Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 4/8 p. 5-7
  • Nsogbu Ahụ Zuru Ụwa Ọnụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Nsogbu Ahụ Zuru Ụwa Ọnụ
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Ha Tụkwasịrị Obi Emebie Ntụkwasị Obi Ha
  • Mmetụta Na-emebi Ihe
  • Otú Ị Ga-esi Chebe Ụmụ Gị
    Teta!—2007
  • Otú Jehova Si Egosi na Ya Nwere Ịhụnanya ma Na-ekpe Ikpe Ziri Ezi ma Mmadụ Mee Ihe Jọgburu Onwe Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Ònye Ga-echebe Ụmụ Anyị?
    Teta!—1999
  • Nrigbu Ụmụaka n’Ụzọ Mmekọahụ—Nsogbu Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—1997
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 4/8 p. 5-7

Nsogbu Ahụ Zuru Ụwa Ọnụ

MGBUKPỌ dị egwu e gburu ụmụaka na-ehi n’okporo ámá na Brazil bụ ihe atụ ọzọ nke ịnọ n’ihe ize ndụ nke ụmụaka ndị a na-achọghị. Akụkọ ndị e si ná mba ahụ nweta kwuru na kwa afọ, a na-egbu ọtụtụ narị ụmụaka.

E jiwo obi ọjọọ wakpoo ụmụaka na Dunblane, Scotland, nakwa na Wolverhampton, England, na n’ọtụtụ ebe ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, cheedị echiche banyere nhụjuanya nke Maria dị afọ 12, nwa mgbei bụ́ onye Angola nke e dinara n’ike, o butekwara afọ ime. Ka e mesịrị a manyere ya iji ụkwụ gaa kilomita 320, ọ mụkwara nwa oge ya na-erubeghị nke dịrị ndụ nanị izu abụọ. Maria nwụrụ ka otu izu gasịrị, ọ rịara ọrịa, o righịkwa nri na-edozi ahụ.

Na 1992 otu akụkọ nke Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otù (UNICEF) nyere kwuru na “‘ịlụso ụmụaka ọgụ’ bụ ihe narị afọ nke 20 wetara.” Dị ka otu akụkọ nke UNICEF nyere na 1996 si kwuo, echiche ụfọdụ ndị bụ na ‘a ghaghịkwa ikpochapụ ọgbọ na-abịa n’ihu nke ndị iro, ya bụ, ụmụ ndị iro.’ Otu onye na-akọwa banyere ndọrọ ndọrọ ọchịchị kwuru ya otú a, sị: “Iji gbuo òké ndị nnukwu, ị ghaghị igbu òké ndị obere.”

Nde ụmụaka abụọ anwụwo ọnwụ ike n’ime afọ iri na-adịbeghị anya. Nde anọ ọzọ abụrụwo ndị a kwarụrụ, ndị ìsì kpuru, ma ọ bụ ndị ogbunigwe ndị e liri n’ala mebiri ụbụrụ ha, ha na ọtụtụ nde ndị agha bibiri ụlọ ha na-adọga otú ike kwere ha ịdị ndụ. Ka a sịkwa ihe mere otu akụkọ ji nwee isiokwu bụ́: “Ahụmahụ Ọjọọ Banyere Mmetụta Ọjọọ Agha Na-enwe n’Ahụ Ụmụaka.”

Arụrụala ndị a a na-arụsa ụmụaka bụ ihe ọjọọ nye ihe a kpọrọ mmadụ, ihe nnwapụta e ji n’aka na ụmụaka nọ ná nsogbu, ọ bụghị nanị ná mba ole na ole kama n’ụwa nile. E mebiwokwa ntụkwasị obi nke ọtụtụ ụmụaka e metọworo.

Ndị Ha Tụkwasịrị Obi Emebie Ntụkwasị Obi Ha

Imebi ntụkwasị obi nwatakịrị pụrụ inwe mmetụta ndị dị njọ. Nke a na-abụ eziokwu karịsịa mgbe ọ bụ nne ma ọ bụ nna, enyi, ma ọ bụ onye nlekọta nwatakịrị ahụ mebiri ntụkwasị obi ya. A pụrụ ịhụ ókè mmetọ ndị nne na nna na-emetọ ụmụaka haruru site n’ọtụtụ òkù fon ndị a zara na telifon mgbe e mesịrị otu ihe omume a kpọrọ “Ndị E Menyere Ụjọ Ịgbachi Nkịtị: Ikpughe na Ịkwụsị Mmetọ Ụmụaka,” nke onye a ma ama na-agba ajụjụ ọnụ bụ́ Oprah Winfrey mere na United States. “Òkù telifon ndị kasị awụ akpata oyi n’ahụ sitere n’aka obere ụmụaka, bụ́ ndị ji ụjọ na-akpọ, na-achọ ịgbanahụ ihe mgbu nke ntirụ ahụ ma ọ bụ mmetọ n’ụzọ mmekọahụ,” ka onyeisi ndị haziri ihe omume ahụ bụ́ Arnold Shapiro kwuru, dị ka e hotara ya na magazin bụ́ Children Today.

Ihe omume a mere ihe dị ukwuu n’iwepụ echiche ahụ bụ́ na ndị na-emetọ ụmụaka bụ ndị gbara agba ha na-amabughị, bụ́ ndị na-emenye egwu. Eziokwu dị na ya bụ na “ọ bụ ndị nne na nna na ndị ikwu ndị ọzọ na-eme ihe ka ọtụtụ ná mmetọ ndị a na-emetọ ha,” ka Shapiro kwubiri. Nchọpụta ndị ọzọ na-akwado nchọpụta a ma na-egosikwa na mgbe ụfọdụ ndị enyi a tụkwasịrị obi nke ezinụlọ akwadebewo nwatakịrị ahụ na ezinụlọ ya maka imesị metọọ nwatakịrị ahụ n’ụzọ e mere atụmatụ ya nke ọma. Idina onye ikwu bụ mmebi nke ntụkwasị obi kasị awụ akpata oyi n’ahụ.

Ndị na-edina ụmụaka imetọ ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ bụ ihe ọzọ na-eyi ụmụaka egwu n’ụwa nile. Akwụkwọ akụkọ bụ́ Trends & Issues in Crime and Criminal Justice na-enye nkọwa a: “Idina ụmụaka na-ezo aka n’inwe ndọrọ iso ụmụaka nwee mmekọahụ. . . . Idina ụmụaka na-agụnyekarị ime mpụ ndị dị ka mwakpo n’ụzọ mmekọahụ, omume na-ekwesịghị ekwesị na mmebi iwu ndị metụtara iji ụmụaka eme ihe na-akpali agụụ mmekọahụ.”

A na-enweta ọtụtụ akụkọ ndị na-akpasu iwe site n’ụwa nile banyere òtù ndị na-edina ụmụaka, bụ́ ndị ji anyaukwu na-erigbu ụmụaka n’ụzọ mmekọahụ. (Lee igbe dị na peji nke 7.) Ndị a na-emeso ya bụ ma ụmụaka nwoke ma ụmụaka nwanyị. N’ịbụ ndị ndị ikom ọjọọ ratara, a na-emetọ ha n’ụzọ mmekọahụ ma yizie ha egwu ma ọ bụ jiri onyinye zụtọọ ha nnọọ iji gbaa ha ume ka ha nọgide ‘n’òtù’ ahụ. Ọ na-abụkarị ndị ndú a ma ama n’obodo na-eme atụmatụ ma na-eme ihe arụ ndị a, mgbe ụfọdụkwa ha na-eme otú ahụ mgbe ndị uwe ojii na òtù ikpe maara banyere ya ma na-echebe ha.

Mmetọ ndị ụkọchukwu na-emetọ ụmụaka na-akpasukwa iwe. Akụkọ a na-enweta n’ụwa nile na-ekpughe ókè mmetọ ndị ụkọchukwu na-emetọ ụmụaka ruworo, mgbe ụfọdụ ọbụna n’aha Chineke. Dị ka ihe atụ, otu onye ụkọchukwu Anglịkan a mara ikpe, gwara onye dị afọ iri o metọrọ na “Chineke ji ya [ụkọchukwu ahụ] na-agwa ndị mmadụ okwu, na ihe ọ bụla ya mere ma ọ bụ ihe ọ bụla [nwatakịrị nwoke] ahụ mere masịrị Chineke, n’ihi ya kwa o ziri ezi.”

N’Australia otu ntụleghachi nke akwụkwọ bụ́ The Battle and the Backlash: The Child Sexual Abuse War kwuru okwu banyere mmetọ ndị ụkọchukwu na ndị ọzọ nọ n’ọnọdụ ebe ndị a tụkwasịrị ha obi na-emetọ ụmụaka. O kwuru na òtù ndị o metụtara yiri ka ha na-enwe nchegbu banyere ibelata nkọcha ọ na-ewetara aha ọma ha na ichebe onwe ha kama ichebe ụmụaka nọ n’ihe ize ndụ.

Mmetụta Na-emebi Ihe

Ụmụaka na-atụkwasịkarị mmadụ obi kpam kpam. Ya mere ọ bụrụ na e mebie ntụkwasị obi ahụ, ọ na-enwe mmetụta na-emebi ihe n’uche nwatakịrị tụkwasịrị mmadụ obi kpam kpam. Akwụkwọ bụ́ Child Abuse & Neglect na-ekwu, sị: “Ndị mmadụ na ebe ndị bụbu ebe nchebe ma ọ bụ ndị na-enye nkwado aghọwo ndị a na-ewere dị ka ndị dị ize ndụ na ndị a na-atụ egwu. Ụwa nwatakịrị na-aghọ nke a na-ejichaghị n’aka na nke a na-apụghị ịchịkwacha.”

N’ihi mmetọ dị otú ahụ, nke gaworo n’ihu ruo ọtụtụ afọ, ụfọdụ ụmụaka enwewo nsogbu iso mmadụ mekọrịta na nsogbu uche ka oge na-aga ná ndụ, ọbụna mgbe ha mere okenye. Mmebi a nke ntụkwasị obi dị nnọọ njọ n’ihi na e rigbuwo nwatakịrị n’ihi na ọ bụ nwatakịrị. Ma, ọtụtụ ụmụaka ndị a na-emetọ adịghị akọ banyere ya ma ọlị—eziokwu nke ndị na-emetọ ụmụaka na-adabere na ya nke ukwuu.

N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ihe àmà nke imetọ ụmụaka n’ụwa nile anọwo na-arị elu, nke na taa e nwere ọtụtụ ihe àmà dị otú ahụ a na-apụkwaghị ịgọpụ agọpụ ma ọ bụ leghara anya ọzọ. Ma ihe ka ọtụtụ kwere na ịkwụsị mmetọ ụmụaka bụ ọrụ siri ike. N’ihi ya, ajụjụ ndị a na-ebili: È nwere onye ọ bụla pụrụ ichebe ụmụaka anyị n’ezie? Olee otú anyị bụ́ ndị mụrụ ụmụ pụrụ isi chebe ihe nketa Chineke nyere anyị ma lekọta ndụ ụmụ anyị nọ n’ihe ize ndụ? Ònye ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ijekwuru maka enyemaka?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]

Ọrụ Ịnwụde Ndị Omempụ n’Internet

Ọnwa ole na ole gara aga, n’otu n’ime mgbalị nzuzo kasịnụ e metụrụla ịnwụde ndị na-eji ụmụaka eme ihe na-akpali mmekọahụ n’Internet, ndị uwe ojii nọ ná mba 12 wakporo ebe obibi nke ihe karịrị 100 mmadụ a na-enyo enyo na-edina ụmụaka. Ha nwetara ihe karịrị 100,000 foto na-akpali agụụ mmekọahụ e sere ụmụaka site n’aka nanị otu òtù na-edina ụmụaka nọ na United States.

Onye Britain na-eme nchọpụta nzuzo, bụ́ onye hụrụ maka nnyocha Internet ahụ nke were ọnwa ise, kwuru, sị: “Ihe e sere na ha ga-asọrịrị onye ọ bụla uche ya zuru okè oyi.” Ụmụaka ndị ahụ bụ ma ndị nwoke ma ndị nwanyị, ụfọdụ n’ime ha dị nanị afọ abụọ. Ndị uwe ojii Belgium kwuru na foto ndị ahụ dị n’Internet bụ “foto na-akpali agụụ mmekọahụ nke kasị asọ oyi e sere ụmụaka. . . . O ruru n’ókè nke na ndị mmadụ metọrọ ụmụ ha iji nwee ike igosi foto ndị kasị adọrọ adọrọ.” Otu nwoke debere foto ndị o sere mgbe ọ na-edina nwa nwanne ya n’ike ma tinye ha na kọmputa ya.

Ndị nkụzi, otu onye ọkà mmụta sayensị, otu nwa akwụkwọ na-amụ banyere iwu, otu nwa akwụkwọ na-amụ banyere ọgwụ, otu onyeisi ndị scout, otu onye mpịazi ego, na otu prọfesọ nọ na mahadum so ná ndị a na-enyo enyo.

[Foto dị na peeji nke 6]

Otu ihe na-agbawa agbawa nyere nwatakịrị nwoke a nkwarụ n’aka nri ya

[Ebe E Si Nweta Foto]

UN/DPI Photo nke Armineh Johannes sere

[Ebe e si Nweta Foto dị na peeji nke 7]

Photo ILO/J. Maillard

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya