Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g99 4/8 p. 8-11
  • Ònye Ga-echebe Ụmụ Anyị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Ga-echebe Ụmụ Anyị?
  • Teta!—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Nne na Nna Pụrụ Ime Ihe Dị Ukwuu
  • Nanị Ezi Ihe Ngwọta E Nwere
  • Otú Ị Ga-esi Chebe Ụmụ Gị
    Teta!—2007
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndị Nne na Nna, Chebenụ Ihe Nketa Unu Dị Oké Ọnụ Ahịa
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Nsogbu Ahụ Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1999
g99 4/8 p. 8-11

Ònye Ga-echebe Ụmụ Anyị?

Ọ BỤ ihe na-agba ume ịmata na e kwetawo ugbu a na mmetọ ụmụaka bụ nsogbu zuru ụwa ọnụ. Ihe omume ndị dị ka Nzukọ Stockholm Megide Iji Ụmụaka Akpa Ego n’Ụzọ Mmekọahụ, nke ndị nnọchiteanya si mba 130 bịara, elebawo anya ná nsogbu a.

Ọzọkwa, ugbu a mba ụfọdụ na-eti iwu na-amachibido ime njem nleta maka iji nwee mmekọahụ na iji ụmụaka eme ihe na-akpali agụụ mmekọahụ. Ọbụna ụfọdụ amalitela inwe ihe ndekọ banyere ndị a ma ama na-edina ụmụaka, na-amachibido ha ịkpa ụmụaka nso n’ụzọ dị mfe.

E nwekwara ndị na-achọ ka ndụ dịrị ụmụaka mma karị site n’iti iwu iji chebe ha. Mba na mmadụ ole na ole ọzọ na-ajụkwa ịzụ ngwá ahịa ndị ọ bụ ụmụaka e ji akpata ego mepụtara.

Ọ bụ ezie na anyị nile na-eto mgbalị ndị dị otú ahụ e tinyere iji kpochapụ mmetọ a na-emetọ ụmụaka pụọ n’ọha mmadụ n’ezie, anyị aghaghị inwe ezi uche ma kweta na idina ụmụaka gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ọha mmadụ. Ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya iche na ihe ngwọta dị mfe dị ka iti iwu ga-echebe ụmụ anyị kpam kpam. E tiworị ọtụtụ iwu, ma nsogbu ahụ ka dịkwa. Eziokwu ahụ bụ́ na a ghaghị iji ọtụtụ usoro iwu chebe ihe ruuru ụmụaka site n’okike na-ama ndị toworo eto n’ụwa ikpe n’ezie dị ka ndị na-ada iwu.

Iwu abụghị ihe bụ́ isi na-echebe ụmụaka. Nanị ihe anyị ga-eme bụ ile anya n’ihe ndị si n’iwu siri oké ike dị ka Mgbakọ UN Maka Ihe Ndị Ruuru Nwatakịrị, nke ọtụtụ gọọmenti bịanyere aka na ya pụta, iji mata. E nwere ihe ndekọ zuru ezu na ọbụna ọtụtụ n’ime gọọmenti ndị a adịghị eme ihe zuru ezu iji kwụsị nrigbu ahụ a na-erigbu ụmụ ha, n’ihi ịbụ ndị ihe isi ike akụ̀ na ụba jichiri. Imetọ ụmụaka ka bụ nsogbu bụ́ isi zuru mba nile.

Ndị Nne na Nna Pụrụ Ime Ihe Dị Ukwuu

Ịzụ ụmụ nke ọma bụ ọrụ siri ike. Ọ na-achọ ịchụ ihe n’àjà. Ma ọ dị ndị nne na nna na-echegbu onwe ha mkpa ijide n’aka na ọ bụghị ụmụ ha ka ha ga-achụ n’àjà. Magazin bụ́ Maclean’s na-ekwu na ọtụtụ mgbe “a na-ele ịzụ ụmụ anya ka ọ̀ bụ ihe omume ntụrụndụ.” A pụrụ ịtụfu ihe e ji egwuri egwu ma ọ bụ kwụsị ihe omume ntụrụndụ, ma ịzụ ụmụ bụ ọrụ Chineke nyere.

Gị ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ nna bụ otu n’ime onyinye ndị kasị baa uru ị pụrụ inye nwa gị, n’ihi na ọ ga-enyere ya aka ịbụ nwata nwere obi ụtọ, nọ ná nchebe. Nchebe dị otú ahụ adịghị adabere n’ọkwá mmadụ n’ọha ma ọ bụ n’akụ̀ na ụba ya. Gị onwe gị—ịhụnanya gị, na mmesi obi ike gị mgbe e yiri ya egwu, na oge gị, dị nwa gị mkpa. Nwa gị chọrọ ịnụ olu gị ka ị na-akọ akụkọ, chọọ gị dị ka onye nlereanya, ọ chọkwara ịdọ aka ná ntị ịhụnanya gị.

N’ihe banyere ụkpụrụ omume mmekọahụ—ndị nne na nna, na-achịkwanụ mmekọrịta ezinụlọ unu n’ụzọ kwesịrị ekwesị na ná nkwanye ùgwù maka uche na ahụ ụmụ unu. Ụmụaka na-amụta ngwa ngwa omume ndị na-emegide ụkpụrụ omume nne na nna ha kụziere ha. Ọ dị mkpa ka a kụziere ha otú ha kwesịrị isi na-akpa àgwà ma n’ụlọ ma n’èzí. Ọ bụrụ na i meghị nke a, onye ọzọ ga-emere gị ya, ihe ga-esi na ya pụta nwekwara ike ọ gaghị amasị gị. Kụziere ụmụ gị otú ha kwesịrị isi meghachi omume ma a nwaa anwa yie ha egwu imebi omume ọma ha. Mee ka ha mara ihe ha ga-eji akụkụ ahụ ndị dịịrị nanị ha mee, ma kụziere ha na a gaghị emetọ ha. Gwa ha otú ha ga-esi meghachi omume ma ọ bụrụ na onye ọ bụla chọrọ iji ha mejuo ọchịchọ ya abịakwute ha.

Mara ebe ụmụ gị nọ na onye ha na ya nọ mgbe nile. Olee ndị bụ ezi ndị enyi nwa gị? Olee ndị na-elekọta nwa gị mgbe ị na-anọghị ya? À pụrụ ịtụkwasị ha obi? Otú ọ dị, nke ahụ apụtaghị na nne ma ọ bụ nna ga na-enyo onye ọ bụla enyo. Mee ntụle kwesịrị ekwesị banyere ndị toworo eto ha na nwa gị na-akpakọrịta, na-ahụ ọ bụghị nanị ọdịdị elu ahụ ha.

Cheedị echiche banyere obi mgbawa nke ndị nne na nna na-achọpụtaghị n’oge na ndị ụkọchukwu, ndị nkụzi, ma ọ bụ ọbụna ndị òtù ezinụlọ ha tụkwasịrị obi emetọwo ụmụ ha. Ọ ga-adị mma ka gị, dị ka nne ma ọ bụ nna, jụọ onwe gị: ‘Chọọchị m ọ̀ na-agbachi nkịtị ma ọ bụ na-ekpuchi mmetọ ụmụaka? Okpukpe m ọ̀ na-ejigidesi ụkpụrụ omume ndị dị elu ike?’ Azịza nye ajụjụ ndị dị otú ahụ pụrụ inyere gị aka ime nhọrọ ndị amamihe dị na ha n’ichebe ụmụ gị.

Ma karịsịa, gbalịa inyere ha aka ịbịa mara na inwe mmasị n’ụkpụrụ dị iche iche nke Onye Okike, bụ́ nke ga-enye aka ichebe ha pụọ n’ihe ọjọọ. Mgbe ụmụaka hụrụ ùgwù ndị mụrụ ha na-akwanyere ụkpụrụ omume ndị dị elu, ha ga-adị njikere karị ịgbaso ezi ihe nlereanya a.

Nanị Ezi Ihe Ngwọta E Nwere

Otú ọ dị, ma iwu ma ịma ikpe ịnọ ogologo oge karị n’ụlọ mkpọrọ agaghị echebe ụmụ anyị. Ọ bụ Onye Okike n’onwe ya, site n’Okwu ya sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, pụrụ ime ka e nwee omume dị ọcha n’ụzọ gara nke ọma, site n’ịgbanwe echiche nke ndị yiri anụ ọhịa gaa n’ịbụ ndị obodo na-ahụ n’anya, ndị nwekwara omume ọma.

E gosiworị na nke a pụrụ ikwe mee. E nwere ọtụtụ ndị hapụworo ụzọ ndụ mbụ ha nke inwe oké agụụ mmekọahụ. Ugbu a, ha bụ ihe àmà a na-ahụ anya nke ike Okwu Chineke nwere. Ma ọ bụ ezie na nke a bụ ihe ziri ezi ime, ihe ka ọtụtụ ná ndị na-eme omume rụrụ arụ agaghị agbanwe. Ọ bụ nke a mere Jehova Chineke jiworo kwee nkwa na a ga-ewepụ ndị nile na-erigbu ụmụ anyị n’ụwa n’oge na-adịghị anya—tinyere nkà ihe ọmụma ha, oké agụụ mmekọahụ ha, na anyaukwu ha.—1 Jọn 2:15-17.

Mgbe ahụ, n’ụwa ọhụrụ Chineke, mgbe ịda ogbenye na-agaghị adịkwa, ụmụaka nile ga-ama ụtọ ịbụ nwata ha nke na-agafeghị ngwa ngwa na nke na-enweghị nsogbu, bụ́ ihe ruuru ha site n’aka Chineke. Nke a ga-apụta ọ bụghị nanị nkwụsị nke mmetọ ụmụaka kamakwa nkwụsị nke ihe ndị na-egbu mgbu n’obi ma e cheta ha, ndị na-emebikwa ndụ ndị mmadụ taa: “A gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi.”—Aịsaịa 65:17.

Ya mere, n’ụwa ọhụrụ Chineke, a ga-aghọta okwu Jisọs Kraịst nke ọma n’ụzọ dị ebube: “Kweenụ ka ụmụntakịrị bịakwute m, unu egbochikwala ha: n’ihi na alaeze eluigwe [nke ga na-achị ụwa, ebe obibi bụ́ Paradaịs nke ihe a kpọrọ mmadụ] bụ nke ndị dị otú a.”—Matiu 19:14.

[Foto dị na peeji nke 9]

Jiri akọ kụziere ụmụ gị otú ha ga-esi meghachi omume ma e yie ha egwu n’ụzọ mmekọahụ

[Foto dị na peeji nke 9]

Gị ịbụ ezigbo nne ma ọ bụ nna bụ onyinye bara uru nye ụmụ gị

[Foto dị na peeji nke 9]

Nyere ụmụ gị aka ịmụta nzube na ụkpụrụ dị iche iche nke Onye Okike

[Foto ndị dị na peeji nke 10]

N’ụwa ọhụrụ Chineke, ụmụaka nile ga-ama ụtọ ịbụ nwata ha n’ụzo zuru ezu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya