Ileta Ọzọdimgba Ugwu
Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Tanzania
NANỊ ihe dị ka 320 n’ime ha bi n’ógbè ugwu mgbawa dị n’ókèala Rwanda na Democratic Republic of Congo. Narị atọ ọzọ bi n’oké ọhịa a na-apụghị ịbanye abanye na Uganda. Ha bụ ọzọdimgba ugwu—nke so n’ime anụ ndị na-enye nwa ara kasị nọrọ n’oké ihe ize ndụ n’ụwa!
Onye America bụ ọkà n’ilekọta anụmanụ bụ́ Dian Fossey mere ihe dị ukwuu iji kpalie mmasị ọha na eze banyere ihe ga-adabara ihe ndị a e kere eke. Fossey bịara n’Africa ná ngwụsị nke afọ ndị 1960 iji mụọ ihe banyere ọzọdimgba ugwu. N’oge ahụ ha na-apụ n’anya ngwa ngwa n’ihi ịchụ nta. Ọkà mmụta sayensị ahụ kara obi biri ndụ yiri nke onye na-anọ nanị ya n’Ugwu Virunga, na-emeta ọzọdimgba ndị bi n’ebe ahụ enyi ngwa ngwa. Fossey bipụtara nchọpụta ya n’isiokwu nke magazin dị iche iche na n’akwụkwọ bụ́ Gorillas in the Mist. Ka oge na-aga, o kpebisiri ike karị ichebe ndị enyi ya gbara ajị, na-ebuso ndị dinta ihe a pụrụ ịkpọ agha. Otú ọ dị, ọ ghọrọ onye atụmatụ ngwọta ya metụtara ma bụrụ onye onye mwakpo a na-amaghị gburu na 1985.
N’ịbụ ndị olileanya nke ịhụ ihe ndị a e kere eke na-eme udo kpaliri n’onwe anyị, na 1993 mụ na nwunye m kpebiri ịnwa ịbanye n’ebe obibi ọzọdimgba ahụ. Biko, kwee ka anyị chetaghachi ahụmahụ anyị.
Ọ malitere ka ndị nduzi anyị kpọọrọ anyị rịa elu were otu hour site n’ala ala nke ugwu mgbawa bụ́ Visoke nke dị mita 3,700 n’ịdị elu ruo n’ọnụ ọnụ ogige Volcanoes National Park, dị na Rwanda. Ka anyị na-ezurutụ ike, ndị nduzi anyị kọwara otú anyị ga-esi kpaa àgwà n’ebe ọzọdimgba ndị ahụ dị. A gwara anyị na nanị ndị nleta asatọ kwa ụbọchị ka a na-ekwe ka ha jee leta ìgwè anụmanụ a. Nke a na-ebelata ihe ize ndụ nke ikpughe ha nye ọrịa ma na-egbochikwa mmeghasị akparamàgwà ha.
“Ozugbo anyị banyesịrị n’oké ọhịa ahụ,” ka otu onye nduzi chetaara anyị, “anyị aghaghị iwedata ụda olu anyị. Nke a ga-enyere anyị aka ikiri anụmanụ na nnụnụ ndị ọzọ dị n’oké ọhịa ahụ, n’ihi na tinyere ọzọdimgba ugwu, e nwere enwe ndị na-acha ọlaedo ọlaedo, anụ duiker, ele, enyi, na ọbụna atụ.”
E mekwara ka anyị mata na e nwere agbara na ahụhụ ndị na-agba agba n’ime ogige ahụ nakwa na anyị aghaghị ịga ije n’ime ọhịa alụlụ na apịtị dị. Mụ na nwunye m lerịtara onwe anyị anya. Anyị adịghị njikere maka nke ahụ! Ma ndị nduzi ahụ nwere omume enyi nyere aka site n’ịgbazinye anyị uwe mmiri na buutu.
Mgbe ahụ onye nduzi anyị kọwara na ọrịa mmadụ na-emetụtakarị ọzọdimgba ndị ahụ nakwa na iji chebe ha, onye ọ bụla na-arịa ọrịa ma ọ bụ maara na o bu ọrịa na-efe efe agaghị eso gaa. “Ọ bụrụ na ị chọọ ịkwa ụkwara ma ọ bụ ịma uzere n’ebe ọzọdimgba ndị ahụ nọ, biko chepụ ihu site n’ebe anụmanụ ndị ahụ dị ma gbalịa ikpuchi imi na ọnụ gị,” ka otu n’ime ndị nduzi ahụ na-ekwu. “Cheta! Anyị bụ ndị ọbịa n’ebe obibi ha jupụtara n’alụlụ.”
Ịnọ Nso Ruo n’Ókè nke Ibitụ Ha Aka!
Ugwu ahụ dịwanyere mkpọda. Anyị ruru ọ̀tụ̀tụ̀ ịdị elu nke mita 3,000. E nweghị ikuku oxygen buru ibu, nke na-eme ka o sie ike iku ume, ụzọ ndị ahụ dịkwa warara. Ma anyị pụrụ ịhụ ịma mma nke osisi hagenia, ya na alaka ya ndị gbasara agbasa, ndị ahịhịa moss, òvù égbé, na osisi orchid tojupụtara na ya. Ọ na-enye oké ọhịa ahụ ịma mma yiri nke paradaịs.
Ndị nduzi ahụ malitere ugbu a ịchọ ebe a hụrụ ọzọdimgba ndị ahụ n’ụbọchị bu ụzọ, ọ bụ ezie na ọzọdimgba ndị ahụ na-anọ na njem mgbe nile na-achọ nri dị mma. “Lee anya n’ebe ahụ!” ka otu onye tiri ná mkpu. Ebe a kpakọtasịrị ọnụ n’ahịhịa ahụ dị nro bụ àkwà, ma ọ bụ akwụ́, nke ọzọdimgba azụ ya na-acha ọlaọcha ọlaọcha.
“A na-akpọ ya Umugome,” ka onye nduzi ahụ na-akọwa. “Mgbe oké ọzọdimgba gbara ihe dị ka afọ 14, azụ ya na-amalite ịcha ọcha dị ka ọlaọcha. Mgbe ahụ a na-ewere ya dị ka onye ndú nke ìgwè ahụ. Ọ bụ nanị nke ahụ azụ ya na-acha ọlaọcha ọlaọcha na-agba nne ọzọdimgba nile ahụ. A na-achụpụ ndị ka bụ nwata karị ndị nwara ime otú ahụ ozugbo! Otú ọ dị, ọ bụrụ na nke na-ama ya aka ejisie ike gbuo nke ahụ azụ ya na-acha ọlaọcha ọlaọcha, ọ na-egbukwa ụmụ ya nile. Mgbe ahụ, onye ndú ọhụrụ ahụ na-anọchi ma soro ndị nke nne nọ n’ìgwè ahụ mụta ụmụ.”
“Afọ ole ka ọzọdimgba pụrụ ịdị ndụ?” ka otu onye n’ìgwè anyị jụrụ ka anyị so ndị nduzi ahụ banye n’ime oké ọhịa achara mara mma.
“Ruo ihe dị ka afọ 40” bụ nzaghachi o ji nwayọọ nye.
“Sh! Sh!” ka otu onye ji nwayọọ kwuo mgbe a nụrụ ụda nke ịsụ ude. “Ọ̀ bụ gịnị? Ọ̀ bụ ọzọdimgba?” Ee e, kama otu n’ime ndị nduzi ahụ na-ebe ka ọzọdimgba, na-agbalị ịkpali nzaghachi. Anyị aghaghị ịnọ nnọọ nso!
N’ezie, nanị mita ise site n’ebe anyị nọ, e nwere ihe dị ka 30 n’ime ha! A gwara anyị ka anyị tukwuru ala ma nọrọ nwayọọ. “Atụla ha aka,” ka otu onye nduzi rịọrọ, “ebe ha pụrụ iche na ị na-atụ ha ihe. Biko etila mkpu. Mgbe ị na-ese foto, gaa nwayọọ nwayọọ ma kpachara anya, ejikwala ọkụ foto.”
Anyị nọ nso ruo n’ókè nke ibitụ ha aka! Ma tupu onye ọ bụla pụrụ imezu ọchịchọ ahụ, otu onye nduzi kwuru n’olu dị ala, sị: “Ebitụla ha aka!” N’oge na-adịghị anya o kwusịrị nke ahụ, ụmụ obere ọzọdimgba ole na ole bịara inyocha anyị. Onye nduzi ahụ pịatụrụ ha obere osisi n’azụ, ndị ntakịrị ahụ chọrọ ịmata ihe gbadara ná mkpọda ahụ, na-agba lịka lịka ka obere ụmụaka. “Nne” tinyere aka mgbe egwuregwu ahụ gafere ókè.
Nke ahụ azụ ya na-acha ọlaọcha ọlaọcha nọ ebe dị anya na-ekiri anyị. Na mberede, ọ bịara anyị nso ma nọdụ ala, nanị mita ole na ole site n’ebe anyị nọdụrụ ala. O buru oké ibu, ọ ghaghịkwa iru ihe dị ka kilogram 200 n’ịdị arọ! Ọ nọ nnọọ na-eri ihe nke na o legharatụụrụ anyị anya, ọ bụ ezie na uche ya dị n’ebe anyị nọ. N’eziokwu, iri nri bụ ọrụ bụ isi nke ọzọdimgba! Nke azụ ya na-acha ọlaọcha ọlaọcha nwere ike iri ihe ruru kilogram 30 nke ihe oriri n’otu ụbọchị. Anụmanụ nke ọ bụla n’ìgwè ahụ na-anọkwa na-achọ nri site n’ụtụtụ ruo mgbede. Mgbe ụfọdụ mmadụ pụrụ ịhụ ka ha na-alụ ọgụ n’ihi “ihe na-atọ ụtọ” ha chọtara.
Nri kasị amasị ha bụ ụmị nnukwu osisi senecio. Ha na-erikwa ahịhịa celery ọhịa, mkpọrọgwụ ihe ọkụkụ ụfọdụ, na achara ndị na-etopụta ọhụrụ. Mgbe ụfọdụ ha na-eme “salad,” na-agwakọta achara ndị na-etopụta ọhụrụ na akwụkwọ ndụ nke ogwu, agbara, galium, na mkpọrọgwụ dịgasị iche iche na ihe ọkụkụ ndị na-akwụ akwụ. “Gịnị mere na agbara ndị ahụ ha na-ejide ma na-ehicha adịghị agbaka ọzọdimgba ndị ahụ?” ka otu onye jụrụ. Otu onye nduzi akọwaa, sị: “Ha nwere anụ ahụ gbasiri ike n’ọbọ aka ha.”
Anyị nọ na-ele ihe nkiri a dị jụụ mgbe, na mberede, nke oké ahụ buru oké ibu kwụụrụ ọtọ, kụọ aka n’obi ya, ma tie mkpu dị egwu, na-akpata oké ụjọ! O ji ọsọ bakwuru otu n’ime ndị nduzi ahụ, na-akwụsị n’ike tupu o rute n’ebe ọ nọ. O lere onye nduzi ahụ ajọ anya! Ma onye nduzi anyị atụghị ụjọ. Kama nke ahụ, o tukwuru ala, bee ubé, ma jiri nwayọọ laghachiwa azụ. O yiri ka nke ahụ azụ ya na-acha ọlaọcha ọlaọcha ọ̀ chọrọ nnọọ ime ka anyị ghọta ume na ike ya. N’ezie, ọ gaziiri ya!
Ndị nduzi ahụ feere anyị aka ugbu a ịdị njikere ịla. Anyị esorola ihe ndị a e kere eke dị ịtụnanya, na-adịghị achọ nsogbu nọrọ ruo ihe ji obere ihe karịa otu hour, dị ka ndị ọbịa “n’ime alụlụ.” Ọ bụ ezie na ọ dị mkpirikpi, nleta anyị abụrụwo otu n’ime ahụmahụ anyị na-agaghị echefu echefu karịsịa. Ọ dịghị ihe anyị pụrụ ime karịa iche banyere nkwa Bible nke ụwa ọhụrụ na-abịanụ, ebe mmadụ na anụ ọhịa ga-eso ibe ha nọrọ n’udo n’ụzọ na-adịgide adịgide!—Aịsaịa 11:6-9.
[Map ndị dị na peeji 18]
(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)
Ọhịa nke Ọzọdimgba Ugwu
DEMOCRATIC REPUBLIC OF CONGO
Ọdọ Mmiri Kivu
UGANDA
RWANDA
AFRICA
Akụkụ E Mere Ka O Buo Ibu
[Ebe E Si Nweta Foto]
Mountain High Maps® Copyright © 1997 Digital Wisdom, Inc.