Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 2/8 p. 25-28
  • Ibi Ndụ n’Obi Ụtọ n’Ụlọ Tọgbọ Chakoo

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ibi Ndụ n’Obi Ụtọ n’Ụlọ Tọgbọ Chakoo
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Lekwasị Anya n’Ihe Ziri Ezi
  • Ị Ka Bụ Nne Ma Ọ Bụ Nna!
  • Zere Mmanye Aka
  • Mee Ka Nkekọ Alụmdi na Nwunye Dịghachi Ọhụrụ
  • Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ya Na-azụ Ụmụ Ikwe Ka A Pụọ
  • Iji Obi Ụtọ Kwe Ka A Pụọ
  • Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ha Na-azụ Ụmụ, Ọtụtụ Ihe Ịma Aka Ha Na-enwe
    Teta!—2002
  • Zụlite Nwa Gị Site na Nwa Ọhụrụ
    Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ
  • Ịmụta Ikwe Ka A Pụọ
    Teta!—1998
  • Kụziere Ụmụ Gị Ịhụ Jehova n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 2/8 p. 25-28

Ibi Ndụ n’Obi Ụtọ n’Ụlọ Tọgbọ Chakoo

“NYE ọtụtụ n’ime anyị,” ka otu nne kwetara, “nkewa ikpeazụ na-abịa na mberede n’agbanyeghị otú anyị kwadoruru nke ọma maka ya.” Ee, n’agbanyeghị na a pụghị izere ọpụpụ nke nwatakịrị, mgbe o mere n’eziokwu, ịnagide ya nwere ike ọ gaghị adị oké mfe. Otu nna na-akọ banyere mmeghachi omume ya mgbe ọ gwasịrị nwa ya ka e mesịa: “Na nke mbụ ya ná ndụ m . . . , akwara m nnọọ ákwá ma kwasie ákwá ike.”

Nye ọtụtụ nne na nna, ọpụpụ nke ụmụaka ha na-ahapụ oghere buru ibu ná ndụ ha—ọnyá nke ghere oghe. N’ịbụ ndị na-enweghị ike iso ụmụ ha mekọrịta ihe kwa ụbọchị, ụfọdụ na-enwe oké mmetụta nke owu ọmụma, ahụ mgbu, na mfu. O nwekwara ike ọ bụghị nanị nne na nna bụ ndị ọ na-esiri ike ime mgbanwe. Otu di na nwunye aha ha bụ Edward na Avril na-echetara anyị, sị: “Ọ bụrụ na e nwere ụmụaka ndị ọzọ nọ n’ụlọ, ha ga na-enwekwa mmetụta nke mfu ahụ.” Gịnị bụ ndụmọdụ di na nwunye a? “Nye ha oge na nghọta gị. Nke a ga-enyere ha aka ime mgbanwe.”

Ee, ndụ na-aga n’ihu. Ọ bụrụ na ị ga-elekọta ụmụ gị ndị fọdụrụ—gụnyekwara ọrụ ego ma ọ bụ ọrụ ụlọ gị—ị pụghị ikwe ka mwute rikpuo gị. Ya mere, ka anyị leba anya n’ụzọ ụfọdụ isi chọta obi ụtọ ka ụmụ gị na-ahapụ ụlọ.

Lekwasị Anya n’Ihe Ziri Ezi

N’ezie, ọ bụrụ na ị na-enwe mwute ma ọ bụ na owu na-ama gị, ọ dịkwa gị mkpa ibe ákwá ma ọ bụ ikwupụta mmetụta gị n’ebe enyi nwere ọmịiko nọ, gbalịa mee otú ahụ. Bible na-asị: “Nchegbu n’obi mmadụ na-eme ka obi huru ala; ma okwu ọma na-eme ka ọ ṅụrịa.” (Ilu 12:25) Mgbe ụfọdụ, ndị ọzọ pụrụ inye echiche ọhụrụ banyere ihe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, otu di na nwunye aha ha bụ Waldemar na Marianne dụrụ ọdụ, sị: “Lee okwu ahụ anya, ọ bụghị dị ka mfu, kama dị ka ịrụzu ihe mgbaru ọsọ n’ụzọ gara nke ọma.” Lee ụzọ dị mma isi lee ihe anya ọ bụ! “Obi dị anyị ụtọ na anyị nwere ike ịzụlite ụmụ anyị ndị nwoke ịghọ ndị okenye ji ihe akpọrọ ihe,” ka otu di na nwunye aha ha bụ Rudolf na Hilde kwuru.

Ị̀ gbalịwo ịzụlite nwa gị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị”? (Ndị Efesọs 6:4) Ọ bụrụgodị na i mewo ya, ị ka pụrụ inwe nchegbu banyere ọpụpụ ya. Ma nye ndị si otú a zụọ nwa ha, mmesi obi ike nke Bible bụ na “ọbụna mgbe o mere okenye ọ gaghị esi n’ime ya wezụga onwe ya.” (Ilu 22:6) Ọ̀ bụ na ọ dịghị enye afọ ojuju buru ibu ịhụ na nwa gị anabatawo ọzụzụ gị? Jọn onyeozi kwuru banyere ezinụlọ ime mmụọ ya, sị: “Enweghị m ọṅụ nke ka ihe ndị a ukwuu, bụ́ ịnụ ka ụmụ nke aka m na-ejegharị n’eziokwu ahụ.” (3 Jọn 4) Ikekwe ị pụrụ ikwu ihe ndị yiri nke ahụ banyere nwa nke gị.

N’eziokwu, ọ bụghị ụmụaka nile na-anabata ọzụzụ ndị Kraịst. Ọ bụrụ na nke a abụrụ eziokwu banyere nwa gị toworo eto, ọ pụtaghị na ị dara dị ka nne ma ọ bụ nna. Akatọla onwe gị n’ụzọ na-adịghị mkpa ma ọ bụrụ na i mewo ihe ị pụrụ ime ịzụlite ya n’ụzọ nke Chineke. Ghọta na dị ka onye toworo eto nwa gị na-eburu ibu ọrụ ya n’ihu Chineke. (Ndị Galetia 6:5) Jigide olileanya ahụ bụ́ na ikekwe ka oge na-aga ọ ga-atụleghachi nhọrọ ya nakwa na “akụ́” ahụ ga-emesịa gaa n’ebe a tụrụ ya.—Abụ Ọma 127:4.

Ị Ka Bụ Nne Ma Ọ Bụ Nna!

Ọ bụ ezie na ọpụpụ nwa gị na-agba àmà mgbanwe pụtara ìhè, ọ pụtaghị na ọrụ gị dị ka nne ma ọ bụ nna agwụla. Ọkachamara n’ahụ ike uche bụ́ Howard Halpern na-ekwu, sị: “Ị bụ nne ma ọ bụ nna ya ruo ụbọchị ị nwụrụ, ma a gaje imezigharị ihe n’inye ihe na nlekọta.”

N’ogologo oge gara aga Bible kwetara na ịbụ nne ma ọ bụ nna adịghị akwụsị nanị n’ihi na nwatakịrị etolitewo. Ilu 23:22 na-ekwu, sị: “Gee nna gị, bụ́ onye mụrụ gị, ntị, eledakwala nne gị anya mgbe o mere agadi.” Ee, ọbụna mgbe nne na nna “mere agadi,” ụmụ ha abụrụkwa ndị toworo eto, ndị nne na nna ka pụrụ inwe mmetụta dị mkpa ná ndụ ụmụ ha. N’ezie, ọ dị mkpa ime nhazigharị ụfọdụ. Ma mmekọrịta nile chọrọ nhazigharị ihe site n’oge ruo n’oge iji mee ka ha dị ọhụrụ ma na-eju afọ. Ya mere ugbu a ụmụ gị toworo, rụọ ọrụ n’ime ka mmekọrịta gị na ha bụrụkwuo nke ndị meworo okenye. N’ụzọ na-akpali mmasị, ihe ọmụmụ na-egosi na ọtụtụ mgbe mmekọrịta onye mụrụ nwa na nwa na-aka mma ozugbo ụmụaka ahụ hapụrụ ụlọ! Ka ụmụaka na-ezute nrụgide nke ụwa, ha na-amalitekarị ịhụ nne na nna ha n’ụdị ọhụrụ. Otu onye Germany aha ya bụ Hartmut na-ekwu, sị: “Ugbu a ana m aghọta nne na nna m nke ọma karị, na-amatakwa ihe mere ha ji mee ihe dị iche iche n’ụzọ ha si mee ha.”

Zere Mmanye Aka

Otú ọ dị, a pụrụ imebi ihe dị ukwuu, ma ọ bụrụ na ị bụrụ onye na-amanye aka ná ndụ nwa gị toworo eto. (Tụlee 1 Timoti 5:13.) Otu nwanyị lụworo di bụ́ onye ya na ndị ọgọ ya na-enwe oké esemokwu kwara arịrị, sị: “Anyị hụrụ ha n’anya, ma anyị chọrọ nnọọ ibi ndụ nke anyị ma mee mkpebi nke anyị.” N’ezie, ọ dịghị nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya nke ga-agbachi nkịtị ebe nwa ya toworo eto na-adaba n’ọdachi. Ma ọ na-akasịkarị mma izere inye ndụmọdụ nne ma ọ bụ nna a na-arịọghị maka ya, n’agbanyeghị otú amamihe dịruru na ya ma ọ bụ nwee ezi nzube. Nke a bụ eziokwu karịsịa mgbe nwata lụsịrị di ma ọ bụ nwunye.

Teta! nyere ndụmọdụ a laa azụ na 1984: “Kweta na ọrụ dịịrị gị agbanweela. Ị na-akwụsị ọrụ gị dị ka onye ọ̀kpà nwa mgbe nwa ahụ ị na-eku malitere ịmụ ije. N’otu aka ahụkwa, ugbu a ị ghaghị ijiri ọrụ ịbụ onye ndụmọdụ wee gbanwere ọrụ ahụ na-amasị gị nke ịbụ onye nlekọta. Imere nwa gị mkpebi n’oge a ga-abụ ihe na-ekwesịghị ekwesị dị ka ọ na-adị n’inyere ya aka ibi ubiri ma ọ bụ inye ya ara. Dị ka onye ndụmọdụ, ị ghaghị inwe ebe ị ga-enyeru wee kwụsị. Ị pụkwaghị ọzọ ime ihe site n’iji ikike ị nwere dị ka onye mụrụ ha. (‘N’ihi na ekwuola m ya, ị ga-emerịrị ya.’) Ị ghaghị inwe nkwanye ùgwù nye ịbụ okenye nke ụmụ gị.”a

I nwere ike ị gaghị ekwenye ná mkpebi nile nwa gị na onye òtù ọlụlụ ya na-eme. Ma nkwanye ùgwù maka ịdị nsọ nke alụmdi na nwunye pụrụ inyere gị aka ịchịkwa nchegbu gị ma zere itinye aka n’ụzọ na-adịghị mkpa. Nke bụ eziokwu bụ, ọ na-akasịkarị mma ikwe ka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ dozie nsogbu ha n’etiti onwe ha. Ma ọ bụghị ya, ị ga-anọ n’ihe ize ndụ nke esemokwu na-adịghị mkpa mgbe ị na-enye di ma ọ bụ nwunye nwa gị ndụmọdụ a na-achọghị bụ́ onye, n’oge alụmdi na nwunye na-enwe nsogbu, okwu nkatọ pụrụ ịdị na-emetụ n’ahụ nke ukwuu. Isiokwu Teta! ahụ a kpọtụrụ uche n’elu gara n’ihu ịdụ ọdụ, sị: “Tipịa ọnwụnwa ahụ nke inye ntụzi aka nke ọ na-adịghị onye rịọrọ gị, nke pụrụ ime ka ọgọ gị nwoke ma ọ bụ nwunye nwa gị ghọọ onyeiro.” Na-enye nkwado—ọ bụghị ịchịkwa ha. Site n’inwe mmekọrịta dị mma, ị na-eme ka ọ dịrị nwa gị mfe karị ịbịakwute gị ma ọ bụrụ na ndụmọdụ dị mkpa n’ezie.

Mee Ka Nkekọ Alụmdi na Nwunye Dịghachi Ọhụrụ

Nye ọtụtụ di na nwunye, ụlọ tọgbọ chakoo pụkwara imepe ohere nke obi ụtọ alụmdi na nwunye ka ukwuu. Oge na mgbalị ọ na-ewe iji zụọ ụmụ nke ọma pụrụ ibu nnọọ ibu nke na ndị di na nwunye na-eleghara mmekọrịta nke ha anya. Otu nwunye kwuru, sị: “Ugbu a ụmụaka pụworo, mụ na Konrad na-agbalị ịmaliteghachi ịmara onwe anyị ọzọ.”

N’ịbụ ndị a tọhapụrụ n’ibu ọrụ kwa ụbọchị nke ịzụ ụmụ, unu pụrụ inwekwu oge maka ibe unu ugbu a. Otu nne kwuru, sị: “Oge ọhụrụ a a na-ejighị ọrụ n’aka . . . na-enye anyị ohere ilekwasị anya karị n’onye anyị bụ, ịtụkwasị uche n’ịmụtakwu banyere mmekọrịta anyị, na ịmalite itinye aka n’ọrụ ndị na-egbo mkpa anyị.” O kwukwasịrị: “Ọ bụ oge nke ịmụ ihe ọhụrụ na uto dị egwu, ọ bụkwa ezie na oge ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ nke na-akpata oké nchekasị, ha na-akpalikwa akpali.”

Ndị di na nwunye ụfọdụ na-enwekwa nnwere onwe akụ̀ na ụba ka ukwuu. Ugbu a, a pụrụ ịchụso ihe omume ntụrụndụ na ọrụ ndị e debeworo n’akụkụ. N’etiti Ndịàmà Jehova, ọtụtụ di na nwunye na-eji nnwere onwe ọhụrụ ha achụso ọdịmma ime mmụọ. Otu nna aha ya bụ Hermann na-akọwa na mgbe ụmụ ya hapụsịrị ụlọ, ya na nwunye ya chigharịrị ozugbo n’ịmaliteghachi ozi oge nile.

Nne Ma Ọ Bụ Nna Nanị Ya Na-azụ Ụmụ Ikwe Ka A Pụọ

Ime mgbanwe ikwekọ n’ụlọ tọgbọ chakoo pụrụ isi ike karịsịa nye nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ. Rebecca, bụ́ nne nanị ya na-azụ ụmụ abụọ, na-akọwa, sị: “Mgbe ụmụ anyị pụrụ, anyị anaghị enwe di ga-anọnyere anyị ma na-ahụ anyị n’anya.” Nne ma ọ bụ nna nanị ya na-azụ ụmụ pụrụ ịhụworị na ụmụ ya bụ ebe o si enweta nkwado mmetụta uche. Ọ bụrụkwa na ha na-atụnye ụtụ n’ego ezinụlọ, ọpụpụ ha pụkwara ịbụ ihe isi ike nke ego.

Ụfọdụ na-agbalị ime ka ọnọdụ akụ̀ na ụba ha ka mma site n’idenye aha n’usoro ihe omume inweta ọzụzụ n’ọrụ ma ọ bụ ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ na-adịru nwa oge. Ma olee otú mmadụ si emeju oghere nke owu ọmụma? Otu nne nanị ya na-azụ ụmụ na-ekwu, sị: “Ihe na-abara m uru bụ ijide ọrụ n’aka. Ọ pụrụ ịbụ ịgụ Bible, ihichasị ụlọ m, ma ọ bụ nanị ije ije ọsọ ọsọ ma ọ bụ ịgba ọsọ. Ma ụzọ kasị baara m uru iji merie owu ọmụma bụ ịgwa otu enyi ime mmụọ okwu.” Ee, “dị obodobo n’obi,” ma zụlite ọbụbụenyi ndị ọhụrụ, ndị na-ejukwa afọ. (2 Ndị Kọrint 6:13) ‘Nọgide n’arịrịọ na ekpere’ mgbe ihe karịrị gị ike. (1 Timoti 5:5) Jide n’aka na Jehova ga-enye gị ume ma kwado gị n’oge a siri ike nke ime mgbanwe.

Iji Obi Ụtọ Kwe Ka A Pụọ

N’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ gị, ghọta na ndụ adịghị agwụsị mgbe ụmụaka hapụrụ ụlọ. Nkekọ ezinụlọ adịghịkwa etisasị. Ịhụnanya dị mma nke a kọwara na Bible siri ike ruo n’ókè nke ijikọta ndị mmadụ ọnụ, ọbụna mgbe ha nọ ebe dị anya n’ebe ibe ha nọ. Pọl onyeozi na-echetara anyị na ịhụnanya “na-anagide ihe nile. Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.” (1 Ndị Kọrint 13:7, 8) Ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị ị zụliteworo n’ezinụlọ gị agaghị ada nanị n’ihi na ụmụ gị hapụrụ ụlọ.

N’ụzọ na-akpali mmasị, mgbe ụmụaka malitere iche ihe mgbu nke nkewa na agụụ ụlọ ihu ma ọ bụ mgbe ha malitere inweta ihe isi ike nke nrụgide akụ̀ na ụba, ha na-abụkarị ndị na-ebu ụzọ amaliteghachi mmekọrịta. Hans na Ingrid na-adụ ọdụ, sị: “Mee ka ụmụaka mara na ọnụ ụzọ ụlọ gị ghere oghe mgbe nile.” Ime nleta chiri anya, akwụkwọ ozi, ma ọ bụ ịkpọ na fon mgbe mgbe ga-enyere gị aka iso ha na-emekọrịta. “Nwee mmasị n’ihe ha na-eme n’amanyeghị aka n’ihe ha na-eme” bụ otú Jack na Nora si kwuo ya.

Mgbe ụmụaka hapụrụ ụlọ, ndụ gị na-agbanwe. Ma ndụ n’ime ụlọ tọgbọ chakoo pụrụ ịbụ nke iji ọrụ n’aka, nke ịrụsi ọrụ ike, na nke na-eju afọ. Ọzọ, mmekọrịta gị na ụmụ gị na-agbanwe. Ma, ọ ka pụrụ ịbụ mmekọrịta ọṅụ na nke na-enye obi ụtọ. “Inweta nnwere onwe pụọ n’ebe nne na nna nọ,” ka Prọfesọ Geoffrey Leigh na Profesọ Gary Peterson na-ekwu, “adịghị apụta enwekwaghị ịhụnanya, iguzosi ike n’ihe, ma ọ bụ nkwanye ùgwù maka nne na nna. . . . N’ezie, ihe nkekọ ezinụlọ siri ike na-adịgidekarị n’usoro ndụ nile.” Ee, ọ dịghị mgbe ị ga-akwụsị ịhụ ụmụ gị n’anya, ọ dịghịkwa mgbe ị ga-akwụsị ịbụ nne ma ọ bụ nna ha. N’ihi na ị hụwokwa ụmụ gị n’anya ruo n’ókè nke ikwe ka ha pụọ, ha efunahụbeghị gị n’ezie.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu bụ́ “Ị Dịghị Akwụsị Ịbụ Nne na Nna,” dị ná mbipụta Teta! nke August 8, 1984.

[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 28]

“Na nke mbụ ya ná ndụ m . . . , akwara m nnọọ ákwá ma kwasie ákwá ike”

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 26]

Okwu Dịịrị Ụmụ Toworo Eto—Nyere Ndị Nne na Nna Aka Ikwe Ka A Pụọ

Ọ na-adịkarị mfe ịnagide nhapụ karịa ịbụ onye a hapụrụ. Ya mere ka ị na-aṅụrị ọṅụ ná nnwere onwe na ịbụ okenye gị, gosi obiọma na nghọta n’ebe ndị mụrụ gị nọ ma ọ bụrụ na ọ na-esiri ha ike ime mgbanwe. Mesie ha obi ike banyere ịhụnanya na mmetụta ịhụnanya ị nọgidere na-enwe. Akwụkwọ ozi dị nkenke, onyinye a na-atụghị anya ya, ma ọ bụ òkù telifon nke enyi pụrụ ime ihe dị ukwuu n’ime ka nne ma ọ bụ nna ihu ya gbarụrụ agbarụ chịa ọchị! Na-akọrọ ha ihe omume ndị dị ịrịba ama ná ndụ gị. Nke a na-eme ka ha mara na nkekọ ezinụlọ ka siri ike.

Ka ị na-eche nrụgide nke ndụ onye toworo eto ihu, ikekwe ị ga-aghọtakwu karịa mgbe ọ bụla ọzọ ihe ndị mụrụ gị hụrụ n’ilekọta gị. Eleghị anya nke a ga-akwali gị ịgwa ndị mụrụ gị, sị: “Unu emeela maka ihe nile unu meere m!”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya