Ọrịa Strok—Ihe Na-akpata Ya
“ỤBỤRỤ bụ akụkụ ahụ kasị dị mfe mbibi,” ka ọkà ọrịa akwara bụ́ Dr. Vladimir Hachinski kwuru, nke Mahadum nke Ebe Ọdịda Anyanwụ Ontario dị na London, Canada. N’ịbụ nanị 2 pasent nke ngụkọta ịdị arọ nke ahụ, ụbụrụ nwere ihe karịrị ijeri akwara ozi iri, nke na-ezirịta ozi mgbe nile iji mepụta echiche, mmegharị ahụ, na mmetụta anyị ọ bụla. N’ịdabere n’ikuku oxygen na glucose maka ume, ụbụrụ na-enweta ihe mgbe nile site n’usoro dị mgbagwoju anya nke akwara nkesa ọbara.
Otú ọ dị, mgbe akụkụ ọ bụla dị nta nke ụbụrụ na-enwetaghị ikuku oxygen ruo ọbụna sekọnd ole na ole, a na-ebibi ịrụ ọrụ akwara ozi ndị dị mfe mbibi. Ọ bụrụ na nke a anọgide ruo ihe karịrị minit ole na ole, ọ na-arụpụta mmebi ụbụrụ, ka mkpụrụ ndụ ụbụrụ na-amalite ịnwụ tinyere ọrụ ndị ha na-achịkwa. A na-akpọ ọnọdụ a ischemia, ụkọ ikuku oxygen nke ihe bụ isi na-akpata ya bụ nsụchi nke akwara nkesa ọbara. A na-emebikwu mkpụrụ ndụ ụbụrụ ka ụkọ ikuku oxygen na-akpalite usoro na-egbu egbu nke ọtụtụ mmeghachi omume mmiri ọgwụ. Ihe ọ na-arụpụta bụ ọrịa strok. Ọrịa strok na-emekwa mgbe akwara gbawara, na-eme ka ọbara jupụta n’ime ụbụrụ, bụ́ nke na-egbubi ụzọ njikọ nile. Nke a na-akpaghasị oruru mmiri ọgwụ na ụzarị gaa n’uru ahụ ma na-akpata mmebi nke mkpụrụ ndụ ụbụrụ.
Mmetụta Ya
Ọrịa strok ọ bụla dị iche, ọrịa strok pụkwara imetụta ndị mmadụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’ụzọ nile. Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye na-atacha ahụhụ ihe nile pụrụ isite n’ọrịa strok apụta, mmetụta ya pụrụ ịgụnye malite ná ndị na-adịghị oké njọ na ndị siri ike nchọpụta gaa ná ndị siri ike ma na-apụta ìhè n’ụzọ na-afụ ụfụ. Akụkụ ụbụrụ ebe ọrịa strok mere na-ekpebi ọrụ akụkụ ahụ ndị a ga-emebi.
Nsogbu a na-ahụkarị bụ adịghị ike ma ọ bụ mkpọnwụ nke aka na ụkwụ. N’ozuzu ya, nke a na-eme nanị n’otu akụkụ ahụ, akụkụ nke chere akụkụ ụbụrụ ebe ọrịa strok ahụ mere ihu. N’ihi ya, mmebi ụbụrụ aka nri na-arụpụta ahụ mkpọnwụ n’akụkụ aka ekpe, mmebi ụbụrụ aka ekpe na-arụpụtakwa ahụ mkpọnwụ n’akụkụ aka nri. Ụfọdụ ndị nwere ike ịnọgide jiri aka na ụkwụ ha na-eme ihe, nanị ịchọpụta na uru ahụ ha na-ama jijiji ruo n’ókè nke na ọ na-eyi ka aka na ụkwụ ha na-agawara nke ha. Onye o metụtara na-eyi onye na-eje ije n’elu apịtị nke na-agbalị iguzozi. Dr. David Levine, nke Ụlọ Ọrụ Ahụ Ike nke Mahadum New York, na-ekwu, sị: “Ha enwekwaghị ụdị mkpali nke na-agwa ha ma aka ma ọ bụ ụkwụ ha ọ na-emegharị ma ọ bụ na ọ dịghị emegharị na ebe ha dị.”
Ihe ọdịdọ na-adọ ihe ruru 15 pasent nke ndị lanarịrịnụ, na-arụpụta ọnọdụ nke mmegharị ahụ a na-achịkwaghị achịkwa, ọ na-emekarịkwa n’oge mmadụ na-amaghị onwe ya. Ọzọkwa, inwe ahụ mgbu nakwa mgbanwe ná mmetụta bụ ihe a na-enwekarị. Otu onye lanarịrị ọrịa strok bụ́ onye aka na ụkwụ ya na-esinwụ mgbe mgbe na-ekwu, sị: “E nwere anyasị mgbe ihe na-emetụ ụkwụ m, m biliekwa n’ihi na ọ na-eyi ka m na-enweta ọdịdọ eletrik.”
Ihe na-esi n’ọrịa strok apụta pụrụ ịgụnye ịhụ ihe abụọ abụọ na nsogbu ilo ihe. Ọ bụrụ na e mebiri isi akwara ozi nke ọnụ na akpịrị, ndị ọrịa strok metụtara pụrụ inwetakwu ọnọdụ ndị na-eme ihere, dị ka ịgụsị asọ mmiri. Ọ pụrụ imetụta nke ọ bụla n’ime ikike ise e ji amata ihe, na-akpata nsogbu ịhụ ụzọ, ịnụ ihe, ịnụ ísì, ịnụ ụtọ, na mmetụ ahụ.
Nsogbu Nkwurịta Okwu
Were ya na akataka mmadụ abụọ ị na-amabughị na-eso gị n’azụ n’okporo ámá ọkụ na-anaghị enwusi ike na ya. N’ileghachi anya azụ, ị hụ ka ha ji ọsọ na-agbata n’ebe ị nọ. Ị gbalịa iti mkpu maka enyemaka, ma o nweghị ihe na-apụta! Ị̀ pụrụ iche n’echiche ụdị oké obi nkoropụ ị ga-enwe n’ọnọdụ dị otú ahụ? Nke ahụ bụ ihe ọtụtụ ndị ọrịa strok metụtara na-ahụ mgbe ikike ikwu okwu ha funahụrụ ha na mberede.
Enweghị ike ikwupụta echiche, mmetụta, olileanya, na egwu—ịbụ onye e kewapụrụ n’ụzọ ihe atụ pụọ n’ebe ndị enyi na ndị ezinụlọ nọ—bụ otu n’ime ihe kasị egbu mgbu na-esi n’ọrịa strok apụta. Otu onye lanarịrị ọrịa strok kọwara ya otú a: “Mgbe ọ bụla m nwara ikwu ihe dị m n’obi ọ dịghị ihe na-apụta. A manyere m idere duu, apụghịkwa m ịgbaso ntụziaka e kwuru ekwu ma ọ bụ e dere ede. Okwu na-ada . . . dị ka a ga-asị na ndị nọ m gburugburu na-asụ asụsụ ala ọzọ. Apụghị m ịghọta ma ọ bụ ikwu okwu.”
Otú ọ dị, Charles ghọtara ihe nile a na-agwa ya. Ma banyere ime nzaghachi, ọ na-ede, sị: “M na-echepụta okwu ndị m chọrọ ikwu, ma ha na-adapụta otu otu na n’ụzọ na-adịghị n’usoro. N’oge ahụ echere m na m tọrọ atọ n’ime onwe m.” N’akwụkwọ ya bụ́ Stroke: An Owner’s Manual, Arthur Josephs na-akọwa, sị: “A na-achịkwa ma na-eduzi ihe karịrị otu narị uru ahụ dị iche iche n’oge a na-ekwu okwu, nkezi nke ihe karịrị otu narị njikọ akwara ozi na-achịkwa nke ọ bụla n’ime uru ahụ ndị ahụ. . . . A chọrọ ihe omume 140,000 dị ịtụnanya metụtara akwara ozi na uru ahụ maka sekọnd ọ bụla nke ikwu okwu. Ọ̀ bụ ihe ijuanya na mmerụ ahụ ọ bụla n’akụkụ ụbụrụ nke na-achịkwa uru ahụ ndị a pụrụ iduga n’okwu na-adịghị n’usoro?”
Ọrịa strok na-emepụta ihe omume na-agbagwoju anya n’akụkụ e ji ekwu okwu. Dị ka ihe atụ, onye na-apụghị ikwu okwu pụrụ inwe ike ịbụ abụ. Onye ọzọ nwere ike ikwu okwu ná ndapụta ma ọ bụghị mgbe ọ chọrọ ikwu ha ma ọ bụ o nwere ike, n’aka nke ọzọ, na-ekwu okwu n’akwụsịghị akwụsị. Ndị ọzọ na-ekwughachi okwu ma ọ bụ nkebi okwu ugboro ugboro ma ọ bụ na-ekwu okwu ndị na-adabaghị adaba, na-asị ee mgbe ha chọrọ ikwu ee e nakwa ee e mgbe ha chọrọ ikwu ee. Ụfọdụ maara okwu ndị ha chọrọ iji mee ihe, ma ụbụrụ apụghị ịkpali ọnụ, egbugbere ọnụ, na ire ikwu ha. Ma ọ bụ ha nwere ike ịdị na-ekwu okwu na-edoghị anya n’ihi adịghị ike nke uru ahụ. Ụfọdụ pụrụ iji ntiwapụ na-ada oké ụda kwụsị okwu ha.
Mmerụ ahụ ọzọ na-esite n’ọrịa strok nwere ike ịbụ mmebi nke akụkụ ụbụrụ na-achịkwa ụda olu na-egosi mmetụta uche. Ihe na-esi na ya apụta pụrụ ịbụ okwu a na-etinyeghị ume na ya. Ma ọ bụ e nwere ike inwe ihe isi ike n’ịghọta ụda olu na-egosi mmetụta uche nke ndị ọzọ. Ihe mgbochi nkwurịta okwu ndị yiri ndị a na ndị a kọwara n’elu pụrụ ịkpata nkewa n’etiti ndị òtù ezinụlọ, dị ka di na nwunye. Georg na-akọwa, sị: “N’ihi na ọrịa strok na-emetụta ọdịdị ihu na mmegharị ahụ, n’ezie ọdịdị mmadụ dum, na mberede anyị adịghị adịkwa ná mma dị ka anyị na-adịbu. Ọ na-eyi m ka m nwere nwunye dịwagara nnọọ iche, onye m na-aghaghị ịmalite n’isi ịmatawa ọzọ.”
Mgbanwe Mmetụta Uche na Ọdịdị Mmadụ
Mgbanwe ọnọdụ uche na-adabaghị adaba, ntiwapụ nke anya mmiri ma ọ bụ ọchị, oké iwe, mmetụta a na-amaghị ebe o si nke inyo mmadụ enyo, na obi ilu dị egwu bụ nanị akụkụ nke nsogbu mmetụta uche na ọdịdị mmadụ na-eju anya nke ndị lanarịrị ọrịa strok na ezinụlọ ha na-aghaghị ịnagide.
Otu onye nwere ọrịa strok aha ya bụ Gilbert na-akọ, sị: “Mgbe ụfọdụ, ihe na-emetụta m, ọ́ bụghị ịchị ọchị ọ bụrụ ịkwa ákwá n’ihe dịkarịsịrị nta. Mgbe ụfọdụ, mgbe m na-achị ọchị, otu onye ga-ajụ, sị, ‘Gịnị ka ị na-achịrị ọchị?’ n’ezie apụghịkwa m ịgwa ha.” Nke a, tinyere nsogbu nguzozi na itetụ ụkwụ, kwaliri Gilbert ikwu, sị: “Ọ na-adị m ka m nọ n’ahụ ọzọ, dị nnọọ ka m bụ onye ọzọ, ọ bụghị onye ahụ m bụ tupu ọrịa strok ahụ.”
N’inwe nkwarụ ahụ na-akpaghasị uche na ahụ, mmadụ ole na ole ma ọ bụrụ na ọ dị na-agbanarị inwe echiche nke mkpaghasị uche. Hiroyuki, bụ́ onye ọrịa strok mere ka o nwee nsogbu ikwu okwu na mkpọnwụ otu akụkụ ahụ, na-ekwu, sị: “Ọbụna mgbe ọtụtụ oge gafesịrị agbakeghị m. N’ịghọta na agaghị m enwe ike ịnọgide n’ọrụ m dị ka ọ dị na mbụ, obi koropụrụ m. Amalitere m ịta ihe na ndị mmadụ ụta, ọ na-adịkwa m ka m ga-egosipụta mmetụta m n’ụzọ a na-achịkwaghị achịkwa. Emeghị m ihe ka nwoke.”
Egwu na nchegbu bụ ihe ndị nwere ọrịa strok na-enwekarị. Ellen kwuru, sị: “Ana m enwe mmetụta nke anọghị ná nchebe mgbe m nwere nrụgide n’isi m nke pụrụ ịgba àmà maka ọrịa strok n’ọdịnihu. Egwu na-ejide m n’ezie ma ọ bụrụ na m nye onwe m ohere iche echiche n’ụzọ na-adịghị mma.” Ron na-akọwa nchegbu ọ na-agbaso mgba, sị: “Iru nkwubi okwu ziri ezi fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe na-adịghị ekwe omume mgbe ụfọdụ. Idozi nsogbu abụọ ma ọ bụ atọ dị nta otu oge na-agbakasị m ahụ. Ana m echefu ihe ngwa ngwa nke na mgbe ụfọdụ apụghị m icheta mkpebi e mere na minit ole na ole bu ụzọ. N’ihi ya, ana m ehie ụzọ ndị buru ibu, ọ na-emechukwa mụ na ndị ọzọ ihu. Gịnị ka m ga-adị ka ya n’afọ ole na ole? Ọ̀ bụ na mụ agaghị enwe ike ịkpa nkata onye isi zuru okè ma ọ bụ nyaa ụgbọala? M̀ ga-abụ ibu arọ nye nwunye m?”
Ọ Na-emetụtakwa Ndị Òtù Ezinụlọ
Mgbe ahụ, a pụrụ ịhụ na ndị nwere ọrịa strok abụghị nanị ndị na-aghaghị ịlụso ihe mgbu na-esi na ya apụta ọgụ. Ezinụlọ ha na-alụkwa. N’ọnọdụ ụfọdụ ha aghaghị ịnagide oké ihe iri ọnụ nke ịhụ onye na-ekwubu okwu, dị gara gara ka ọ na-agbada n’anya ha, bụrụ onye e weturu gaa n’ọnọdụ yiri nke nwa ọhụrụ na-adabere n’onye ọzọ. A pụrụ ịkpaghasị mmekọrịta ebe ọ pụrụ ịbụ na ndị òtù ezinụlọ aghaghị iweghara ibu ọrụ ndị na-amaghị ha ahụ.
Haruko na-akọ mmetụta ahụ dị mwute n’ụzọ a: “Di m apụkwaghị icheta ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ihe nile dị mkpa. Na mberede anyị aghaghị imechi ụlọ ọrụ ọ na-elekọtabu, ụlọ anyị na ihe onwunwe anyị funahụkwara anyị. Ihe kasị wute m bụ enwekwaghị ike isoro di m kwurịta okwu ma ọ bụ ijekwuru ya maka ndụmọdụ. N’ịbụ onye na-amakwaghị nke bụ anyasị na ehihie, ọ na-ewepụkarị ákwà a wara ya n’anyasị. Ọ bụ ezie na anyị maara na oge na-abịa mgbe ọ ga-agbada ruo n’ọnọdụ a, ọ ka na-esiri anyị ike ịnakwere ịbụ eziokwu nke ọnọdụ ya. A gbanwere ọnọdụ anyị kpam kpam, nke na ugbu a mụ na ada m bụ ndị nlekọta di m.”
“Ilekọta onye nwere ọrịa strok—n’agbanyeghị otú ị hụruru ya n’anya—pụrụ ịkarị gị ike mgbe ụfọdụ,” ka Elaine Fantle Shimberg kwuru n’akwụkwọ bụ́ Strokes: What Families Should Know. “Nrụgide na ibu ọrụ adịghị ebelata.” N’ọnọdụ ụfọdụ ọ̀tụ̀tụ̀ dị elu nke nlekọta nke ndị òtù ezinụlọ ụfọdụ na-enye pụrụ imebi ahụ ike, mmetụta uche, na ọnọdụ ime mmụọ nke onye na-enye nlekọta. Maria na-akọwa na ọrịa strok nne ya nwere mmetụta dị egwu ná ndụ ya: “Ana m eleta ya kwa ụbọchị ma na-agbalị iwulite ya elu n’ụzọ ime mmụọ, soro ya na-agụ ihe ma na-ekpe ekpere, mgbe ahụkwa na-egosi ya ịhụnanya, na-amakụ, ma na-esusu ya ọnụ nke ukwuu. Mgbe m lọtara ụlọ, ike na-agwụsị m n’ụzọ mmetụta uche—ụbọchị ụfọdụ ruo n’ókè nke ịgbọ agbọ.”
Ihe kasị sie ike ịnagide nye ụfọdụ ndị na-enye nlekọta bụ mgbanwe n’akparamàgwà. Ọkà mmụta njikọ ụbụrụ na akparamàgwà mmadụ bụ́ Dr. Ronald Calvanio na-akọrọ Teta! sị: “Mgbe i nwere ọrịa nke na-emetụta ọrụ dị mgbagwoju anya nke ụbụrụ—ya bụ, otú mmadụ si eche echiche, eduzi ndụ ya, mmeghachi omume mmetụta uche ya—ihe na-eche anyị ihu bụ onye ahụ n’ozuzu ya, ya mere n’ụzọ ụfọdụ mmebi akparamàgwà nke na-ewere ọnọdụ na-agbanwe ọdịdị ndụ nke ezinụlọ ahụ n’ụzọ dị nnọọ egwu.” Yoshiko na-akọ, sị: “Di m yiri ka ọ gbanwere kpam kpam ka nrịanrịa ya gasịrị, na-ewe oké iwe n’ihi ihe kasị nta. N’eziokwu ana m ahụsi anya n’oge ndị ahụ.”
Ọtụtụ mgbe, ndị na-anọghị n’ezinụlọ nwere ike ghara ịghọta mgbanwe ọdịdị mmadụ. N’ihi ya, ọ na-adị ụfọdụ ndị na-enye nlekọta ka e kewapụrụ ha ma na-ebu ibu arọ ha nanị ha. Midori na-akọwa, sị: “Ọrịa strok ahụ nyere di m nkwarụ uche na mmetụta uche. Ọ bụ ezie na agbamume dị ya mkpa nke ukwuu, ọ gaghị esoro onye ọ bụla kwurịta banyere ya, ọ na-atakwa ahụhụ nanị ya. Ya mere ọ dịịrị m ime ihe banyere mmetụta uche ya. Ịhụ ọnọdụ uche di m kwa ụbọchị emewo ka ahụ ghara iru m ala, ọbụna mgbe ụfọdụ ọ na-atụkwa m egwu.”
Olee otú ọtụtụ ndị lanarịrị ọrịa strok na ezinụlọ ha siworo nagide mgbanwe ndị ọrịa strok na-eweta ná ndụ ha? N’ụzọ ndị dị aṅaa ka onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ isi kwadoo ndị na-ata ahụhụ mmetụta na-enye nkwarụ nke ọrịa strok? Isiokwu anyị na-eso na-akọwa.
[Igbe/Foto dị na peeji nke 7]
Mgbaàmà Ịdọ Aka ná Ntị
• Ike ọgwụgwụ mberede, ahụ nsinwụ, ma ọ bụ mkpọnwụ nke ihu, aka, ma ọ bụ ụkwụ, karịsịa n’otu akụkụ nke ahụ
• Ịmalite ịhụ ihe inyoghị inyoghị na mberede, karịsịa n’otu anya; ọnọdụ nke ịhụ ihe abụọ abụọ
• Inwe ihe isi ike n’ikwu okwu ma ọ bụ ịghọta ọbụna ahịrịokwu ndị dị mfe
• Ajụ obubu ma ọ bụ akwụsighị ike ma ọ bụ achịkwaghị onwe onye, karịsịa mgbe e jikọtara ya na mgbaàmà ọzọ
Mgbaàmà Ndị A Na-adịghị Ahụkarị
• Oké isi ọwụwa mberede, nke a na-apụghịkwa ịkọwa—nke a na-akọwakarị dị ka “isi ọwụwa kasị njọ e nwetụworo”
• Onunu agbọ na ahụ ọkụ mberede—nke dị iche na nrịanrịa nje virus site n’ịdị ngwa nke mmalite ya (na minit ma ọ bụ hour kama ịbụ ọtụtụ ụbọchị)
• Amaghị onwe onye ruo nwa oge ma ọ bụ oge amachaghị ihe na-emenụ (ntụbọ, mgbagwoju anya, ihe ọdịdọ, amaghị onwe onye ruo ogologo oge)
Elegharala Mgbaàmà Anya
Dr. David Levine na-agba ume na mgbe mgbaàmà pụtara, ka onye ọrịa ahụ “gaa ngwa ngwa dị ka o kwere omume n’ọnụ ụlọ ndị ọrịa ọnọdụ mberede nke ụlọ ọgwụ. E nwere ihe àmà na ọ bụrụ a gwọọ ọrịa strok na hour ole na ole ndị mbụ, a pụrụ ibelata mbibi ya.”
Mgbe ụfọdụ mgbaàmà pụrụ ịpụta ruo oge dị mkpirikpi wee pụọkwa n’anya. A maara ọnọdụ ndị a dị ka TIA, ma ọ bụ ụkọ ọbara na-adịghị adịte anya. Elegharala ha anya, ebe ha nwere ike ịdị na-agba àmà ihe ize ndụ nke ọrịa strok siri ike, ọrịa strok zukwara ezu pụrụ isochi. Dọkịta pụrụ ịgwọ ihe ndị na-akpata ha ma nye aka belata ihe ize ndụ nke ọrịa strok n’ọdịnihu.
E nwetara ya site n’ụkpụrụ nduzi nke Òtù Ọrịa Strok Mba, Englewood, Colorado, U.S.A., wepụtara.