Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 11/8 p. 17-19
  • Otú Agha Si Akpa Ụmụaka Aka Ọjọọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Agha Si Akpa Ụmụaka Aka Ọjọọ
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngwá Agha, Agụụ, na Ọrịa
  • Ebe Obibi Adịghị, Ezinụlọ Adịghị
  • Ndị Ogbunigwe E Liri n’Ala Gburu
  • Mmekpọ Ọnụ na Ndina n’Ike
  • Nsogbu Mmetụta Uche
  • Olee Otú A Pụrụ Isi Nyere Ụmụaka Aka?
  • Egwu—Ọ Dị Ebe Nile Ugbu A Ma Ọ Gaghị Adị Ruo Mgbe Ebighị Ebi!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ụmụaka Kwesịrị Ịbụ Ndị A Chọrọ Ma Hụ n’Anya
    Teta!—2000
  • Nsogbu Ahụ Zuru Ụwa Ọnụ
    Teta!—1999
  • Ọdịdị nke Agha Agbanweela
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 11/8 p. 17-19

Otú Agha Si Akpa Ụmụaka Aka Ọjọọ

ỌGỤ ahụ, otu n’ime ọtụtụ a lụrụ n’agha obodo Sierra Leone, weere ọnọdụ ná mmalite 1995. Ka ụda égbè ndị ahụ dajụrụ, Tenneh dị afọ anọ, bụ́ onye ndị mụrụ ya nwụwororị n’agha ahụ, bu mmerụ ahụ tọgbọrọ n’ala. Otu mgbọ agbabawo ya n’isi, n’azụ anya aka nri ya, e nwekwara ihe ize ndụ na mgbọ ahụ ga-akpalite ọrịa ga-agbasa n’ụbụrụ ya ma gbuo ya.

Ọnwa 16 mgbe e mesịrị, otu di na nwunye si Britain jisiri ike kpọfee Tenneh n’England maka ịwa ahụ. Otu ìgwè ndị na-awa ahụ wepụrụ mgbọ ahụ, ndị mmadụ ṅụrịkwara ọṅụ na ịwa ahụ ahụ gara nke ọma, na a zọpụtawo ndụ onye na-eto eto. Ma, ọṅụ ahụ erughị ihe ọ bụla n’ihi ihe ọmụma bụ na Tenneh ka bụ nwa mgbei bụ́ onye a na-ekwesịghị ịgba égbè ma ọlị.

Ngwá Agha, Agụụ, na Ọrịa

Ọ bụ ezie na mgbọ hiere ụzọ tụtara Tenneh, n’ụzọ na-arị elu, ụmụaka abụghị ndị ihe na-adabara n’ọghọm kama ndị e lekwasịrị anya. Mgbe ọgụ agbụrụ dara, igbu ndị toro eto ezughị ezu; a na-ele ụmụ ndị iro anya dị ka ndị iro n’ọdịnihu. Otu onye nkọwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị na Rwanda kwuru n’otu ihe omume redio na 1994, sị: “Iji gbuo òké ndị nnukwu, ị ghaghị igbu òké ndị obere.”

Otú ọ dị, ihe ka ọtụtụ n’ụmụaka ndị na-anwụ n’agha abụghị ndị bọmbụ na mgbọ gbatara kama ndị agụụ na ọrịa na-egbu. Dị ka ihe atụ, n’agha Africa dị iche iche, ụkọ ihe oriri na nlekọta ahụ ike egbuwo ihe dị ka okpukpu 20 nke ndị mmadụ karịa ka ọgụ ahụ n’ezie gbuworo. Ịgbachi ebe ndị e si enweta ihe bụ atụmatụ agha e ji emeghị ebere na-etinye n’ọrụ n’oge ndị a. Usuu ndị agha eliwo ogbunigwe n’ókèala buru ibu a na-akọpụta nri, na-ebibi nkwakọba ihe oriri na usoro e ji enweta mmiri, na-ejichikwa ihe enyemaka. Ha ebibiwokwa ụlọ ọrụ ahụ ike, na-achụsasị ndị ọrụ ahụ ike.

Atụmatụ ndị dị otú ahụ kasị emetụta ụmụaka. Dị ka ihe atụ, n’agbata 1980 na 1988, ụmụaka nwụrụ n’ihi ihe ndị agha kpatara ruru 330,000 n’Angola na 490,000 na Mozambique.

Ebe Obibi Adịghị, Ezinụlọ Adịghị

Agha na-akpata ụmụ mgbei site n’igbu ndị mụrụ ha, ma ọ na-emekwa otú ahụ site n’itisa ezinụlọ. N’ụwa nile, ihe dị ka nde mmadụ 53 agbapụwo n’ebe obibi ha n’ihi iyi egwu nke ihe ike. Nke ahụ bụ ihe dị ka 1 n’ime mmadụ 115 ọ bụla n’ụwa! Ọ dịkarịa ala ọkara bụ ụmụaka. N’ọgba aghara nke ịgba ọsọ, a na-ekewapụkarị ụmụ n’ebe ndị mụrụ ha nọ.

N’ihi ihe si n’ọgụ dara na Rwanda pụta, e kewapụwo 114,000 ụmụaka n’ebe ndị mụrụ ha nọ ka ọ na-erule 1994. Dị ka otu nnyocha e mere na 1995 gosiri, 1 nwata n’ime 5 n’Angola nwere otu ahụmahụ ahụ. Nye ọtụtụ ụmụaka, karịsịa ndị ka dị ntakịrị, mkpasasị uche nke anọnyeghịrị ndị mụrụ ha na-egbu mmụọ karịa nke ọgba aghara agha n’onwe ya na-akpata.

Ndị Ogbunigwe E Liri n’Ala Gburu

Gbaa ụwa gburugburu, ọtụtụ narị puku ụmụaka apụwo ịga gwurie egwu, ịchị anụ, ịkpa nkụ, ma ọ bụ ịkụ ihe ọkụkụ, nanị ịbụ ndị ogbunigwe ndị e liri n’ala gbagburu. Ogbunigwe ndị e liri n’ala na-egbu mmadụ 800 kwa ọnwa. Ná mba 64 e nwere ngụkọta nke nde 110 ogbunigwe e liri n’ala. Na Cambodia nanị, e liri ihe dị ka nde asaa nke ogbunigwe ndị dị otú ahụ, abụọ maka nwata ọ bụla.

Ihe karịrị mba 40 na-emepụta ihe dị ka ụdị 340 nke ogbunigwe a na-eli eli n’ọtụtụ ụdị na ụcha dị iche iche. Ụfọdụ na-eyi nkume, ndị ọzọ na-eyi akwụoro, ndị ọzọ na-eyikwa obere urukurubụba na-eji nwayọọ efetu n’ala dị ka helikọpta, n’agbawaghị agbawa. Akụkọ na-atụ aro na e debewo ogbunigwe ụfọdụ a na-eli eli, ndị e mere ka ha yie ihe egwuregwu, na nso ụlọ akwụkwọ na ámá egwuregwu ebe ndị inyom na ụmụaka ga-achọta ha.

Ọ na-efu nanị ihe dị ka $3 iji mepụta otu ogbunigwe a na-eli eli iji gbuo onye agha, ma iji chọta ma wepụ otu ogbunigwe e liri n’ala na-efu agbata $300 na $1,000. Na 1993 e wepụrụ ihe dị ka ogbunigwe 100,000 e liri eli, ma e liri nde abụọ ndị ọhụrụ. Ha nile bụ ogbu ọchụ na-enwe ndidi nke na-adịghị ehi ụra, na-amaghị ọdịiche dị n’etiti onye soja na nwatakịrị, na-aghọtaghị nkwekọrịta udo, na-adịkwa irè ruo ihe ruru afọ 50.

Na May 1996, mgbe afọ abụọ nke nkwurịta okwu gasịrị na Geneva, Switzerland, ndị UN tinyere ọnụ n’okwu ahụ enweghị ike iti iwu na-amachibido ogbunigwe a na-eli eli n’ụwa nile. Ọ bụ ezie na ha mapụrụ ụdị ụfọdụ nke ogbunigwe a na-eli eli n’iwu ma tinye ihe mgbochi n’iji ndị ọzọ na-eme ihe, a gaghị atụleghachi ịmachibido ogbunigwe a na-eli eli iwu kpam kpam ruo ná nzukọ ntụleghachi UN ọzọ, nke e yiri iwere ọnọdụ n’afọ 2001. N’agbata ugbu a na mgbe ahụ, ogbunigwe ndị e liri eli pụrụ igbu mmadụ 50,000 ọzọkwa ma menye 80,000 ọrụsị. Ọtụtụ ga-abụ ụmụaka.

Mmekpọ Ọnụ na Ndina n’Ike

N’agha oge ndị a, e mekpọwo ụmụaka ọnụ, ma ọ bụghị iji taa ndị mụrụ ha ahụhụ ọ bụrụ iji ghụpụta ha ihe n’ọnụ banyere ndị mụrụ ha. Mgbe ụfọdụ, n’ụwa nke ọgụ obi ọjọọ, inwe ihe kpatara ya adịghị mkpa, imekpọ ụmụaka ọnụ na-ewere ọnọdụ nanị maka ntụrụndụ.

Ihe ike mmekọahụ, gụnyere ndina n’ike, jupụtara n’agha. N’ọgụ a na-alụ n’ógbè Balkan, ọ bụ ụkpụrụ idina ụmụ agbọghọ nọ n’afọ iri na ụma na ịmanye ha ibu afọ ime nke nwa onye iro. N’otu aka ahụ, na Rwanda ndị soja jiri ndina n’ike mere ngwá agha ibibi ihe nkekọ ezinụlọ. Ná mwakpo ụfọdụ ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na e dinara nwa agbọghọ ọ bụla nọ n’afọ iri na ụma lanarịrị mwakpo ndị agha n’ike. Ọtụtụ ụmụ agbọghọ tụtara ime bụ ndị ezinụlọ na ógbè ha jụrụ. Ụmụ agbọghọ ụfọdụ gbahapụrụ ụmụ ọhụrụ ha; ndị ọzọ gburu onwe ha.

Nsogbu Mmetụta Uche

Ụmụaka ndị nọ n’agha na-edikarị ahụmahụ ndị dị njọ karịa ajọ nrọ nke ọtụtụ ndị toworo eto. Dị ka ihe atụ, na Sarajevo, nnyocha e mere ụmụaka 1,505 gosiri na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile anụwo ụda nke ogbunigwe. A gbawo ihe karịrị ọkara égbè, ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ anọwokwa n’ọnọdụ ebe ndị ha tụrụ anya na a ga-egbu ha.

Otu nnyocha e mere ụmụaka Rwanda 3,000 chọpụtara na 95 pasent ejiwo anya ha hụ ihe ike na ogbugbu n’oge mgbuchapụ ahụ, ndị òtù ezinụlọ anwụnahụwokwa ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 80 pasent. Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ atọ ahụwo ndina n’ike ma ọ bụ mwakpo mmekọahụ, ihe karịkwara otu ụzọ n’ime ụzọ atọ ahụwo ka ụmụaka ndị ọzọ na-ekere òkè n’ogbugbu ma ọ bụ n’iti ihe. Ahụmahụ ndị dị otú ahụ na-akpa uche na obi ụmụaka ajọ aka. Otu akụkọ banyere ụmụaka a kpasasịrị uche sitere n’ebe bụbu Yugoslavia kwuru, sị: “Ncheta nke ihe omume ahụ apụbeghị ha n’uche . . . na-akpata oké nrọ ọjọọ, ncheta ndị na-agbabata n’uche kwa ụbọchị banyere ihe omume na-akpasasị uche, ụjọ, anọghị na nchebe na obi ilu.” Mgbe mgbuchapụ ahụ kwụsịrị na Rwanda, ọkà akparamàgwà mmadụ n’Ụlọ Ọrụ Mba Maka Mgbake nke Mkpasasị Uche kọrọ, sị: “N’ime ihe mgbaàmà ndị na-apụta ìhè n’ụmụaka bụ nrọ ọjọọ, ihe isi ike n’ịtụkwasị uche n’ihe, ịda mbà n’obi na echiche nke enweghị olileanya banyere ọdịnihu.”

Olee Otú A Pụrụ Isi Nyere Ụmụaka Aka?

Ọtụtụ ndị nnyocha kwetara na mkpasasị uche adịghị apụ apụ mgbe ụmụaka na-ekwupụtaghị mmetụta na ihe ndị ha na-echeta. Ọgwụgwọ na-amalitekarị mgbe nwatakịrị chere ihe ndị ọ na-echeta ihu site n’ịkọrọ onye toworo eto nwere ọmịiko na nghọta banyere ihe merenụ. “Ọkara nke ọgụ ahụ bụ ime ka ụmụaka ihe na-enye nsogbu n’obi n’ezie mepee ọnụ ma kọọ obi ha,” ka otu onye ọrụ ebere n’Ọdịda Anyanwụ Africa kwuru.

Ihe inyeaka ọzọ dị mkpa n’ịgwọ ihe mgbu nke mmetụta uche bụ ịdị n’otu siri ike na nkwado nke ezinụlọ na ógbè. Dị ka ụmụaka nile, ndị agha kpara ajọ aka nwere mkpa ịhụnanya, nghọta, na ọmịiko. Ma, è nwere n’ezie ihe mere a ga-eji kwere na e nwere olileanya maka ụmụaka nile ịnụ ụtọ ọdịnihu mara mma?

[Igbe/Foto dị na peeji nke 18]

O Yiri Bọl

Na Laos otu nwatakịrị nwanyị na nwanne ya nwoke kpọọ atụ ha na-aga ebe ọ ga-ata nri. Nwatakịrị nwanyị ahụ hụrụ otu ihe n’ime olulu nke yiri bọl. Ọ tụtụlitere ya ma tụọrọ ya nwanne ya nwoke. Ọ dara n’ala ma gbawaa, na-egbu ya ozugbo ahụ.

[Igbe dị na peeji nke 19]

Nanị Otu n’Ime Ọtụtụ Puku

Mgbe ọgụ malitere n’ógbè ebe o bi n’Angola, e dinara Maria, otu nwa mgbei dị afọ 12, n’ike, o wee tụrụ ime. Mgbe ọgụ siri ike, Maria gbapụrụ, jiri ụkwụ jee kilomita 300 ruo ebe dị nchebe, bụ́ ebe ọ banyere n’ogige maka ụmụaka na-enweghị ebe obibi. N’ihi na ọ ka bụ obere nwa, ime mewere ya tupu o ruo ọmụmụ, na-amụkwo nwa n’oké ihe isi ike. Nwa ọhụrụ ahụ dịrị ndụ nanị izu abụọ. Maria nwụrụ mgbe otu izu gasịrị. Maria bụ nanị otu n’ime ọtụtụ puku ụmụaka ndị e mekpọworo ọnụ ma dinaa n’ike n’agha oge ndị a.

[Igbe/Foto dị na peeji nke 19]

Uche na Obi Ndị Tisara Etisa

E gosipụtara nke ọma otú ime ihe ike si emetụtakarị ụmụaka n’ebe Shabana onye India dị afọ asatọ nọ. Ọ hụrụ ka otu ìgwè na-eme ihe ike tigburu nna ya ma mesịa bepụ nne ya isi. Uche na obi ya mere etili, na-ezochi ụjọ na mfu ahụ. “Agụụ ndị mụrụ m adịghị agụ m,” ka o kwuru n’olu na-enweghị mmetụta ọ bụla na ya. “Adịghị m eche banyere ha.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya