Ọrịa Strok!
I HE kasị akpata ọnwụ na ọrụsị na-adịghị ala ala ná mba ndị mepere emepe nke Ebe Ọdịda Anyanwụ bụ ọrịa strok. Okwu ahụ bụ́ “strok” na-enye echiche ụdị mberede nke “nkụchi ụbụrụ” ji eme. N’otu oge, ahụ nwere ike ịdị gị mma, ma n’oge na-esonụ, ọ na-adị gị ka àmụ̀mà o tiri gị—ọrịa strok siri ike pụrụ ịgbanwe ndụ gị na mberede na n’ụzọ dị egwu. N’ịkwarụ gị n’ụzọ obi ọjọọ, ọ pụrụ ime ka ị kwụsị ikwu okwu, bibie mmetụta uche gị, kpaghasịa ụdị mmadụ gị na ikike ịmata ihe gị, ma bokwasị gị ihe yiri ndọlị na-adịghị agwụ agwụ inwetaghachi ndụ dị otú o kwesịrị nke gị na ezinụlọ na-ebibu.
Tụlee Ellen Morgan.a Na Wednesday, Ellen bụ onye ji ahụ, dị gara gara, dị afọ 64. Na Thursday, ka ya na di ya nọ na-azụrụ ihe, na mberede Ellen enwekwaghị ike ikwu okwu, ihu ya hịkọkwara. Ike gwụrụ ya, ọ na-adagharịkwa dị ka mmanya ọ̀ na-egbu ya. Ihe ji Ellen bụ ajọ ọrịa strok!
Mgbe ọrịa strok ahụ mesịrị ya, Ellen nwere ahụ nkwarụ dị ukwuu nke na ọ pụghị ime ihe ndị kasị nta, dị ka ịsa ahụ ma ọ bụ iyinye onwe ya ákwà. N’enweghị ike ide ihe, ịkpa ihe, ma ọ bụ ịkwa ákwà, ọtụtụ oge nke ịkwa ákwá a na-apụghị ịchịkwa achịkwa na oké ike ọgwụgwụ tiri ya ihe otiti. N’ihe a nile, e mebighị usoro iche echiche Ellen; otú ọ dị, mmetụta nke ihere ga-ebilite mgbe o chere na ikekwe ndị ọzọ na-ele ya anya dị ka onye na-enweghị uche. Mgbe e mesịrị, Ellen kọwara, sị: “Ole na ole na-aghọta otú ihe iri ọnụ nke mgbanwe mberede a si emetụta mmadụ n’ụzọ mmetụta uche na n’ụzọ akparamàgwà. Ọ fọrọ nke nta ka m chee dị ka a ga-asị na ọ bụ njedebe nke ịdị adị m dị ka mmadụ.”
Gịnị na-akpata ọrịa strok? Ọ̀ na-emetụta onye ọ bụla nwere ọrịa strok n’otu ụzọ ahụ? Olee otú ndị lanarịworo si nagide ọrịa a? Olee otú ezinụlọ nke ndị lanarịrị ọrịa strok si anagide? Gịnị ka anyị nile pụrụ ime iji nye nkwado? Teta! na-enyocha ajụjụ ndị dị otú ahụ ma na-enye gị ihe ọmụma banyere ndụ nke ndị lanarịrị ọrịa strok na ezinụlọ ha bụ́ ndị so ha ekerịta ndọlị ha.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ n’ihi nchebara echiche maka ndị ahụ na-arịa ọrịa na ezinụlọ ha.