Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 2/8 p. 19
  • Ihe Mgbu nke Ikwe Ka A Pụọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Mgbu nke Ikwe Ka A Pụọ
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ, Ọtụtụ Ihe Ịma Aka Ha Na-enwe
    Teta!—2002
  • Ibi Ndụ n’Obi Ụtọ n’Ụlọ Tọgbọ Chakoo
    Teta!—1998
  • Ndị Nne na Nna—Bụrụnụ Ezi Ihe Nlereanya Nye Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ndị Nne na Nna—Jirinụ Ịhụnanya Na-azụ Ụmụ Unu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 2/8 p. 19

Ihe Mgbu nke Ikwe Ka A Pụọ

“Di m adọwo m aka ná ntị n’ụbọchị a mụrụ nwa mbụ—‘Nke m, ịzụlite ụmụ bụ usoro dị ogologo nke ikwe ka a pụọ.’”—Ourselves and Our Children—A Book by and for Parents.

IHE ka ọtụtụ ná ndị nne na nna na-enwe obi ụtọ—ọbụna na-enwe oké mkpali—mgbe a mụrụ nwa mbụ ha. N’agbanyeghị nsogbu, ọgba aghara, ihe mgbu, nkụda mmụọ, na nchegbu nile nke ịbụ nne ma ọ bụ nna na-eweta, ụmụaka pụrụ ịbụ isi iyi nke oké ọṅụ. Ihe dị ka puku afọ atọ gara aga, Bible kwupụtara, sị: “Ụmụaka bụ onyinye sitere n’aka ONYENWE ANYỊ; ha bụ ezigbo ngọzi.”—Abụ Ọma 127:3, Today’s English Version.

Ka o sina dị, Bible na-ebukwa amụma a na-eme ka e chee echiche: “Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya.” (Jenesis 2:24) N’ihi ihe dịgasị iche iche, ụmụaka ndị toworo eto na-ahapụkarị ụlọ—ịchụso agụmakwụkwọ ma ọ bụ ọrụ, ịmụba ozi ndị Kraịst ha, ịlụ di ma ọ bụ nwunye. Ma nye ụfọdụ ndị nne na nna, ihe a na-eme eme na-egbu oké mgbu n’ezie. Ha na-ekwe ka mgbalị kwesịrị ekwesị nke ụmụ ha na-eme inweta nnwere onwe mee ka ha—dị ka otu onye edemede si tinye ya—“nwee mmetụta nke ịbụ ndị a kparịrị, a kpasuru iwe, e mechuru ihu, e yiri egwu ma ọ bụ a jụrụ ajụ.” Nke a na-edugakarị n’ọgụ na esemokwu ezinụlọ na-adịghị akwụsị akwụsị. N’ịjụ ịnakwere ụbọchị ụmụ ha ga-ahapụ ụlọ, ụfọdụ ndị nne na nna adịghị akwadebe ha maka ịbụ okenye. Ihe na-esi ná nleghara anya dị otú ahụ apụta pụrụ ịdị egwu: ndị okenye a na-akwadoghị nke ọma ilekọta ebe obibi, ilekọta ezinụlọ, ma ọ bụ ọbụna ijigide ọrụ.

Ihe mgbu nke nkewa pụrụ isi oké ike karịsịa n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna. Nne nanị ya na-azụ nwa, onye aha ya bụ Karen, na-ekwu, sị: “Mụ na ada m bụ akị na ụkwa; anyị zụlitere ezi nkekọ nke ọbụbụenyi. Ebe ọ bụla m na-aga, m na-akpọrọ ya.” Mmekọrịta chiri anya nke nne ma ọ bụ nna na nwa na-adịkarị n’ezinụlọ ndị nwere nanị nne ma ọ bụ nna. N’ụzọ kwere nghọta, echiche nke ịtụfu ichi anya dị otú ahụ pụrụ ịkpata ọgba aghara.

Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ Traits of a Healthy Family na-echetara nne na nna, sị: “Ọ bụ ya bụ ihe dị ná ndụ ezinụlọ: ịzụlite nwa ọhụrụ nke na-adabere ná ndị ọzọ ịghọ onye toworo eto nọ na nke ya.” Ọ dọziri aka ná ntị, sị: “Ọtụtụ nsogbu dị n’ezinụlọ na-ebilite n’ihi enweghị ike nke nne na nna ikwe ka a pụọ.”

Gịnị banyere gị? Ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna? Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ dị njikere maka ụbọchị mgbe ị na-aghaghị ikwe ka ụmụ gị pụọ? Gịnịkwa banyere ụmụ gị? Ị̀ na-akwadebe ha inwe ihe ịga nke ọma n’onwe ha?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya