Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 2/8 p. 20-24
  • Ịmụta Ikwe Ka A Pụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmụta Ikwe Ka A Pụọ
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịkụziri Ụmụaka Iji Ihe Akpọrọ Ihe
  • Mgbazi Olu Ịhụnanya
  • Agụmakwụkwọ Maka Ndụ
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Ịzulite Ezinụlọ Siri Ike N’ụzọ Ime Mmụọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 2/8 p. 20-24

Ịmụta Ikwe Ka A Pụọ

“DỊ KA akụ́ n’aka dike, otú a ka ụmụ a mụrụ na mgbe okorobịa dị,” ka onye ọbụ abụ so dee Bible dere. (Abụ Ọma 127:4) Akụ́ adịghị eru n’ebe a gbara ya ná ndabara. A ghaghị iji nlezianya tụọ ya. N’ụzọ yiri nke ahụ, ụmụaka nwere ike ghara iru ihe mgbaru ọsọ nke ịbụ ndị okenye ji ihe akpọrọ ihe n’enweghị nduzi nne na nna. “Zụlite nwata dị ka ụzọ ya si dị,” ka Bible na-agba ume, “ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.”—Ilu 22:6.

A pụghị ime mgbanwe site n’ịdabere ná ndị ọzọ n’oge nwata gaa n’ịnọrọ onwe onye n’okenye n’otu abalị. Ya mere ole mgbe nne na nna kwesịrị ịmalite ịzụ ụmụaka ha ịnọrọ onwe ha? Pọl onyeozi chetaara otu nwa okorobịa aha ya bụ Timoti, sị: “Ebe ị makwaara na i sitere n’oge ị dị na nwa ọhụrụ mata ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ nke pụrụ ime ka ị bụrụ onye amamihe ịnata nzọpụta site n’okwukwe nke i kwere na Kraịst Jisọs.” (2 Timoti 3:15) Cheedị echiche, nne Timoti malitere inye ya ọzụzụ ime mmụọ mgbe ọ ka bụ nwa ọhụrụ!

Ugbu a, ọ bụrụ na obere ụmụ ọhụrụ pụrụ irite uru n’ọzụzụ ime mmụọ, ọ̀ bụ na ezi uche adịghị ya na e kwesịrị inye ụmụaka ọzụzụ maka ịbụ okenye ozugbo o kwere omume? Otu ụzọ isi mee nke a bụ ịkụziri ha iji ihe akpọrọ ihe, ime mkpebi nke aka ha.

Ịkụziri Ụmụaka Iji Ihe Akpọrọ Ihe

Olee otú ị pụrụ isi gbaa ụmụ gị ume iji ihe akpọrọ ihe? Otu di na nwunye aha ha bụ Jack na Nora chetara banyere ada ha, sị: “Mgbe ọ na-amalitechabeghị ije ije, ọ mụtara iwere sọks na ihe ndị dị nta gaa n’ọnụ ụlọ ya ma tinye ha na drọwa kwesịrị ekwesị. Ọ mụtakwara iwepụ ihe egwuregwu na akwụkwọ gaa n’ọnọdụ ha.” Ndị a bụ mmalite ndị dị nta, ma nwa ahụ amụtawalarịị ime mkpebi ndị ezi uche dị na ha.

Ka nwatakịrị na-emewanye okenye, ikekwe a pụrụ inyefe ya ibu ọrụ ndị buru ibu karị. Abra na Anita si otú a kwere ka ada ha nwee nkịta e ji mere enyi. Onye ntorobịa ahụ lekọtara nkịta ahụ, ọbụnakwa nye ego site n’ego mmachi akpa ya maka nlekọta ya. Ịzụ ụmụaka ime ihe banyere ibu ọrụ ha chọrọ ndidi. Ma o kwesịrị mgbalị e tinyere ma na-etinye ihe n’uto mmetụta uche ha.

Ọrụ ụlọ na-enye ohere ọzọ iji kụziere ụmụaka ibu ọrụ. Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nne na nna adịghị ekenye ụmụ ha ọrụ ezinụlọ, na-ewere ntinye aka ha ịbụkarị ihe mkpasu iwe karịa ịbụ enyemaka. Ndị ọzọ na-ekwubi na ụmụ ha kwesịrị ‘ibi ndụ ka mma karịa ka ha biri mgbe ha bụ ụmụaka.’ Nke a bụ echiche na-ezighị ezi. Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, sị: “Onye zụtọworo ohu ya site na nwata, n’ikpeazụ ya ohu ahụ ga-aghọkwa [onye na-enweghị ekele, NW].” (Ilu 29:21) O doro anya na ụkpụrụ dị n’akụkụ akwụkwọ nsọ a metụtara ụmụaka. Ọ bụ ihe mwute mgbe onye ntorobịa ghọrọ okenye ọ bụghị nanị nke “na-enweghị ekele” kamakwa nke na-enweghị ike ịrụ ọrụ ụlọ ndị kasị mfe.

A na-ekenyekarị ndị ntorobịa n’oge Bible ọrụ ụlọ. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ dị nanị afọ 17, Josef na-eto eto keere òkè n’ibu ọrụ nke ilekọta ìgwè atụrụ ezinụlọ. (Jenesis 37:2) Nke a abụghị ọrụ dị nta, ebe ìgwè atụrụ nna ya buru ibu. (Jenesis 32:13-15) N’ihi eziokwu ahụ bụ́ na Josef tolitere ịbụ onye ndú dị ike, o sighị ike ikwere na ọzụzụ a malitere n’oge mere ihe dị ukwuu n’ịkpụzi àgwà ya n’ụzọ dị mma. E nyefekwara onye ga-abụ eze Israel bụ́ Devid ìgwè atụrụ nke ezinụlọ ya mgbe ọ bụ onye ntorobịa.—1 Samuel 16:11.

Gịnị bụ ihe mmụta dịịrị ndị nne na nna taa? Kenye ụmụaka gị ọrụ ụlọ ndị gbara ọkpụrụkpụ. Site n’itinye oge, mgbalị, na ndidi, ị pụrụ ịkụziri ndị na-eto eto ikere òkè n’ihicha ihe, isi nri, ilekọta gburugburu ụlọ, na idozi ebe obibi na ụgbọala. N’eziokwu, ihe dị ukwuu na-adabere n’afọ ndụ na ikike nke nwa ahụ. Ma ọbụna obere ụmụaka pụkwara ikere òkè ụfọdụ ‘n’inyere Papa aka idozi ụgbọala’ ma ọ bụ ‘n’inyere Mama aka isi nri.’

Ịkụzi ọrụ ụlọ na-achọkwa ka ndị nne na nna nye ụmụaka ha onyinye kasị oké ọnụ ahịa—oge ha. A jụrụ otu di na nwunye, bụ́ ndị mụrụ ụmụ abụọ, ihe bụ isi ihe dị n’ọzụzụ nwa gara nke ọma. Ha zara, sị: “Oge, oge, oge!”

Mgbazi Olu Ịhụnanya

Mgbe ụmụaka rụrụ ọrụ ha nke ọma, ma ọ bụ ma ọ dịghị ihe ọzọ tinye mgbalị ime otú ahụ, jiri otuto buru ibu nke si n’obi jaa ha mma! (Tụlee Matiu 25:21.) N’ezie, ụmụaka adịghị ejikarị nkà onye toworo eto arụ ọrụ. Mgbe e nyekwara ụmụaka ohere ime mkpebi nke onwe ha, ha na-ehie ụzọ mgbe mgbe. Ma lezie anya maka imeghachi omume gabiga ókè! Ọ̀ bụ na gị onwe gị ehiebeghị ụzọ dị ka onye toworo eto? Ya mere gịnị ma i gosi ndidi mgbe nwa gị jehiere? (Tụlee Abụ Ọma 103:13.) Nye ohere maka ihie ụzọ. Lee ha anya dị ka akụkụ nke usoro ọmụmụ ihe.

Michael Schulman na Eva Mekler bụ́ ndị na-ede akwụkwọ kwuru, sị: “Ụmụaka ndị e mesoro ihe n’ụzọ enyi adịghị atụ egwu na a ga-ata ha ahụhụ n’ihi ime ihe n’onwe ha.” Otú ọ dị, “ụmụaka nke nne na nna na-enweghị omume enyi ma ọ bụ na-achị ọchịchị aka ike na-atụ ụjọ ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị ihe ọ bụla n’onwe ha, gụnyere ihe ndị na-enye aka, n’ihi na ha na-atụ egwu na ndị mụrụ ha ga-ahụchata mmejọ ụfọdụ n’ihe ha mere ma katọọ ma ọ bụ taa ha ahụhụ.” Okwu a kwekọrọ n’ịdọ aka ná ntị Bible nyere ndị nne na nna: “Akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha.” (Ndị Kọlọsi 3:21) Ya mere mgbe mgbalị nwatakịrị na-erughị ihe a tụrụ anya ya, gịnị ma i too ya ma ọ dịghị ihe ọzọ n’ihi ịgbalị? Gbaa ya ume ime nke ọma karị n’oge ọzọ. Mee ka ọ mara na ọganihu ya na-ewetara gị obi ụtọ. Mesie ya obi ike banyere ịhụnanya gị.

N’ezie, mgbe ụfọdụ mgbazi olu dị mkpa. Nke a nwere ike ịpụta ìhè karịsịa n’afọ uto, mgbe ndị na-eto eto na-agbalị ịzụlite ụdị mmadụ ha, ịbụ ndị a nakweere dị ka ndị dị nnọọ iche. Ya mere ọ bụ ihe amamihe nye ndị nne na nna iji nghọta na-ele mgbalị ndị dị otú ahụ nke inweta nnwere onwe anya kama ịkọwa ha mgbe nile dị ka nnupụisi.

N’eziokwu, ndị na-eto eto na-emekarị ihe ná mkpali ma ọ bụ na-adaba ‘n’agụụ ihe ọjọọ na-agụ nwa okorobịa.’ (2 Timoti 2:22) Ya mere akpaghị ókè n’akparamàgwà onye ntorobịa pụrụ imebi nwata n’ụzọ mmetụta uche; ọ gaghị amụta njide onwe onye na ọzụzụ onwe onye. Bible na-adọ aka ná ntị, sị: “Nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” (Ilu 29:15) Ma ịdọ aka ná ntị kwesịrị ekwesị, e nyere n’ụzọ ịhụnanya, bara uru ma na-akwadebe onye ntorobịa maka mkpa na nrụgide nke ịbụ okenye. Bible na-enye ndụmọdụ, sị: “Onye na-egbochi mkpanaka ya na-akpọ nwa ya asị: ma onye na-ahụ ya n’anya na-adọsi ya aka ná ntị ike.” (Ilu 13:24) Otú ọ dị, cheta na nzube nke ịdọ aka ná ntị bụ ịkụzi ihe na inye ọzụzụ—ọ bụghị inye ahụhụ. O yikarịrị ka “mkpanaka” n’ebe a na-ezo aka na mkpara ndị na-azụ atụrụ na-eji eduzi ìgwè atụrụ ha. (Abụ Ọma 23:4) Ọ bụ ihe atụ nke nduzi ịhụnanya—ọ bụghị mmeso obi ọjọọ.

Agụmakwụkwọ Maka Ndụ

Nduzi nke nne na nna dị mkpa karịsịa mgbe a bịara n’agụmakwụkwọ nwatakịrị. Nwee mmasị n’agụmakwụkwọ nwa gị. Nyere ya aka ịhọrọ ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ kwesịrị ekwesị na ime mkpebi ezi uche dị na ya banyere ma inwetakwu agụmakwụkwọ ọ bụla ọ ga-adị mkpa.a

N’ezie, agụmakwụkwọ kachasị mkpa bụ agụmakwụkwọ ime mmụọ. (Aịsaịa 54:13) Ụkpụrụ nsọpụrụ Chineke ga-adị ụmụaka mkpa iji nwee ihe ịga nke ọma mgbe ha mere okenye. A ghaghị ịzụ “nghọta” ha. (Ndị Hibru 5:14) Ndị nne na nna pụrụ ime ihe dị ukwuu iji nyere ha aka n’akụkụ a. A na-agba ezinụlọ bụ́ Ndịàmà Jehova ume isoro ụmụaka ha na-enwe ọmụmụ Bible chiri anya. N’ịgbaso ihe nlereanya nke nne Timoti, bụ́ onye kụziiri ya Akwụkwọ Nsọ site na nwa ọhụrụ, nne na nna bụ́ Ndịàmà na-akụziri obere ụmụaka ha ihe n’otu aka ahụ.

Otu nne nanị ya na-azụ nwa aha ya bụ Barbara na-eme ọmụmụ Bible ezinụlọ ahụmahụ kasị ụtọ nye ụmụaka ya. “N’uhuruchi ahụ ana m ejide n’aka na m nyere ụmụaka nri dị mma, nke e ji nri nhicha ọnụ na-amasị ha mejuo. Ana m akpọ tepụ Kingdom Melodies iji hụ na e nwere ọnọdụ kwesịrị ekwesị. Mgbe ahụ, mgbe e meghesịrị n’ekpere, anyị na-amụkarị magazin Ụlọ Nche. Ma ọ bụrụ na e nwere mkpa ụfọdụ pụrụ iche, apụrụ m iji mbipụta ndị dị ka Questions Young People Ask—Answers That Work mee ihe.”b Dị ka Barbara si kwuo, ịmụ Bible na-enyere ụmụ ya aka “ịghọta echiche Jehova n’okwu dị iche iche.”

Ee, ọ dịghị onyinye ka ukwuu a pụrụ inye nwata karịa ihe ọmụma na nghọta nke Okwu Chineke, bụ́ Bible. Ọ pụrụ “inye ndị na-enweghị uche ezi uche, inye nwa okorobịa ihe ọmụma na izuzu.” (Ilu 1:4) N’ịbụ onye e si otú a kwadebe, onye na-eto eto na-abụ okenye na-enwe ike izute nrụgide na ọnọdụ ndị ọhụrụ.

Ya bụrụgodị otú ahụ, ọpụpụ nke ụmụaka na-agba àmà mgbanwe buru ibu n’ụzọ ndụ nke ihe ka ọtụtụ ná ndị nne na nna. Ụzọ ha pụrụ isi nagide ụlọ tọgbọ chakoo n’ụzọ na-aga nke ọma bụ ihe a tụlere n’isiokwu anyị na-eso.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee usoro isiokwu bụ́ “Ndị Mụrụ Ụmụ—Unu Nwekwara Ọrụ Dịịrị Unu n’Ụlọ!” na mbipụta Teta! nke February 8, 1990.

b Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 22]

“Ụmụaka nke nne na nna na-enweghị omume enyi ma ọ bụ na-achị ọchịchị aka ike na-atụ ụjọ ime ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ụdị ihe ọ bụla n’onwe ha, gụnyere ihe ndị na-enye aka, n’ihi na ha na-atụ egwu na ndị mụrụ ha ga-ahụchata mmejọ ụfọdụ n’ihe ha mere ma katọọ ma ọ bụ taa ha ahụhụ.”—Bringing Up a Moral Child, nke Michael Schulman na Eva Mekler dere

[Igbe dị na peeji nke 22]

Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Nwa —Ihe Ịma Aka nke Ikwe Ka A Pụọ

Otu nne nanị ya na-azụ nwa aha ya bụ Rebecca kwuru, sị: “Ọ na-esiri ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ oké ike ikwe ka ụmụ ha pụọ. Ọ bụrụ na anyị elezighị onwe anyị anya, ọ na-eyi ka anyị na-echebe ha gabiga ókè ma na-egbochi uto ha.” Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ,* peji nke 106-107, na-ekwu ihe ndị a na-enye aka:

“Ọ bụ ihe dị otú a tụrụ anya ya ka ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ na-anọ ụmụ ha nso nke ukwuu, ma a ghaghị ịkpachara anya ka a ghara imebi ókè Chineke kpara n’etiti ndị nne na nna na ụmụaka. Dị ka ihe atụ, oké ihe isi ike pụrụ ibilite ma ọ bụrụ na nne nanị ya na-azụ ụmụ atụọ anya n’aka nwa ya nwoke iweghara ibu ọrụ nke nwoke nwe ụlọ ma ọ bụ mesoo nwa ya nwanyị dị ka onye ọ na-agwa ihe nzuzo, jiri nsogbu onwe onye na-ebogbu nwata nwanyị ahụ. Ime otú ahụ ekwesịghị ekwesị, na-akpata nrụgide, ma eleghị anya na-agbagwojukwa nwa ahụ anya.

“Mesie ụmụ gị obi ike na gị, dị ka nne ma ọ bụ nna, ga-elekọta ha—ọ bụghị ha ga-elekọta gị. (Tụlee 2 Ndị Kọrint 12:14.) Mgbe ụfọdụ, okwu ndụmọdụ ma ọ bụ nkwado ụfọdụ pụrụ ịdị gị mkpa. Chọọ ya n’aka ndị okenye ndị Kraịst ma ọ bụ ma eleghị anya n’aka ndị inyom tozuru okè bụ́ ndị Kraịst, ọ bụghị site n’aka ụmụntakịrị gị.—Taịtọs 2:3.”

Mgbe ndị nne ma ọ bụ nna nanị ha na-azụ ụmụ guzobere ókè kwesịrị ekwesị ma nọgide na-enwe mmekọrịta dị mma n’ebe ụmụaka ha nọ, ọ na-adịkarịrị ha mfe ikwe ka a pụọ.

*Nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ọzụzụ dị irè pụrụ inyere ụmụaka aka ịghọ ndị okenye ji ihe akpọrọ ihe karị

[Foto ndị dị na peeji nke 24]

Ọmụmụ Bible ezinụlọ pụrụ inye ụmụaka amamihe dị mkpa iji nagide ndụ onye toworo eto

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya