idina onye ikwu n’ebe obibi na-amanye ha ịga n’okporo ámá. N’ebe ahụ, ha nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e metọrọ site n’aka ndị na-edina ụmụaka na ndị ọzọ, ọbụna, dị ka o yiri, site n’aka ndị uwe ojii ụfọdụ. Otu akụkọ banyere nsogbu ahụ nke a kpọrọ Kids for Hire na-akọ banyere Katia dị afọ isii, nọ na Brazil. Mgbe otu onye uwe ojii jidere ya, ọ manyere ya ime omume ndị na-adịghị mma ma yie egwu igbu ezinụlọ ha ma ọ bụrụ na ọ gwa onye isi ya. N’echi ya ọ bịaghachiri ya na ụmụ nwoke ise ndị ọzọ, ndị chọchara ka o jekwaara ha ozi mmekọahụ ahụ.
Òtù Nnara Mkpesa Ụmụaka, bụ́ ụlọ ọrụ Sweden, gwara ndị bịaranụ, sị: “Mgbe e meworo nchọpụta n’ihe ndị na-akpata ụmụaka ịgba akwụna, obi abụọ adịghị ya na njem [mmekọahụ] bụ otu n’ime ihe ndị bụ isi na-akpata ya.” Otu akụkọ kwuru, sị: “Oké mmụba nke ụmụaka ịgba akwụna n’ime afọ iri gara aga bụ ihe azụmahịa ime njem nleta kpatara kpọmkwem. Ụmụaka ịgba akwụna bụ ụdị ihe ndọrọ njem nleta kasị ọhụrụ nke a na-enweta ná mba ndị na-emepe emepe.” “Njem mmekọahụ” malite na Europe, United States, Japan, na ebe ndị ọzọ na-eme ka a na-achọsi ụmụaka na-agba akwụna ike gburugburu ụwa. Otu ụlọ ọrụ ụgbọelu Europe jiri ihe osise na-atọ ọchị nke otu nwatakịrị nọ nnọọ n’ụzọ na-akpali mmekọahụ mee ihe iji kwalite njem mmekọahụ. Ụlọ ọrụ ime njem na-emere ọtụtụ puku mmadụ ndokwa maka njem mmekọahụ kwa afọ.
Ihe ọzọ so n’ogologo ndepụta nke ihe ndị na-akpata ya bụ nkwalite zuru ụwa ọnụ nke ụlọ ọrụ mmekọahụ ụmụaka site na nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ. A na-akọ na Usoro Nzirịta Ozi Kọmputa, tinyere nkà na ụzụ ndị ọzọ nke kọmputa ndị e jikọtara ya na ha, bụ otu ebe kachasịnụ e si enweta ihe ndị na-akpali mmekọahụ. Ngwá vidio dị ọnụ ala n’otu aka ahụ akwalitewo mmepụta nke ihe ndị na-akpali mmekọahụ e ji ụmụaka mee.
Olee Ndị Ha Bụ?
Ọtụtụ n’ime ndị toworo eto bụ́ ndị na-emetọ ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ bụ ndị na-edina ụmụaka. Onye na-edina ụmụaka nwere ndọrọ mmekọahụ rụrụ arụ n’ebe ụmụaka nọ. Dị ka Òtù Nnara Mkpesa Ụmụaka nke Sweden si kwuo, “ha abụchaghị ndị ikom na-eme agadi, na-adịghị ejizi ejiji nke ọma yi uwe mmiri ma ọ bụ ụdị ndị na-eme ihe ike ndị ji ịbụ nwoke ha eme nganga. Onye na-edina ụmụaka bụ nwoke na-akatachabeghị ahụ nke gụrụ ezigbo akwụkwọ, nke na-arụkarị ọrụ n’etiti ụmụaka dị ka onye nkụzi, dọkịta, onye ọrụ ebere ma ọ bụ ụkọchukwu.”
Ìgwè ndị Sweden ahụ welitere ihe atụ nke Rosario, bụ́ nwa agbọghọ onye Philippines dị afọ 12 nke onye na-eme njem mmekọahụ, bụ́ onye dọkịta si Austria metọrọ n’ụzọ mmekọahụ. Mmetọ ya rụpụtara ọnwụ nke nwa agbọghọ ahụ.
Carol Bellamy, bụ́ ọga kpata kpata nke UNICEF (Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu) na Geneva, kwuru ihe na-esonụ banyere nwa agbọghọ onye Philippines ahụ dị afọ 12, sị: “Ọ na-abụkarị ndị toworo eto e nyere nlekọta na nchebe nke ụmụaka ahụ bụ ndị na-ekwere ma na-eme omume a jọgburu onwe ya. E nwere ndị nkụzi, ndị ọkachamara banyere ahụ ike, ndị ọrụ uwe ojii, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na ndị ụkọchukwu ndị na-eji ùgwù na ikike ha erigbu ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ.”
Okpukpe So na Ya
Otu onye nọchitere anya Chọọchị Roman Katọlik ná nzukọ Stockholm ahụ kwuru na nrigbu ụmụaka bụ “mpụ kasị njọ” nakwa “ihe sitere n’oké mgbanwe na ndakpọ nke ụkpụrụ omume ọma.” Ma, omume dị otú ahụ n’etiti ndị ụkọchukwu ya akpawo Chọọchị Katọlik aka ọjọọ.
Ná mbipụta Newsweek nke August 16, 1993, otu isiokwu a kpọrọ “Ndị Ụkọchukwu na Mmetọ” kọrọ banyere “omume kasị njọ nke ndị ụkọchukwu n’akụkọ ihe mere eme nke oge a nke Chọọchị Katọlik United States.” O kwuru, sị: “Ọ bụ ezie na e bowo ihe e mere atụmatụ ya ịbụ ndị ụkọchukwu 400 ebubo kemgbe 1982, ụfọdụ ndị chọọchị na-akọwa na ihe ruru ndị ụkọchukwu 2,500 emetọwo ụmụaka ma ọ bụ ndị nọ n’afọ iri na ụma. . . . Tụkwasị n’ifu ha ego, omume ọjọọ ahụ ewetaworo chọọchị ahụ oké mmechuihu—napụkwa ya ụfọdụ n’ime ikike o nwere n’ụkpụrụ omume.” Okpukpe ndị ọzọ gburugburu ụwa nọkwa n’otu ọnọdụ ahụ.
Ray Wyre, onye ndụmọdụ n’okwu mpụ mmekọahụ nke si United Kingdom, gwara nzukọ Stockholm ahụ banyere ụmụ okoro abụọ onye ụkọchukwu metọworo n’ụzọ obi ọjọọ. Ugbu a otu n’ime ụmụ okoro ahụ nwere ụlọ ọrụ maka ụmụaka ndị ụkọchukwu metọrọ, onye nke ọzọkwa bụ onye mmetọ n’onwe ya.
Mettanando Bhikkhu, bụ́ ọkà mmụta okpukpe Buddha nke si Thailand, kọrọ na “ụta dịịrị ụdị omume ụfọdụ nke ndị Buddha n’akụkụ nile maka nrigbu ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ maka azụmahịa na Thailand. N’ime obodo dị iche iche na Thailand, ndị mọnk eritewo uru mgbe ụfọdụ site n’ego ụmụaka a manyeworo ịgba akwụna weghachitere n’ógbè ahụ.”
Gịnị Ka A Pụrụ Ime?
Dr. Julia O’Connell Davidson, nke Mahadum Leicester na United Kingdom, kpọrọ nzukọ ahụ òkù ka ọ maa ngọpụ ndị nrigbu ahụ na-agọpụ akparamàgwà ha aka. Ndị mmetọ na-elekwasịkarị anya n’ihe e weere dị ka enweghị njide onwe n’ihe banyere mmekọahụ na omume rụrụ arụ nke nwatakịrị ahụ, na-arụ ụka na nwatakịrị ahụ arụọlarị arụ ma laa n’iyi. Ndị nrigbu ndị ọzọ na-eme nzọrọ ahụ gbagọrọ agbagọ na nke na-abụghị eziokwu na ọ dịghị ihe ọjọọ ga-esi n’omume ha pụta nakwa na nwatakịrị ahụ ritere uru.
Otu òtù na-ahụ maka njem mmekọahụ tụrụ aro ịgbaso ya mgba site n’agụmakwụkwọ n’usoro ihe omume ụlọ akwụkwọ. Tụkwasị na nke ahụ, e kwesịrị inye ndị na-eme njem ihe ọmụma megide nrigbu ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ n’oge nile a na-eme njem ahụ—tupu a pụọ, n’oge a na-eme njem, na n’ebe a na-aga.
Banyere nkà na ụzụ nzirịta ozi ndị ọhụrụ, otu òtù tụrụ aro na e kwesịrị inye mba nile ụkpụrụ nduzi maka mwepụ nke ihe ọ bụla nke na-erigbu ụmụaka. A tụlere nguzobe nke otu ụlọ ọrụ ụwa nile iji chịkwaa ihe a na-eme n’akụkụ a. Òtù ọzọ tụrụ aro na e kwesịrị ime ka ihe ndị na-akpali mmekọahụ e ji ụmụaka mee nke kọmputa na-emepụta na inwe ihe ndị na-akpali mmekọahụ e ji ụmụaka mee n’ozuzu ya bụrụ ịda iwu mpụ ná mba nile, na-enwe ntaramahụhụ iwu kwuru.
Gịnị ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ime? Otu òtù na-ahụ maka òkè ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-ekere tụrụ aro ka ndị mụrụ ụmụ were ibu ọrụ maka ichebe ụmụ ha. O kwuru, sị: “Ndị mụrụ ụmụ pụrụ ọ bụghị nanị iduzi ụmụaka ka ha na-etolite ma na-ege ntị n’ụlọ ọrụ mgbasa ozi kamakwa inyekwu ihe ọmụma, nkọwa na ihe ọmụma dịgasị iche iche iji hazie mmetụta nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi ma nyere nwatakịrị ahụ aka ito ná nghọta.”
Otu usoro ihe omume TV Sweden nke na-akọ banyere nzukọ ahụ mesiri mkpa ọ dị ike ka ndị mụrụ ụmụ na-eleru ụmụ ha anya n’ụzọ ka mma na ime ka ha mata ihe ize ndụ ha. Otú ọ dị, ọ dụrụ ọdụ, sị: “Adọla ụmụaka aka ná ntị nanị megide ‘agadi ndị ikom rụrụ arụ,’ n’ihi na ụmụaka . . . ga-esi otú a na-eche na ha kwesịrị ịkpachara anya nanị maka ndị ikom mere agadi, na-adịghị ejizi ejiji, ebe onye na-eme mpụ ndị dị otú ahụ pụrụ iyi nnọọ yunifọm ma ọ bụ suit dị mma. Ya mere, dọọ ha aka ná ntị megide ndị a na-amabughị ndị nwere mmasị pụrụ iche n’ebe ha nọ.” N’ezie, e kwesịkwara ịdọ ụmụaka aka ná ntị banyere—gbaakwa ha ume ịkọrọ ndị ọchịchị—onye ọ bụla na-emeso ha omume na-ekwesịghị ekwesị, gụnyere ndị ha maara.
Nanị Ngwọta E Nwere
Ihe nzukọ Stockholm ahụ na-apụghị ịtụ aro ya bụ ụzọ isi merie ihe ndị na-akpata nrigbu ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ. Ndị a na-agụnye ụkpụrụ omume na-adalata ọsọ ọsọ n’ebe nile; ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na oké ọchịchọ maka ihe onwunwe na-arị elu; enweghị nkwanye ùgwù na-amụba amụba maka iwu ndị e mere iji chebe ndị mmadụ pụọ n’ikpe na-ezighị ezi; ịrị elu nke ejighị ọdịmma, ùgwù, na ndụ ndị ọzọ kpọrọ ihe; ndakpọ dị ngwa nke ndokwa ezinụlọ; ịda ogbenye zuru ebe nile n’ihi ụba mmadụ gabigara ókè, enweghị ọrụ, mmepe nke ime obodo, na nkwagharị; ịkpọasị agbụrụ na-amụba amụba megide ndị ala ọzọ na ndị gbara ọsọ ndụ; mmepụta na ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ nọgidere na-amụba; na echiche, omume, na ọdịnala okpukpe rụrụ arụ.
Ọ bụ ezie na nrigbu ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ na-awụ akpata oyi n’ahụ, ajọ omume dị otú ahụ abụghị ihe ijuanya nye ndị ji nlezianya na-agụ Bible. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị na-ebi ugbu a n’ihe Bible kpọrọ “mgbe ikpeazụ,” dịkwa ka Okwu Chineke si kwuo, “oge dị oké egwu” abịala. (2 Timoti 3:1-5, 13) Ya mere ọ̀ bụ ihe ijuanya na ụkpụrụ omume akawanyewo njọ?
Otú ọ dị, Bible na-ezo aka n’ihu na nanị ngwọta e nwere maka nsogbu ndị buru ibu nke ụwa—nhichapụ kpam kpam site n’aka Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile. N’isi nso ọ ga-egosipụta ike ya ma wepụ ndị nile nọ n’elu ala bụ́ ndị na-adịghị erube isi n’ụkpụrụ ezi omume na iwu ya: “Ndị ziri ezi ga-ebi n’ụwa, ndị zuru okè ga-afọdụkwa n’ime ya. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa.”—Ilu 2:21, 22; 2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9.
Ndị “a ga-ebipụ” ga-agụnye ndị nile na-eme ụmụaka ndị akwụna na ndị rụrụ arụ na-emetọ ụmụaka. Okwu Chineke na-ekwu, sị: “Ndị na-akwa iko . . . ma ọ bụ ndị ikom na-akwa iko, bụ́ ndị nwere nwunye . . . ma ọ bụ ndị ikom na-emerụ onwe ha n’ahụ ndị ikom [ma ọ bụ ụmụ okoro] . . . agaghị eketa alaeze Chineke.” (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Ọ na-ekwukwasị na a ga-atụba ‘ndị arụ . . . na ndị na-akwa iko n’ọnwụ nke abụọ ahụ’—mbibi ebighị ebi.—Mkpughe 21:8.
Chineke ga-ehicha ụwa ma webata usoro ihe dị nnọọ ọhụrụ ma zie ezie, “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ.” (2 Pita 3:13) Mgbe ahụ, n’ime ụwa ọhụrụ ahụ ọ ga-eme, ndị rụrụ arụ, na-ezighị ezi agakwaghị erigbu ndị aka ha dị ọcha ọzọ. Ọ dịkwaghị mgbe ndị aka ha dị ọcha ga-atụ ụjọ ọzọ ịbụ ndị e mesoro ihe ọjọọ, n’ihi na “ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji.”—Maịka 4:4.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 12]
‘Ụdị mpụ obi ọjọọ na nke na-asọ oyi karịsịa.’—Praịm minista Sweden
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 13]
“Kwa izu nde ndị ikom 10 ruo 12 na-ejekwuru ndị akwụna na-eto eto.”—The Economist, London
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 14]
Njem mmekọahụ bụ isi ihe na-akpata nrigbu ụmụaka ná mba ndị ka na-emepe emepe
[Igbe dị na peeji nke 13]
Njem Mmekọahụ—N’ihi Gịnị?
(Ihe ụfọdụ mere ndị na-eme njem nleta ji eso ụmụaka enwe mmekọahụ)
(1) Onye njem ahụ ịbụ onye a na-amaghị na-atọhapụ ya pụọ n’ihe mgbochi mmekọrịta mmadụ na ibe ya nke ebe o si bịa
(2) N’ihi amachaghị ma ọ bụ aghọtaghị asụsụ ebe ahụ, a pụrụ iduhie ndị na-eme nleta n’ụzọ dị mfe ikwenye na ịkwụ ụgwọ maka iso nwatakịrị nwee mmekọahụ bụ ihe a na-anakwere ma ọ bụ bụrụ ụzọ isi nyere nwatakịrị aka pụọ n’ịda ogbenye
(3) Omume ịkpa ókè agbụrụ na-eme ka ndị nleta rigbuo ndị ọzọ ha chere na ha ka mma
(4) Ndị na-eme njem nleta na-eche na ha bara ọgaranya mgbe ha hụrụ na a pụrụ ịkwụ ụgwọ ozi mmekọahụ n’ụzọ dị mfe ná mba ndị na-emepe emepe
[Igbe dị na peeji nke 15]
Otú Nsogbu ahụ Haruru n’Ụwa Nile
(Ihe na-esonụ bụ atụmatụ ndị isi nke gọọmenti dị iche iche na òtù ndị ọzọ mere)
Brazil: Ọ dịkarịa ala ụmụaka 250,000 na-agba akwụna
Canada: Òtù a haziri ahazi ndị na-achọtara ndị akwụna ndị ahịa na-eji ọtụtụ puku ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma na-agba akwụna
China: Ụmụaka 200,000 ruo 500,000 na-agba akwụna. N’afọ ndị na-adịbeghị anya a rarawo ihe dị ka ụmụ agbọghọ 5,000 ndị China gafere ókèala ma ree ha dị ka ndị akwụna na Myanmar
Colombia: Ọnụ ọgụgụ ụmụaka a na-erigbu n’ụzọ mmekọahụ n’okporo ámá Bogotá amụbawo okpukpu ise n’ime afọ asaa gara aga
Ọwụwa Anyanwụ Europe: Ụmụaka 100,000 bi n’okporo ámá. A na-eziga ọtụtụ n’ụlọ ndị akwụna ndị dị n’Ọdịda Anyanwụ Europe
India: Ụmụaka 400,000 nọ n’ọrụ mmekọahụ
Mozambique: Ụlọ ọrụ enyemaka dị iche iche boro ndị agha ndebe udo nke UN ebubo irigbu ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ
Myanmar: A na-ebuga ụmụ agbọghọ na ụmụ nwanyị 10,000 n’ụlọ ndị akwụna ndị dị na Thailand kwa afọ
Philippines: Ụmụaka 40,000 nọ na ya
Sri Lanka: Ụmụaka 10,000 ndị dị afọ 6 ruo 14 nọ n’ohu n’ụlọ ndị akwụna, 5,000 kwa ndị dị afọ 10 ruo 18 na-arụrụ onwe ha ọrụ n’ebe ndị njem nleta na-eje atụrụ ndụ
Taiwan: Ụmụaka 30,000 nọ na ya
Thailand: Ụmụaka 300,000 nọ na ya
United States: Ndị ọnụ na-eru n’okwu na-ekwu na ihe karịrị 100,000 ụmụaka nọ na ya